Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe E Ji n’Aka Ga-eweta Obi Ụtọ

Ihe E Ji n’Aka Ga-eweta Obi Ụtọ

Ihe E Ji n’Aka Ga-eweta Obi Ụtọ

“ỊCHỌ inweta Obi Ụtọ” bụ ihe ruuru mmadụ nile. Nke ahụ bụ echiche nke ndị dere Nkwupụta Nnwere Onwe United States of America. Ma ịchọ inweta ihe na inweta ya enweta abụghị otu ihe. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-eto eto na-emesi mgbalị ike iji ghọọ ndị na-eme ihe ngosi ma ọ bụ ndị na-eme egwuregwu, mmadụ ole n’ime ha n’ezie ka ị maara ghọrọla ihe ahụ ha chọrọ ịghọ? Otu onye ọgụ egwu a ma ama bụ́ onye maara mgbalị ndị mmadụ na-eme iji ghọọ ndị egwu a ma ama kwuru, sị: “Ma eleghị anya, ị gaghị enweta ihe ahụ ị na-achọ.”

Ọ bụrụ na ị na-eche na ị gaghị enwetali obi ụtọ, e nwere ezi ihe mere ị na-ekwesịghị iji daa mbà. Ọ bụrụ na ị chọọ obi ụtọ n’ụzọ ziri ezi, ị ga-enweta ya. Gịnị mere nke ahụ ji bụrụ eziokwu? Isiokwu bú nke a ụzọ kpọtụrụ “Chineke onye obi ụtọ,” bụ́ Jehova, aha. (1 Timoti 1:11) Na Bible, Chineke nyere nduzi nke ga-enyere anyị aka inweta obi ụtọ. Jehova pụrụ inyere gị aka imeri ihe ndị na-akpatakarị mwute. Dị ka ihe atụ, tụlee nkasi obi ọ na-enye gị mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụrụ.

Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ

Ò nwere ihe dị mma banyere ọnwụ? Ọnwụ na-anara nne na nna ụmụ ha, na-anarakwa ụmụ nne ha na nna ha. Ọ na-ekewa ezi ndị enyi ma na-eme ka obi gharazie iru obodo ndị dịbu n’otu ala. Mgbe ọnwụ batara n’ezinụlọ, ọ pụrụ ime ka ezinụlọ nke nwere obi ụtọ nọrọ ná mwute.

Ọ dịghị mkpa mmadụ ịgwa gị agwa na ọnwụ bụ ọdachi. Ma, ụfọdụ ndị ekwetaghị na ọ bụ ọdachi, ha na-ekwukwa na ọnwụ bụ ngọzi. Tụlee ihe merenụ mgbe otu oké ifufe a kpọrọ Katrina kpachara Ọwara Oké Osimiri Mexico aka ọjọọ n’August 2005. Mgbe a na-eli otu onye ọdachi ahụ gburu, onye ụkọchukwu kwuru okwu olili ya, kwuru, sị: “Ọ bụghị Katrina gburu ya. Ọ bụ Chineke kpọọrọ ya.” N’oge ọzọ, otu onye ọrụ ụlọ ọgwụ bú ezi ihe n’obi gwara otu nwata nwanyị nne ya nwụrụ ka ọ ghara iwute ya, n’ihi na ọ bụ Chineke kpọọrọ nne ya laa eluigwe. Nwata nwanyị ahụ bere ákwá, na-ajụ, sị: “Maka gịnị, maka gịnị ka o ji kpọnara m ya?”

N’ezie, echiche na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ e nwere banyere ndị nwụrụ anwụ adịghị akasikarị ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. N’ihi gịnị? N’ihi na echiche ndị ahụ ekwekọghị n’ihe ọnwụ bụ n’ezie. Nke kadị njọ bụ na ha na-eme ka Chineke yie onye na-eji ike akpọnara ndị mmadụ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha ha hụrụ n’anya n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na n’ụzọ na-ewute ewute. Kama Chineke ịbụ onye nkasi obi, a na-eme ka o yie onye na-akpata ọnwụ. Ma, Okwu Chineke na-agwa anyị eziokwu banyere ọnwụ.

Bible kpọrọ ọnwụ onye iro. O ji ọnwụ tụnyere eze nke chịworo ụmụ mmadụ. (Ndị Rom 5:17; 1 Ndị Kọrint 15:26) Onye iro a bụ́ ọnwụ dị nnọọ ike nke na ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ imeri ya, onye ọ bụla anyị hụrụ n’anya nwụkwaranụ esonyela n’imerime mmadụ ọnwụ gburula. Eziokwu a sitere na Bible na-eme ka anyị ghọta nnọọ ihe mere anyị ji eru újú na ụkwụ na aka na-akụjisi anyị mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ na-egosi na mmetụta ndị ahụ anyị na-enwe kwesịrị ekwesị. Ma, Chineke ọ̀ na-eji onye iro a bụ́ ọnwụ akpọrọ ndị anyị hụrụ n’anya laa eluigwe? Ka Bible zaa ajụjụ ahụ.

Eklisiastis 9:5, 10 na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla. . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol], ebe gị onwe gị na-ala?” Gịnị bụ Shiol? Ọ bụ ili nkịtị nke ụmụ mmadụ, bụ́ ebe ha na-aga mgbe ha nwụrụ. N’ili, ndị nwụrụ anwụ adịghị arụ ọrụ, ha adịghị aga ije, ihe adịghị emetụ ha n’ahụ́, ha adịghị eche echiche ọ bụla. Ha nọ n’ọnọdụ a pụrụ iji tụnyere oké ụra. * N’ihi ya, Bible mere ka o doo anya na Chineke adịghị akpọrọ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ laa eluigwe ka ya na ha wee biri. Ọnwụ kpọgara ha n’ili, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ha maara ebe ahụ.

Jizọs gosiri na nke ahụ bụ eziokwu mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụsịrị. Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra. Ọ bụrụ na Lazarọs lara eluigwe ka ya na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile gaa biri, ọ dịghị ihe ọma Jizọs meere ya site n’ịkpọghachi ya n’ụwa, e mesịakwa ya anwụọ. Bible kwuru na Jizọs ji oké olu tie mkpu n’ili Lazarọs, sị: “Lazarọs, pụta!” Bible gara n’ihu kwuo, sị: “Nwoke ahụ nwụworo anwụ pụtara.” Lazarọs dịghachikwara ndụ. Jizọs maara na Lazarọs ahapụtụghị ụwa. Ọ nọ n’ili, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọ maara.—Jọn 11:11-14, 34, 38-44.

Ihe a mere eme e dekọrọ na Bible na-enyere anyị aka ịghọta na ọnwụ abụghị ụzọ Chineke si akpọrọ ụmụ mmadụ site n’ụwa laa eluigwe. N’ihi ya, anyị pụrụ ịbịaru Chineke nso, ebe ọ bụ na anyị maara na ọ bụghị ya kpatara mwute anyị na-enwe. Anyị jikwa n’aka na ọ ghọtara nnọọ iru újú ọnwụ na-akpatara anyị na ihe ọ na-emebiri anyị. Eziokwu Bible na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na-egosikwa na ndị nwụrụ anwụ anọghị n’ọkụ ala mmụọ ma ọ bụ na pọgatrị na-ata ahụhụ, kama na ha nọ n’ili, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ha maara. N’ihi ya, o kwesịghị ịbụ mgbe ọ bụla anyị chetara ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, anyị enwewe obi ilu n’ebe Chineke nọ ma ọ bụ tụwa ụjọ n’ihi na anyị amaghị ebe ha nọ. Ọzọkwa, Jehova ji Bible na-akasikwu anyị obi.

Olileanya Na-eweta Obi Ụtọ

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị tụlerela gosiri na olileanya bụ otu n’ime ihe ndị dị mkpa na-eweta ezi obi ụtọ. N’otú e si jiri okwu ahụ bụ́ “olileanya” mee ihe na Bible, ọ pụtara iji obi ike na-atụ anya ihe ọma. Iji hụ otú olileanya pụrụ isi mee ka mmadụ nweta obi ụtọ ugbu a, ka anyị tụleghachi ebe ahụ Bible kwuru na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.

E nwere ọ dịkarịa ala ihe abụọ mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ahụ. Otu n’ime ha bụ iji mee ka Mata, Meri na ndị enyi ha, kwụsị újú ha na-eru. Nke ahụ ga-eme ka ha soro Lazarọs mekọọ ihe ọzọ. Ma, Jizọs gwara Mata ihe nke abụọ ka mkpa mere o ji kpọlite Lazarọs n’ọnwụ: “Ọ̀ bụ na agwaghị m gị na ọ bụrụ na ị ga-ekwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?” (Jọn 11:40) The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips sụgharịrị, kpọrọ okwu ikpeazụ ndị ahụ “ịdị ebube nke ihe Chineke pụrụ ime.” Jizọs ji mkpọlite ọ kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ gosi ihe Jehova Chineke pụrụ ime na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu. Ka anyị hụ ihe ndị ọzọ e kwuru banyere ‘ịdị ebube a nke ihe Chineke pụrụ ime.’

Na Jọn 5:28, 29, Jizọs kwuru, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” Nke ahụ pụtara na a ga-akpọlitecha ndị nile nọ na Shiol, gụnyere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, n’ọnwụ. Ọrụ 24:15 gwakwuru anyị ihe banyere ihe omume a magburu onwe ya, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” N’ihi ya, ọbụna “ndị ajọ omume,” bụ́ ọtụtụ ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ jeere ya ozi tupu ha anwụọ, ga-enwe ohere inweta ihu ọma Chineke n’ọdịnihu.

Olee ebe a ga-anọ kpọlite ha n’ọnwụ? Abụ Ọma 37:29 na-ekwu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Chee nnọọ echiche ihe nke ahụ pụtara! A ga-ejikọtaghachi ezinụlọ dị iche iche na ndị enyi ọnwụ kewasịrị, ọnụ, n’elu ụwa ebe a. Ka ị na-eche otú gị na ndị bụ́bu ezi ndị enyi gị ga-esi kporie ndụ ọzọ, ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na i nwewe obi ụtọ.

Jehova Chọrọ Ka I Nwee Obi Ụtọ

Anyị atụlewo ụzọ abụọ Jehova pụrụ isi mee ka i nwekwuo obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị i nwere. Nke mbụ, ọ na-esi na Bible enye gị ihe ọmụma na nduzi iji nyere gị aka imeri nsogbu. E wezụga inyere anyị aka idi ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya, ndụmọdụ Bible pụkwara inyere anyị aka imeri nsogbu ego na ọrịa. Ọ pụrụ inye gị ike idi mmegbu a na-emegbu gị n’obodo nakwa nsogbu ndị ọchịchị na-akpata. Ọ bụrụkwa na i jiri nduzi ya na-eme ihe ná ndụ gị, ọ pụrụ inyere gị aka imeri nsogbu ndị ọzọ ị na-enwe.

Nke abụọ, site n’ịmụ Bible, ị na-enwe olileanya nke karịrị olileanya ọ bụla ụmụ mmadụ pụrụ inye gị. Mbilite n’ọnwụ nke ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị nwụrụ anwụ so n’olileanya ahụ e kwuru banyere ya na Bible. Mkpughe 21:3, 4 na-akọwakwu, sị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara [ụmụ mmadụ]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” Nke a pụtara na n’isi nso, a ga-ewepuru gị ihe ọ bụla na-akpatara gị mwute ná ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emezu ihe Bible kwere ná nkwa, ị pụkwara iso ná ndị a ga-emezuru ya. Nanị ịmara na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu na-eme ka ahụ́ ruo gị ala. Ịmara na ị gaghị ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi ma ị nwụọ ga-eme gị obi ụtọ.

Dị ka ihe atụ: Afọ ole na ole gara aga, Maria nọ na-ele di ya anya ka ọ na-anwụ ọnwụ ahụhụ n’ihi ọrịa cancer. O ruchabeghị újú ọnwụ di ya mgbe ụkọ ego mere ka ya na ụmụ ya nwanyị atọ kwapụ n’ụlọ ha. Afọ abụọ ka e mesịrị, Maria chọpụtara na ya na-arịa cancer. A waala ya ahụ́ ugboro abụọ, ahụ́ na-egbukwa ya ezigbo mgbu kwa ụbọchị. N’agbanyeghị nsogbu ndị a, o nwere olileanya, nke a na-akpalikwa ya ịgba ndị ọzọ ume. Olee ihe na-enyere ya aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ?

Maria na-ekwu, sị: “Mgbe m nọ ná nsogbu, ana m agbalị ịghara ichegbubiga onwe m ókè. M na-ezere ịjụ ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ihe mere o ji bụrụ m ka ihe a na-eme? N’ihi gịnị ka m ga-eji ata ahụhụ otú a? N’ihi gịnị ka m ga-eji daa ọrịa?’ Iche echiche na-ezighị ezi na-eme ka ike gwụ mmadụ. Kama iji ike m na-eche banyere nsogbu m, m na-eji ya ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka. Nke ahụ na-eme ka m nwee obi ụtọ.”

Olee ọrụ olileanya na-arụ ná ndụ Maria? Ọ na-atụ anya ịhụ mgbe Jehova ga-akwụsị ọrịa na nsogbu ndị ọzọ ụmụ mmadụ na-enwe n’ọdịnihu. Mgbe ọ gara ịnara ọgwụ n’ụlọ ọgwụ, ọ na-akọrọ ndị ọzọ na-arịa cancer, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha enweghị olileanya, ihe banyere olileanya ya. Olee otú olileanya dịruru Marịa ná mkpa? O kwuru, sị: “M na-echekarị echiche banyere ihe ahụ Bible kwuru ná Ndị Hibru 6:19, bụ́ ebe Pọl kọwara olileanya dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụrụ na i nweghị arịlịka ahụ, nsogbu ga-ebufu gị dị nnọọ ka ebili mmiri na-ebufu ụgbọ nke na-enweghị arịlịka. Ma ọ bụrụ na e kegidere gị n’arịlịka ahụ, ọ dịghị ihe nsogbu ndị yiri ebili mmiri ga-emeli gị.” “Olileanya ndụ ebighị ebi nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere ná nkwa” na-enyere Maria aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ. Ọ pụkwara inyere gị aka inwe obi ụtọ.—Taịtọs 1:2.

Site n’ịmụ Bible, ị pụrụ inweta ezi obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu gị. Ma, i nwere ike inwe ajụjụ banyere uru nke a pụrụ ịbara gị. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ igosi gị azịza ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị dị gị mkpa ịmara iji nwee obi ụtọ n’ezie. Ka ị na-echere mmezu nke ihe ndị ahụ Jehova kwere anyị ná nkwa, ị pụrụ iso ná ndị a kọwara n’ụzọ dị otú a: “Obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—Aịsaịa 35:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica (2003) na-akọwa Shiol dị ka “ebe ihe mgbu, ihe ụtọ, ntaramahụhụ ma ọ bụ ụgwọ ọrụ na-adịghị.”

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọ bụ nanị eziokwu Bible pụrụ ime ka iru újú belata

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Olileanya mbilite n’ọnwụ nke dabeere na Bible pụrụ iso mee ka i nwee obi ụtọ