Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ gwara Nikọdimọs, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ”?—Jọn 3:13.

Jizọs nọ n’ụwa mgbe ahụ, ọ rịgobeghịkwa, ma ọ bụ laghachi, n’eluigwe. Otú ọ dị, ihe anyị maara banyere Jizọs na ihe ndị ọzọ o kwuru tupu kwuo okwu ahụ pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe ọ na-ekwu.

Jizọs “si n’eluigwe rịdata” n’ihi na ya na Nna ya ebiela n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ma n’oge a kara aka, e bufere ndụ Ọkpara ahụ n’akpa nwa Meri, nke mere ka a mụọ Jizọs dị ka mmadụ. (Luk 1:30-35; Ndị Galeshia 4:4; Ndị Hibru 2:9, 14, 17) Mgbe Jizọs nwụrụ, a gaje ịkpọlite ya n’ọnwụ dị ka mmụọ, ọ ga-alaghachikwurukwa Jehova. N’ihi ya, ntakịrị oge tupu e gbuo Jizọs, o kpere ekpere, sị: “Nna, jiri ebube m nwere n’akụkụ gị tupu ụwa amalite ịdị mee ka m dị ebube n’akụkụ gị.”—Jọn 17:5; Ndị Rom 6:4, 9; Ndị Hibru 9:24; 1 Pita 3:18.

Jizọs alaghachibeghị n’eluigwe n’oge ahụ ya na Nikọdimọs, bụ́ onye Farisii na onye nkụzi n’Izrel, na-ekwu okwu. N’ezie, ọ dịbeghị mmadụ nwụrụlanụ nke rịgooro n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, bụ́ eluigwe, mgbe ahụ. Jizọs n’onwe ya kwuru na ọ dịghị onye amụma Chineke nke ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu, ma “onye ka nta n’alaeze nke eluigwe ka ya ukwuu.” (Matiu 11:11) Pita onyeozi kwukwara na ọbụnadị Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ ma ka nọrọ n’ili ya; Devid arịgoghị eluigwe. (Ọrụ 2:29, 34) O nwere ihe mere ndị nwụrụ tupu Jizọs abịa n’ụwa, dị ka Devid, Jọn Onye Na-eme Baptizim, na ndị ọzọ kweere na Chineke, na-ejighị gaa eluigwe. Ha nwụrụ tupu Jizọs emegheere ụmụ mmadụ ụzọ ma ọ bụ ohere nke ịbụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ibi n’eluigwe. Pọl onyeozi dere na Jizọs, dị ka onye obu ụzọ ‘meghere ụzọ ọhụrụ nke dịkwa ndụ’ e si aba n’eluigwe.—Ndị Hibru 6:19, 20; 9:24; 10:19, 20.

Ebe ọ bụ na Jizọs anwụbeghị mgbe ahụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, gịnị ka o bu n’uche mgbe ọ gwara Nikọdimọs, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ”? (Jọn 3:13) Tụlee ihe Jizọs na Nikọdimọs na-ekwurịta mgbe o kwuru okwu ahụ.

Mgbe onye ọchịchị ndị Juu ahụ bịakwutere Jizọs n’abalị, Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m gị, Ọ gwụla ma à mụrụ mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Ná nzaghachi, Nikọdimọs jụrụ, sị: ‘Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee? Olee otú a pụrụ isi mụọ mmadụ ugboro abụọ?’ Ọ ghọtaghị ozizi a sitere n’aka Chineke banyere mmadụ ịba n’Alaeze Chineke. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi ghọta nke a? Ọ dịghị mmadụ ga-eme ka ọ ghọta ya; ọ dịghị mmadụ pụrụ izi ya ihe banyere ya n’ihi na ọ dịbeghị mmadụ birila n’eluigwe n’ihi ya nwee ike ịkọwa ihe banyere otú a pụrụ isi baa n’Alaeze ahụ. Ọ bụ nanị Jizọs birila ebe ahụ. Ọ pụrụ izi Nikọdimọs na ndị ọzọ ihe ahụ n’ihi na O si n’eluigwe rịdata, o rukwara eru izi ndị mmadụ ihe banyere ihe ndị ahụ.

N’ihi ya, ajụjụ ahụ a jụrụ n’amaokwu Bible a na-egosi anyị otu ihe dị mkpa banyere ịmụ Okwu Chineke. Anyị ekwesịghị inwewe obi abụọ banyere Akwụkwọ Nsọ nanị n’ihi na otu ebe n’ime ya yiri ihe siri ike nghọta. Anyị aghaghị ịtụle ihe akụkụ ndị ọzọ nke Bible kwuru mgbe anyị na-achọ ịghọta ihe ebe anyị gụrụ pụtara, ihe ahụ anyị ghọtara aghaghịkwa ikwekọ n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible. Ọzọkwa, ihe gbara ebe ahụ gburugburu—ọnọdụ e nwere mgbe ahụ ma ọ bụ ihe a na-ekwu n’ebe ahụ—pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe ebe na-agbagwoju anyị anya na Bible pụtara n’ezie.