Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Obi Ụtọ n’Ezie?

Ì Nwere Obi Ụtọ n’Ezie?

Ì Nwere Obi Ụtọ n’Ezie?

EE, I nwere ike ịjụ nnọọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere obi ụtọ n’ezie?’ Ndị ọkà ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-agba mgbọ ịchọpụta otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ ma ọ bụ otú ndị ọzọ ga-esi zaa ya, ma ọ dịghịrị ha mfe. A pụrụ iji ịtụ obi ụtọ ndị mmadụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụnyere ịchọ ịtụ ịhụnanya nwoke hụrụ nwunye ya ma ọ bụ újú ezinụlọ na-eru mgbe otu onye n’ime ha nwụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọ dịghị mfe ịtụ mmetụta n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta sayensị ghọtara otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: Ọ dịghị onye na-enweghị ike inwe obi ụtọ.

N’agbanyeghị na e kere mmadụ ka o nwee ike inwe obi ụtọ, nsogbu ndị siri ike anapụla ụmụ mmadụ obi ụtọ. Tụlee ihe atụ a: N’obodo ụfọdụ, ndị ọrịa AIDS gburu emeela ka a gharakwa inwe ohere n’ebe ndị a na-eli ozu. Ndị na-ahụ maka ebe ndị a na-eli ozu na-enyezi ikike ka e lie ozu ndị ọhụrụ n’ili ndị e liburu mmadụ. N’ebe ụfọdụ n’Africa, ịrụ igbe ozu aghọọla ọrụ ọtụtụ ndị na-arụ. N’agbanyeghịkwa ebe i bi, ị na-ahụ obi ilu ndị na-arịa ajọ ọrịa na ndị ndị ikwu ha na ndị enyi ha nwụnahụrụ na-enwe.

Gịnịkwanụ banyere mba ndị ka baa ọgaranya? Ihe mberede pụrụ iwekọrọ akụ̀ na ụba ndị mmadụ mgbe ha na-akwadoghị akwado maka ya. Na United States, ọtụtụ ndị larala ezumike nká amaliteghachila ọrụ n’ihi na a kwụghị ha ụgwọ ezumike nká ha. Ọtụtụ mgbe, ezinụlọ na-eji ego nile ha nwere akwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ. Otu onye ọkàiwu kwuru, sị: “Ọ na-ewute ewute ịhụ ka ndị mmadụ na-abịakwute gị maka ndụmọdụ n’ihi oké ụgwọ ha ji na ọrịa ndị ha na-arịa. Ọtụtụ mgbe, ị na-agwa ha, sị, ‘Ị ga-ere ụlọ gị.’” Ma, gịnị banyere ndị ọgaranya? Hà pụkwara ịbụ ndị na-enweghị obi ụtọ?

Ndụ ụfọdụ ndị yiri nke otu onye a ma ama na-ede egwú, bụ́ Richard Rodgers. E kwuru banyere ya, sị: “Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole merela ọtụtụ mmadụ obi ụtọ ka ya.” Ọ bụ ezie na egwú ya mere ndị ọzọ obi ụtọ, o nwere nkụda obi mgbe nile. O nwetara ego ma bụrụ onye a ma ama, bụ́ ihe abụọ ọtụtụ ndị na-achọsi ike inweta, ma gịnị banyere obi ụtọ? Otu onye dere akụkọ ndụ ya kwuru, sị: “[Rodgers] bịara ghọọ ọkaibe n’ọrụ ya, bie ndụ ọgaranya, ma soro onye ọzọ nweta Ihe Nrite Pulitzer ugboro abụọ. O nwekwara nkụda obi ọtụtụ mgbe ma nọrọ ná mwute.”

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ịtụkwasị obi n’akụ̀ na ụba iji nweta obi ụtọ na-abụkarị ihe na-enweghị isi. Otu onye ọkọ akụkọ banyere achụmnta ego nke na-arụrụ akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Toronto, Canada, ọrụ kwuru banyere “owu ọmụma na nkụda obi” ọtụtụ ndị bara ọgaranya na-enwe. Dị ka otu onye na-enye ndụmọdụ banyere ego si kwuo, mgbe ndị nne na nna ji ego na ihe ndị ọ pụrụ ịzụta na-asa ụmụ ha ahụ́, “ọ na-akpatakarị nhụsianya n’ọdịnihu.”

Ọ̀ Dị Ihe E Ji n’Aka Ga-eweta Obi Ụtọ?

Ka okooko osisi wee too nke ọma, ọ chọrọ ezigbo ala, mmiri, na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ kwesịrị ekwesị. N’otu aka ahụ, ndị nchọpụta ghọtara na e nwere ihe ụfọdụ so eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ihe ndị ahụ gụnyere ezi ahụ́ ike; ezigbo ọrụ; nri, ụlọ, na uwe zuru ezu; mmadụ iji aka ya rụpụta ihe; na ezi ndị enyi.

Ma eleghị anya, i kweere na ihe ndị ahụ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, e nwere ihe ka ha mkpa so eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ bụ ihe ọmụma nke “Chineke onye obi ụtọ,” onye aha ya bụ Jehova. (1 Timoti 1:11) Olee otú ihe ọmụma ahụ si enyere anyị aka? Jehova bụ Onye Okike anyị, o kekwara anyị ka anyị nwee ike inwe obi ụtọ. N’ihi ya, ọ ghaghị ịma ihe pụrụ ime ka anyị nwee obi ụtọ. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ụzọ Jehova si akụziri ndị mmadụ nọ n’ebe ọ bụla na n’ọnọdụ ọ bụla otú ha ga-esi nweta obi ụtọ na-adịgide adịgide.

[Foto dị na peeji nke 4]

Dị ka okooko osisi, ọ dị mmadụ mkpa ịnọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị iji inweta obi ụtọ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© Gideon Mendel/CORBIS