Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Letakwa Osisi Vaịn A”!

“Letakwa Osisi Vaịn A”!

“Letakwa Osisi Vaịn A”!

NDỊ nledo 12 ahụ gagharịrị n’akụkụ nile nke Ala Nkwa ahụ. Mozis gwara ha ka ha chọpụta ndị bi na ya ma wetara ya mkpụrụ ụfọdụ si n’ala ahụ. Olee ihe ọkụkụ nke dọọrọ mmasị ha karịsịa? N’ebe na-adịghị anya site na Hibrọn, ha hụrụ otu ubi vaịn mkpụrụ ya dị nnọọ ọtụtụ nke na ihe mmadụ abụọ n’ime ndị nledo ahụ nwere ike ibu bụ nanị otu ụyọkọ ya. N’ihi otú ebe ahụ si mịa mkpụrụ vaịn, ndị nledo ahụ kpọrọ ebe ahụ na-eme nri nke ọma “ndagwurugwu Eshkọl,” ma ọ bụ Ụyọkọ Mkpụrụ Vaịn.—Ọnụ Ọgụgụ 13:21-24.

Na narị afọ nke 19, otu onye gara Palestaịn kọrọ, sị: “Vaịn ka jupụtara n’Eshkọl, ma ọ bụ ndagwurugwu Vaịn, . . . , mkpụrụ vaịn ya bụkwa nke kasị mma na nke kasị buo ibu na Palestaịn.” Ọtụtụ ebe na Palestaịn mịrị vaịn n’oge Bible, ma nke Eshkọl ka ha nile mma. Ihe ndekọ nke ndị Ijipt na-egosi na ndị Fero siri na Kenan zụbata mmanya n’obodo ha.

Akwụkwọ bụ́ The Natural History of the Bible na-akọwa, sị: “Ugwu ndị bụ́ okwute okwute [e nwere na Palestaịn], ájá ya nke nwere obere okwute, anwụ na-achasa na ya, okpomọkụ na-adị ebe ahụ n’oge okpomọkụ, na otú mmiri ndị zoro ebe ahụ n’oge oyi si asọpụ ngwa ngwa na-eme ka vaịn na-eme nke ọma n’obodo ahụ.” Aịzaịa kwuru na ebe ụfọdụ nwere vaịn ruru otu puku.—Aịsaịa 7:23.

‘Ala nke Osisi Vaịn’

Mozis gwara mba Izrel na ha ga-enweta ala nke “osisi vaịn, na osisi fig, na pomegranate.” (Deuterọnọmi 8:8) Dị ka akwụkwọ bụ́ Baker Encyclopedia of Bible Plants si kwuo, “osisi vaịn juru na Palestaịn oge ochie nke na a chọtawo mkpụrụ vaịn n’ọtụtụ ebe e gwupụtara ihe n’ala n’ebe ahụ, ma ọ bụrụdị na ọ bụghị na ha nile.” Osisi vaịn ndị dị n’Ala Nkwa ahụ na-amị mkpụrụ nke ukwuu nke na ọbụna n’afọ 607 T.O.A. mgbe ndị agha Nebukadneza bibiri Juda, ndị fọdụrụ n’ala ahụ “wee chịkọta mmanya vaịn na mkpụrụ nke mgbe nghọkọta mkpụrụ nke ukwuu.”—Jeremaịa 40:12; 52:16.

Iji mepụta mmanya buru ibu, ndị Izrel bụ́ ndị ọrụ ugbo aghaghị ilekọta osisi vaịn ha anya nke ọma. Akwụkwọ Aịsaịa na-akọwa otú ezigbote onye na-akụ vaịn n’Izrel ga-esi gwuo ala n’ala dị n’akụkụ ugwu ma wepụsịa okwute ọ bụla buru ibu dị na ya tupu ya akụọ “osisi vaịn kachasị mma.” O nweziri ike iji okwute ndị ahụ o gwupụtara n’ala rụọrọ ya mgbidi. Mgbidi a ga-enye aka chebe ubi vaịn ya ka ehi ghara ịzọgbu osisi vaịn ya, chebekwa ubi ahụ ka nkịta ọhịa, ezì ọhịa, na ndị ohi ghara ịbata na ya. O nwekwara ike igwu ebe nzọcha mmanya vaịn ma wuo obere ụlọ dị elu bụ́ ebe ga na-ajụ oyi nke mmadụ ga-anọ n’oge owuwe ihe ubi mgbe ọ dị mkpa ka e chebe vaịn ndị ahụ nke ọma. Ka ọ rụchara ọrụ ndị a bu ụzọ, ọ ga-atụ anya ịghọta ọtụtụ mkpụrụ vaịn.—Aịsaịa 5:1, 2. *

Ka onye ọrụ ugbo wee jide n’aka na ọ ga-aghọta ọtụtụ mkpụrụ n’ubi vaịn ya, ọ na-akwachasị osisi vaịn ahụ mgbe nile ka o wee na-amị mkpụrụ nke ọma ma jiri ọgụ na-abọcha úkwù ya ka ahịhịa na ogwu ghara igbu ya. O nwere ike ịgba ubi vaịn ya mmiri n’oge okpomọkụ ma ọ bụrụ na mmiri ikpeazụ zoronụ edeghị ala ahụ nke ọma!—Aịsaịa 5:6; 18:5; 27:2-4.

Oge a na-eji aghọ mkpụrụ vaịn, nke bụ́ ná ngwụsị nke oge okpomọkụ, bụ oge oké ọṅụ. (Aịsaịa 16:10) Ihe e dekwasịrị n’elu abụ ọma atọ gụnyere okwu ndị bụ́ “n’elu Gittith.” (Abụ Ọma nke 8, 81, na nke 84) Nsụgharị Septuagint kpọrọ okwu a metụtara abụ bụ́ nke a na-ejighị n’aka ihe ọ pụtara “ebe nzọchapụta mmanya,” ọ pụkwara ịpụta na ndị Izrel na-abụ abụ ndị a n’oge ha na-aghọ mkpụrụ vaịn ha. Ọ bụ ezie na ihe e ji mkpụrụ vaịn ndị ahụ mee karịsịa bụ mmanya, ndị Izrel rakwara ha ara ma ọ bụ mịkpọọ ha amịkpọọ, ma eleghị anya jiri ha mee mbadamba mkpụrụ vaịn.—2 Samuel 6:19; 1 Ihe E Mere 16:3.

Osisi Vaịn nke Bụ́ Izrel

Ọtụtụ ugboro na Bible, a kọwara ndị Chineke dị ka osisi vaịn—bụ́ ihe atụ dabara adaba n’ihi otú vaịn si dị ndị Izrel mkpa. N’Abụ Ọma nke 80, Esaf ji mba Izrel tụnyere osisi vaịn Jehova kụrụ na Kenan. A sụchasịrị ala ahụ ka osisi vaịn nke bụ́ Izrel wee gbanye mkpọrọgwụ ma sie ike. Ma ka oge na-aga, mgbidi e ji chebe ya dara. Mba ahụ atụkwasịghịzi Jehova obi, ya akwụsịkwa ichebe ha. Dị ka ezì ọhịa si emebi ubi vaịn, mba ndị bụ́ ndị iro Izrel nọgidere na-emebi akụ̀ na ụba ndị Izrel. Esaf kpere ekpere ka Jehova nyere mba ahụ aka ka o nwetaghachi ebube mbụ ya. Ọ rịọrọ, sị: “Letakwa osisi vaịn a.”—Abụ Ọma 80:8-15.

Aịzaịa ji “ụlọ Izrel” tụnyere ubi vaịn nke jiri nwayọọ nwayọọ malite ịmị “mkpụrụ vaịn ọhịa,” ma ọ bụ mkpụrụ vaịn rere ure. (Aịsaịa 5:2, 7) Mkpụrụ vaịn ọhịa na-adị nnọọ obere karịa nke vaịn a kụrụ akụ, uru ya na-adị ntakịrị, mkpụrụ dị n’ime ya na-ebukwa ibu. Vaịn ọhịa abaghị uru maka iji mee mmanya na ịra ya ara—nke ahụ bụ ihe dabara adaba e kwesịrị iji mee ihe atụ nke mba si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị mkpụrụ ha na-amị bụ mmebi iwu kama ịbụ ezi omume. Mkpụrụ a na-abaghị uru nke vaịn a na-amị esighị Onye kụrụ ya n’aka. Jehova emewo ihe nile o nwere ike ime iji hụ na mba ahụ mịrị mkpụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka a ga-eme ubi vaịn nke m ọzọ, nke m na-emeghị n’ime ya?”—Aịsaịa 5:4.

Ebe ọ bụ na osisi vaịn nke bụ́ Izrel amịghị mkpụrụ, Jehova dọrọ ha aka ná ntị na ya ga-akwatu mgbidi ya wuru gburugburu ndị ya bụ́ nke na-echebe ha. Ọ gaghịzi na-akwachasị ubi ihe atụ ya ma ọ bụ na-abọ ya ahịhịa. Mmiri ozuzo ikpeazụ nke ga-eme ka ihe ọkụkụ ahụ mee nke ọma agaghị ezo, ahịhịa na ogwu ga-etojukwa ubi vaịn ahụ.—Aịsaịa 5:5, 6.

Mozis buru amụma na ndapụ n’ezi ofufe nke ụmụ Izrel ga-eme ka ubi vaịn nkịtị ha kpọnwụọ. O kwuru, sị: “Ị ga-akụ ubi vaịn dị iche iche, rụọkwa ha, ma ọ dịghị mmanya vaịn ị ga-aṅụ, ị gaghị aghọkọtakwa mkpụrụ vaịn; n’ihi na ikpuru ga-eri ha.” (Deuterọnọmi 28:39) Osisi vaịn nwere ike ịkpọnwụ n’ime abalị ole na ole ma ọ bụrụ na ikpuru abanye n’ime úkwù ya ma richapụ ya.—Aịsaịa 24:7.

“Ezi Osisi Vaịn Ahụ”

Dị nnọọ ka Jehova ji ndị Izrel nkịtị tụnyere osisi vaịn, Jizọs jikwa vaịn mee ihe atụ. N’oge Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eri nri ọtụtụ ndị maara dị ka Nri Anyasị Ikpeazụ, ọ gwara ha, sị: “Abụ m ezi osisi vaịn ahụ, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.” (Jọn 15:1) Jizọs ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka osisi vaịn ahụ. Dị ka alaka osisi vaịn nkịtị si enweta ihe o ji adị ndụ site n’úkwù osisi ahụ, n’otu aka ahụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst na Onyenwe ha bụ́ Jizọs aghaghị ịnọgide na-adị n’otu. Jizọs kwuru, sị: “E wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” (Jọn 15:5) Ndị ọrụ ugbo na-akụ osisi vaịn n’ihi mkpụrụ ya, Jehova na-achọkwa ka ndị ya na-amị mkpụrụ ime mmụọ. Nke a na-ewetara Chineke, bụ́ Onye kụrụ osisi vaịn ahụ, ọṅụ na otuto.—Jọn 15:8.

Ka osisi vaịn nkịtị wee mịa mkpụrụ, a ga na-akwachasị ya akwasị ma na-eme ka ọ dị ọcha, Jizọs zochakwara aka n’ọrụ abụọ ahụ. Onye na-akụ vaịn nwere ike ịkwachasị osisi vaịn ahụ ugboro abụọ n’afọ ka o wee mịa ọtụtụ mkpụrụ. N’oge oyi, e nwere ike ịkwachapụ ọtụtụ alaka osisi vaịn ahụ. Onye ahụ na-akụ vaịn na-akwachapụ ihe ka ọtụtụ n’alaka ndị tolitere n’afọ gara aga. Eleghị anya, ọ ga-ahapụ alaka atọ ma ọ bụ anọ buru ibu n’osisi ahụ, bụ́ ndị nwere otu alaka ma ọ bụ abụọ ndị pulitere ọhụrụ na ha. Alaka ọhụrụ ndị a, bụ́ ndị topụtara n’afọ gara aga, ga-abụ alaka ndị ga-amị mkpụrụ n’oge okpomọkụ na-abịa abịa. N’ikpeazụ, mgbe onye ahụ na-akụ vaịn kwachasịchara osisi ahụ, ọ ga-akpọ alaka ndị ahụ ọ kwachapụtara ọkụ.

Jizọs kọwara oké nkwacha a a na-akwacha osisi vaịn, sị: “Ọ bụrụ na mụ na onye ọ bụla anọgideghị na-adị n’otu, a na-atụpụ ya dị ka alaka, ọ na-akpọnwụkwa; ndị mmadụ na-achịkọtakwa alaka ndị ahụ ma wụba ha n’ime ọkụ, ha ewee ree ọkụ.” (Jọn 15:6) Ọ bụ ezie na osisi vaịn ahụ nwere ike iyi ihe na-enwekwaghị alaka n’oge a, a ka ga-akwachatụkwu ya n’oge opupu ihe ubi.

Jizọs kwuru, sị: “Alaka ọ bụla dị na mụ nke na-adịghị amị mkpụrụ ka ọ na-ewepụ.” (Jọn 15:2) Ọ pụrụ ịbụ na nke a na-ezo aka ná nkwachasị ọzọ a ga-akwachasị osisi ahụ, mgbe osisi vaịn ahụ mịsịrị ọtụtụ mkpụrụ ọhụrụ, e nweekwa ike ịhụ ụyọkọ mkpụrụ vaịn ndị ka dị obere nke ọma. Onye ahụ na-akụ vaịn na-eji nlezianya nyochaa alaka ọhụrụ nke ọ bụla iji mata ndị mịrị mkpụrụ na ndị na-amịghị. Ọ bụrụ na a hapụ alaka ndị ahụ na-amịghị mkpụrụ, ha ka ga na-amịrị mmiri na ihe ndị ọzọ n’osisi ahụ. N’ihi ya, onye ahụ na-akụ vaịn na-akwachapụ alaka ndị a na-amịghị mkpụrụ, ka nri ndị dị n’osisi ahụ gaa nanị n’alaka ndị ahụ na-amị mkpụrụ.

N’ikpeazụ, Jizọs kwuru banyere usoro e ji eme ka ọ dị ọcha. Ọ kọwara, sị: “Nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.” (Jọn 15:2) Ozugbo onye ahụ na-akụ vaịn kwachasịrị alaka ndị ahụ na-amịghị mkpụrụ, ọ na-eleru nke ọ bụla n’ime alaka ndị ahụ na-amị mkpụrụ anya. Ná nso ala ala nke alaka nke mịrị mkpụrụ, ọ na-ahụkarị alaka ọhụrụ ndị na-epulitenụ bụ́ ndị kwesịkwara ka e wepụ ha. Ọ bụrụ na a hapụ ha ka ha too, ha ga na-amịrị mmiri ndị dị mkpụrụ vaịn ndị ahụ mkpa. A pụkwara ịkụpụ ụfọdụ akwụkwọ ndị dị mbadamba, ka anyanwụ wee chasa mkpụrụ vaịn ọhụrụ ndị ahụ nke ọma. A na-eme ihe a nile iji mee ka alaka ndị ahụ na-amị mkpụrụ nwee ike ịmị ọtụtụ mkpụrụ.

‘Nọgidenụ Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu’

Alaka ihe atụ nke “ezi osisi vaịn ahụ” na-anọchi anya Ndị Kraịst e tere mmanụ. N’agbanyeghị nke ahụ, “atụrụ ọzọ” ahụ aghaghị igosipụta na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-amị mkpụrụ. (Jọn 10:16) Ha onwe ha pụkwara ịmị “mkpụrụ dị ukwuu” ma wetara Nna ha nke eluigwe otuto. (Jọn 15:5, 8) Ihe atụ Jizọs nke ezi osisi vaịn ahụ na-echetara anyị na nzọpụta anyị dabeere n’anyị na Kraịst ịnọgide na-adị n’otu na ịmị ezi mkpụrụ ime mmụọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe ndị m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debeworo ihe ndị Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.”—Jọn 15:10.

N’oge Zekaraịa, Chineke kwere ihe fọdụrụ ná ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi nkwa na a ga-enweghachi ‘mkpụrụ udo n’ala ahụ; osisi vaịn ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya.’ (Zekaraịa 8:12) E jikwa osisi vaịn kọwaa udo ndị Chineke ga-enwe n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. Maịka buru amụma, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica si kwuo, ndị Izrel na-akụ vaịn na-enwe mmasị ịkụ vaịn ndị na-amị mkpụrụ na-acha odo odo nke a maara dị ka sorek. O yiri ka ọ̀ bụ ụdị vaịn a ka e kwuru banyere ya n’Aịsaịa 5:2. A na-eji mkpụrụ vaịn ndị a emepụta mmanya vaịn na-atọ ụtọ nke na-acha ọbara ọbara.

[Foto dị na peeji nke 18]

Osisi vaịn ka kpọnwụrụ ọhụrụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Osisi vaịn a kwachasịrị n’oge oyi

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe a na-akpọ alaka ndị a kwachapụrụ akwachapụ ọkụ