Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

“Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”—ABỤ ỌMA 119:97.

1, 2. (a) Olee ọnọdụ onye e nyere ike mmụọ nsọ ide Abụ Ọma nke 119 nọ na ya? (b) Gịnị ka o mere banyere ya, n’ihi gịnịkwa?

E LERE onye dere Abụ Ọma nke 119 ule tara akpụ. Ndị iro ya bụ́ ndị dị mpako ma na-emebi iwu Chineke chịrị ya ọchị ma kwutọọ ya. Ndị isi gbara izu megide ya ma kpagbuo ya. Ndị ajọ mmadụ gbara ya gburugburu ma chọọdị igbu ya. Ihe a nile mere ka ‘mkpụrụ obi ya tụpụ dị ka mmiri site n’iru újú.’ (Abụ Ọma 119:9, 23, 28, 51, 61, 69, 85, 87, 161) N’agbanyeghị ule a, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”— Abụ Ọma 119:97.

2 I kwesịrị ịjụ onwe gị, sị, “Olee otú iwu Chineke si kasie ọbụ abụ ahụ obi?” Ihe wusiri ya ike bụ na o nwere obi ike na Jehova nwere mmasị n’ebe ọ nọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị na-emegide ọbụ abụ ahụ wetaara ya, o nwere obi ụtọ n’ihi na ọ maara uru ndị dị n’idebe iwu ahụ Chineke ji ịhụnanya nye ndị ya. Ọ ghọtara na Jehova ejiriwo obiọma mesoo ya ihe. Ọzọkwa, ịgbaso nduzi sitere n’iwu Chineke mere ka ọbụ abụ ahụ mara ihe karịa ndị iro ya ọbụna debe ya ndụ. Irubere iwu ahụ isi mere ka obi ruo ya ala meekwa ka o nwee akọnuche dị ọcha.—Abụ Ọma 119:1, 9, 65, 93, 98, 165.

3. N’ihi gịnị ka o ji esiri Ndị Kraịst ike ịgbaso ụkpụrụ Chineke taa?

3 A na-elekwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ohu Chineke taa ule kpụ ọkụ n’ọnụ. O nwere ike ndụ anyị agaghị anọ n’ihe ize ndụ dị ka nke ọbụ abụ ahụ, ma anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ Ọtụtụ ndị anyị na-ezute kwa ụbọchị ejighị ihe metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe—ihe ndị ha na-achụsosi ike bụ ọdịmma onwe ha na ihe onwunwe, ha dị mpako, ha adịghịkwa asọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:1-5) A na-anwa Ndị Kraịst na-eto eto ọnwụnwa mgbe nile ịkpa àgwà ọjọọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, o nwere ike isi ike ịnọgide na-ahụ Jehova na ihe ziri ezi n’anya. Olee otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị?

4. Olee otú ọbụ abụ ahụ si gosi na ya ji iwu Chineke kpọrọ ihe, Ndị Kraịst hà kwesịkwara ime otú ahụ?

4 Ihe nyeere ọbụ abụ ahụ aka imeri nsogbu ndị ahụ o nwere bụ na o wepụtara oge iji mụọ ma tụgharịa uche n’iwu Chineke. Nke ahụ mere ka ọ hụ iwu Chineke n’anya. N’ezie, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ amaokwu nile dị n’Abụ Ọma nke 119 kpọtụrụ otu akụkụ nke iwu Jehova aha. * Ndị Kraịst anọkwaghị n’okpuru Iwu Mozis, bụ́ nke Chineke nyere mba Izrel oge ochie. (Ndị Kọlọsi 2:14) N’agbanyeghị nke ahụ, ụkpụrụ ndị dị n’Iwu ahụ ka bara uru. Ụkpụrụ ndị a kasiri ọbụ abụ ahụ obi, ha pụkwara ịkasi ndị ohu Chineke, bụ́ ndị ha na nsogbu ndị e nwere n’oge a na-alụ, obi.

5. Olee akụkụ nke Iwu Mozis ndị anyị na-aga ịtụle?

5 Ka anyị hụ agbamume anyị pụrụ inweta site nanị n’ihe atọ dị n’Iwu Mozis: ndokwa nke idebe Ụbọchị Izu Ike, ndokwa nke ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi, na iwu e nyere banyere anyaukwu. Mgbe anyị na-atụle nke ọ bụla n’ime iwu ndị ahụ, anyị ga-achọpụta na ịghọta ụkpụrụ ndị ha dabeere na ha dị anyị ezigbo mkpa iji nagide nsogbu ndị e ji mara oge anyị.

Igbo Mkpa Ime Mmụọ Anyị

6. Olee mkpa ndị bụ́ isi ụmụ mmadụ nwere?

6 Ụmụ mmadụ bu ọtụtụ mkpa pụta ụwa. Dị ka ihe atụ, nri, mmiri, na ụlọ dị ụmụ mmadụ mkpa iji nọgide na-enwe ezi ahụ́ ike. E wezụga nke ahụ, ụmụ mmadụ aghaghịkwa igbo “mkpa nke ime mmụọ” ha. Ha agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha egboghị ya. (Matiu 5:3) Jehova lere igbo mkpa a ụmụ mmadụ bu pụta ụwa anya dị ka ihe dị oké mkpa nke na o nyere ndị ya iwu ka ha hapụ ịrụ ọrụ otu ụbọchị n’izu iji lebara ihe ndị metụtara ofufe ha na-efe ya anya.

7, 8. (a) Olee otú Chineke ji mee ka Ụbọchị Izu Ike dị iche n’ụbọchị ndị ọzọ? (b) Olee ihe Ụbọchị Izu Ike rụzuru?

7 Ndokwa nke idebe Ụbọchị Izu Ike gosiri mkpa ọ dị mmadụ imeziwanye mmekọrịta ya na Chineke. Mgbe mbụ e ji okwu ahụ bụ́ “ụbọchị izu ike” mee ihe na Bible bụ mgbe a na-ekwu banyere mana ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel n’ọzara. A gwara ụmụ Izrel ka ha chịkọta nri a e ji ọrụ ebube nye ha ụbọchị isii. N’ụbọchị nke isii ahụ, ha ga-achịkọta “nri nke ụbọchị abụọ,” n’ihi na ọ dịghị nke ga-ada n’ụbọchị nke asaa. Ụbọchị nke asaa ga-abụ “ụbọchị izu ike dị nsọ nye Jehova,” bụ́ ụbọchị onye ọ bụla ga-anọ n’ụlọ ya. (Ọpụpụ 16:13-30) Otu n’ime Iwu Iri ahụ kwuru na ọ dịghị ọrụ ọ bụla a ga-arụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ụbọchị ahụ dị nsọ. A ga-egbu onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ.—Ọpụpụ 20:8-11; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36.

8 Iwu banyere Ụbọchị Izu Ike gosiri na Jehova na-eche banyere ma mkpa anụ ahụ́ nke ndị ya ma mmekọrịta ha na ya. Jizọs kwuru, sị: “Ụbọchị izu ike malitere ịdị n’ihi mmadụ.” (Mak 2:27) Ọ bụghị nanị na o mere ka ụmụ Izrel zuru ike, kamakwa o nyere ha ohere ịbịaru Onye Okike ha nso na igosi ya na ha hụrụ ya n’anya. (Deuterọnọmi 5:12) Ọ bụ ụbọchị e wepụtara maka nanị ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Nke ahụ gụnyere ezinụlọ ifekọ Chineke ọnụ, ikpekọ ekpere ọnụ, na ịtụgharịkọta uche ọnụ n’Iwu Chineke. Ndokwa ahụ mere ka ndị Izrel zere iji oge na ike ha nile chụsoo akụ̀ na ụba. Ụbọchị Izu Ike ahụ chetaara ha na mmekọrịta ha na Jehova bụ ihe kasị mkpa ná ndụ ha. Jizọs kwupụtaghachiri ụkpụrụ ahụ na-adịghị agbanwe agbanwe mgbe ọ sịrị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’”—Matiu 4:4.

9. Olee ihe ndokwa Ụbọchị Izu Ike ahụ na-akụziri Ndị Kraịst?

9 Taa, Chineke achọghịzi ka ndị ya na-edebe ụbọchị izu ike nkịtị, ma ndokwa Ụbọchị Izu Ike ahụ nwere ihe ọ pụtara nye anyị. (Ndị Kọlọsi 2:16) Ọ́ naghị echetara anyị na anyị onwe anyị kwa aghaghị ibute ihe ndị metụtara ofufe anyị na-efe Chineke ụzọ? Anyị ekwesịghị ikwe ka nchegbu banyere inweta ihe onwunwe ma ọ bụ ịtụrụ ndụ kpagbuo ihe ndị metụtara ofufe anyị. (Ndị Hibru 4:9, 10) N’ihi ya, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: “Olee ihe m na-ebute ụzọ ná ndụ? Àna m ebute ịmụ ihe, ikpe ekpere, ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, na ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ m? Ka ihe ndị ọzọ hà na-ewekọrọ oge ndị m gaara eji eme ihe ndị a?” Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị ebute ihe ndị metụtara ofufe ya ụzọ ná ndụ na ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa ná ndụ agaghị akọ anyị.—Matiu 6:24-33.

10. Olee otú anyị ga-esi rite uru site n’iwepụta oge maka ofufe anyị na-efe Chineke?

10 Oge anyị ji mụọ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, nakwa nke anyị ji chebara ihe ndị anyị gụtara na ha echiche, pụrụ inyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. (Jems 4:8) Susan, bụ́ onye malitere iwepụta oge ịmụchi Bible anya afọ 40 gara aga, kwetara na ọ dịghịrị ya mfe ná mmalite. Ọ bụụrụ ya ọrụ siri ike. Ma, ka ọ na-agụkwu ya, otú ahụ ka ọ na-atọkwu ya ụtọ. Ugbu a, ọ na-ewute ya nke ukwuu ma ọ bụrụ na e nwee ihe gbochiri ya ịmụ ihe. O kwuru, sị: “Ịmụ ihe enyerela m aka ịmata Jehova dị ka Nna. Apụrụ m ịtụkwasị ya obi, dabere n’ebe ọ nọ, ma kpegara ya ekpere n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. Ọ na-emetụ m nnọọ n’ahụ́ ịhụ otú Jehova hụruru ndị ohu ya n’anya, otú o si elekọta m anya, na otú o siworo nyere m aka.” Lee otú anyị ga-esi nwee ọṅụ ma ọ bụrụ anyị ana-egbo mkpa anyị nwere ife ofufe n’ụzọ chiri anya!

Iwu Chineke Banyere Ịtụtụkọta Ihe Ndị A Hapụrụ n’Ubi

11. Olee otú e si jiri ndokwa ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi mee ihe?

11 Ihe ọzọ dị n’Iwu Mozis nke gosiri na Chineke na-eche maka ọdịmma nke ndị ya bụ ndokwa o mere ka a na-ahapụ ndị ogbenye ka ha chịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi. Jehova nyere iwu na mgbe onye Izrel bụ́ onye ọrụ ugbo na-ewekọrọ ihe dị n’ubi ya, o kwesịrị ịhapụ ndị nọ ná mkpa ka ha chịkọta ihe ndị na-ewere ya ihe ubi hapụrụ. A gwara ndị ọrụ ugbo ka ha ghara iwesị ihe dị n’akụkụ ubi ha mgbe ha na-ewe ihe ubi, nakwa ka ha ghara ịtụtụcha mkpụrụ vaịn ma ọ bụ oliv ha fọrọ afọ. A gwakwara ha ka ha ghara ịgaghachi iburu ùkwù ọka ha chefuru n’ubi. E mere ndokwa ọma a maka ndị ogbenye, ndị bịara abịa, ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ. Ọ bụ ezie na iwekọrọ ihe a hapụrụ n’ubi chọrọ ha ịrụsi ọrụ ike, ma, o nyeere ha aka izere ịrịọ arịrịọ.—Levitikọs 19:9, 10; Deuterọnọmi 24:19-22; Abụ Ọma 37:25.

12. Olee ohere ndokwa ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi nyere ndị ọrụ ugbo?

12 Iwu ahụ e nyere banyere ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi ekwughị otú ihe a ga-ahapụrụ ndị nọ ná mkpa ga-aha. Ọ bụ ndị ọrụ ugbo ahụ ga-ekpebi ma ihe ha ga-ahapụ n’akụkụ ubi ha ọ̀ ga-ebu ibu ka ọ̀ ga-epe mpe. Ndokwa a si otú a kụziere ha imesapụ aka. O nyere ndị ọrụ ugbo ahụ ohere igosi ekele ha nwere maka Onye mere ka ihe ha kụrụ n’ubi mee nke ọma, n’ihi na “onye na-asọpụrụ [Onye kere ya] ka onye na-emere ogbenye amara bụ.” (Ilu 14:31) Boaz mere otú ahụ. O ji obiọma hụ na Rut, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke tụtụkọtara ihe n’ubi ya, tụtụkọtara ihe buru ibu. Jehova gọziri Boaz n’ụba maka mmesapụ aka ya.—Rut 2:15, 16; 4:21, 22; Ilu 19:17.

13. Olee ihe iwu ahụ e nyere n’oge ochie banyere ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi na-akụziri anyị?

13 Ụkpụrụ e bu n’obi mee iwu banyere ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi agbanwebeghị. Jehova na-atụ anya ka ndị ohu ya na-emesapụ aka, karịsịa n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ. Ka anyị na-emesapụkwu aka, otú ahụ ka a ga na-agọzikwu anyị. Jizọs kwuru, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ unu ji atụ ihe, ya ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”—Luk 6:38.

14, 15. Olee otú anyị pụrụ isi na-emesapụ aka, oleekwa uru ọ pụrụ ịbara anyị na ndị anyị na-enyere aka?

14 Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịchọ ịhụ na Ndị Kraịst ibe anyị nwetara ntụziaka Bible mgbe ọ bụla a na-ele okwukwe ha ule. Ma ọ̀ pụrụ ịbụ na enyemaka nkịtị dịkwa ha mkpa, dị ka ihe atụ, hà chọrọ onye ga-enyere ha aka ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ịzụtara ha ihe n’ahịa? Ọ̀ dị ndị agadi, ndị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ndị na-adịghị apụ èzí nọ n’ọgbakọ unu bụ́ ndị ọ ga-amasị ka mmadụ bịa leta ha iji gbaa ha ume ma ọ bụ nyere ha aka mee ihe ụfọdụ? Ọ bụrụ na anyị agbalịa ịmata mkpa ndị dị otú ahụ, Jehova ga-enwe ike iji anyị zaa ekpere nke onye nọ ná mkpa. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọrụ dịịrị Onye Kraịst ilekọta Ndị Kraịst ibe ya, ilekọta ndị ọzọ na-enyekwara onye na-elekọta elekọta aka. Ịhụ ndị anyị na ha na-efekọ ofufe n’anya site n’ala ala obi anyị na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu na afọ ojuju bụ́ nke na-eme ka Jehova gọzie anyị.—Ilu 15:29.

15 Ụzọ ọzọ dị mkpa Ndị Kraịst si egosi na ha adịghị eche nanị banyere ọdịmma nke ha bụ iji oge na ume ha agwa ndị ọzọ banyere nzube Chineke. (Matiu 28:19, 20) Onye ọ bụla nyeerela mmadụ aka ịrara ndụ ya nye Jehova maara na okwu na-esonụ Jizọs kwuru bụ eziokwu: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Izere Anyaukwu

16, 17. Olee ihe iwu nke iri ahụ machibidoro, n’ihi gịnịkwa?

16 Ihe nke atọ anyị ga-atụle n’Iwu ahụ Chineke nyere Izrel bụ iwu nke iri ahụ, bụ́ nke kwuru ka mmadụ ghara inwe anyaukwu. Iwu ahụ kwuru, sị: “Gị enwela anyaukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe gị dị, gị enwela anyaukwu n’ebe nwunye mmadụ ibe gị nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwoke nọ, ma ọ bụ n’ebe ohu ya nwanyị nọ, ma ọ bụ n’ebe ehi ya dị, ma ọ bụ n’ebe ịnyịnya ibu ya dị, ma ọ bụ n’ebe ihe ọ bụla dị nke mmadụ ibe gị nwere.” (Ọpụpụ 20:17) Ọ dịghị mmadụ pụrụ ịmanye onye ọzọ irubere ụdị iwu ahụ isi, n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ịma ihe dị n’obi onye ọzọ. Otú ọ dị, iwu ahụ gosiri na Iwu ahụ Jehova nyere mba Izrel dị nnọọ elu karịa iwu ọ bụla ụmụ mmadụ nyere. O mere ka onye Izrel nke ọ bụla mara na ya ga-aza Jehova, bụ́ onye nwere ike ịma ihe mmadụ na-eche n’obi ya, ajụjụ. (1 Samuel 16:7) E wezụga nke ahụ, iwu a lekwasịrị anya n’ihe na-akpata ọtụtụ àgwà ọjọọ.—Jems 1:14.

17 Iwu ahụ e nyere banyere anyaukwu gbara ndị Chineke ume izere ịhụ ihe onwunwe n’anya na ịtamu ntamu banyere ọnọdụ ha ná ndụ. O nyekwaara ha aka imeri ọnwụnwa nke izu ohi na inwe mmekọahụ rụrụ arụ. Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe ndị nwere ihe ndị masịrị anyị ma ọ bụ ndị yiri ka hà na-eme nke ọma karịa anyị n’ụzọ ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị achịkwaghị echiche anyị n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị nwere ike inwewe obi ilu ma mewere ndị ọzọ anyaụfụ. Bible kwuru na anyaukwu na-egosipụta “ọnọdụ uche a jụrụ ajụ.” Ọ ga-akara anyị nnọọ mma izere ya.—Ndị Rom 1:28-30.

18. Olee mmụọ juru ebe nile n’ụwa taa, oleekwa ihe ọjọọ ndị ọ pụrụ ịkpata?

18 Mmụọ jupụtara n’ebe nile n’ụwa taa bụ mmụọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na nke ịsọ mpi. Ndị na-ere ngwá ahịa na-eji mkpọsa ngwá ahịa eme ka anyị chọọ inweta ihe ndị pụtara ọhụrụ, mgbe mgbe, ha na-ejikwa ya agwa anyị na anyị agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enwetaghị ihe ndị ahụ pụtara ọhụrụ. Nke a bụ kpọmkwem mmụọ nke Iwu Jehova katọrọ. Ihe ọzọ ya na ya yiri bụ ọchịchọ ịka ndị ọzọ na ịba ọgaranya n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:9, 10.

19, 20. (a) Olee ihe ndị na-aka onye hụrụ iwu Jehova n’anya mkpa? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ndị hụrụ iwu Chineke n’anya maara ihe ize ndụ ndị dị n’ịhụ ihe onwunwe n’anya, ha anaghịkwa adaba na ha. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ ahụ kpegaara Jehova ekpere, sị: “Wezụga obi m iche ihe àmà Gị nile ihu, ewezụgakwala ya iche uru na-ezighị ezi ihu. Iwu ọnụ Gị dị m mma karịa ọlaedo na ọlaọcha na-adịghị ịgụta ọnụ.” (Abụ Ọma 119:36, 72) Anyị ikwenyesi ike na okwu ndị a bụ eziokwu ga-eme ka anyị nwee echiche ziri ezi bụ́ nke ga-enyere anyị aka izere ịhụ ihe onwunwe n’anya, anyaukwu, na ịtamu ntamu n’ihi ọnọdụ anyị ná ndụ. Ọ bụ “nsọpụrụ Chineke,” ọ bụghị inwe ọtụtụ ihe onwunwe, na-eme ka mmadụ nwee ezi afọ ojuju.—1 Timoti 6:6.

20 Ụkpụrụ ndị Iwu ahụ Jehova nyere mba Izrel oge ochie dabeere na ha baara anyị uru n’oge ihe isi ike a anyị bi na ya otú ha si baara ndị Izrel mgbe ahụ Jehova nyere Mozis Iwu ahụ. Ka anyị na-etinyekwu ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ná ndụ anyị, otú ahụ ka anyị ga na-aghọtakwu ha, na-ahụkwu ha n’anya, ma na-enwekwu obi ụtọ. Iwu ahụ na-akụziri anyị ọtụtụ ihe bara uru, ndụ na ahụmahụ nke ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible na-echetakwara anyị nnọọ otú ihe ndị ahụ ọ na-akụziri anyị baruru n’uru. A ga-atụle ụfọdụ n’ime akụkọ ndụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E wezụga amaokwu anọ n’ime otu narị na amaokwu iri asaa na isii e nwere n’Abụ Ọma nke 119, ndị ọzọ nile kwuru banyere ihe Jehova nyere n’iwu, ikpe ezi omume ya, iwu ya, ihe ịrịba ama ya, ụkpụrụ ya, ihe àmà ya, okwu ọnụ ya, ụzọ ya, ma ọ bụ okwu ya.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

• Gịnị mere onye dere Abụ Ọma nke 119 ji hụ iwu Jehova n’anya?

• Gịnị ka Ndị Kraịst pụrụ ịmụta site ná ndokwa nke idebe Ụbọchị Izu Ike?

• Olee uru na-adịgide adịgide anyị na-erite n’iwu ahụ Chineke nyere banyere ịtụtụkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi?

• Olee otú iwu ahụ e nyere banyere anyaukwu si echebe anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Gịnị ka iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ mere ka ọ pụta ìhè?

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka iwu ahụ e nyere banyere ịchịkọta ihe a hapụrụ n’ubi na-akụziri anyị?