Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ A Na-achọ Ihe Ọmụma

Ọchịchọ A Na-achọ Ihe Ọmụma

Ọchịchọ A Na-achọ Ihe Ọmụma

LAURA FERMI, bụ́ nwunye onye ọkà n’ihe ọmụmụ physics a ma ama aha ya bụ Enrico Fermi, kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe onye na-amaghị ihe na-aganụ ga-aka onye maaranụ mma.” Ụfọdụ nwere ike ha agaghị ekweta n’ihe a o kwuru, na-asị na ihe mmadụ na-amaghị anaghị egbu ya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kwetara ihe ahụ nwunye Fermi kwuru, ọ bụghị nanị ma e kwuwe ihe banyere sayensị kamakwa n’ihe nile ọzọ a na-eme ná ndụ. Ruo ọtụtụ narị afọ, amaghị nke a na-akọ, ya bụ, amaghị eziokwu ahụ, emeela ka ọtụtụ mmadụ bụrụ iti, mee ka ha ghara ịma nke bụ́ omume ọma na nke bụ́ omume ọjọọ, meekwa ka ha ghara ime ihe Chineke na-achọ.—Ndị Efesọs 4:18.

Ọ bụ ya mere ndị na-eche echiche ji na-achọ ihe ọmụma. Ha chọrọ ịma ihe mere anyị ji dịrị ndụ na ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu. Nke a edugawo ha n’ebe dịgasị iche iche. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha ná nkenke.

À Ga-achọta Ya n’Okpukpe?

Dị ka akụkọ ọdịnala okpukpe Buddha si kwuo, ahụhụ ndị mmadụ na-ata na ọnwụ ndị mmadụ na-anwụ nyere nnọọ Siddhārtha Gautama, bụ́ onye hiwere okpukpe Buddha, nsogbu n’obi. Ọ gwara ndị nkụzi okpukpe Hindu ka ha nyere ya aka chọta “ụzọ nke eziokwu.” Ụfọdụ ndị nkụzi ahụ kwuru ka ndị mmadụ na-emega ahụ́ n’ụzọ siri ike, bụ́ nke a na-akpọ yoga, nakwa ka ha na-atatụ ndụ ha ahụhụ. Gautama mechaziri họrọ ịnọpụrụ nnọọ onwe ya iche na-atụgharị uche dị ka ụzọ ọ ga-esi chọta ezi ihe ọmụma.

Ndị ọzọ aṅụwo ọgwụ ndị na-akpaghasị uche na-ele ha anya dị ka ihe ga-enyere ha aka ịchọta ihe ọmụma. Dị ka ihe atụ, taa, ndị okpukpe bụ́ Native American Church na-akọwa peyote—ahịhịa a na-akpọ cactus nke nwere ihe ndị na-eme ka mmadụ na-anụ ma na-ahụ ihe ndị na-adịghị adị—dị ka “ihe na-ekpughe ihe ọmụma zoro ezo.”

Na narị afọ nke 18, otu ọkà ihe ọmụma bụ́ onye France aha ya bụ Jean-Jacques Rousseau kwetara na Chineke ga-ekpughere onye ọ bụla ji obi ya na-achọ ya ihe ọmụma. Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Ọ bụ site ná mmadụ ịdị na-egere “ihe Chineke na-agwa obi ya.” Rousseau kwuziri na otú mmadụ si ele ihe anya, ya bụ, ihe obi mmadụ na akọnuche ya na-agwa ya, ga-aghọzi “ezigbo ihe nduzi nke ga-enyere mmadụ aka ịchọta ihe ọmụma.” —History of Western Philosophy.

À Ga-achọta Ya n’Ikike Iche Echiche Mmadụ?

Ọtụtụ n’ime ndị dịrị ndụ n’oge Rousseau ekweghị nnọọ na a ga-achọta ezi ihe ọmụma n’okpukpe. Dị ka ihe atụ, onye France ibe ya bụ́ Voltaire, chere na kama okpukpe ime ka ndị mmadụ nweta ihe ọmụma na ọ bụ ya bụ ihe bụ́ isi kpatara amaghị nke a na-akọ, nkwenkwe ụgha, na ekweghị ibe nọrọ nke dịrị na Europe n’oge ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kpọrọ Oge Ụwa Nọ n’Ìsì bụ́ nke dịrị ruo ọtụtụ narị afọ.

Voltaire sonyeere otu òtù dị na Europe bụ́ nke a maara dị ka Mmepeanya bụ́ nke kwenyesiri ike na ikike echiche mmadụ bụ ụzọ e si enweta ihe ọmụma. Ndị òtù a nwere echiche ndị Grik oge ochie—nke bụ́ na ikike iche echiche mmadụ na nnyocha sayensị bụ ụzọ ndị e si achọta ezi ihe ọmụma. Bernard de Fontenelle, bụ́ onye ọzọ so n’òtù ahụ chere na ikike iche echiche mmadụ ga-eduga ụmụ mmadụ “n’otu narị afọ bụ́ nke ndị nọ na ya ga-anọgide na-enweta ihe ọmụma ruo mgbe ihe ọmụma ha nwere ga-akarị nke e nwere na narị afọ ndị gara aga.”—Encyclopædia Britannica.

Echiche ndị a bụ ụfọdụ n’ime echiche ndị dịrịtara iche e nwere banyere otú e si achọta ihe ọmụma. È nwere nnọọ “ezigbo nduzi” nke ga-eduzi anyị ka anyị na-achọ eziokwu? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu banyere ụzọ e si achọta ihe ọmụma nke a pụrụ ịdabere na ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Gautama (Buddha), Rousseau, na Voltaire chọrọ ihe ọmụma n’ebe dịgasị iche iche