Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Na-atọ Ha Ụtọ Ime Uche Chineke

Ọ Na-atọ Ha Ụtọ Ime Uche Chineke

Ọ Na-atọ Ha Ụtọ Ime Uche Chineke

JIZỌS setịpụụrụ Ndị Kraịst nile ihe nlereanya site n’ikpegara Nna ya ekpere, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ọtụtụ nde ndị ohu Chineke taa na-ekwughachi okwu ahụ Jizọs ji obi umeala kwuo, bụ́ nke na-egosi na ọ na-edo onwe ya n’okpuru Jehova. Ụmụ akwụkwọ iri ise na abụọ nke klas nke otu narị na iri abụọ nke Watchtower Bible School of Gilead, so ná ndị ji obi umeala na-ekwughachi okwu ahụ Jizọs kwuru. Na March 11, 2006, ndị klas ahụ na-agụsị akwụkwọ nwere nnọọ obi ụtọ na ha gaje ime uche Chineke n’ala dịgasị iche iche, ọbụna n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ha pụrụ iche ihu.

Olee ihe kpaliri ndị a na-agụsị akwụkwọ ikwe ka uche Jehova na-eduzi ihe nile ha na-eme ná ndụ? Chris na Leslie, bụ́ di na nwunye e kenyere ije ozi ala ọzọ na Bolivia, kwuru ihe kpaliri ha ime nke a, ha sịrị: “Ebe ọ bụ na anyị ajụwo onwe anyị, anyị chọrọ iwepụta onwe anyị ime ihe ọ bụla nzukọ Jehova sịrị anyị mee.” (Mak 8:34) Jason na Chere, bụ́ ndị e kenyere ije ozi n’Albania, gbakwụnyere, sị: “Ọrụ ọ bụla nzukọ Jehova kenyere anyị nwere ihe ịma aka nke ya. Otú ọ dị, anyị achọpụtawo na Jehova ruru eru ka anyị tụkwasị ya nnọọ obi.”

A Gbara Ha Ume Ime Uche Jehova

George Smith, bụ́ onye òtù ezinụlọ Betel, nke na-eje ozi ná Ngalaba Na-ese Ihe, kpere ekpere e ji malite ihe omume ahụ. Ọ bụ Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ma bụrụ onyeisi oche nke ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ, nabatara ndị nile bịaranụ. Ndị ọbịa si mba iri abụọ na atọ gara n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, maka ihe omume a na-enye ọṅụ. Nwanna Lett gwara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ na ha gaje ịrụzu “ihe dị nnọọ ike.” Ọ dọọrọ uche gaa ‘n’ihe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike’—ndị dị ka ozizi ụgha—bụ́ ndị ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a ga-enwe ike ikpu ihu site n’ike nke Akwụkwọ Nsọ. (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5) O mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Unu ga-enwe nnọọ ọṅụ na Jehova ji unu na-ekpu ihe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’obi ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị unu ga-achọta n’ozi unu ihu!”

Harold Jackson, bụ́ onye na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, kwuru okwu n’isiokwu bụ́: “Ihe Ole na Ole A Ga-eburu n’Uche.” O kwuru na ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a ekwesịghị ichefu ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’ (Matiu 6:33) Ha kwesịrị icheta na “ịhụnanya na-ewuli elu” nakwa na ọ bụ ya bụ isi ihe na-adịghị ada ada nke na-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma. (1 Ndị Kọrịnt 8:1) O kwuru, sị: “Meenụ ka ịhụnanya na-achịkwa otú unu si emeso ndị ọzọ ihe.”

Mgbe nke a gasịrị, Geoffrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye jere ozi dị ka onye ozi ala ọzọ site n’afọ 1979 ruo 2003, jụrụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị, “Ị̀ Na-eme Ihe Ruuru Gị?” O mesiri ike na ọ dị ha mkpa ile onwe ha na ozi ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesi. Ọ bụ ọrụ dịịrị Ndị Kraịst ịrụsi ọrụ ike n’ịkụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ na ịkwọsa ya mmiri. Otú ọ dị, ọ bụzi Jehova ka ọ dịịrị ime ka ọ na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ebe ọ bụ na ọ bụ ‘Chineke na-eme ka ọ na-eto.’ (1 Ndị Kọrịnt 3:6-9) Nwanna Jackson gbakwunyere, sị: “Jehova na-atụ anya ka unu gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ. Ma olee ọrụ kasịnụ unu nwere? Ọ bụ ịhụ Jehova na ndị ahụ unu gaje ijere ozi n’anya.”

Onye nkụzi Gilead, bụ́ Lawrence Bowen kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Maranụ Otú Unu Kwesịrị Isi Na-akpa Àgwà.” O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na Jehova duziri ụmụ Izrel n’ụzọ ọrụ ebube ma chebe ha n’ịkpa. (Ọpụpụ 13:21, 22) Ruo n’ókè ụfọdụ, ọ na-eji ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị bụ́ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu,” na-echebe anyị. (1 Timoti 3:14, 15) Ọ dị mkpa ka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a kwadosie eziokwu Bible ike, bụ́ nke na-eduzi ma na-echebe ndị dị umeala n’obi.

Onye nkụzi Gilead ọzọ aha ya bụ́ Wallace Liverance, gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha ghara ichefu okwu Chineke si “n’azụ” na-agwa ha. Chineke si n’azụ na-agwa anyị okwu n’echiche bụ́ na e dezuru Bible kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke si n’azụ igwe atụrụ na-akpọ oku, Jehova nọ ndị ya n’azụ, na-eduzi ha site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Aịsaịa 30:21; Matiu 24:45-47) Ụlọ Akwụkwọ Gilead nyeere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka igosipụtakwu ekele ha nwere maka òtù ohu ahụ. Ọ bụ “ohu” ahụ wepụtadịrị New World Translation of the Holy Scriptures. Ọkà okwu ahụ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume, sị: “Jirinụ akụ̀ a e chekwara echekwa, nke bụ́ ihe ọmụma, kụziere ndị ọzọ ihe.”—Matiu 13:52.

Ime Uche Jehova n’Ozi Ubi

N’isiokwu bụ́ ‘Iji Ọchịchọ Siri Ike Na-akpọsa Ozi Ọma Ahụ,’ Mark Noumair bụ́ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilead kọrọ ụfọdụ ahụmahụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ nwetara n’ozi ubi n’oge ha na-aga akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. (Ndị Rom 1:15) Ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ kpughere n’ezie na ha egosiwo na ha nwere nnọọ ọchịchọ siri ike ikwusa ozi ọma n’oge ọ bụla.

Ajụjụ ọnụ Kenneth Flodin gbara ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị atọ, bụ́ ndị na-eje ozi ugbu a na United States, gbakwuru ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume. Richard Keller na Alejandro Lacayo, bụ́ ndị jere ozi n’oge ndị gara aga n’Ebe Ndịda na n’Etiti Kọntinent America, kọrọ otú ha si nagide ọnwụnwa dị iche iche ma kọọ ụfọdụ ngọzi ndị ha nwetara mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ. Moacir Felisbino kọrọ banyere ọzụzụ o nwetara ka o so ndị ozi ala ọzọ na-arụkọ ọrụ na Brazil, bụ́ ebe ọ nọrọ tolite.

David Schafer gbara Robert Jones, Woodworth Mills na Christopher Slay, bụ́ ndị ozi ala ọzọ nwere ahụmahụ, ajụjụ ọnụ.Ụmụnna atọ a kọrọ otú ha si nwee obi ike n’ebe Jehova nọ mgbe ihe siiri ha ike. Ha mesiri ụmụ akwụkwọ ahụ obi ike na ọzụzụ a nzukọ Jehova nyeworo ha akwadebewo ha nnọọ nke ọma maka ije ozi ala ọzọ ha. Nwanna Mills chịkọtara okwu ya site n’ikwu, sị: “Ihe nyeere m aka karịsịa abụghị ihe ndị a kụziri na Gilead, kama ọ bụ ihe ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri m banyere umeala n’obi na ịhụnanya.”

Ọ bụ Guy Pierce onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ, “Ọ Dịghị Mgbe Jehova Ga-agha Agha.” Adam emezughị ihe a chọrọ ya n’aka, ma nke ahụ ọ̀ pụtara na Chineke na-agha agha? Dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu, Jehova ò kere Adam dị ka onye na-ezughị okè? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na “Chineke mere mmadụ ka o zie ezie.” (Eklisiastis 7:29) Ọkà okwu ahụ kwuru na otú Jizọs siri guzosie ike n’ihe n’ule kasịnụ e letụrụla mmadụ n’ụwa gosiri na “Adam enweghị ihe ọ bụla ziri ezi ọ ga-ekwu mere o ji daa.” Ule e lere Adam n’ogige Iden ma ọ̀ ga-erube isi enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ule ahụ Jizọs meriri. N’agbanyeghị nke ahụ, Adam dara. Ka o sina dị, ọ dịghị mgbe Jehova ga-agha agha. Nzube ya ga-emezurịrị. (Aịsaịa 55:11) Nwanna Pierce gwara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ, sị: “Unu nwere ihe ùgwù nke iji mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà unu sọpụrụ Jehova. Ka Jehova nọnyere onye ọ bụla n’ime unu n’ebe ọ bụla unu ga-anọ na-ejere ya ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ.”

Mgbe Nwanna Lett, bụ́ onyeisi oche nke usoro ihe omume ahụ gụpụtasịrị ozi ekele si n’alaka ụlọ ọrụ dịgasị iche iche nke Ndịàmà Jehova, o nyeziri ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ diplọma ha na ebe e kenyere ha ọrụ. Vernon Wisegarver, onye jeteworo ozi aka n’ezinụlọ Betel, kpere ekpere mmechi.

Puku mmadụ isii na narị asatọ na iri asaa na abụọ bịara ihe omume ahụ kwuru na ihe omume ahụ emewo ka ha nweghachi ume ọhụrụ ime uche Chineke. (Abụ Ọma 40:8) Andrew na Anna, bụ́ ndị so ná ndị a na-agụsị akwụkwọ kwuru, sị: “Anyị raara ndụ anyị nye Jehova. Anyị kwere Jehova nkwa na anyị ga-eme ihe ọ bụla ọ sịrị anyị mee. Ugbu a, Jehova asịwo anyị gaa Cameroon nke dị n’Africa.” Ha na ụmụ klas ha ndị ọzọ na-agụsị akwụkwọ dị njikere ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha rụzuo ọrụ ha ma nwee afọ ojuju. Ee, ọ na-atọ ha ụtọ ime uche Chineke.

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 20

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 52

Nkezi afọ ndụ: 35.7

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 18.3

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 14.5

[Foto dị na peeji nke 18]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Wright, S.; Suárez, B.; Croisant, B.; Davenport, L. (2) Johnson, A.; Ali, C.; Cady, K.; Guerrero, P.; Ases, A. (3) Ortiz, L.; Lyall, K.; Uzeta, M.; Perez, R.; Backus, K.; Caterina, C. (4) Palmer, B.; Loving, D.; Macdonough, J.; Bostock, D.; Benetatos, L. (5) Jasicki, M.; Sarafianos, E.; Stelter, C.; Vaira, R.; Woon, J.; Prentice, K. (6) Davenport, H.; Croisant, H.; Perez, M.; Vaira, E.; Suárez, A.; Caterina, I.; Wright, C. (7) Cady, K.; Macdonough, J.; Ortiz, M.; Woon, J.; Ali, J.; Ases, M. (8) Sarafianos, G.; Lyall, D.; Uzeta, C.; Stelter, P.; Prentice, G.; Johnson, A.; Benetatos, C. (9) Palmer, J.; Jasicki, W.; Backus, J.; Bostock, S.; Guerrero, J. M.; Loving, S.