Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nweta Afọ Ojuju Site n’Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ

Nweta Afọ Ojuju Site n’Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ

Nweta Afọ Ojuju Site n’Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ

OBI abụọ adịghị ya na ị hụtụwo ka nwamba sụkwụụrụ na-ebe nwa ube nke na-egosi na afọ juru ya. Lee nnọọ ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ịnọ nnọọ otú ahụ ma nweekwa afọ ojuju! Otú ọ dị, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike inweta ihe ndị na-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju. Ndị na-enwetụ afọ ojuju adịghị enwe ya ruo ogologo oge. Gịnị mere o ji dị otú a?

Ọ bụ n’ihi na anyị na-emekarị mmehie n’ihi ezughị okè, anyị aghaghị idi ya mgbe ndị ọzọ mejọrọ. Ọzọkwa, anyị bi n’oge ahụ Bible kpọrọ ‘ụbọchị ikpeazụ’ bụ́ nke e ji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara. (2 Timoti 3:1-5) Ọ bụrụgodị na anyị nwere ihe ndị mere ka anyị nwee afọ ojuju mgbe anyị dị obere, nsogbu ndị ‘oge ndị a pụrụ iche’ na-akpata na-emetụta nnọọ ọtụtụ n’ime anyị taa. Ọ̀ pụrụ ikwe omume inweta afọ ojuju n’oge anyị a?

Rịba ama na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru abụghị na oge ndị a pụrụ iche agaghị ekwe obibi, kama na ọ ga-esi ike obibi. Anyị pụrụ ịnagide ha site n’itinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ. O nwere ike ọ bụchaghị mgbe nile ka anyị ga-edozili nsogbu anyị, ma anyị ga-enwetụ afọ ojuju. Ka anyị nyochaa atọ n’ime ụkpụrụ ndị a.

Mara Ebe Ike Gị Ruru

Iji nweta afọ ojuju, anyị aghaghị ịma ebe ike anyị ruru, marakwa ebe ike ndị ọzọ ruru. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom, o mere ka nke a pụta ìhè: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) E nwere ọtụtụ akụkụ nke ebube Jehova ndị anyị na-apụghị ịghọtacha. Otu ihe atụ bụ eziokwu ahụ dị na Jenesis 1:31: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” Mgbe ọ bụla Jehova leghachiri anya azụ n’ihe ndị o kere n’oge ndị gara aga, ọ pụrụ ikwu nnọọ na “ọ dị mma nke ukwuu.” Ọ dịtụghị mmadụ ọ bụla pụrụ ikwu otú ahụ banyere ihe ndị o mere. Ịmara ebe ike anyị ruru bụ nzọụkwụ mbụ na-eduga n’inwe afọ ojuju. Otú ọ dị, a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Anyị kwesịrị ịghọta ma nakwere ụzọ Jehova si ele ihe anya.

Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mmehie” sitere n’okwu nke pụtara “erughị ihe a chọrọ.” (Ndị Rom 3:9) Iji maa atụ: Cheedị banyere onye chọrọ inweta ihe nrite site n’ịgba akụ́ kpọmkwem n’ebe e kwuru ka a gbaa ya. E nyere ya akụ́ atọ. Ọ gbara nke mbụ ma jiri otu mita gbajọọ ya. Nke abụọ ọ gbara ka nke mbụ mma, ma na nke ugbu a o ji sentimita iri atọ gbajọọ ya. Ọ saziri anya mmiri gbaa nke atọ ma jiri nanị sentimita abụọ gbajọọ ya. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ gbata ya, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ gbataghị ya.

Anyị dị ka onye ahụ bụ ọkà n’ịgba akụ́ nke na-agbataghị ihe ọ na-agba. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị anyị ka anyị ji nnukwu ihe ‘ghara iru ihe a chọrọ anyị n’aka.’ N’oge ndị ọzọ, ọ na-afọ nke nta ka anyị ruo ihe a chọrọ n’aka anyị. Ọ na-ewute anyị na n’agbanyeghị mgbalị nile anyị mere, anyị erughị ihe a chọrọ n’aka anyị. Ngwa, ka anyị laghachi n’ihe atụ ahụ banyere onye ahụ bụ́ ọkà n’ịgba akụ́.

Ọgba akụ́ ahụ jiri nwayọọ na-apụ, obi adịghị ya mma n’ihi na ọ chọsiri nnọọ ike inweta ihe nrite ahụ. Na mberede, nwoke na-ahụ maka asọmpi ahụ kpọghachiri ya ma nye ya ihe nrite, na-ekwu, sị: “Achọrọ m inye gị nke a n’ihi na enwere m mmasị n’ebe ị nọ, ahụkwara m na i tinyere mgbalị dị ukwuu.” Nke a mere ka onye ahụ bụ ọkà n’ịgba akụ́ nwee ọṅụ dị ukwuu!

Ee, ọkà n’ịgba akụ́ ahụ nwere nnọọ nnukwu ọṅụ! Ọ ga-adị onye ọ bụla nke Chineke nyere “onyinye” nke ịdị ndụ ebighị ebi n’izu okè otú ahụ ọ dị ọgba akụ́ ahụ. (Ndị Rom 6:23) Mgbe nke a gasịrị, ihe ọ bụla ha ga-eme ga-adị mma—ọ dịkwaghị ihe ga-eme ka ha ghara iru ihe a chọrọ ha n’aka ọzọ. Ha ga-enwe nnọọ afọ ojuju. Ka ọ dịgodị, ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’uche, anyị ga-enwekwu echiche ziri ezi banyere onwe anyị nakwa ndị nọ anyị gburugburu.

Ghọta na Ihe Ọ Bụla Na-ewe Oge

N’eziokwu ihe ọ bụla na-ewe oge. Ma, ị̀ rịbawo ama otú o si esi ike ịnọgide na-enwe afọ ojuju mgbe o yiri ka ihe ị na-atụ anya ya ọ na-anọ ọdụ karị otú i chere, ma ọ bụ mgbe o yiri ka nsogbu i nwere ọ na-anọte aka karị ka ị tụrụ anya? Ka o sina dị, ụfọdụ anọgidewo na-enwe afọ ojuju n’agbanyeghị ọnọdụ ndị ha nọ na ya. Tụlee ihe banyere Jizọs.

Tupu Jizọs abịa n’ụwa, o setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’irube isi n’eluigwe. Otú ọ dị, ọ bụ n’ụwa ebe a ka ọ “mụtara nrubeisi.” N’ụzọ dị aṅaa? “Site n’ahụhụ ndị ọ tara.” Tupu mgbe ahụ, ọ hụla ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ tatụbeghị ahụhụ n’onwe ya. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ gabigara ọtụtụ ule karịsịa malite mgbe e mere ya baptizim n’osimiri Jọdan ruo n’ọnwụ ya na Gọlgọta. Anyị amaghị kpọmkwem otú e si ‘mee ka Jizọs zuo okè’ n’akụkụ a, ma anyị maara na nke a were oge.—Ndị Hibru 5:8, 9.

Ihe mere Jizọs ji nwee ihe ịga nke ọma bụ n’ihi na ọ tụgharịrị uche ‘n’ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya,’ nke bụ́ ụgwọ a kwụrụ ya maka ikwesị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 12:2) Ka o sina dị, mgbe ụfọdụ, o ‘ji mkpu ákwá siri ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọkwa arịrịọ.’ (Ndị Hibru 5:7) Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ikpe ekpere n’ụzọ dị otú ahụ. Olee otú Jehova si ele nke a anya? Amaokwu ahụ gosiri na Jehova ji “ihu ọma” nụrụ ekpere Jizọs. Chineke ga-emekwara anyị otu ihe ahụ. N’ihi gịnị?

Ọ bụ n’ihi na Jehova na-agbatara anyị ọsọ enyemaka n’ihi na ọ maara banyere adịghị ike anyị. Onye ọ bụla nwere ebe ihe na-emeru ya, ya akarịa ya ike. Ndị mba Benin nke dị n’Africa na-ekwu, sị: “Mmiri karịa akarịa, ọ na-agbagbu ọbụna nwa awọ.” Jehova maara mgbe ihe na-achọ ịkarị anyị ọbụna karịa ka anyị maara. Ọ na-eji ịhụnanya emere anyị ‘ebere, anyị ana-enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Ndị Hibru 4:16) O meere Jizọs nke a, o mekwaarala ya ọtụtụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Tụlee otú Monika si nweta ụdị enyemaka a.

Mgbe Monika na-etolite, o nweghị ọtụtụ ihe na-echegbu ya, ọ dị garagara, na-enwekwa ihu ọchị mgbe nile. Na 1968, mgbe ọ ka dị afọ iri abụọ na ụma, o juru ya anya mgbe ọ matara na o nwere ọrịa na-ebibi akwara bụ́ multiple sclerosis, nke bụ́ ọrịa na-akpọnwụkarị ahụ́. Nke a gbanwere nnọọ ndụ ya, nke chọkwara ka o mee mgbanwe dị ukwuu n’ozi oge nile ọ na-eje. Monika maara na ọrịa ya ga-adịte aka. Afọ iri na isii ka e mesịrị, o kwuru, sị: “A ka-agwọtabeghị ọrịa m, ọ pụkwara ịnọgide otú a ruo mgbe usoro ihe ọhụrụ Chineke ga-eme ka ihe nile dị ọhụrụ.” O kwetara na ọ dịbeghị mgbe ọ dịịrị ya mfe, na-asị: “Ọ bụ ezie na ndị enyi m sịrị na m ka na-enwekarị ihu ọchị na obi ụtọ dị ka m na-enwebu, ezigbo ndị enyi m maara na mgbe ụfọdụ anya mmiri m adịghị akwụsị akwụsị.”

Otú ọ dị, o kwuru, sị: “Amụtala m inwe ndidi na ịṅụrị ọṅụ mgbe ọ bụla ahụ́ sitụrụ m ike. Ịhụ na ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịkwụsị ọrịa n’agbanyeghị mgbalị ha na-eme emeela ka mmekọrịta mụ na Jehova chikwuo anya. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime ka ọrịa kwụsị kpamkpam.” Site n’enyemaka Jehova, Monika anọgidewo na-enwe afọ ojuju, ọ pụkwara ugbu a ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ iri anọ o jiworo jee ozi oge nile.

N’ikwu eziokwu, ọnọdụ ndị dị ka nke a Monika nọ na ya adịghị mfe. Ma otu ihe doro anya, ị ga-enwekwu afọ ojuju ma ọ bụrụ na ị ghọta na ihe ụfọdụ pụrụ iwe oge karị ka i chere. Dịkwa ka Monika, ị pụrụ inwe obi ike na ị ga-enweta ‘enyemaka Jehova n’oge kwesịrị ekwesị.’

Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ—Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị A Pụrụ Iru Eru

Ị dị nnọọ iche n’ebe onye ọzọ nọ. Ọ dịtụghị onye dị ka gị kpọmkwem. Ilu ndị Gun nke dị n’Africa mere nnọọ ka eziokwu a pụta ìhè: “Mkpịsị aka nile ahaghị otu.” Ọ ga-abụ ihe nzuzu mmadụ iji otu mkpịsị aka ya na-atụnyere nke ọzọ. Ị gaghị achọ ka Jehova jiri gị tụnyere onye ọzọ, ọ dịtụghịkwa mgbe ọ ga-eme otú ahụ. Otú ọ dị, ụmụ mmadụ n’ebe nile na-achọkarị iji otu onye atụnyere ibe ya, nke a pụkwara ime ka mmadụ ghara inwe afọ ojuju. Rịba ama otú Jizọs si mee nnọọ ihe atụ nke a ka anyị na-agụ Matiu 20:1-16.

Jizọs kwuru okwu banyere “nna nwe ubi” bụ́ onye chọrọ ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya. Ọ chọtara ụfọdụ ndị na-enweghị ọrụ ma goo ha ọrụ “n’isi ụtụtụ,” eleghị anya n’elekere anya isii nke ụtụtụ. Ha kwekọrịtara n’ụgwọ a na-akwụ ndị ọrụ n’ụbọchị n’oge ahụ, otu dinarịọs maka ọrụ were awa iri na abụọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ nwere obi ụtọ na ha nwetara ọrụ ọbụna ego e kwere ịkwụ ha bụ ego a na-akwụkarị ndị ọrụ n’ụbọchị. Ka e mesịrị, nna ahụ nwe ubi hụtara ndị ọzọ na-enweghị ọrụ ma goo ha ọrụ n’elekere anya itoolu nke ụtụtụ, elekere anya iri na abụọ nke ehihie, elekere anya atọ nke ehihie, ọbụna gookwa ndị nke ikpeazụ n’elekere anya ise nke uhuruchi. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a e goro ọrụ mgbe e gosiri ndị nke mbụ ga-arụzu ọrụ otu ụbọchị zuru ezu. Nna ahụ nwe ubi kwere ha nkwa na ya ga-enye ha “ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị,” ndị ọrụ ahụ kwetakwara.

Ná ngwụsị nke ụbọchị ahụ, nna ahụ nwe ubi gwara onye na-elekọtara ya ọrụ ka ọ kwụọ ndị ahụ rụụrụ ya ọrụ ụgwọ. O kwuru ka a kpọọ ndị ọrụ ahụ ma buru ụzọ kwụọ ndị ikpeazụ e goro ọrụ ụgwọ. Ndị a rụrụ ọrụ nanị otu awa, ma n’ụzọ na-eju nnọọ anya, a kwụrụ ha ụgwọ a na-akwụ ndị rụrụ ọrụ otu ụbọchị zuru ezu. Anyị pụrụ iji anya nke uche anyị hụ ụdị mkparịta ụka ga na-aga nnọọ n’ihu. Ndị rụrụ ọrụ ruo awa iri na abụọ zuru ezu kwubiri na ha ga-anata ihe ka nke ahụ. Otú ọ dị, a kwụkwara ha otu ụgwọ a kwụrụ ndị nke ọzọ.

Olee ihe ha mere? “Mgbe ha natara ya, ha malitere ịtamu ntamu megide onyeisi ezinụlọ ahụ wee sị, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa; n’agbanyeghị nke ahụ i mewo ka anyị na ha hara nhata, anyị ndị buru ibu arọ nke ụbọchị, nọọkwa n’oké okpomọkụ!’”

Otú ọ dị, nna ahụ nwe ubi lere ihe anya n’ụzọ dị iche. O mere ka ọ pụta ìhè na ha natara ihe ha na ya kwekọrịtara, ọ dịghị ihe e sepụrụ na ya. Nye ndị nke ọzọ ahụ, o kpebiri ịkwụ ha ụgwọ a na-akwụ n’ọrụ ụbọchị, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ihe a kwụrụ ha karịrị ihe ha tụrụ anya ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye natara ihe na-erughị ihe e kwekọrịtara; ọtụtụ natadịrị ihe karịrị ihe ha tụrụ anya ya. N’ikpeazụ, nna ahụ nwe ubi jụrụ, sị: “Iwu ọ́ kwadoghị ka m jiri ihe ndị bụ́ nke m mee ihe m chọrọ?”

Chetụdị nnọọ echiche, a sị na onye ahụ na-elekọta ọrụ bu ụzọ kwụọ ndị mbụ ahụ ụgwọ, ha alawakwa ozugbo. Ha gaara enwe afọ ojuju. Enweghị afọ ojuju ahụ bilitere nanị mgbe ha hụrụ na ha na ndị ọzọ rụrụ obere ọrụ natara otu ụgwọ ọrụ ahụ. Nke a kpasuru ha iwe, ọbụna ruo n’ókè nke na ha tamuru ntamu megide nna ahụ nwe ubi, bụ́ onye ha kwesịrị ikele nnọọ ekele n’ihi na o goro ha ọrụ.

Nke a na-egosi nnọọ ihe na-eme mgbe anyị jiri otu onye tụnyere onye ọzọ. Ị ga-enwe afọ ojuju ma ọ bụrụ na ị tụgharịa uche ná mmekọrịta gị na Jehova ma gosi na i nwere obi ekele n’ihe ndị o meere gị. Ejila ọnọdụ gị atụnyere ọnọdụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na o yiri ka Jehova o mekwuuru ndị ọzọ ihe dị iche, nwee obi ụtọ n’ihe e meere ha, sorokwa ha ṅụrịa ọṅụ.

Otú ọ dị, ọ dị ihe Jehova na-atụ anya ka i mee. Gịnị ka ọ bu? Ndị Galeshia 6:4 na-ekwu, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-eruli. Mee atụmatụ ihe ị ga-emeli, ma gbalịakwa imezu ya. Ọ bụrụ na ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ nke amamihe dị na ya, gị eruokwa ya, ị ‘ga-enwe ihe ga-eme ka i nwee aṅụrị.’ Ị ga-enwe nnọọ afọ ojuju.

A Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ

Ụkpụrụ atọ ndị ahụ anyị tụleworo na-egosi na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ n’ezie ime ka mmadụ nwee afọ ojuju ọbụna n’ụbọchị ikpeazụ ndị a n’agbanyeghị ezughị okè. Mgbe ị na-agụ Bible kwa ụbọchị, gbalịanụ hụ ma ị̀ ga-achọta ụkpụrụ ndị e depụtara edepụta ma ọ bụ ndị dị n’akụkọ ma ọ bụ n’ihe atụ ndị e ji mee ihe!

Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị dịghịkwa enwecha afọ ojuju, gbalịa chọpụta isi ihe na-akpata ya. Mgbe ahụ, chọọ ụkpụrụ Bible ndị ị pụrụ itinye n’ọrụ iji mezie ọnọdụ ahụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgụ akwụkwọ bụ́ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peeji nke 110-111. * A tụlere akwụkwọ Ilu na ya, ị ga-ahụkwa ọtụtụ ụkpụrụ na ndụmọdụ ndị e depụtara n’okpuru isiokwu iri na abụọ. Watch Tower Publications Index * na Watchtower Library nke dị na CD-ROM * bụ nnọọ ebe ndị magburu onwe ha a pụrụ isi nweta ihe ọmụma. Ọ bụrụ na i jiri ha na-eme ihe mgbe mgbe, ọ ga-adịrị gị mfe ịchọta ụkpụrụ ndị ị ga-eji mee ihe n’ọnọdụ ọ bụla dapụtaranụ.

Oge na-abịa mgbe Jehova ga-enye ndị kwesịrị ekwesị ndụ ebighị ebi n’izu okè na paradaịs elu ala. Ha ga na-enwe nnọọ afọ ojuju ná ndụ ha nile.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 30 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.

^ par. 30 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.

^ par. 30 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

“Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Jizọs “mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.”—Ndị Hibru 5:8, 9

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

“Ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4