Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Ezi Ihe Ọmụma

Ịchọta Ezi Ihe Ọmụma

Ịchọta Ezi Ihe Ọmụma

N’UHURUCHI December 18, 1810, ụgbọ mmiri Ndị Agha Mmiri Britain a na-akpọ HMS Pallas gahiere ụzọ. Ọ nọ na-aga n’ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Scotland. Oké ifufe nọ na-efe. Ọchịchịrị nke gbachiri ebe nile na snow nọ na-ada mere ka o siere ha ike ịhụ ìhè nke kwesịrị idute ha n’ebe ha ga-akwụsị n’enweghị nsogbu. Obi tọrọ ha nnọọ ụtọ mgbe ha mesịrị hụ ìhè ọkụ, ha kwọọrọ ụgbọ ha gawa ebe ahụ ha hụrụ ìhè ọkụ ahụ! Ọ dị nnọọ mwute na ebe ahụ ìhè ahụ ha hụrụ dị abụghị ebe dị mma ha kwesịrị ịkwụsị. Ihe ahụ ha hụrụ bụ ọkụ nke ndị nọ na-arụ ọrụ n’ụsọ oké osimiri mụnyere. Pallas ahụ sọrọ isi n’okwute ma kpọkasịa. Mmiri gbagburu mmadụ iri na otu nọ n’ụgbọ ahụ. Nke ahụ bụ nnọọ nnukwu ọdachi!

Ọ bụ ihie ụzọ kpataara Pallas ọdachi ahụ. Otú ọ dị, n’oge ndị ọzọ, ndị na-eji ụgbọ mmiri eme njem na-adaba ọbụna ná nsogbu ndị ka nke ahụ dakwasịrị Pallas—ha na-ahụ ìhè ọkụ ndị na-eduhie eduhie. Dị ka akwụkwọ bụ́ Wrecks, Wreckers and Rescuers si kwuo, ihe mere ndị mmadụ ji amụnye ọkụ ndị dị otú ahụ bụ iji rata ụgbọ mmiri n’ikperé mmiri okwute juru, ka ụgbọ ndị ahụ wee kpọkasịa, ha enwezie ike ịkwakọrọ ihe ndị dị n’ime ha.

‘Ihe Odide Dị Nsọ nke Pụrụ Iduga Gị ná Nzọpụta’

Ị pụrụ iche ihe ize ndụ ndị yiri ndị ahụ chere ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ihu ka ị na-achọ ihe ọmụma. Ị pụrụ inweta ihe ọmụma ndị na-eduhie eduhie, ma ọ bụkwanụ mmadụ amara ụma duhie gị. Nke ọ bụla n’ime ihe abụọ a pụrụ iwetara gị ọdachi. Gịnị ka ị pụrụ ime iji chebe onwe gị? Jide n’aka na ebe i si enweta ihe ọmụma bụ nke ezigbo ya nakwa nke e kwesịrị ịdabere na ya. Ruo ihe karịrị otu narị afọ na iri abụọ na ise, magazin a anọwo na-agbachitere Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible, dị ka ebe kachasịnụ a ga-adabere maka ịchọta ihe ọmụma n’ihi na ihe ndị dị na ya bụ “ihe odide dị nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ma duga gị ná nzọpụta.”—2 Timoti 3:15-17, New English Bible.

N’ezie, iji wee nwee obi ike na Bible na-enye ìhè a pụrụ ịdabere na ya, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ka i nyochaa ihe ndị e dere na ya iji chọpụta ma hà bụkwa eziokwu. (Abụ Ọma 119:105; Ilu 14:15) Alala azụ idegara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi iji nwetakwuo ihe ọmụma nke meworo ka ọtụtụ nde mmadụ kweta n’ezie na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke ka e ji dee Bible. Dị ka ihe atụ, gụọ broshuọ isiokwu ya bụ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile. * O nwere ihe ọmụma buru nnọọ ibu nke gosiri na Bible ziri ezi, na-ekwu eziokwu, ma na-egosi na ọ bụ ike mmụọ nsọ ka e ji dee ya.

Eziokwu Ndị Bụ́ Isi

Oleedị ụfọdụ n’ime eziokwu ndị bụ́ isi ndị dị ‘n’ihe odide ndị a dị nsọ’? Tụlee ihe atụ ndị na-esonụ.

E nwere nanị otu Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, onye bụkwa Onye Okike nke kere ihe nile. (Jenesis 1:1) Ihe mere anyị ji dị ndụ bụ “n’ihi na [Chineke] kere ihe nile” ma nye anyị ndụ. (Mkpughe 4:11) Ọ bụ nke a mere o ji kwesị ekwesị ka anyị fee nanị ya ofufe. Ọ bụ Onye Okike bụ Isi Iyi nke ihe ọmụma nile. (Abụ Ọma 36:9; Aịsaịa 30:20, 21; 48:17, 18) O nwere ihe bụ́ ezigbo aha ya nke ọ chọrọ ka anyị jiri na-eme ihe. (Ọpụpụ 3:15) Aha a e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị Hibru dee, nke a na-edepụtakwa ná mkpụrụ akwụkwọ ndị Bekee dị ka YHWH, pụtara ihe dị ka puku asaa n’ime Bible. E jiwo aha ahụ bụ́ “Jehova” na-edochi anya ya n’Igbo kemgbe ọtụtụ narị afọ.—Abụ Ọma 83:18.

Jehova kere ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa ebe a. O kenyere ụmụ mmadụ àgwà ndị yiri nke ya. O mere ka ha nwee nká na ikike nke ga-eme ka ha bie ndụ agwụghị agwụ na nke obi ụtọ n’ụwa. (Jenesis 1:26-28) Ọ dịtụghị mgbe o zubere ka ụwa bụrụ ebe ọ ga-anọ na-anwale ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị—ebe ọ ga-anọ na-akwadebe ha maka ibi ndụ dị ka ndị mmụọ n’eluigwe, dị nnọọ ka à ga-asị na ọ bụ nanị n’eluigwe ka ha na Chineke pụrụ imekọ ihe.

O nweghị ihe ọjọọ dị n’ime ụmụ mmadụ mgbe Chineke kere ha. Ọ bụ nanị mgbe ụfọdụ n’ime ndị Chineke kere—ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ—jiri nnwere onwe ime nhọrọ ha nwere mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma nupụrụ Chineke isi ka ihe ọjọọ malitere ịdị. (Deuterọnọmi 32:5) Nne na nna anyị mbụ weghaara ikike nke ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:17; 3:1-5) Nke ahụ wetaara ụmụ mmadụ ọnwụ. (Jenesis 3:19; Ndị Rom 5:12) Jehova kpebiri ikwe ka ajọ omume dịrị ruo nwa oge iji nwee ike idozi ihe iseokwu nke nnupụisi ahụ kpatara. Ma nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ agbanwebeghị. (Aịsaịa 45:18) Ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ka ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha.—Matiu 6:10; Mkpughe 21:1-5.

Jizọs Kraịst abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile kama ọ bụ Ọkpara Chineke. Jizọs Kraịst n’onwe ya kụziiri ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọ dịtụghị mgbe o kwuru na ya na Chineke ha. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.”—Jọn 14:28.

Jizọs keere òkè dị mkpa ná mmezu nke nzube Chineke. Chineke zitere ya “dị ka ìhè n’ime ụwa, ka onye ọ bụla nke na-etinye okwukwe na [ya] wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.” (Jọn 12:46) Dị ka Pita onyeozi si kwuo, “nzọpụta adịghị n’onye ọ bụla ọzọ.” (Ọrụ 4:12) Nke a bụ eziokwu n’ihi na nzọpụta anyị dabeere n’ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Kraịst. (1 Pita 1:18, 19) Jizọs Kraịst nyere ndụ ya dị ka àjà mgbapụta iji gbapụta ụmụ mmadụ site ná mmehie nke nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, wetaara ụmụ mmadụ. (Matiu 20:28; 1 Timoti 2:6) Chineke jikwara Jizọs Kraịst mee ihe iji kpugheere anyị uche Ya na nzube Ya.—Jọn 8:12, 32, 46, 47; 14:6; Ọrụ 26:23.

Chineke guzobere Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị eluigwe, nke Jizọs Kraịst na ndị a họọrọ site n’ụmụ mmadụ mejupụtara. Ozi a pụtara nnọọ ọtụtụ ugboro n’ime Bible. Chineke nyefere ọchịchị a ọrụ nke ịhụ na uche Ya mere n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe. (Matiu 6:10) Chineke ezubeghị ná mbụ na mmadụ ọ bụla ga-aga eluigwe. Ụwa bụ ebe obibi ha. Ọ bụ mgbe ụmụ mmadụ mere mmehie ka Chineke zubere ihe ọhụrụ. O mere ndokwa ka e si “n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla” họta ndị ga-eso Kraịst ‘chịa dị ka ndị eze’ n’ọchịchị eluigwe. (Mkpughe 5:9, 10) N’oge na-adịghị anya, ọchịchị Alaeze ahụ ‘ga-etipịa ịchịisi nile nke ụmụ mmadụ, bụ́ nke wetawooro ụmụ mmadụ nhụjuanya na ihe mgbu, ma mee ka ha gwụsịa.’—Daniel 2:44.

Mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Eziokwu a bụ́ isi nke Bible mere ka ihe banyere ụmụ mmadụ na ọdịnihu ha doo nnọọ anya. O wepụkwara nghọtahie na ihe ndị na-abụghị eziokwu bụ́ ndị nọworo na-agbagwoju ụmụ mmadụ anya banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Akwụkwọ mbụ nke Bible na-agwa anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Ị̀ ghọtara ihe nke ahụ pụtara? Mkpụrụ obi abụghị ihe dị inyoghi inyoghi nke dị n’ahụ́ mmadụ. Mmadụ enweghị mkpụrụ obi. Mmadụ bụ mkpụrụ obi—ihe mejupụtara ya bụ “ájá sitere n’ala” na ikike ndụ nke Chineke nyere. Mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụ mkpụrụ obi nwụrụ.—Jenesis 3:19; Eklisiastis 9:5, 10.

A pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ. Mgbe obere oge Chineke kwere ka ajọ omume dịrị ga-agafe, “ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta, ndị mere ezi ihe gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) A ga-esite ná mbilite n’ọnwụ mee ka ndị mmadụ dịghachi ndụ ma biri n’ụwa paradaịs, bụ́ ihe Chineke zubeburu maka ụmụ mmadụ.

Jiri Nlezianya Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị

Ị̀ hụlanụ otú ịma banyere eziokwu ndị a bụ́ isi pụrụ isi nyere gị aka! N’oge ndị a pụrụ iche nke na-agba aghara, ihe ọmụma dị otú a pụrụ ichebe gị pụọ n’ihe “a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha” bụ́ nke Setan bụ́ Ekwensu na-agbasa. Ọ na-eme ka ọ̀ bụ “mmụọ ozi nke ìhè,” ndị na-ejere ya ozi ana-emekwa ka ha bụ́ “ndị ozi nke ezi omume.” (1 Timoti 6:20; 2 Ndị Kọrint 11:13-15) Ezi ihe ọmụma nke Bible pụrụ ichebe gị pụọ n’ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma bụ́ nke dabeere na nkà ihe ọmụma nke “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” nke ụwa bụ́ ndị ‘jụrụ okwu Jehova.’—Matiu 11:25; Jeremaịa 8:9.

N’ihi ozizi ndị na-eduhie eduhie na nkà ihe ọmụma ndị e nwere n’oge ya, Jọn onyeozi dụrụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ ọdụ, sị: “Ekwerela okwu nile sitere ná mkpali nke mmụọ.” O kwuru, sị: “Nwaleenụ okwu ndị sitere ná mkpali nke mmụọ ịhụ ma hà sitere na Chineke.” (1 Jọn 4:1) Legodị ihe atụ a. Ọ bụrụ na ị natara ozi nke pụrụ ịgbanwe ndụ gị, ị̀ ga-ekwere ya ozugbo e ziri gị ya nanị n’ihi na o yiri ka ọ̀ bụ onye ị tụkwasịrị obi ziri gị ya? Ọ dịghị ma ọlị. Ị ga-enyocha ma ọ̀ bụkwa onye ahụ i chere na ọ bụ ya ziteere gị ozi ahụ ziri ya ma tụlee ihe ozi ahụ ga-apụtara gị tupu gị emee ihe e ziri gị.

Chineke nyere gị ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke eziokwu ndị bụ́ isi dị na ya iji mee ka o kwe gị omume ime otú ahụ—ka i ‘wee nwapụta’ ma ìhè na-ezi gị ụzọ ọ̀ bụkwa nke ezigbo ya. (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) A jara ndị nwere obi sara mbara na narị afọ mbụ mma maka iji “nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị” iji jide n’aka na ihe ha na-amụta bụ eziokwu. (Ọrụ 17:11) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ka Bible, dị ka “oriọna na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị,” zi gị ezigbo ụzọ. (2 Pita 1:19-21) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-achọta “ihe ọmụma Chineke,” bụ́ nke na-eme ka mmadụ mara ihe.—Ilu 2:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 4]

Okwu Chineke dị ka oriọna

[Foto dị na peeji nke 5]

Gịnị bụ aha Chineke?

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọnọdụ dị aṅaa ka ụmụ mmadụ ga-anọ na ya n’ọdịnihu?

[Foto dị na peeji nke 6]

Jizọs ọ̀ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile?

[Foto dị na peeji nke 6]

Olee ebe ndị nwụrụ anwụ nọ?

[Foto dị na peeji nke 7]

Mbilite n’ọnwụ bụ otu n’ime eziokwu ndị bụ́ isi Bible na-akụzi