Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Ncheta Gị Nile Bụ Ihe Na-atọ M Ụtọ nke Ukwuu”

“Ihe Ncheta Gị Nile Bụ Ihe Na-atọ M Ụtọ nke Ukwuu”

“Ihe Ncheta Gị Nile Bụ Ihe Na-atọ M Ụtọ nke Ukwuu”

“Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka.”—NDỊ ROM 15:4.

1. Olee otú Jehova si echetara anyị ihe, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa?

JEHOVA na-echetara ndị ya ihe iji nyere ha aka ịnagide nsogbu ndị ha na-enwe n’oge ihe isi ike a. A na-echetara anyị ụfọdụ ihe ndị a mgbe anyị na-agụ Bible n’onwe anyị, a na-echetara anyị ndị ọzọ site n’ihe omume ndị ọzọ mere na ajụjụ ndị ha zara n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị anyị na-agụ ma ọ bụ na-anụ n’oge ndị ahụ abụụrụghị anyị ihe ọhụrụ. Ikekwe, anyị anụla ihe ndị yiri ha mbụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị na-echefukarị ihe, ọ dị anyị mkpa ka a na-echetara anyị nzube, iwu, na ntụziaka Jehova mgbe nile. Anyị kwesịrị ikele Chineke maka ihe ndị ọ na-echetara anyị. Ihe ndị ahụ na-agba anyị ume site n’inyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị kpaliri anyị ịmalite ime uche Chineke. N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ bụkuru Jehova abụ, sị: “Ihe àmà [ma ọ bụ, “ihe ncheta”] Gị nile bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 119:24.

2, 3. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji chebe akụkọ ndụ nke ndị dịrị ndụ n’oge Bible ruo n’oge anyị? (b) Olee akụkọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọ bụ ezie na e dere Okwu Chineke ọtụtụ narị afọ gara aga, ọ na-akpa ike. (Ndị Hibru 4:12) Ọ na-akọrọ anyị banyere ụdị ndụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible biri. Ọ bụ ezie na omenala na ụzọ ndị mmadụ si eche echiche agbanweela nke ukwuu kemgbe e dere Bible, ihe isi ike ndị anyị na-enwe na-eyikarị ndị ndị mmadụ nwere n’oge ahụ. Ọtụtụ akụkọ ndị e dekọọrọ anyị na Bible na-eme anyị obi ụtọ site n’ịkọrọ anyị banyere ndị hụrụ Jehova n’anya ma jiri ikwesị ntụkwasị obi fee ya n’agbanyeghị ihe isi ike. Akụkọ ndị ọzọ dị na ya na-agwa anyị banyere ụdị àgwà Chineke kpọrọ asị. Jehova mere ka e dee akụkọ banyere mmadụ ndị a, ma ndị mere ezi ihe ma ndị mere ihe ọjọọ, na Bible ka ha bụrụ ihe ncheta. Ọ dị nnọọ dị ka Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.

3 Ka anyị lekwasị anya n’akụkọ atọ dị n’Akwụkwọ Nsọ: akụkọ nke otú Devid si mesoo Sọl ihe, nke Ananaịas na Safaịra, na akụkọ nke otú Josef si mesoo nwunye Pọtịfa ihe. Nke ọ bụla n’akụkọ ndị a na-akụziri anyị ihe ndị bara uru.

Ịsọpụrụ Ndokwa Ndị Chineke Mere

4, 5. (a) Olee ọnọdụ dị n’etiti Eze Sọl na Devid? (b) Gịnị ka Devid mere banyere ibu iro Sọl?

4 Eze Sọl nupụụrụ Jehova isi ma gharazie iru eru ịchị ndị Ya. N’ihi ya, Chineke jụrụ ya ma gwa Samuel onye amụma ka o tee Devid mmanụ dị ka eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu. Mgbe Devid kpara ike dị egwu n’agha, ndị mmadụ etookwa ya, Sọl malitere ile Devid anya dị ka onye na-achọ iweghara ọkwá ya. Sọl nwara ugboro ugboro igbu ya. Ọ dịghị nke nwere isi n’ihi na Jehova nọnyeere Devid.—1 Samuel 18:6-12, 25; 19:10, 11.

5 Devid gbara ọsọ ndụ ruo ọtụtụ afọ. Mgbe Devid nwere ohere igbu Sọl, ndị ha na ya so gwara ya ka o gbuo ya, na Jehova enyela Devid onye iro ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Devid jụrụ. Ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova na ùgwù ọ na-akwanyere ọkwá Sọl dị ka eze e tere mmanụ nke ndị Chineke mere o ji jụ. Ọ́ bụghị Jehova họpụtara Sọl ịbụ eze Izrel? Jehova ga-ewepụkwa ya mgbe ọ chọrọ iwepụ ya. Devid chere na nke ahụ abụghị ọrụ ya. Mgbe Devid mechara ihe nile o nwere ike ime iji mee ka iwe Sọl dajụlata n’ebe ọ nọ, o kwubiri, sị: “Jehova aghaghị itigbu ya; ma ọ bụ ụbọchị ya ga-abịaru, o wee nwụọ; ma ọ bụ na ọ ga-arịda n’agha, e wee kpochapụ ya. Ya bụrụ m ihe arụ sitere na Jehova, bụ́ isetị aka m megide onye Jehova e tere mmanụ.”—1 Samuel 24:3-15; 26:7-20.

6. Olee ihe mere o ji dị anyị mkpa ịtụle akụkọ Devid na Sọl?

6 Ọ dị ihe dị mkpa anyị pụrụ ịmụta n’akụkọ a. Ọ̀ dịtụla mgbe ị nọ na-eche ihe mere nsogbu ụfọdụ ji dịrị n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị onye na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị. Ọ pụrụ ịbụ na ihe ọ na-eme abụghị oké mmehie, ma ọ na-enye gị nsogbu n’obi. Gịnị ka i kwesịrị ime? N’ihi mmasị i nwere n’ahụ́ onye ahụ dị ka Onye Kraịst na n’ihi ikwesị ntụkwasị obi gị nye Jehova, i nwere ike ikpebi iji nwayọọ gwa ya okwu iji rite ya n’uru. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ adịgide? Mgbe i merela ihe nile i nwere ike ime, i nwere ike ịhapụrụ Jehova okwu ahụ. Nke ahụ bụ ihe Devid mere.

7. Iji ṅomie Devid, olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe a na-akpaso anyị àgwà ọjọọ ma ọ bụ kpọọ anyị asị?

7 O nwekwara ike ịbụ na a na-emeso gị omume na-ezighị ezi n’obodo ma ọ bụ a kpọọ gị asị n’ihi okpukpe gị. Ikekwe, ọ dịchaghị ihe i nwere ike ime banyere ya ka ọ dị ugbu a. Ọnọdụ dị otú ahụ pụrụ isi nnọọ ike odidi, ma ihe Devid mere mgbe a na-emegbu ya na-akụziri anyị ihe. Abụ ọma ndị Devid dere gosiri n’ụzọ na-emetụ n’ahụ́ ekpere ndị sitere n’obi Devid kpere ka Chineke ghara ikwe ka aka Sọl kpara ya. Ha gosikwara ikwesị ntụkwasị obi Devid nye Jehova na otú ito aha Chineke dịruru ya mkpa. (Abụ Ọma 18:1-6, 25-27, 30-32, 48-50; 57:1-11) Devid nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’agbanyeghị na Sọl nọgidere na-akpaso ya àgwà ọjọọ ruo ọtụtụ afọ. Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova na nzukọ ya n’agbanyeghị àgwà ọjọọ ndị a kpasoro anyị na ihe ndị ọzọ na-eme. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova maara nnọọ ihe na-emenụ.—Abụ Ọma 86:2.

8. Gịnị ka Ndịàmà Jehova nọ na Mozambique mere mgbe e lere ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova ule?

8 Ndị Kraịst nọ na Mozambique bụ ihe atụ nke oge a nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’akụkụ Jehova n’oge a na-ele ha ule. N’afọ 1984, ndị agha nke otu òtù nnupụisi wakporo obodo ha ugboro ugboro, zukọrọ ihe ndị mmadụ, gbaa ụlọ ha ọkụ ma gbuo ụfọdụ ndị. O yighị ka ọ̀ dị ihe ezi Ndị Kraịst a pụrụ ime iji chebe onwe ha. A gbalịrị ime ka ndị bi n’obodo ahụ sonye n’òtù ndị agha ma ọ bụ nwaa ịmanye ha ịkwado ya n’ụzọ ndị ọzọ. Ndịàmà Jehova lere ya anya na ime otú ahụ agaghị abụ ha ịnọpụ iche dị ka Ndị Kraịst. Ọjụjụ ha jụrụ kpasuru ndị agha ahụ iwe. E gburu ihe ruru Ndịàmà 30 n’oge ọgba aghara ahụ, ma ọbụna iyi ndị Chineke egwu na a ga-egbu ha emeghị ka ha kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova. * Dị ka Devid, ha diri mmegbu ma ha mesịrị merie.

Ihe Ncheta Bụ́ Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Nye Anyị

9, 10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe atụ ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ? (b) Olee ihe dị njọ n’ihe Ananaịas na Safaịra mere?

9 Ụfọdụ ndị a kpọrọ aha n’Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị àgwà ndị anyị kwesịrị izere. N’ezie, Bible kọrọ ọtụtụ akụkọ banyere ndị mere ihe ọjọọ ma taa ahụhụ ya, ọbụna ndị na-ejere Chineke ozi. (1 Ndị Kọrint 10:11) Otu n’ime akụkọ ndị dị otú ahụ bụ nke Ananaịas na Safaịra, bụ́ otu di na nwunye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ dị na Jeruselem.

10 Mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, a bịara nwee mkpa nke igbo mkpa anụ ahụ́ nke ndị ọhụrụ kwere ekwe bụ́ ndị nọgidere na Jeruselem iji ritekwuo uru site n’iso ndịozi na-akpakọ. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ rere ala ha iji hụ na e gboro mkpa onye ọ bụla. (Ọrụ 2:41-45) Ananaịas na Safaịra rere otu ala ha ma ghara inyecha ndịozi ahụ ego nile ha retara na ya, ma kwuo na ha enyechaala ego nile ha retara na ya. Ọ bụ eziokwu na Ananaịas na Safaịra nwere ike inye ego ole ọ bụla ha chọrọ, ma ò buru ibu ma ò pere mpe, ma ebumnobi ha dị njọ, ha ghakwara ụgha. Ha chọrọ ka a kpọọ ha ezi mmadụ, nakwa ka ha yie ka hà mere ihe karịrị ihe ha mere n’ezie. Site n’ike mmụọ nsọ, Pita onyeozi gbara aghụghọ na ihu abụọ ha n’anwụ, Jehova gbukwara ha.—Ọrụ 5:1-10.

11, 12. (a) Olee ndụmọdụ ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ nyere anyị banyere ikwu eziokwu? (b) Olee uru ndị dị n’ikwu eziokwu?

11 Ọ bụrụ na a nwaa anyị ọnwụnwa ịgha ụgha iji mee ka ndị mmadụ kpọọ anyị ezi mmadụ, ka akụkọ Ananaịas na Safaịra dọọ anyị aka ná ntị. Anyị nwere ike ịghọgbu ụmụ mmadụ ibe anyị, ma anyị apụghị ịghọgbu Jehova. (Ndị Hibru 4:13) Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ugboro ugboro ka anyị na-agwa ibe anyị eziokwu n’ihi na ndị ụgha agaghị ebi n’ụwa nke ajọ omume na-agaghị adị na ya. (Ilu 14:2; Mkpughe 21:8; 22:15) Ihe mere e ji nye anyị agbamume ahụ kwesịrị ido anyị anya. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-akwalite ụgha nile.—Jọn 8:44.

12 Ikwu eziokwu na-aba nnọọ uru ná ndụ. Otu n’ime uru ndị a na-erite na ya bụ inwe akọnuche dị ọcha na inwe afọ ojuju n’ihi na ndị ọzọ tụkwasịrị anyị obi. Ọtụtụ mgbe, Ndị Kraịst enwetawo ọrụ, ma ọ bụ nọgide n’ọrụ ha n’ihi na ha na-ekwu eziokwu. Otú ọ dị, uru kasị mkpa anyị na-erite bụ na ikwu eziokwu na-eme ka anyị bụrụ enyi nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.—Abụ Ọma 15:1, 2.

Ịnọgide Na-eme Omume Dị Ọcha

13. Olee ọnọdụ Josef hụrụ onwe ya na ya, gịnịkwa ka o mere?

13 E rere Josef, bụ́ nwa nke nna ochie bụ́ Jekọb, ịbụ ohu mgbe ọ dị afọ 17. O mesịrị biri n’ụlọ Pọtịfa, bụ́ onye Ijipt na-arụrụ eze ọrụ, bụ́ ebe nwunye nna ya ukwu nọ malite inwe mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ gụrụ nwanyị ahụ agụụ ka ya na Josef, bụ́ nwa okorobịa mara mma, kwaa iko, kwa ụbọchị ọ nọgidekwara na-arịọ Josef, sị: “Ka mụ na gị dinaa.” Josef nọ n’ebe dị anya n’ebe ezinụlọ ya nọ, n’ala ebe ọ na-adịghị onye maara ya. Ya na nwanyị a nwere ike ịkwa iko n’enweghị onye maara banyere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe nwunye Pọtịfa bagidere Josef, Josef gbalagara.—Jenesis 37:2, 18-28; 39:1-12.

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka akụkọ banyere Josef ji baara anyị uru? (b) Olee ihe mere obi ji dị otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst ụtọ na ọ ṅara ntị n’ihe ncheta Chineke?

14 A zụlitere Josef n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, ọ ghọtakwara na mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ. Ọ jụrụ, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” O yiri ka ihe nyeere ya aka ime mkpebi ahụ o mere ọ̀ bụ na ọ maara ụkpụrụ Chineke nyere ụmụ mmadụ n’Iden ịgbaso, nke bụ́ otu nwoke ịlụ otu nwanyị. (Jenesis 2:24) Ndị Chineke nke oge a ichebara ihe Josef mere n’ọnọdụ ahụ echiche pụrụ ịbara ha uru. N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ele ịkwa iko anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ nke na ndị na-eto eto na-akwa ndị ọgbọ ha na-ekweghị itinye aka na ya emo. Ndị toro eto bụ́ ndị na-eso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha enwe mmekọahụ juru ebe nile. N’ihi ya, akụkọ Josef na-echetara anyị ihe dị mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche n’oge anyị. Ụkpụrụ Chineke ka bụ na ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye na nke ndị na-alụbeghị bụ mmehie. (Ndị Hibru 13:4) Ndị a nwataworo inwe mmekọahụ rụrụ arụ na-ekweta na e nwere ezi ihe mere e kwesịrị iji zere ya. Ihe ọjọọ ndị ọ pụrụ ịkpata gụnyere mmadụ ire ùgwù ya, akọnuche ya inye ya nsogbu, ekworo, afọ ime, na ọrịa a na-ebute ná mmekọahụ. Dị nnọọ ka Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị, onye nọgidere na-akwa iko “na-emehie megide ahụ́ nke ya.”—1 Ndị Kọrint 5:9-12; 6:18; Ilu 6:23-29, 32.

15 Jenny, * bụ́ Onyeàmà Jehova na-alụbeghị di, nwere ihe mere ọ ga-eji jiri ihe ncheta Chineke kpọrọ ihe. N’ebe ọ na-arụ ọrụ, otu nwoke mara mma ya na ya na-arụkọ ọrụ chọrọ ka ya na ya bụrụ enyi. Mgbe Jenny na-egosighị mmasị, nwoke ahụ nyesiwere ya nsogbu ike. Jenny kwetara, sị: “O siiri m ike ịnọgide na-eme omume dị ọcha n’ihi na ọ na-ebu isi mgbe nwoke gosiri mmasị n’ebe ị nọ.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọpụtara na nanị ihe nwoke ahụ chọrọ bụ ime ka o sonye n’ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ha na ya kwarala iko. Mgbe Jenny hụrụ na o siwerela ya ike ịnọgide na-eme omume ọma, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya. Jenny chọpụtara na ihe ndị ya mụtara ka ya na-enyocha Bible na akwụkwọ Ndị Kraịst yiri ihe ncheta ndị hiri ya ájá n’úkwù ịnọgide na-akpachara anya. Otu n’ime ihe ncheta ndị ahụ bụ akụkọ banyere Josef na nwunye Pọtịfa. O kwubiri, sị: “Ọ bụrụhaala na m nọgide na-echetara onwe m otú m hụruru Jehova n’anya, ekwesịghị m ịtụwa ụjọ na m ga-eme oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide ya.”

Ṅaa Ntị n’Ihe Ncheta Ndị Sitere n’Aka Chineke!

16. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịgụ na n’ịtụgharị uche ná ndụ nke ndị a kpọtụrụ aha na Bible?

16 Anyị nile nwere ike ịghọtakwu ụkpụrụ Jehova site n’ịgbalị ịghọta ihe mere o ji mee ka e detuoro anyị akụkọ ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ. Gịnị ka ha na-akụziri anyị? Olee àgwà ndị a kpọtụrụ aha na Bible kpara bụ́ ndị anyị kwesịrị iṅomi ma ọ bụ izere? A kpọrọ ọtụtụ narị mmadụ aha n’Okwu Chineke. Ndị nile hụrụ iwu Chineke n’anya ga-erite uru site n’inwe agụụ maka amamihe na-enye ndụ, nke gụnyere ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ndị Jehova jiworo nlezianya mee ka e dekọọrọ anyị. Mgbe mgbe, magazin a akọọla akụkọ banyere ndị dị otú ahụ bụ́ ndị akụkọ ha na-akụziri anyị ihe. Gịnị ma i wepụta oge gụgharịa ha?

17. Olee otú i si ele ihe ncheta Jehova anya, n’ihi gịnịkwa?

17 Obi dị anyị nnọọ ụtọ n’ihi otú Jehova si hụ ndị na-agbalị ime uche ya n’anya ma na-eche banyere ha! N’ezie, anyị ezughị okè, dị nnọọ ka ndị ikom na ndị inyom a kpọtụrụ aha na Bible na-ezughị. N’agbanyeghị nke ahụ, akụkọ ha e dere na Bible baara anyị ezigbo uru. Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ihe ncheta Jehova, anyị ga-enwe ike izere ime ajọ mmehie, anyị ga-enwekwa ike iṅomi ezi ihe nlereanya nke ndị jere ije n’ụzọ nke ezi omume. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwe ike iso ọbụ abụ ahụ bụọ, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-echebe ihe àmà [ma ọ bụ, “ihe ncheta” nile nke Jehova] bụ, ndị na-ewere obi ha nile chọọ Ya. Mkpụrụ obi m edebewo ihe àmà [ma ọ bụ, “ihe ncheta”] Gị nile; ana m ahụkwa ha n’anya nke ukwuu.”—Abụ Ọma 119:2, 167.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Lee 1996 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 160-162.

^ par. 15 A gbanwere aha ahụ agbanwe.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

• Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’otú Devid si mesoo Sọl ihe?

• Olee ihe akụkọ banyere Ananaịas na Safaịra na-akụziri anyị?

• N’ihi gịnị ka akụkọ ndụ Josef ji baara anyị ezigbo uru taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

N’ihi gịnị ka Devid ji ghara ikwe ka e gbuo Sọl?

[Foto dị na peeji nke 27]

Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ banyere Ananaịas na Safaịra?

[Foto dị na peeji nke 28]

Olee ihe mere Josef ji jụ ime omume rụrụ arụ?