Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Mụrụ Ha ná Mba Chineke Họọrọ

A Mụrụ Ha ná Mba Chineke Họọrọ

A Mụrụ Ha ná Mba Chineke Họọrọ

“Ọ bụ gị ka Jehova, bụ́ Chineke gị họpụtaworo ịbụrụ Ya ihe nke aka Ya.”—DEUTERỌNỌMI 7:6.

1, 2. Ọrụ ndị dị aṅaa dị ike ka Jehova rụụrụ ndị ya, oleekwa ọgbụgba ndụ ya na ha gbara?

NA 1513 T.O.A., Jehova na ndị ohu ya nọ n’elu ala malitere inwe mmekọrịta ọhụrụ. N’afọ ahụ, o menyere otu onye ọchịchị ụwa ihere ma napụta ụmụ Izrel n’ohu. Ihe a o meere ha mere ka ọ ghọọ Onye nzọpụta ha na Onye nwe ha. Tupu Chineke emee nke ahụ, ọ gwara Mozis, sị: “Sị ụmụ Izrel, Mụ onwe m bụ Jehova, M ga-emekwa ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndị Ijipt pụọ, M ga-anapụtakwa unu n’ofufe ha, werekwa ogwe aka e setịrị esetị, werekwa ikpe ukwu dị iche iche, gbapụta unu: M ga-ewerekwa unu n’Onwe m ka unu bụrụ otu ndị, M ga-abụkwara unu Chineke.”—Ọpụpụ 6:6, 7; 15:1–7, 11.

2 Ndị Izrel na Chineke ha bụ́ Jehova gbara ndụ obere oge ka ha hapụsịrị Ijipt. Kama iso nanị ndị mmadụ n’otu n’otu, ezinụlọ dị iche iche, ma ọ bụ ọnụmara dị iche iche na-emekọ ihe, Jehova ga-enwezi ndị a haziri ahazi, otu mba, ha na ya ga na-emekọ ihe n’ụwa. (Ọpụpụ 19:5, 6; 24:7) O nyere ndị ya iwu nke chịkwara ihe ndị ha na-eme ná ndụ. Ihe kasịkwa mkpa iwu ahụ chịkwara bụ otú ha si fee ofufe. Mozis gwara ha, sị: “Olee mba ukwu dị, nke nwere chi dị ya nso dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị, si dị n’ihe nile anyị kpọkuworo Ya? Olee mba ukwu dịkwa, nke nwere ụkpụrụ na ikpe ziri ezi dị ka iwu a nile, nke Mụ onwe m na-etinye n’ihu unu taa?”—Deuterọnọmi 4:7, 8.

Ndị A Mụrụ ná Mba Bụ́ Ndị Àmà

3, 4. Olee ihe dị mkpa mere e ji guzobe mba Izrel?

3 Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Jehova si n’ọnụ Aịzaịa onye amụma chetara ụmụ Izrel otu ihe dị mkpa mere o ji guzobe mba ha. Aịzaịa kwuru, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye keworo gị, Jekọb, Nke kpụwokwara gị, Izrel: Atụla egwu, n’ihi na agbapụtawo m gị; akpọwo m gị n’aha gị, nke m ka ị bụ. N’ihi na Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke gị, na Onye Nsọ nke Izrel, na onye nzọpụta gị . . . mee ka ụmụ m ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, gị meekwa ka ụmụ m ndị inyom si ná nsọtụ ụwa bịa; onye ọ bụla nke a na-akpọ n’aha m, nke M kewokwara nye nsọpụrụ m; akpụwo m ya; ee, emewo m ya. Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara . . . ndị M kpụworo nye Onwe m, akụkọ otuto m ka ha ga-akọ.”—Aịsaịa 43:1, 3, 6, 7, 10, 21.

4 Dị ka ndị a kpọkwasịrị aha Jehova, ụmụ Izrel ga-agbara mba dị iche iche àmà banyere ọbụbụeze Jehova. Ha ga-abụ ndị ‘e kere maka nsọpụrụ Jehova.’ Ha ‘ga-akọ akụkọ otuto Jehova,’ kọọ banyere ihe ndị dị ebube o mere iji napụta ha, ha ga-esikwa otú ahụ too aha ya dị nsọ. Igbu ya na nkenke, ha ga-aghọ mba bụ́ ndị àmà Jehova.

5. N’echiche dị aṅaa ka Izrel bụ mba a raara nye Jehova?

5 Na narị afọ nke iri na otu tupu oge anyị, Eze Solomọn kwuru na Jehova si n’etiti mba ndị ọzọ kewapụta Izrel. Mgbe ọ na-ekpegara Jehova ekpere, o kwuru, sị: “Gị onwe gị kewapụtara ha n’etiti ndị nile nke ụwa, ịbụrụ Gị ihe nketa.” (1 Ndị Eze 8:53) Ndị Izrel n’otu n’otu sokwa Jehova nwee mmekọrịta pụrụ iche. Tupu oge Solomọn, Mozis gwara ha, sị: “Unu onwe unu bụụrụ Jehova, bụ́ Chineke unu, ụmụ . . . ndị nsọ ka [unu] bụụrụ Jehova, bụ́ Chineke [unu].” (Deuterọnọmi 14:1, 2) N’ihi nke a, ọ dịghị ụmụaka bụ́ ndị Izrel mkpa ịrara ndụ ha nye Jehova. A mụrụ ha n’etiti ndị a raara nye Chineke. (Abụ Ọma 79:13; 95:7) N’ihi ọgbụgba ndụ Jehova na Izrel gbara, a kụziiri ọgbọ ọ bụla nke Izrel iwu Jehova, iwu jikwa ha idebe ya.—Deuterọnọmi 11:18, 19.

Ha Nweere Onwe Ha Ịhọrọ Ihe Ha Ga-eme

6. Olee ihe ndị e chere onye Izrel ọ bụla n’ihu ịhọrọ?

6 Ọ bụ ezie na a mụrụ ụmụ Izrel ná mba a raara nye Jehova, onye ọ bụla n’ime ha aghaghị ikpebi n’onwe ya ma ọ̀ ga-ejere Chineke ozi ma ọ bụ na ọ gaghị ejere ya. Tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis gwara ha, sị: “Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya: n’ihi na Ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị: ka i wee biri n’elu ala ahụ nke Jehova ṅụụrụ nna gị ha iyi, bụ́ Ebreham, na Aịzik, na Jekọb, inye ha.” (Deuterọnọmi 30:19, 20) N’ihi nke a, ụmụ Izrel n’otu n’otu ga-eji aka ha họrọ ma hà ga-ahụ Jehova n’anya, gee ntị n’olu ya, ma rapara n’ahụ́ ya ma ọ bụ na ha agaghị eme otú ahụ. Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel nweere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme, ha ga-eji isi ha buru ihe ọ bụla si n’ihe ha họọrọ ime pụta.—Deuterọnọmi 30:16-18.

7. Gịnị mere mgbe ndị ọgbọ Jọshụa nwụchara?

7 Anyị na-ahụ ajọ ihe ndị na-esi n’ekwesịghị ntụkwasị obi apụta nakwa ezi ihe ndị na-esi n’ikwesị ntụkwasị obi apụta site n’ihe mere n’oge Ndị Ikpe. Obere oge tupu oge Ndị Ikpe, ụmụ Izrel gbasoro ezi ihe nlereanya nke Jọshụa, a gọzikwara ha. “Ndị Izrel wee fee Jehova ofufe ụbọchị nile nke Jọshụa, na ụbọchị nile nke ndị okenye ndị e mere ka ụbọchị ha dị anya ka Jọshụa nwụsịrị, ndị hụrụ omume ukwu nile nke Jehova, nke O meere Izrel.” Otú ọ dị, ka oge gatụrụ ka Jọshụa nwụsịrị, “ọgbọ ọzọ wee bilie ịnọchi ha, ndị na-amaghị Jehova, ha amaghịkwa omume nke O meere Izrel. Ụmụ Izrel wee mee ihe ọjọọ n’anya Jehova.” (Ndị Ikpe 2:7, 10, 11) O yiri ka ọgbọ a ọhụrụ nke na-enwechaghị ahụmahụ ejighị ihe nketa ha nke iso ná ndị a raara nye Jehova, bụ́ ndị Chineke ha bụ́ Jehova rụwooro ọtụtụ ọrụ dị ike n’oge gara aga, kpọrọ ihe.—Abụ Ọma 78:3-7, 10, 11.

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nrara A Raara Ha Nye Jehova

8, 9. (a) Ndokwa dị aṅaa nke e mere n’Izrel mere ka ụmụ Izrel nwee ohere ime ihe gosiri na a raara ha nye Jehova? (b) Olee ihe ndị ji ọchịchọ obi ha nye onyinye nwetara?

8 Jehova nyere ndị ya ihe ga-enyere ha aka ibi ndụ dị ka mba a raara nye ya. Dị ka ihe atụ, n’Iwu ya, e depụtara àjà dị iche iche ndị a ga na-achụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ụmụ Izrel ga-achụrịrị, ebe ndị ọzọ bụ ndị ha ga-achụ ma ha chọọ. (Ndị Hibru 8:3) Àjà ndị a gụnyere àjà nsure ọkụ, onyinye ịnata ihu ọma, na àjà udo bụ́ ndị a na-eji ọchịchị obi achụ—ha bụ onyinye ndị e nyere Jehova iji nweta ihu ọma ya na iji kelee ya ekele.—Levitikọs 7:11-13.

9 Àjà ndị ahụ e ji ọchịchọ obi chụọ masịrị Jehova. E kwuru na àjà nsure ọkụ na onyinye ịnata ihu ọma bụ “ihe ísì ụtọ a na-achụrụ Jehova.” (Levitikọs 1:9; 2:2) Mgbe a na-achụ àjà udo, a na-awụsịrị Jehova ọbara nke anụmanụ e ji chụọ àjà ma nyekwa ya abụba ya. Onye nchụàjà na onye wetara àjà ahụ na-erizi anụ ahụ. N’ụzọ dị otú a, ọ na-abụ nri ihe atụ nke na-egosi na mmadụ na Jehova dị ná mma. Iwu ahụ kwuru, sị: “Ma mgbe unu ga-achụrụ Jehova àjà nke àjà udo, unu ga-achụ ya ka unu wee bụrụ ihe na-atọ ụtọ.” (Levitikọs 19:5) Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel nile bụ ndị a raara nye Jehova n’ihi na a mụrụ ha ná mba a raara nye Jehova, ndị kpebiri n’ezie ijere Jehova ozi ma gosipụta nke a site n’iji ọchịchọ obi ha nye ya onyinye ‘na-abụ ihe na-atọ Jehova ụtọ,’ a gọzikwara ha n’ụba.—Malakaị 3:10.

10. Olee otú Jehova si gosi na obi adịghị ya mma n’oge Aịzaịa na n’oge Malakaị?

10 Otú ọ dị, mba Izrel nke a raara nye Jehova gosipụtara omume nke ekwesịghị ntụkwasị obi ọtụtụ ugboro. Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa gwa ha, sị: “Ị kpụghị atụrụ nke àjà nsure ọkụ gị nile bịakwute m; i jighịkwa àjà gị nile sọpụrụ m. Ejighị m onyinye ịnata ihu ọma mee ka i fee ofufe.” (Aịsaịa 43:23) Tụkwasị na nke ahụ, àjà ndị a na-ejighị obi dum chụọ na ndị mmadụ na-achụghị n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ, abaghị uru n’anya Jehova. Dị ka ihe atụ, narị afọ atọ ka ụbọchị Aịzaịa gasịrị, n’ụbọchị Malakaị onye amụma, ndị Izrel nyere Jehova anụmanụ ndị gbara ọrụ. N’ihi ya, Malakaị gwara ha, sị: “Ọ dịghị ihe unu na-atọ m ụtọ, ka Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha sịrị, M gaghị anarakwa onyinye ịnata ihu ọma n’aka unu nke ọma. . . . Unu ewebatawokwa ihe a napụrụ n’ike, na ihe gwọrọ ngwụrọ, na ihe na-arịa ọrịa; otú a ka unu webataworo onyinye ịnata ihu ọma: M̀ ga-anara nke a nke ọma n’aka unu? ka Jehova sịrị.”—Malakaị 1:10, 13; Emọs 5:22.

Ha Kwụsịrị Ịbụ Mba A Raara Nye Jehova

11. Ohere dị aṅaa ka e nyere ndị Izrel?

11 Mgbe ụmụ Izrel ghọrọ mba a raara nye Jehova, o kwere ha nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa ga-apụta n’etiti ha ma nye ha ohere nke ịbụ ndị mbụ ná ndị ga-eso chịa n’Alaeze Chineke. (Jenesis 22:17, 18; 49:10; 2 Samuel 7:12, 16; Luk 1:31-33; Ndị Rom 9:4, 5) Ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Izrel emeghị ihe kwekọrọ ná nrara a raara ha nye Jehova. (Matiu 22:14) Ha jụrụ Mezaịa ahụ ma mesịa gbuo ya.—Ọrụ 7:51-53.

12. Gịnị ka Jizọs kwuru nke gosiri na Izrel kwụsịrị ịbụ mba a raara nye Jehova?

12 Ụbọchị ole na ole tupu ya anwụọ, Jizọs gwara ndị ndu okpukpe ndị Juu, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị nke a n’Akwụkwọ Nsọ, ‘Nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ bụ nke ghọworo nkume isi nkuku bụ́ isi. Nke a adịrịwo site n’aka Jehova, ọ dịkwa ebube n’anya anyị’? Nke a mere m ji asị unu, A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:42, 43) N’igosi ha na Jehova ajụwo ha ịbụ mba a raara nye Ya, Jizọs kwuru, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e zigaara ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya. Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.”—Matiu 23:37, 38.

Mba Ọhụrụ A Raara Nye Jehova

13. Gịnị ka Jehova buru n’amụma n’ụbọchị Jeremaịa?

13 N’oge Jeremaịa onye amụma, Jehova kwuru ihe ọhụrụ ọ ga-eme n’ọdịnihu banyere ndị ya. Anyị na-agụ, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), mgbe Mụ na ụlọ Izrel na ụlọ Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ: ọ bụghị dị ka ọgbụgba ndụ ahụ si dị nke Mụ na ndị bụ́ nna ha gbara n’ụbọchị M jidere ha n’aka ime ka ha si n’ala Ijipt pụta; n’ihi na ha onwe ha mebiri ọgbụgba ndụ m ahụ, ọ bụ ezie na Mụ onwe m bụ di nwe ha; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta. N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ nke Mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị nile ahụ gasịrị, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); M ga-etinye iwu m n’ime obi ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị.”—Jeremaịa 31:31-33.

14. Olee mgbe e hiwere mba ọhụrụ a raara nye Jehova, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka e ji hiwe ya? Ole ndị mejupụta mba ọhụrụ ahụ?

14 A tọrọ ntọala maka ọgbụgba ndụ ọhụrụ a mgbe Jizọs nwụrụ ma mesịa chee uru nke ọbara ya a wụsịrị n’ihu Nna ya n’afọ 33 O.A. (Luk 22:20; Hibru 9:15, 24-26) Otú ọ dị, ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè mgbe a wụsara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst nke afọ 33 O.A., bụ́kwa mgbe a mụrụ mba ọhụrụ bụ́ “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 2:28, 29; 9:6; 11:25, 26) Mgbe Pita onyeozi na-edegara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, ọ gwara ha, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche, ka unu wee kpọsaa n’ebe nile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube. N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a unu bụ ndị Chineke.” (1 Pita 2:9, 10) Jehova kwụsịrị iso mba Izrel anụ ahụ́ na-emekọ ihe n’ụzọ pụrụ iche dị ka ọ na-emebu. Na 33 O.A., ọ bụ Izrel ime mmụọ, bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst, ‘mba nke na-amị mkpụrụ’ nke Alaeze Mezaịa ka ha na Jehova dịzi ná mma kama ịbụ Izrel anụ ahụ́.—Matiu 21:43.

Onye nke Ọ Bụla Ga-ekpebi Ma Ọ̀ Ga-arara Onwe Ya Nye Jehova

15. Olee ụdị baptizim Pita gbara ndị na-ege ya ntị n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A. ume ka ha mee?

15 Mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, onye nke ọ bụla, ma onye Juu ma onye Jentaịl, aghaghị ijizi aka ya rara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” * (Matiu 28:19) N’ụbọchị Pentikọst, Pita onyeozi gwara ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị nọ na-ege ya ntị, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst maka mgbaghara mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” (Ọrụ 2:38) Ọ bụghị nanị na baptizim nke ndị Juu ndị a na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ga-egosipụta na ha raara ndụ ha nye Jehova kamakwa ọ ga-egosipụta na ha nakweere Jizọs dị ka onye Jehova ga-esi n’aka ya gbaghara ha mmehie ha. Ha aghaghị ịnakwere ya dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà nke Jehova na Onye Ndú ha, Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 1:13, 14, 18.

16. N’ụbọchị Pọl, olee otú ndị nwere ezi ọchịchọ obi—ndị Juu na ndị Jentaịl—si sonye n’Izrel ime mmụọ?

16 Afọ ole na ole ka e mesịrị, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ebu m ụzọ wetara ndị bi na Damaskọs ozi ahụ, wetakwara ndị bi na Jeruselem, na n’obodo Judia dum, nakwa ndị mba ọzọ ka ha nile chegharịa ma chigharịkwuru Chineke site n’ịrụ ọrụ kwesịrị nchegharị.” (Ọrụ 26:20) Mgbe o mesịrị ka ndị mmadụ kweta—ndị Juu na ndị Jentaịl—na Jizọs bụ Kraịst, Mezaịa ahụ, Pọl nyeere ha aka ruo mgbe ha raara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim. (Ọrụ 16:14, 15, 31-33; 17:3, 4; 18:8) Site n’ịbịakwute Chineke, ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ sonyere n’Izrel ime mmụọ.

17. Ọrụ ịka akara dị aṅaa na-eru ná njedebe, oleekwa ọrụ ọzọ nke na-aga ngwa ngwa?

17 Taa, o ruwela mgbe a ga-akacha ndị fọdụrụ n’Izrel ime mmụọ ahụ akara. Mgbe a kachara akara ahụ, a ga-agwa “ndị mmụọ ozi anọ” jichiri ikuku mbibi nke ‘oké mkpagbu ahụ’ ka ha hapụ ya. Ka ọ dịgodị, a nọ nnọọ na-achịkọta n’ike n’ike “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. “Atụrụ ọzọ” a na-eji aka ha ahọrọ igosipụta okwukwe “n’ọbara Nwa atụrụ ahụ” ma bụrụ ndị e mere baptizim iji gosipụta na ha raara onwe ha nye Jehova. (Mkpughe 7:1-4, 9-15; 22:17; Jọn 10:16; Matiu 28:19, 20) Ndị so ha bụ ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst zụlitere. Ọ bụrụ na i so ná ndị a na-eto eto, ọ ga-amasị gị ịgụ isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Ntụleghachi

• N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị mkpa ka ndị na-eto eto bụ́ ndị Izrel jiri aka ha rara onwe ha nye Jehova?

• Olee otú ndị Izrel pụrụ isi gosipụta na ha na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke?

• N’ihi gịnị ka Izrel ji kwụsị ịbụ mba a raara nye Jehova, oleekwa otú e si dochie anya ya?

• Site na Pentikọst nke afọ 33 O.A. gaa n’ihu, gịnị ka ma ndị Juu ma ndị Jentaịl ga-eme iji sonye n’Izrel ime mmụọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

A mụrụ ụmụaka Izrel ná mba Chineke họọrọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Onye Izrel nke ọ bụla aghaghị ikpebi n’onwe ya ma ọ̀ ga-ejere Chineke ozi ma ọ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndokwa e mere ka ndị mmadụ jiri ọchịchọ obi na-enye onyinye nyere ụmụ Izrel ohere igosipụta na ha hụrụ Jehova n’anya

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, ụmụazụ Kraịst aghaghị iji aka ha rara onwe ha nye Chineke ma gosipụta nke a site n’ịbụ ndị e mere baptizim