Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uto n’Etiti Ndị Dị Iche Iche Bi na Uganda

Uto n’Etiti Ndị Dị Iche Iche Bi na Uganda

Uto n’Etiti Ndị Dị Iche Iche Bi na Uganda

UGANDA, bụ́ obodo dị n’etiti Oké Ndagwurugwu Rift dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa na nke akara kere ụwa abụọ si n’etiti ya gafee, mara mma dị egwu. O nwere ụdị ala dị iche iche, nwee ụdị osisi dị iche iche, nakwa ụmụ anụmanụ mara mma. N’ihi na ọ dị n’ebe dị elu ma dị larịị n’Africa, ọ naghị ekpo oké ọkụ, o nwekwara ugwu ndị mara mma bụ́ ndị dị ọtụtụ narị kilomita n’ogologo.

Ọ rara ahụ́ inweta mba ebe ebe jụrụ oyi dị nnọọ nso n’ebe na-ekpo ọkụ, ma Uganda bụ mba dị otú ahụ. N’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ya, e nwere Ugwu Ọnwa nke snow kpuchiri elu ya, bụ́ Ugwu Ruwenzori, n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, e nwee ebe fọrọ nke nta ka ọ kpọọ nkụ ka ọzara. Ị ga-ahụ enyí, atụ, na ọdụm n’ebe ahụ. Ọzọdimgba, na ụdị nnụnụ dị iche iche karịrị otu puku bi n’oké ọhịa na n’ugwu ndị dị n’ebe ahụ. Ụkọ mmiri ozuzo na ụnwụ nri na-akpa ọtụtụ mba ndị dị n’Africa aka ọjọọ, ma e ji ọtụtụ mmiri na ọtụtụ ọdọ mmiri dị ka Ọdọ Mmiri Victoria, bụ́ ọdọ mmiri nke abụọ kasị buo ibu n’ụwa, gọzie Uganda. Akụkụ ebe ugwu Ọdọ Mmiri Victoria na-asọba n’Osimiri Naịl. Ka a sịkwa ihe mere Winston Churchill ji kpọọ ala a “pel Africa”!

“Pel” ahụ Na-egbukepụ Egbukepụ Taa

Otú ọ dị, ihe kasị adọrọ mmasị na Uganda bụ ndị bi na ya—ha nwere omume enyi, na-ele ọbịa, ma dịgasịa iche. Mba a ọtụtụ ndị bi na ya bụ “Ndị Kraịst” nwere ọtụtụ agbụrụ na omenala. Ọbụna taa, a pụrụ iji omenala na ejiji nke ndị a dịgasị iche mata ha.

Na nso nso a, ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị Uganda aṅawala ntị n’ozi ọma Bible banyere oge a ga-enwe udo na-adịgide adịgide n’ụwa nile. (Abụ Ọma 37:11; Mkpughe 21:4) Ọ rara ahụ́ izicha ndị nile bi ná mba a, bụ́ nke haruru ka Great Britain, ozi a.

Malite mgbe e mere Onyeàmà Jehova mbụ bi ebe ahụ raara onwe ya nye baptizim n’Ọdọ Mmiri Victoria n’afọ 1955, “onye nta” mesịrị nnọọ ghọọ otu puku n’afọ 1992. Kemgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà anọgidewo na-amụba. Nke a kwekọrọ n’okwu Chineke ji mesie anyị obi ike bụ́: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.”—Aịsaịa 60:22.

Imeri Nsogbu nke Asụsụ

Asụsụ Bekee bụ asụsụ bụ́ isi a na-asụ ná mba a, karịsịa n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụghị ya bụ asụsụ ala nna nke ihe ka ọtụtụ n’ụmụ amaala Uganda. N’ihi ya, iji zie ndị mmadụ ozi ọma, Ndịàmà na-ejikwa asụsụ ndị a kasị asụ ná mba a eme ihe. Nke a adịla mkpa n’ihi na ihe karịrị pasent 80 nke nde mmadụ 25 e nwere ná mba a bi n’ime ime obodo ma ọ bụ n’obodo ndị na-emepechaghị emepe bụ́ ebe ndị mmadụ na-eji asụsụ ala nna ha agwa ibe ha okwu. Izi ndị a na-asụ asụsụ dịgasị iche ozi ọma na igbo mkpa ime mmụọ ha chọrọ mgbalị dị ukwuu.

Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova agbalịala igbo mkpa ndị ahụ site n’izi ha ozi ọma n’asụsụ nke ha na site n’ibipụta akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ dị iche iche. N’alaka ụlọ ọrụ dị na Kampala, bụ́ isi obodo mba a, e nwere ìgwè dị iche iche na-asụgharị asụsụ anọ: Acholi, Lhukonzo, Luganda, na Runyankore. E wezụga nke ahụ, a na-enwe ọnụ ọgụgụ buru ibu ná mgbakọ Ndị Kraịst a na-eme n’asụsụ dị iche iche n’akụkụ nile nke mba a. Ọnụ ọgụgụ ahụ na-abụ okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova e nwere ná mba a. Nke ahụ na-egosi nnọọ na mgbalị nile a na-eme iji zie ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma so na-eme ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà e nwere ná mba a na-amụba n’ike n’ike. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ so akpata mmụba ahụ.

Ndị Ọsụ Ụzọ Na-ebute Ụzọ n’Ọrụ Ahụ

Ọgbakọ dị iche iche na-eji ọṅụ akwado mkpọsa na-ewe ọnwa atọ bụ́ nke a na-eme kwa afọ iji kwusaa ozi ọma n’ókèala ndị dịpụrụ adịpụ. (Ọrụ 16:9) Ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị na-eto eto bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, na-ebute ụzọ n’ọrụ a. Ha na-aga n’ime ime obodo, bụ́ ebe ndị bi na ha nwere ike bụrụ na ha anụtụbeghị ozi ọma.

E zigara Ndịàmà abụọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo ọnwa atọ na Bushenyi, bụ́ obere obodo nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Uganda. Ha sooro nanị otu Onyeàmà Jehova e nwere n’ógbè ahụ na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. N’ime otu ọnwa, ndị ọsụ ụzọ abụọ ahụ malitere iduziri mmadụ 40 ọmụmụ Bible, mmadụ 17 n’ime ha na-abịakwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ndị ọsụ ụzọ ahụ kọrọ, sị: “Ụfọdụ ndị anyị nyere broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? * bịara n’ụlọ anyị ka ụbọchị ole na ole gasịrị ma gosi anyị ebe ndị ha depụtara ọtụtụ azịza maka ajụjụ ndị dị na broshuọ ahụ. Ha chọrọ ịma ma hà zatara ajụjụ ndị ahụ.” Taa, e nwere otu ọgbakọ n’obodo ahụ, ọgbakọ ahụ nwekwara Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ya.

Ndị ọsụ ụzọ abụọ gara n’otu ókèala dị n’ebe ọdịda anyanwụ Uganda, bụ́ ebe a na-ekwusabeghị ozi ọma mbụ. Ha dere, sị: “Akpịrị eziokwu Bible na-akpọ ndị mmadụ nkụ n’ezie. N’ime ọnwa atọ anyị nọrọla ebe a, anyị amalitela ma duzie ọmụmụ Bible 86.” O teghị aka tupu e hiwe ìgwè ọmụmụ ihe nke Ndịàmà n’ógbè ahụ.

Ndị Ọzọ Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-arụ Ọrụ Ahụ

Ụfọdụ n’ime ndị ọsụ ụzọ ndị ahụ na-anụ ọkụ n’obi ejeela ozi ọtụtụ afọ. Tupu Patrick aghọọ Onyeàmà Jehova, ọ na-afụrụ ndị agha ụgbọelu nke onye ọchịchị Uganda bụ́ Idi Amin, opi. Ọnwa isii ka e mesịrị Patrick baptizim n’afọ 1983, ọ ghọrọ onye ozi oge nile. Taa, ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, na-eleta ọgbakọ dị iche iche ma na-agba ha ume.

E mere Margaret baptizim n’afọ 1962. N’agbanyeghị na ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ 80 ma na-arịa ọrịa úkwù bụ́ nke na-eme ka ịga ije na-ara ya ahụ́, ọ na-eji ihe dị ka awa 70 kwa ọnwa agwa ndị agbata obi ya banyere olileanya ya dabeere na Bible. Ọ na-edebe akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Bible na bench dị n’ihu ụlọ ya ma na-ezi ndị na-agafe ebe ahụ ga-achọ ige ntị n’ozi ọma banyere ụwa ọhụrụ nke udo, ozi ọma.

Simon, bụ́ onye ọrụ ugbo bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Uganda, anọwo na-achọ eziokwu ruo afọ 16. N’afọ 1995, ọ hụrụ ụfọdụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Ihe ndị ọ gụtara n’akwụkwọ ndị ahụ mere ka o nwee ọchịchọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe magburu onwe ya Jehova zubere maka ụwa. E nweghị Onyeàmà na Kamuli bụ́ ebe o bi, n’ihi ya, o gara Kampala, bụ́ nke dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri anọ site n’ebe ahụ, iji chọọ Ndịàmà. Taa, e nwere ọgbakọ n’obodo ya.

“Ụkwụ Eruola Anyị Ala”

Dị ka ọ dị n’ebe ndị ọzọ n’Africa, ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya ka okpukpe nwee ebe dị mma ha na-anọ efe ofufe. Nke a bụụrụ ụfọdụ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova nnukwu nsogbu, n’ihi na ha enweghị ego ha ga-eji wuo ezigbo Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọṅụ ụmụnna ahụ nwere ná ngwụsị afọ 1999 enweghị atụ, bụ́ mgbe a malitere ndokwa zuru ụwa ọnụ nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa. N’ime afọ ise sochirinụ, e wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ 40 na Uganda. Taa, ọ fọrọ nke nta ka ọgbakọ nile nwee ezigbo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha a na-ejighị oké ego wuo. Ihe ụmụnna ahụ ji owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ gwa ndị obodo ahụ bụ, “Ụkwụ eruola anyị ala.” Nke a enyewokwa aka mee ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà na-amụba.

Otu obere ọgbakọ nke dị n’ebe ugwu Uganda na-amụbu ihe n’okpuru osisi mango. Mgbe ha nwetara otu ibé ala, ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha biiri ọkụ ozugbo. Ndị ọrụ na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ gbakọtara aka ma malite iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ọrụ ahụ masịrị nnọọ otu onye bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama n’obodo ahụ. O nyere ọgbakọ ahụ ebe ọ na-adọba ụgbọala ya ka ha jiri ya na-amụ ihe ruo mgbe ha wuchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. O kwekwara ka otu n’ime ndị ọrụ afọ ofufo na-ewu ụlọ nzukọ ahụ duziwere ya ọmụmụ Bible. Ugbu a, ọ bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi e mere baptizim, obi dịkwa ya ụtọ ife Jehova n’ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ!

Mgbe a na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ndịda nke akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ, ọbụbụenyi, ịhụnanya, na ịrụkọ ọrụ ọnụ otu onye na-edo ụlọ hụrụ n’etiti ụmụnna masịrị ya nnọọ nke na o nyere onwe ya n’afọ ofufo inye aka n’ọrụ ahụ. Mgbe ọ fọrọ obere ka e wuchaa ya, o ji ọbụna otu abalị rụọ ọrụ iji hụ na ụmụnna ga-enwe ike iwucha Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ma rara ya nye n’ụtụtụ echi ya. O kwuru, sị: “Ọ bụ nanị unu bụ ndị hụrụ ibe ha n’anya, ọ bụghị nanị ikwu ya n’ọnụ.”

A Ka Pụrụ Inwe Mmụba, n’Agbanyeghị Nsogbu

Ozi a na-eje n’ókèala ndị ọhụrụ na Uganda na-eme ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọgide na-amụba, ọtụtụ ndị nwere mmasị na-abịakwa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ dị iche iche. Otú ọ dị, otu ihe na-enye ụmụnna nsogbu n’obi ugbu a bụ ọtụtụ ndị gbatara ọsọ ndụ na Uganda. Agha obodo a na-alụ ná mba ndị ha na Uganda gbara agbata obi emetụtawokwa ndị Jehova. Ndịàmà nọ n’ogige ndị gbatara ọsọ ndụ egosiwo nnọọ ntụkwasị obi pụrụ iche ha nwere n’ebe Jehova nọ. Otu onye bụ́bu onye ọchịchị n’otu mba ya na Uganda gbara agbata obi, bụ́ onye so kpagbuo Ndịàmà mgbe mba ya machibidoro ha iwu, chetara mgbe ọ bụ aka ji akụ̀. Mgbe ọ mụsịrị Bible n’otu n’ime ogige ndị gbatara ọsọ ndụ na Uganda ma ghọọ Onyeàmà, o kwuru, sị: “Inwe akụ̀ na ụba na ọkwá dị elu n’ụwa a abaghị ezi uru. Ọ bụ ezie na abụzi m ogbenye ma na-arịa ọrịa, ọ dịtụbeghị mgbe ndụ m dịrịla mma otú ọ dị ugbu a. Amaara m Jehova, obi dịkwa m ụtọ na m nwere ihe ùgwù nke ikpe ekpere. Enwere m olileanya siri ike maka ọdịnihu ma mara ihe mere anyị ji ata ahụhụ ugbu a. N’ihi ya, obi ruru m ala ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”

A na-ekwu na ọ bụrụ na ị rụnye osisi n’ala Uganda na-eme nri ná mgbede, na ọ ga-agbanye mkpọrọgwụ n’ụtụtụ echi ya. Otú ọnụ ọgụgụ Ndịàmà si amụba ná mba a na-egosi na ala a na-emepụtakwa ihe n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-ekele Jehova Chineke maka ikwe ka ọtụtụ ndị si ebe dị iche iche na Uganda mụta ihe banyere Alaeze ya. Jizọs ji ịdị oké ọnụ ahịa ya tụnyere “nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa.” Ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị bi na Uganda na-aghọta nke ahụ ugbu a.—Matiu 13:45, 46.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Map dị na peeji 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SUDAN

UGANDA

Osimiri Naịl

Kamuli

Tororo

Kampala

Bushenyi

Ọdọ Mmiri Victoria

KENYA

TANZANIA

RWANDA

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Atọ n’ime ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi e nwere n’ebe ahụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Patrick

[Foto dị na peeji nke 10]

Margaret

[Foto dị na peeji nke 10]

Simon

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mgbakọ distrikti e mere na Tororo

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Ihe osise dị n’azụ: © Uganda Tourist Board