Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ezie, Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ

N’ezie, Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ

N’ezie, Ị Pụrụ Inwe Obi Ụtọ

OBI ỤTỌ—ezi obi ụtọ na-adịgide adịgide—na-ara ahụ́ nnweta mgbe ụfọdụ. Isi ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-agbalịsi ike inweta obi ụtọ na-achọ ya n’ebe ọ na-adịghị. A sị nnọọ na ha nwere enyi ha pụrụ ịtụkwasị obi nke ga-enwe ike ịgwa ha otú ha ga-esi nweta ya!

Bible na-enye nduzi dị otú ahụ. Tụlee nanị otu n’ime akwụkwọ ndị dị na ya—Abụ Ọma. Akwụkwọ a nwere otu narị abụ nsọ na iri ise ndị e ji eto Jehova Chineke, ọ bụkwa Eze Devid nke Izrel oge ochie dere ihe dị ka ọkara ya. Ma ịmata na e ji ike mmụọ nsọ nke Enyi kasịnụ nke ụmụ mmadụ, bụ́ Jehova, dee akwụkwọ a dị mkpa karịa ịmata ndị dere ya. N’ihi ya, o doro anyị anya na o nwere nduzi sitere n’aka Chineke maka ọdịmma anyị, nakwa na ọ na-ezi anyị ụzọ anyị pụrụ isi nweta obi ụtọ.

O doro ndị dere Abụ Ọma anya na ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ na Chineke inwe ezi mmekọrịta. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova.” (Abụ Ọma 112:1) Ọ dịghị mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ibe ya, ihe onwunwe, ma ọ bụ ihe mmadụ rụzuru nke pụrụ inye ya ụdị obi ụtọ mmadụ na-enweta site n’iso ná ndị “Jehova bụ Chineke ha.” (Abụ Ọma 144:15) Ndụ nke ọtụtụ ndị ohu Chineke nke oge a na-egosi na nke a bụ eziokwu.

Susanne, bụ́ onye dị afọ iri anọ na ụma, kwenyesiri ike na nke ahụ. * O kwuru, sị: “Taa, ọtụtụ ndị na-esonyere òtù ụfọdụ iji nweta ihe ha na-achọ ma ọ bụ iji hụ ndị ha na ha nwere mmasị n’otu ihe. Ma, ọ na-esi ike ha ewere mmadụ nile nọ n’òtù ahụ dị ka enyi ha. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’etiti ndị Jehova. Ịhụnanya anyị nwere maka Jehova na-eme ka anyị hụrịta ibe anyị n’anya. Ahụ́ na-eru anyị ala mgbe anyị na ndị Chineke ibe anyị nọ, n’agbanyeghị ebe anyị nọ. Ịdị n’otu a na-enye anyị nnọọ ọṅụ. Olee ndị ọzọ ga-etu ọnụ na ha nwere ndị enyi si n’agbụrụ dị iche iche, ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche iche na ndị si ná mba dịgasị nnọọ iche? Apụrụ m iji obi m nile kwuo na ịbụ onye Jehova bụ ihe na-enye mmadụ obi ụtọ.”

Maree, bụ́ onye a mụrụ na Scotland, chọpụtakwara na ọ dị mmadụ mkpa ya na Jehova ịdị ná mma ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ inwe obi ụtọ. O kwuru, sị: “Tupu m mụta eziokwu Bible, ọ na-atọ m ụtọ ile fim ndị na-atụ ụjọ. Ma n’abalị, ụra anaghị ekwe m ohihi ma mụ ejighị obe n’aka iji chụpụ ndị mmụọ na ndị nwụrụ anwụ na-amị mmadụ ọbara, bụ́ ndị m na-ahụ n’ọtụtụ fim ndị ahụ. Otú ọ dị, ozugbo m mụtara eziokwu ahụ ma kwụsị ikiri ụdị fim ahụ, mmekọrịta mụ na Jehova mere ka o kwe m omume ịlaba n’abalị n’atụghị ụjọ, meekwa ka m nwee obi ụtọ ife Chineke nke dị ike karịa ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ndị e chere na-amị mmadụ ọbara.”

Ịtụkwasị Jehova Obi Na-eweta Obi Ụtọ

Ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji nwewe obi abụọ banyere Onye Okike anyị ịbụ onye pụrụ ime ihe nile na onye amamihe ya na-enweghị nsọtụ. Ebe Devid maara na ya pụrụ ịtụkwasị Jehova obi ya nile nakwa na ya pụrụ ịgbaba n’ime Ya, o dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke meworo Jehova ka Ọ bụrụ ihe ntụkwasị obi ya.”—Abụ Ọma 40:4.

Maria kwuru, sị: “Ihe m chọpụtarala na Spen na n’ebe ndị ọzọ bụ na mgbe anyị mere ihe otú Jehova si chọọ, n’agbanyeghị na echiche anyị ma ọ bụ obi anyị nwere ike gwa anyị ka anyị mee ihe dị iche, ọ na-arụpụta ihe kasị mma. Nke a na-eweta obi ụtọ n’ihi na echiche Jehova na-aka mma mgbe nile.”

Andreas, bụ́ okenye ọgbakọ Ndị Kraịst nke jerela ozi ná mba dị iche iche na Europe, mụtakwara na anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi. O kwuru, sị: “Agbasoro m nnọọ echiche deede m, bụ́ onye mụ na ya na-anọghị n’otu okpukpe, mgbe m bụ nwa okorobịa. Ọ gbara m ume inweta ọrụ a na-akwụ ezi ụgwọ na ya. Obi gbawara ya mgbe m malitere ozi oge nile ma ghara ịdabere n’ezi ndụ a sịrị na ụgwọ ezumike nká na-eme ka mmadụ bie. N’oge ozi oge nile m, ọ dịtụbeghị mgbe m nọ ná mkpa, enwetawokwa m ngọzi ndị ọzọ na-arọ nanị ná nrọ.”

N’afọ 1993, a kpọrọ Felix ka ọ bịa nye aka wusakwuo alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Selters, Germany. Ozugbo ọrụ ahụ gwụrụ, a gwara ya ka ọ nọrọwazie dị ka onye òtù ezinụlọ Betel ahụ. Gịnị ka o mere? O kwuru, sị: “Ejichaghị m obi m nile nabata ọrụ ahụ. Ma anọọla m ebe a ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri, ekwenyesikwara m ike na Jehova zara ekpere m. Ọ maara ihe ga-aka abara m uru. Site n’ịtụkwasị ya obi m nile na ikwe ka ọ na-eduzi m, ana m enye ya ohere igosi m ihe ọ chọrọ ka m mee.”

Susanne, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’elu, chọrọ ije ozi dị ka onye ozi oge nile ma ọ bu onye ọsụ ụzọ, ma ịchọta ọrụ nwa oge bịara siere ya ike. Mgbe ọ nọsịrị otu afọ n’enweghị ọrụ, o mere ihe iji gosipụta ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ. O kwuru, sị: “Etinyere m akwụkwọ ịghọ ọsụ ụzọ oge nile. Tupu m tinye akwụkwọ ahụ, echekwaala m ego ga-ezuru m ruo ihe dị ka otu ọnwa. Ihe mere n’ọnwa ahụ tụrụ m nnọọ n’anya! Ozi m nọ na-enye m nnọọ ọṅụ, ma ọrụ nile m chọtara adịghị nke dabaranụ. Otú ọ dị, dị ka Jehova kwere ná nkwa, ọ hapụghị m. N’ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa ahụ, enwetara m ọrụ. Ọ bịara doo m anya na m pụrụ nnọọ ịtụkwasị Jehova obi! Ahụmahụ a m nwere ná mmalite nke ozi oge nile m esowo mee ka m nwee afọ ojuju na obi ụtọ ná ndụ.”

Ịnabata Ndụmọdụ Chineke Na-eme Ka Mmadụ Nwekwuo Obi Ụtọ

Eze Devid mere mmehie ụfọdụ dị oké njọ. Mgbe ụfọdụ, ndụmọdụ amamihe dị na ya dị ya mkpa. Ànyị dị njikere ịnabata ndụmọdụ na ntụziaka dị ka Devid?

Otu mgbe, Aida, bụ́ onye bi na France, ghọtara na ya mere mmehie dị oké njọ. Ọ kọrọ, sị: “Ihe kasị m mkpa bụ ime ka mụ na Jehova dịghachi ná mma. Ọ dịghị ihe ọzọ.” Ọ gakwuuru ndị okenye ọgbakọ maka enyemaka. O jeela ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 14 ma kwuo, sị: “Ọ na-enye m nnọọ obi ụtọ ịmata na Jehova gbaghaara m mmehie m!”

Ịnabata ndụmọdụ Chineke pụrụ ime ka anyị ghara imedị mmehie eme. Judith kọwara, sị: “Mgbe m dị afọ 20, otu onye Germany mụ na ya so achụ nta ego mere ihe nile o nwere ike ime iji dọta mmasị m, abịakwara m nwee mmasị n’ebe ọ nọ. A na-akwanyere ya ùgwù, o nwere ezigbo ọrụ, ọ lụọkwala nwanyị! Ọ bịara doo m anya na m ghaghị ịhọrọ ma m̀ ga-erubere iwu Jehova isi ka m̀ ga-agbakụta Ya nnọọ azụ. Agwara m ndị mụrụ m ihe na-enye m nsogbu n’obi. Nna m gwara m hoo haa ihe Jehova tụrụ m anya n’aka ime. O zooroghị m ọnụ—bụ́kwanụ ihe dị m nnọọ mkpa mgbe ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, anọgidere m na-achọ ihe m ga-eji kụnye aka mee ihe ahụ dị m n’obi. Ruo ọtụtụ izu, nne m na-eji mgbede agwa m otú o si dị mkpa irubere iwu Chineke isi na otú ọ pụrụ isi zọpụta ndụ m. Obi dị m nnọọ ụtọ na obi m ji nwayọọ nwayọọ laghachi n’ebe Jehova nọ. Ịdọ aka ná ntị o nyere m na ihe ọ kụziiri m ewetarala m nnọọ obi ụtọ—ejiriwo m ọtụtụ afọ jee ozi oge nile ma lụta ezigbo Onye Kraịst hụrụ m n’anya ma jiri obi ya nile hụ Jehova n’anya.”

N’ezie, ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-emesi eziokwu nke okwu Devid ike, bụ́ onye kwuru, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya. Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ mmadụ nke Jehova na-adịghị agụrụ ya ajọ omume.”—Abụ Ọma 32:1, 2.

Obi Ụtọ A Na-enweta n’Inyere Ndị Ọzọ Aka

Devid dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye nwere uche n’imeso onye na-enweghị ike: n’ụbọchị ihe ọjọọ Jehova ga-eme ka ọ wepụga onwe ya. Jehova ga-edebe ya, mee ka ọ dị ndụ, a ga-eme ka ihe gaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 41:1, 2) Ịhụnanya Devid gosiri Mefiboshet, bụ́ nwa ngwụrọ nke enyi ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Jonatan, bụ ezi ihe atụ nke mmadụ imere onye na-enweghị ike ebere.—2 Samuel 9:1-13.

Marlies, bụ́ onye nọworo n’ozi ala ọzọ ruo afọ 47, nwere ihe ùgwù nke ikwusara ndị si Africa, Eshia, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe gbata ọsọ ndụ, ozi ọma. O kwuru, sị: “Ha nwere nsogbu dị iche iche, ọtụtụ n’ime ha chekwara na ọ dịchaghị ihe e ji ha kpọrọ, na a na-emegbu ha nnọọ emegbu. Inyere ndị dị otú ahụ aka na-enye nnọọ obi ụtọ.”

Marina, bụ́ onye dị afọ 40 na ụma, dere, sị: “Dị ka onye na-alụbeghị di, amaara m otú o si bụrụ ihe nkasi obi ịmara na i nwere ndị enyi ga-enyere gị aka mgbe i nwere nsogbu. Nke a na-akpali m ịgba ndị mmadụ ume site n’ịkpọ ha na fon ma ọ bụ idere ha akwụkwọ ozi. Ọtụtụ ekelewo m maka ya. Inyere ndị ọzọ aka na-enye m ọṅụ.”

Dimitar, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ 25, kwuru, sị: “Ọ bụ nanị nne m zụrụ m. Mgbe m ka dị obere, obi dị m ụtọ inwe onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-akpọ m aga ozi ọma kwa izu iji zụọ m. Obi ka dị m nnọọ ụtọ na ike agwụghị ya n’inyere m aka. Amaara m na ọ bụghị mgbe nile ka ọ dịịrị ya mfe ịkpali mmasị m ịga.” N’ihi na obi dị Dimitar ụtọ maka aka ahụ e nyeere ya, ọ na-enyeziri ndị ọzọ aka ugbu a. O kwuru, sị: “Ana m agbalị iso otu onye na-eto eto na onye merela agadi aga ozi ubi, ya dịkarịa ala otu ugboro n’ọnwa.”

Akwụkwọ Abụ Ọma kwukwara ihe ndị ọzọ na-eweta obi ụtọ. Otu n’ime ha bụ mkpa ọ dị mmadụ ịdabere n’ike Jehova kama ịdabere n’ike nke onwe ya: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke ike o nwere dị na [Jehova].”—Abụ Ọma 84:5.

Corinna chọpụtara na nke a bụ eziokwu ná ndụ ya. Ọ kwagara ná mba ebe e nwere mkpa dị ukwuu n’ozi. O kwuru, sị: “Asụsụ ha, omenala ha, ụzọ ha si eche echiche dị iche na nke m. O yiri m nnọọ ka m̀ nọ n’ụwa ọzọ. Ụjọ tụrụ m mgbe m chere echiche ikwusa ozi ọma n’ebe m na-amaghị. Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka, ọ bụkwa ya nyere m ike ikwusa ozi ọma site n’ụtụtụ ruo ná mgbede n’ókèala dịpụrụ adịpụ. Ka oge na-aga, ime otú ahụ bịara mara m nnọọ ahụ́. Amalitere m iduziri ọtụtụ ndị ọmụmụ Bible, ahụmahụ m nwere n’ebe ahụ ka na-abakwara m uru. Amụtara m na Jehova pụrụ inye anyị ike imeri ọbụna nsogbu ndị karịrị mmadụ ike.”

N’ezie, e nwere ihe dị iche iche na-eweta obi ụtọ, ha gụnyere mmadụ na Chineke na ndị Ya ịbụ enyi, ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam, ịnabata ndụmọdụ ya, na ichebara ndị ọzọ echiche. Site n’ije ije n’ụzọ Jehova na irube isi n’iwu ya, anyị pụrụ inweta ngọzi ya ma nwee obi ụtọ.—Abụ Ọma 89:15; 106:3; 112:1; 128:1, 2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A gbanwere aha ụfọdụ agbanwe.

[Foto dị na peeji nke 12]

Maria

[Foto dị na peeji nke 13]

Maree

[Foto dị na peeji nke 13]

Susanne na Andreas

[Foto dị na peeji nke 15]

Corinna

[Foto dị na peeji nke 15]

Dimitar