Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-egosi “Ikpeazụ Site na Mbụ”

Jehova Na-egosi “Ikpeazụ Site na Mbụ”

Jehova Na-egosi “Ikpeazụ Site na Mbụ”

“[Onye] na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.”—AỊSAỊA 46:10.

1, 2. Olee ihe dị ịrịba ama banyere ihe omume ndị weere ọnọdụ n’oge ọdịda Babilọn, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere Jehova?

N’ETITI abalị, ndị agha bụ́ ndị iro Babilọn zooro ezoro si n’ala Osimiri Yufretis gawa obodo ukwu bụ́ Babilọn, bụ́ obodo ha bu n’obi ịlụso agha. Ha hụrụ ihe tụrụ ha nnọọ n’anya ka ha na-erute n’ụzọ e si aba n’obodo ahụ. E ghewere agadaga ọnụ ụzọ ámá Babilọn oghe! Ha siri n’ala osimiri ahụ pụta ma si na steepụ mgbidi obodo ahụ banye n’ime obodo ahụ. Ha meriri obodo ahụ n’egbughị oge. Ngwa ngwa, Saịrọs, bụ́ onyeisi ndị agha ahụ, malitere ịchị ala ahụ ha meriri ma nyezie iwu ka a tọhapụ ndị Izrel a dọọrọ n’agha. Ọtụtụ puku ndị ahụ a dọọrọ n’agha laghachiri n’obodo ha ma maliteghachi ife Jehova na Jeruselem.—2 Ihe E Mere 36:22, 23; Ezra 1:1-4.

2 Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme agbaala akaebe na ihe ndị a e kwuru okwu ha, bụ́ ndị mere n’afọ ndị 539-537 T.O.A., mere eme n’ezie. Otu ihe dị ịrịba ama banyere ihe ndị a merenụ bụ na a maara banyere ha ihe dị ka narị afọ abụọ tupu ha emee. Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka onye amụma ya bụ́ Aịzaịa kwuo banyere ọdịda Babịlọn ogologo oge tupu ya emee. (Aịsaịa 44:24–45:7) Chineke mere ka a mata ma ihe ndị ga-eme n’oge Babịlọn ga-ada ma aha onye ga-emeri ya. * Mgbe Jehova na-agwa ụmụ Izrel, ndị bụ́ ndị àmà ya n’oge ahụ, okwu, ọ sịrị: “Chetanụ ihe mbụ nile site na mgbe ebighị ebi gara aga: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.” (Aịsaịa 46:9, 10a) Jehova bụ n’ezie Chineke nke pụrụ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle azịza ha ugbu a?

3 Ruo n’ókè ha aṅaa ka Chineke maara ihe ga-eme n’ọdịnihu? Jehova ọ̀ maara ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme n’ọdịnihu? À kara ọdịnihu anyị aka n’ezie? Anyị ga-atụle ihe Bible zara n’ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ metụtara ihe a na-ekwu maka ya n’isiokwu a na n’isiokwu na-esonụ.

Jehova Bụ Chineke nke Nwere Ikike nke Ibu Amụma

4. Ònye ka amụma ndị dị na Bible sitere n’aka ya?

4 Ebe ọ bụ na Jehova maara ihe ga-eme n’ọdịnihu, o ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị ohu ya n’oge Bible dekọọ ọtụtụ amụma. Amụma ndị a nyeere anyị aka ịma ihe Jehova zubere ime n’ọdịnihu. Jehova kwupụtara, sị: “Ihe mbụ, lee, ha abịawo, ọ bụkwa ihe ọhụrụ dị iche iche ka Mụ onwe m na-egosi: tupu ha epuo ana m eme ka unu nụrụ ha.” (Aịsaịa 42:9) Ndị Chineke nwere nnọọ ihe ùgwù pụrụ iche!

5. Olee ibu ọrụ dịịrị onye maara ihe Jehova ga-eme n’ọdịnihu?

5 Emọs onye amụma mesiri anyị obi ike, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” Jehova ikpughere ndị ohu ya izu nzuzo a mere ka ha nwee ibu ọrụ. Lee ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ Emọs jizi mee ihe: “Ọdụm agbọwo ụja, ọ̀ bụ onye na-agaghị atụ egwu?” Dị nnọọ ka ụja ọdụm na-eme ka mmadụ na anụmanụ nọ ebe ahụ ọ nọ na-agbọ ụja tụọ egwu, otú ahụkwa ka ọ na-adị ndị amụma dị ka Emọs, ha na-akpọsa ihe Jehova gwara ha n’egbughị oge. “Onyenwe anyị Jehova ekwuwo, ọ̀ bụ onye na-agaghị ebu amụma?”—Emọs 3:7, 8.

“Okwu” Jehova ‘Ga-aga nke Ọma’

6. Olee otú “ndụmọdụ” Jehova banyere ọdịda Babilọn si gaa nke ọma?

6 Jehova sitere n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa kwuo, sị: “Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.” (Aịsaịa 46:10b) “Ndụmọdụ” Chineke, ya bụ, uche ma ọ bụ nzube ya banyere Babilọn, bụ isi na Peshia kpọpụta Saịrọs ka ọ bịa kwada Babilọn. Jehova kpọsara nzube ya banyere Babịlọn ogologo oge tupu ya emezuo. Dị ka anyị maara, nke ahụ mezuru nnọọ n’afọ 539 T.O.A.

7. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na “okwu” Jehova na-emezu mgbe nile?

7 Ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị afọ anọ tupu Saịrọs emerie Babilọn, ndị agha Amọn na Moab gbakọtara aka bịa ibuso Eze Jehoshafat nke Juda agha. O ji obi ike kpegara Jehova ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke nna anyị ha, ọ̀ bụghị Gị onwe gị bụ Chineke n’eluigwe? ọ̀ bụghị Gị onwe gị na-achịkwa alaeze nile nke mba nile? ọ bụkwa n’aka Gị ka ume na ịdị ike dị, ọ dịghịkwa onye ga-eguzo onwe ya n’ebe Ị nọ?” (2 Ihe E Mere 20:6) Aịzaịa gosipụtakwara obi ike yiri nke ahụ mgbe ọ sịrị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ezubewo; ònye ga-emebikwa ya? aka Ya esetịwokwa; ònye ga-emekwa ka ọ laghachi azụ?” (Aịsaịa 14:27) Ka e mesịrị, mgbe e mere ka isi dị Eze Nebukadneza nke Babịlọn mma ka ọ gbasịrị ara ruo oge ụfọdụ, o ji umeala n’obi kweta, sị: “Ọ dịghịkwa onye ga-eti aka [Chineke] ihe, sị Ya, Gịnị ka i meworo?” (Daniel 4:35) Ee, Jehova na-emesi ndị ya obi ike, sị: ‘Okwu m agaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.’ (Aịsaịa 55:11) Ka obi sie anyị nnọọ ike na “okwu” Jehova na-emezu mgbe nile. Nzube Chineke agaghị ada.

“Nzube Ebighị Ebi” nke Chineke

8. Gịnị bụ “nzube ebighị ebi” Chineke?

8 N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, Pọl onyeozi kwuru na Chineke nwere “nzube ebighị ebi.” (Ndị Efesọs 3:11) Nke a abụghị nnọọ ime atụmatụ ihe ọ ga-eme, dị ka à ga-asị na Chineke na-ebu ụzọ eme atụmatụ otú ọ ga-esi rụọ ọrụ ya tupu ya arụwa ya. Kama ọ bụ mkpebi siri ike Jehova mere imezu nzube mbụ ya maka ụmụ mmadụ na ụwa. (Jenesis 1:28) Iji nyere anyị aka ịghọta na nzube Jehova adịghị agha agha, tụlee amụma mbụ e dekọrọ na Bible.

9. Olee otú Jenesis 3:15 si metụta nzube Chineke?

9 Nkwa ahụ dị na Jenesis 3:15 gosiri na ozugbo Adam na Iv mehiere, Jehova kpebisiri ike na nwanyị ihe atụ ya ga-amụta mkpụrụ, ma ọ bụ nwa. Jehova makwaara ihe ga-esi n’iro ga-adị n’etiti nwanyị ya na Setan nakwa n’etiti mkpụrụ nwanyị ahụ na mkpụrụ Setan pụta tupu nke ahụ emee. Ọ bụ ezie na Jehova ga-ekwe ka e chihịa ikiri ụkwụ nke Mkpụrụ nwanyị Chineke, ma n’oge nke Chineke, Mkpụrụ ahụ ga-echipịa agwọ ahụ, ma ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu, n’isi. Ka ọ dịgodị, nzube Jehova nọ nnọọ na-emezu dị ka Jehova si zube ya site ná mgbe a họọrọ osuso ọmụmụ a ga-esi mụta mkpụrụ ahụ ruo mgbe Jizọs pụtara dị ka Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa.—Luk 3:15, 23-38; Ndị Galeshia 4:4.

Ihe Ndị Jehova Bu Ụzọ Kpebie na Ha Ga-eme

10. Jehova ò kpebiri tupu ya e kee Adam na Iv na ha ga-emehie? Kọwaa.

10 Mgbe ọ na-ekwu banyere òkè Jizọs keere n’imezu nzube Chineke, Pita onyeozi dere, sị: “E bu ụzọ mara ya [Jizọs] tupu a tọọ ntọala ụwa, ma e mere ka ọ pụta ìhè n’ọgwụgwụ nke oge n’ihi unu.” (1 Pita 1:20) Jehova ò kpebiri tupu ya ekee Adam na Iv na ha ga-emehie nakwa na Jizọs Kraịst ga-achụ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ? Ee e. E si n’okwu Grik pụtara n’ụzọ nkịtị “ịgha mkpụrụ” sụgharịta okwu ahụ bụ́ “tọọ ntọala.” Adam na Iv hà ‘ghara mkpụrụ’ ma ọ bụ mụọ ụmụ tupu ha emehie? Mba. Ọ bụ mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi ka ha mụrụ ụmụ. (Jenesis 4:1) Ya mere, ọ bụ mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi nakwa tupu ha amụta ụmụ ka Jehova kpebiri na “mkpụrụ” ga-apụta. Ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs mere ka o kwe omume ịgbapụta ụmụ mmadụ. Nke ahụ bụ ndokwa e ji ịhụnanya mee, bụ́ nke ga-eme ka e kpochapụ mmehie e ketara eketa na ọrụ nile nke Setan.—Matiu 20:28; Ndị Hibru 2:14; 1 Jọn 3:8.

11. Olee ihe Jehova kpebiri ga-eme iji mezuo nzube ya tupu ya emee?

11 Chineke kpebiri ihe ọzọ ga-eme bụ́ nke ga-emezu nzube ya, tupu ya emee. E gosipụtara nke a n’ihe Pọl degara ndị Efesọs, ya bụ na Chineke ‘ga-achịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.’ N’ikwuzi banyere “ihe ndị dị n’eluigwe,” ya bụ, ndị a họọrọ ka ha na Kraịst kekọọ ihe, Pọl kọwara, sị: “Ebe a họpụtara anyị tupu oge eruo dị ka nzube nke onye ahụ si dị bụ́ onye ji ihe nile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu.” (Ndị Efesọs 1:10, 11) Ee, Jehova kpebiri tupu oge eruo na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ụmụ mmadụ ga-emejupụta akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ nwanyị Chineke ma soro Kraịst mee ka ndị ọzọ rite uru site n’àjà mgbapụta ahụ. (Ndị Rom 8:28-30) Pita onyeozi kpọrọ ndị a “mba dị nsọ.” (1 Pita 2:9) Jọn onyeozi nwere ihe ùgwù nke isi n’ọhụụ mata ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ ga-eso Kraịst kekọọ ihe—ha dị otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ. (Mkpughe 7:4-8; 14:1, 3) Ha ‘na-eje ozi maka otuto nke ebube Chineke’ ka ha na-akwado Kraịst dị ka Eze.—Ndị Efesọs 1:12-14.

12. Olee otú anyị si mara na e kpebighị kpọmkwem ndị ga-eso n’otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ ahụ?

12 Ihe a e kpebiri na otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ ga-eso Kraịst ketakọọ ihe apụtaghị na e nwere kpọmkwem ndị e kwuru na ọ bụ ha ga-eji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi. N’ezie, ọ bụ ndị e tere mmanụ ka e bu ụzọ nye ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst iji duzie ha ma wusie ha ike ịnọgide na-eme ezi ihe nakwa iji nọgide na-eme onwe ha ka ha ruo eruo maka ọkpụkpọ eluigwe a kpọrọ ha. (Ndị Filipaị 2:12; 2 Ndị Tesalonaịka 1:5, 11; 2 Pita 1:10, 11) Jehova maara tupu ego eruo na otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ ga-eru eru imezu nzube ya ahụ. Ndị ọ ga-abụ ga-adabere n’otú ndị a kpọrọ ga-esi bie ndụ ha, ọ bụ mkpebi nke onye nke ọ bụla n’ime ha ga-eme n’onwe ya.—Matiu 24:13.

Ihe Ndị Jehova Maara Tupu Ha Emee

13, 14. Olee ihe ya na otú Jehova si eji ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu eme ihe na-ekwekọ, n’ihi gịnịkwa?

13 Ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke nke nwere ikike ibu amụma na nke na-ezube ihe ọ na-eme, olee otú o si eji ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu eme ihe? Nke mbụ, e mere ka obi sie anyị ike na ụzọ Chineke nile ziri ezi, bụrụ ụzọ ezi omume na nke ịhụnanya. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara ndị Hibru ghọrọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, o mesiri ya ike na ‘ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe Chineke omume ịgha ụgha na ha’ bụ isi ọ dụrụ na nkwa o kwere. (Ndị Hibru 6:17, 18) Pọl mekwara ka nke a pụta ìhè n’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, bụ́ ebe o dere na Chineke ‘apụghị ịgha ụgha.’—Taịtọs 1:2.

14 Ọzọkwa, ọ bụ ezie na Jehova nwere ike na-enweghị atụ, ọ dịtụghị eme ihe na-ezighị ezi. Mozis kọwara Jehova dị ka “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ihe ọ bụla Jehova na-eme na-ekwekọ n’ụdị onye ọ bụ. Ihe ndị ọ na-eme na-ekwekọ nnọọ n’àgwà ya ndị bụ́ isi ndị bụ́ ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi na ike.

15, 16. Olee nhọrọ Jehova chere Adam n’ihu n’ogige Iden?

15 Tụlee otú ihe a nile si metụta ihe ndị mere n’ogige Iden. Dị ka Nna na-ahụ n’anya, Jehova nyere ụmụ mmadụ ihe nile dị ha mkpa. O nyere Adam ikike nke iche echiche, ịtụgharị uche n’ihe, na iru ná nkwubi okwu. Adam adịghị ka ụmụ anụmanụ bụ́ ndị ihe e kenyere n’ime ha na-achịkwa, o nwere ikike nke ịhọrọ ihe ọ ga-eme. Mgbe Chineke kesịrị Adam, o si n’ocheeze ya dị n’eluigwe letuo anya ma hụ “ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:26-31; 2 Pita 2:12.

16 Mgbe Jehova chọrọ inye Adam iwu ka ọ ghara iri “mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ,” O nyere Adam ntụziaka zuru ezu nke ga-enyere ya aka ikpebi ihe ọ ga-eme. O nyere Adam ohere iri mkpụrụ sitere “n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige” ma e wezụga otu ma dọọ ya aka ná ntị banyere ihe ọjọọ ga-esi n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu pụta. (Jenesis 2:16, 17) Ọ kọwaara Adam ihe ga-esi n’ihe ọ bụla ọ họọrọ ime pụta. Gịnị ka Adam ga-eme?

17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova na-ahọrọ ụdị ihe ọ na-achọ ịma banyere ha tupu ha emee?

17 O doro anya na Jehova họọrọ ịghara ịhụ ihe Adam—na Iv—ga-eme tupu ha emee ya, n’agbanyeghị na O nwere ikike nke ịma ihe nile ga-eme tupu ha emee. Ya mere, ihe bụ́ isiokwu abụghị ma Jehova ọ̀ pụrụ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu, kama ọ bụ ma ọ̀ họọrọ ime otú ahụ. Ọzọkwa, anyị pụrụ ikwu na ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke ịhụnanya, ọ gaghị ama ụma jiri obi ọjọọ kpebie na ụmụ mmadụ ga-enupụ isi, ebe ọ maara ihe ọjọọ nile ga-esi na ya pụta. (Matiu 7:11; 1 Jọn 4:8) N’ihi ya, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova na-ahọrọ ụdị ihe ndị ọ na-achọ ịma banyere ha tupu ha emee.

18. N’ihi gịnị ka Jehova ịhọrọ ụdị ihe ndị ọ na-achọ ịma banyere ha tupu ha emee na-ejighị gosi na e nwere ihe ndị ọ na-enweghị ikike ime?

18 Jehova ịhọrọ ụdị ihe ọ na-achọ ịma banyere ha tupu ha emee ọ̀ pụtara na e nwere ihe ọ na-enweghị ikike ime? Ọ dịghị ma ọlị. Mozis kọwara Jehova dị ka “Oké nkume,” na-agbakwụnye, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.” Ụta adịghịrị ya n’ihi ihe ọjọọ nile si ná mmehie nke ụmụ mmadụ pụta. Ọ bụ nnupụisi Adam kpatara ihe ọjọọ nile si ná mmehie pụta, bụ́ nke na-emekpọ anyị nile ọnụ taa. Pọl onyeozi kwuru n’ụzọ doro anya na “mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Deuterọnọmi 32:4, 5; Ndị Rom 5:12; Jeremaịa 10:23.

19. Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Site n’ihe ndị anyị tụleworo, anyị ahụwo na Jehova adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. (Abụ Ọma 33:5) Kama nke ahụ, ikike Jehova, omume ọma ya, na ụkpụrụ ya na-ekwekọ ná nzube ya. (Ndị Rom 8:28) Dị ka Chineke nke nwere ikike nke ibu amụma, Jehova “na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.” (Aịsaịa 46:9, 10) Anyị ahụkwala na ọ na-ahọ ihe ọ na-achọ ịma ahọ. Oleezi otú nke a si emetụta anyị? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na mkpebi ndị anyị na-eme kwekọrọ ná nzube ịhụnanya Chineke? Oleekwa ngọzi ime otú ahụ ga-ewetara anyị? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 28, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ihe ndị mere n’oge ochie bụ́ ndị gbara akaebe na “okwu” Chineke ‘na-aga nke ọma’ mgbe nile?

• Gịnị ka Jehova kpebiri ime tupu oge ya eruo n’ihe banyere “nzube ebighị ebi” ya?

• Olee otú Jehova si eji ikike ya nke ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu eme ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

Jehoshafat tụkwasịrị Jehova obi

[Foto dị na peeji nke 23]

Chineke buru amụma banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs

[Foto dị na peeji nke 24]

Jehova ò kpebiri ihe Adam na Iv ga-eme tupu ha emee ya?