“Obodo Kachasị Mma na Galili”
“Obodo Kachasị Mma na Galili”
E NWERE otu obodo a na-akpọtụdịghị aha n’Oziọma anọ ndị ahụ nke dị nanị kilomita isii na ọkara site n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Nazaret, bụ́ obodo Jizọs nọ tolite. N’agbanyeghị na a kpọtụghị ya aha, ọkọ akụkọ a ma ama na narị afọ mbụ bụ́ Flavius Josephus toro ya dị ka “obodo kachasị mma na Galili.” Ọ bụ obodo Sepphoris. Gịnị ka anyị maara banyere obodo a?
Mgbe Herọd Onye Ukwu nwụchara, ma eleghị anya n’afọ nke mbụ T.O.A., ụmụ amaala Sepphoris nupụụrụ Rom isi, nke a mere ka e bibie obodo ha. Nwa Herọd bụ́ Antipas chịwara Galili na Peraea ma jiri Sepphoris e bibiri ebibi mere ebe ọ ga-ewu isi obodo ọhụrụ ya. E ji ụkpụrụ ndị Gris na ndị Rom ji ewu ụlọ wughachi obodo ahụ, ma ndị Juu bi ebe ahụ ka n’ọnụ ọgụgụ. Dị ka Prọfesọ Richard A. Batey, si kwuo, ọ ghọrọ “isi obodo nke gọọmenti Galili na Perea,” ruo mgbe Antipas jiri Taịbirias mere isi obodo nke ọchịchị ya n’ihe dị ka afọ 21 O.A., iji dochie anya Sepphoris. Nke a bụ n’oge Jizọs bi nso n’obodo ahụ.
Prọfesọ James Strange, bụ́ onye gwupụtara ihe ụfọdụ na Sepphoris, kwetara na ọ dị mgbe obodo ahụ nwere ebe a na edebe ihe mgbe ochie, ebe ndebe akụ̀, ebe a na-edebe ngwá agha, ụlọ akụ̀, ụlọ ọhaneze, na ahịa ebe a na-ere ihe ndị dị ka efere nkụwa, ugegbe, ígwè, ọla, nakwa ụdị ihe oriri dịgasị iche iche. E nwere ndị na-akpa ákwà na ndị na-ere ákwà, nakwa ụlọ ahịa ebe a na-ere nkata, arịa ụlọ, ihe ndị na-esi ísì ụtọ a na agba n’ahụ́, nakwa ihe ndị ọzọ yiri ha. E kwuru na ọnụ ọgụgụ mmadụ bi ebe ahụ n’oge ahụ bụ site n’agbata puku mmadụ asatọ ruo puku mmadụ iri na abụọ.
Ọ̀ dị mgbe Jizọs letara obodo a na-ekwo ekwo, bụ́ nke na-ewe otu awa iji ụkwụ site na ya ruo Nazaret? Oziọma ndị ahụ agwaghị anyị. Otú ọ dị, akwụkwọ na-akọwa Bible bụ́, The Anchor Bible Dictionary, kwuru na e nwere “otu okporo ụzọ nke si Nazaret gaa Kenan nke Galili, bụ́ nke si Sepphoris gafee.” (Jọn 2:1; 4:46) A pụrụ ịnọ na Nazaret hụ ugwu Sepphoris, bụ́ nke dị otu narị mita n’elu. Ụfọdụ kweere na o yiri ka ọ bụ obodo a ka Jizọs bu n’uche mgbe o mere ihe atụ ahụ bụ́ na “a pụghị izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu.”—Matiu 5:14.
Mgbe e bibichara Jeruselem na 70 O.A., Sepphoris ghọrọ obodo ndị Juu kasị biri na ya na Galili, mesịakwa bụrụ ebe ụlọikpe kasị elu nke ndị Juu bụ́ Sanhedrin dị. Ruo oge ụfọdụ, ọ ghọrọ ebe bụ́ isi ndị Juu nọ amụ ihe.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 32]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Oké Osimiri Galili
GALILI
Kena
Taịbirias
SEPPHORIS
Nazaret
PEREA
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 32]
Arịa ndị e ji ụrọ kpụọ: Ọ bụ Wohl Archaeological Museum, Herodian Quarter, Jewish Quarter gwupụtara ha. Ọ bụ ụlọ ọrụ bụ́ Company for the Reconstruction of the Jewish Quarter in the Old City of Jerusalem, Ltd nwe ha