Akụkọ Na-akụziri Anyị Ihe Banyere Mpako na Ịdị Umeala n’Obi
Akụkọ Na-akụziri Anyị Ihe Banyere Mpako na Ịdị Umeala n’Obi
OTU ihe mere ná ndụ Eze Devid na-egosi ọdịiche dị n’etiti onye dị umeala n’obi n’ezie na onye dị nnọọ mpako. Ihe a mere mgbe Devid merisịrị Jeruselem ma mee ya isi obodo ya. Devid weere Jehova dị ka Onye na-achị Izrel n’ezie, n’ihi ya, o mere ndokwa ka e bubata Igbe Ọgbụgba Ndụ ahụ, bụ́ nke nọchiri anya ọnụnọ Chineke, n’obodo ahụ. Ihe omume a dị nnọọ Devid mkpa nke na o gosipụtara ọṅụ o nwere n’ihu ọha ka o so ndị nchụàjà bu Igbe ahụ n’azụ. Ndị bi na Jeruselem hụrụ eze ha ka ọ “na-awụli” ma “werekwa ike ya nile tee egwu.”—1 Ihe E Mere 15:15, 16, 29; 2 Samuel 6:11-16.
Otú ọ dị, nwunye Devid bụ́ Maịkal, esonyereghị ìgwè mmadụ ahụ na-aṅụrị ọṅụ. O si na windo na-ele ihe na-emenụ, kamakwa igosi mmasị n’otú Devid si na-enye Jehova otuto, o ‘ledara ya anya n’obi ya.’ (2 Samuel 6:16) Gịnị mere Maịkal ji kpaa ụdị àgwà a? O doro anya na o chere banyere onwe ya gabiga ókè n’ihi na ọ bụ nwa eze mbụ nke Izrel, bụ́ Sọl, ma bụrụ ugbu a nwunye eze nke abụọ nke Izrel. Ọ pụrụ ịbụ na o chere na di ya, bụ́ eze, ekwesịghị iweda onwe ya ala ruo n’ókè nke isoro ndị nkịtị n’ememe ha na-eme. Ụdị mpako ahụ pụtara ìhè n’otú o si kelee Devid mgbe Devid lọtara. O ji ịkwa emo kwuo, sị: “Lee, otú eze Izrel dị nsọpụrụ nke ukwuu taa, onye kpupụrụ uwe n’ahụ́ ya taa n’anya ndị ohu nwanyị nke ndị ohu ya, dị ka otu n’ime ndị ikom efu na-ekpupụ uwe n’ahụ́ ya ekpupụ!”—2 Samuel 6:20.
Olee ihe Devid mere banyere nkatọ a? Devid baara Maịkal mba site n’ịgwa ya na Jehova napụrụ nna ya, bụ́ Sọl, ọbụbụeze Izrel, ma nye ya ya. Devid kwukwara, sị: “M ga-ewetakwara onwe m nkọcha karịa nke a, m ga-adịkwa ala n’anya m: ma ndị ohu nwanyị ndị i kwuru okwu banyere ha, n’etiti ha ka a ga-asọpụrụ m.”—2 Samuel 6:21, 22.
Ee, Devid kpebisiri ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ịdị umeala n’obi. Àgwà a na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Jehova ji kpọọ Devid “nwoke kwekọrọ n’obi m.” (Ọrụ 13:22; 1 Samuel 13:14) N’ezie, Devid gbasoro ihe nlereanya kasị mma nke ịdị umeala n’obi—nke Jehova Chineke. N’ụzọ na-akpali mmasị, okwu ahụ Devid kwuru mgbe ọ gwara Maịkal, sị, “M ga-adịkwa ala” sitere na ngwaa Hibru e ji mee ihe iji kọwaa otú Chineke si ele ụmụ mmadụ anya. Ọ bụ ezie na Jehova bụ Onye kachasị elu n’eluigwe na ala, Abụ Ọma 113:6, 7 na-akọwa ya dị ka onye “na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala [mmadụ iwedata onwe ya ala site n’ọkwá ya mgbe ya na ndị ọ ka aka na-emekọrịta ihe] ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu.”
Ebe ọ bụ na Jehova dị umeala n’obi, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ kpọrọ “anya dị elu” nke ndị dị mpako asị. (Ilu 6:16, 17) N’ihi àgwà ọjọọ a Maịkal kpara na n’ihi akwanyereghị onye Chineke họọrọ dị ka eze ùgwù, e mere ka ọ ghara ịmụtara Devid nwa. Ọ nwụrụ n’amụtaghị nwa. Lee ihe bara uru akụkọ a na-akụziri anyị! Ndị nile chọrọ inweta ngọzi Chineke aghaghị ịgbaso okwu ndị a: “Werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.