Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa, Họrọnụ Ijere Jehova Ozi

Ndị Ntorobịa, Họrọnụ Ijere Jehova Ozi

Ndị Ntorobịa, Họrọnụ Ijere Jehova Ozi

“Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe.”—JOSHUA 24:15.

1, 2. Olee ụdị baptizim na-ezighị ezi nke ndị Krisendọm na-eme?

“HAPỤNỤ [ụmụaka] ka ha mụta ihe banyere Kraịst tupu ha aghọọ Ndị Kraịst.” Ọ bụ onye edemede a na-akpọ Tertullian dere okwu ndị ahụ ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ. Ọ nọ na-akatọ ime ụmụ ọhụrụ baptizim, bụ́ omume nọ na-agbanyesi mkpọrọgwụ ike n’etiti Ndị Kraịst adịgboroja e nwere n’oge ya. N’ụzọ megidere ihe Tertullian kwuru nakwa ihe Bible kwuru, onye ụkọchukwu bụ́ Augustine kwuru na baptizim na-asachapụ njọ e bu pụta ụwa nakwa na ụmụ ọhụrụ ndị a na-emeghị baptizim tupu ha anwụọ ga-aga ọkụ ala mmụọ. Nkwenkwe ahụ mere ka a na-eme ụmụ ọhụrụ baptizim ozugbo o kwere mee ka a mụsịrị ha.

2 Ọtụtụ chọọchị ndị a ma ama na Krisendọm ka na-eme ụmụ ọhụrụ baptizim. Ọzọkwa, kemgbe ụwa, ndị ọchịchị na ndị ndú okpukpe nke mba ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-eme “ndị ọgọ mmụọ” ha meriri n’agha baptizim ná mmanye. Ma Bible akwadoghị ime ụmụ ọhụrụ baptizim, ọ kwadoghịkwa ime ndị toro eto baptizim ná mmanye.

Anaghị Amanye Mmadụ Amanye Taa Ịrara Onwe Ya Nye Jehova

3, 4. Gịnị pụrụ inyere ụmụaka ndị nne na nna raara onwe ha nye Jehova zụlitere aka iji obi ha raara onwe ha nye Jehova?

3 Bible na-egosi na Chineke na-ele ụmụaka anya dị ka ndị dị nsọ ọbụna ma a sị na ọ bụ nanị nne ma ọ bụ nna ha bụ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. (1 Ndị Kọrint 7:14) Na Jehova na-ele ụmụaka dị otú ahụ anya dị ka ndị dị nsọ ọ̀ na-eme ka ha bụrụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye? Ọ dịghị ma ọlị. Otú ọ dị, ụmụaka ndị nne na nna raara onwe ha nye Jehova zụlitere na-enweta ọzụzụ nke pụrụ ime ka ha jiri aka ha rara onwe ha nye Jehova. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Nwa m, chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị: . . . Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-edina ala, ọ ga na-eche gị; mgbe i tetakwara, nke ahụ ga-eso gị kparịa ụka. N’ihi na oriọna ka ihe ahụ e nyere n’iwu bụ; iwu ahụ bụkwa ìhè; Ọ bụkwa ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ.”—Ilu 6:20-23.

4 Nduzi nke ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ ịbụrụ ụmụ ha ndị na-eto eto ihe nchebe, ma ọ bụrụ na ha dị njikere ịgbaso nduzi a. Solomọn kwukwara, sị: “Nwa nke maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa: ma nwa dị nzuzu bụ iru újú nne ya.” “Nụrụ, gị onwe gị, nwa m, wee mara ihe, meekwa ka obi gị gazie agazie n’ụzọ.” (Ilu 10:1; 23:19) Iji rite uru n’ọzụzụ ndị nne na nna na-enye, unu bụ́ ndị na-eto eto aghaghị iji obi ọcha nakwere ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị. Unu ebughị amamihe pụta ụwa, ma unu pụrụ ịghọ ndị ‘maara ihe’ ma jiri aka unu gbasoo “ụzọ ndụ.”

Gịnị Bụ Nduzi Echiche?

5. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ma ndị nna ma ụmụaka?

5 Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe metụtara Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume: ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa: ‘Ka o wee gaara gị nke ọma, ka i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.’ Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:1-4.

6, 7. Gịnị ka ịzụlite ụmụaka ná “nduzi echiche nke Jehova” gụnyere, oleekwa ihe mere na a gaghị ele ya anya na ndị nne na nna na-eduhie ụmụ ha?

6 Ọrụ ịzụlite ụmụ “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova” nke ndị nne na nna na-arụ ọ̀ bụ iduhie ụmụ ha? Ee e. Ònye ga-akatọ ndị nne na nna maka ịkụziri ụmụ ha ihe ha weere na o ziri ezi na ihe ga-enyere ụmụ ha aka ịkpa àgwà dị mma? A dịghị akatọ ndị na-ekweghị na Chineke mgbe ha na-akụziri ụmụ ha na Chineke adịghị. Ndị Roman Katọlik were ya na iwu ji ha ịzụlite ụmụ ha ịghọ ndị Katọlik, ọ dịghịkwa onye na-akọta ha maka ịgbalị ime nke a. N’otu aka ahụ, ekwesịghị ibo Ndịàmà Jehova ebubo na ha na-eduhie ụmụ ha mgbe ha na-azụlite ụmụ ha ịnakwere echiche Jehova n’eziokwu ndị bụ́ isi nakwa n’ihe banyere ụkpụrụ omume.

7 Dị ka otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị e ji mee ihe na Bible na-egosi, okwu Grik e si na ya sụgharịta okwu ahụ bụ́ “nduzi echiche” bụ́ nke e ji mee ihe ná Ndị Efesọs 6:4, na-ezo aka n’usoro e ji “achọ ịgbazi echiche, ime ka ihe na-ezighị ezi zie ezie, na ime ka mmadụ na Chineke dịkwuo ná mma.” Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye na-eto eto ajụ ịnara ọzụzụ ndị mụrụ ya na-enye ya n’ihi nrụgide ndị ọgbọ, ya bụ, ịchọ ime ihe ndị ọgbọ ya na-eme. Ònye ka à ga-asị na ọ bụ ya na-arụgide nwata a ime ihe ga-emerụ ya ahụ́—ndị mụrụ ya ka ọ̀ bụ ndị ọgbọ ya? Ọ bụrụ na ndị ọgbọ onye ahụ na-eto eto na-arụgide ya ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụ oké mmanya, ma ọ bụ ime omume rụrụ arụ, è kwesịrị ịkatọ ndị nne na nna maka ịgbalị ịgbazi echiche nwata ahụ ma nyere ya aka ịghọta ajọ ihe ndị na-esi n’omume rụrụ arụ apụta?

8. Gịnị ka ‘ime ka Timoti kwere’ gụnyere?

8 Pọl onyeozi degaara nwa okorobịa bụ́ Timoti akwụkwọ, sị: “Gị onwe gị, nọgide n’ihe ndị ị mụtara na ndị e mere ka i kwere, ebe ị maara mmadụ ndị i sitere n’aka ha mụta ha nakwa na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị mawooro ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe maka nzọpụta site n’okwukwe n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:14, 15) Site na mgbe Timoti dị nnọọ obere, nne ya na nne nne ya, bụ́ ndị Juu, mere ka o nwee okwukwe siri ike na Chineke site n’ịkụziri ya ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 16:1; 2 Timoti 1:5) Ka e mesịrị, mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst, ha amanyeghị Timoti ikwere ihe ha na-akụziri ya kama ha ‘mere ka o kwere’ site n’iji Akwụkwọ Nsọ gosi ya otú ihe a na-akụziri ya siri bụrụ eziokwu.

Jehova Na-agwa Gị Ka Ị Họrọ Ihe Ị Ga-eme

9. (a) Olee otú Jehova si kwanyere ndị o kere eke ùgwù, gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ? (b) Olee otú Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya si jiri nnwere onwe ya nke ịhọrọ ihe ọ ga-eme mee ihe?

9 Ọ bụrụ na Jehova chọrọ, ọ gaara eke ụmụ mmadụ ka ha na-arụ ọrụ dị ka ngwá electronics bụ́ robot, ya bụ, ọ gaara eke ha otú ha ga na-eme nnọọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ka ha na-eme n’enwereghị onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme. Kama nke ahụ, ọ kwanyeere ha ùgwù site n’ike ha otú ha ga-enwere onwe ha ịhọrọ ihe ha ga-eme. Chineke anyị chọrọ ka ndị mmadụ jiri obi ha na-erubere ya isi. Ọ na-atọ ya ụtọ ịhụ ka ndị o kere, ma ndị agadi ma ndị na-eto eto, na-ejere ya ozi n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ. Ọ bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya gosiri ihe nlereanya kasị mma nke ime uche Chineke n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya. Jehova kwuru banyere ya, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Ọkpara a Chineke buru ụzọ mụọ gwara Nna ya, sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.”—Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:9, 10.

10. Gịnị ga-eme ka Jehova nakwere ozi anyị na-ejere ya?

10 Jehova na-atụ anya ka ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị Ọkpara ya na-eduzi, jiri obi ha na-eme uche Ya dị ka Ọkpara ya mere. Ọbụ abụ ahụ buru amụma n’ụdị abụ, sị: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị ụsụụ ndị agha gị; n’ịma mma nile nke ịdị nsọ, site n’afọ nke ụtụtụ; Gị nwe igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa gị.” (Abụ Ọma 110:3) Nzukọ Jehova, ma akụkụ ya nke dị n’eluigwe ma nke dị n’ụwa, na-eme uche Chineke n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ.

11. Nhọrọ dị aṅaa ka e chere n’ihu ndị na-eto bụ́ ndị ndị nne na nna raara onwe ha nye Jehova zụlitere?

11 Ya mere, unu ndị na-eto eto kwesịrị ịghọta na ma ndị mụrụ unu ma ndị okenye ọgbakọ adịghị nke ga-amanye unu ime baptizim. Ọ bụ unu ga-eji obi unu chọọ ijere Jehova ozi. Jọshụa oge ochie gwara ndị Izrel, sị: “Na-efekwanụ [Jehova] ofufe n’izu okè na n’eziokwu . . . họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe.” (Joshua 24:14-22) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ unu ga-eji aka unu họrọ ịrara onwe unu nye Jehova ma na-eme uche ya n’oge nile unu dị ndụ.

Ịnakwere Ibu Ọrụ Dịịrị Gị

12. (a) Ọ bụ ezie na ndị nne na nna pụrụ inye ụmụ ha ọzụzụ, gịnị ka ha na-apụghị imere ụmụ ha? (b) Olee mgbe nwatakịrị na-eru eru ịza Jehova ajụjụ maka ihe ndị ọ họọrọ ime?

12 Oge na-abịa mgbe ikwesị ntụkwasị obi nke ndị nne na nna unu na-agaghịzi echebe unu. (1 Ndị Kọrint 7:14) Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ maara ụzọ isi mee ihe ziri ezi ma o meghịkwa ya, ọ bụụrụ ya mmehie.” (Jems 4:17) Ndị nne na nna apụghị ijechitere ụmụ ha ozi ha kwesịrị ijere Chineke n’onwe ha, ụmụaka apụghịkwa imere ndị nne na nna ha otú ahụ. (Ezikiel 18:20) Ị̀ mụtala ihe banyere Jehova na nzube ya? Ì toruola ogo ịghọta ihe ị na-amụ ma malitekwa iso Jehova na-emekọrịta ihe? Ọ̀ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya iche na Chineke ga na-ele gị anya dị ka onye nwere ikike nke ikpebi ijere ya ozi?

13. Olee ajụjụ ndị ndị na-eto eto na-emebeghị baptizim kwesịrị ịjụ onwe ha?

13 Ị̀ bụ onye na-eto eto nke na-emebeghị baptizim, onye ndị nne na nna na-efe Chineke na-azụ na onye na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, ọbụna na-eso aga ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, jiri ezi obi jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji na-eme ihe ndị a? M̀ na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma n’ihi na ndị mụrụ m chọrọ ka m mee otú ahụ ka m̀ na-eme ha n’ihi na m chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ?’ Ị̀ nwapụtawooro onwe gị “ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè”?—Ndị Rom 12:2.

Gịnị Mere I Ji Na-ala Azụ Ime Baptizim?

14. Ihe atụ ndị dị aṅaa dị na Bible na-egosi na e kwesịghị igbu oge ime baptizim mgbe a na-enweghị ezi ihe kpatara ya?

14 “Gịnị na-egbochi ime m baptizim?” Nwoke Etiopia nke jụrụ onye na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip ajụjụ ahụ ka mụtara nnọọ na ọ bụ Jizọs bụ Mezaịa ahụ. Ma onye Etiopia ahụ maara Akwụkwọ Nsọ ruo n’ókè nke na o mere ka ọ ghọta na ya ekwesịghị igbu oge ikwupụta n’ezoghị ọnụ na site mgbe ahụ gaa n’ihu, na ya ga na-eso ọgbakọ Ndị Kraịst na-ejere Jehova ozi, nke ahụ wetekwaara ya ọṅụ dị ukwuu. (Ọrụ 8:26-39) N’ụzọ yiri nke ahụ, otu nwanyị aha ya bụ́ Lidia, bụ́ onye “meghepụrụ obi ya ịṅa ntị n’ihe ndị Pọl na-ekwu” na ezinụlọ ya ‘mere baptizim ozugbo.’ (Ọrụ 16:14, 15) N’otu aka ahụkwa, otu onye na-elekọta ndị mkpọrọ na Filipaị gere Pọl na Saịlas ntị ka ha ‘na-agwa ya okwu Jehova,’ “e mekwara ha nile baptizim, ya na ndị nke ya, n’egbughị oge.” (Ọrụ 16:25-34) Ya mere, ọ bụrụ na ị maara ihe ndị bụ́ isi banyere Jehova na nzube ya, nwee ọchịchọ sitere n’obi ime uche ya, nwee aha dị mma n’ọgbakọ ma na-agachi ọmụmụ ihe anya, sorokwa na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, gịnị mere ị ga-eji na-ala azụ ime baptizim?—Matiu 28:19,20.

15, 16. (a) Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi na-adọla ụfọdụ ndị na-eto eto azụ ime baptizim? (b) Olee otú mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova na ime baptizim si bụrụ ihe nchebe nye ndị na-eto eto?

15 Ọ̀ ga-abụ na ihe i ji na-ala azụ ime baptizim, nke bụ́ ihe dị ezigbo mkpa, bụ n’ihi na ụjọ na-atụ gị na a ga-elebara okwu gị anya ma ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ? Ya bụrụ otú ahụ, chee echiche banyere nke a: Ị̀ ga-ajụ ịgbata akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala nanị n’ihi na ụjọ na-atụ gị na i nwere ike inwe ihe ọghọm okporo ụzọ otu ụbọchị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị gaghị eme otú ahụ! I kwesịghịkwa ịla azụ ime baptizim ma ọ bụrụ na i ruo eruo ime otú ahụ. N’ezie, ọ bụrụ na ị raara onwe gị nye Jehova ma kweta ime uche ya, nke ahụ ga-akpali gị ime ihe nile i nwere ike ime iji zere itinye aka n’ihe ọjọọ. (Ndị Filipaị 4:13) Bikonụ ndị na-eto eto, unu echela na iyigharị mgbe unu ga-eme baptizim ga-eme ka unu ghara ịza ajụjụ maka ihe ọjọọ unu mere. Mgbe unu ruru ogo iburu ibu ọrụ, unu ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe unu mere, ma ùnu mere baptizim ma ọ bụ na unu emeghị.—Ndị Rom 14:11, 12.

16 Ọtụtụ Ndịàmà n’ụwa nile chere na mkpebi ha mere ime baptizim n’oge ha na-eto eto nyeere ha aka nke ukwuu. Were otu Onyeàmà dị afọ iri abụọ na atọ nke bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe dị ka ihe atụ. Ọ na-echeta na baptizim ya mere mgbe ya dị afọ iri na atọ kpaliri ya ịkpachara anya ịghara ịdaba ‘n’ọchịchọ nke oge ntorobịa.’ (2 Timoti 2:22) Mgbe ọ dị obere, o kpebiri ịbanye n’ozi oge nile. O ji obi ụtọ na-eje ozi ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ndị nile na-eto eto bụ́ ndị họọrọ ijere Jehova ozi, gụnyere gị onwe gị, ga-enweta ngọzi bara ụba n’ọdịnihu.

17. N’ihe ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka anyị na-aghọta ihe “uche Jehova” bụ?

17 Nraranye na baptizim bụ mmalite nke ndụ ọhụrụ, bụ́ oge anyị ga na-atụle ihe bụ́ uche Jehova banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime ná ndụ. Ibi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova chọrọ ka anyị ‘na-azụpụtara onwe anyị oge.’ Olee otú anyị ga-esi mee nke ahụ? Nke a bụ site n’iji oge anyị gaara eji eme ihe ndị na-enweghị isi na-amụchi Bible anya, na-agachi ọmụmụ ihe anya, ma soro na-aga ekwusa “ozi ọma nke alaeze ahụ” ruo n’ókè o kwere anyị mee. (Ndị Efesọs 5:15, 16; Matiu 24:14) Nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova na ọchịchọ anyị ime uche ya ga-abara anyị uru n’akụkụ nile nke ndụ anyị, gụnyere n’ihe banyere ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ, otú anyị si eri ihe na otú anyị si aṅụ ihe ọṅụṅụ nakwa ụdị egwú ndị anyị na-ege. Gbalịa họrọ ihe ntụrụndụ ndị ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ọtụtụ puku Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị nwere obi ụtọ ga-agwa gị na e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ziri ezi isi tụrụ ndụ bụ́ ndị na-emegideghị “uche Jehova.”—Ndị Efesọs 5:17-19.

“Anyị na Unu Ga-ayịkọ Jee”

18. Ajụjụ dị aṅaa ka ndị na-eto eto kwesịrị ịjụ onwe ha?

18 Site n’afọ 1513 T.O.A. ruo na Pentikọst nke afọ 33 O.A., Jehova nwere ndị a haziri ahazi n’elu ala bụ́ ndị ọ họọrọ ka ha na-efe ya ofufe ma bụrụ ndị àmà ya. (Aịsaịa 43:12) A mụrụ ndị Izrel na-eto eto ná mba ahụ. Kemgbe ụbọchị Pentikọst, Jehova enwewo “mba” ọhụrụ n’ụwa, ya bụ, Izrel ime mmụọ, ‘ndị o wepụtara maka aha ya.’ (1 Pita 2:9, 10; Ọrụ 15:14; Ndị Galeshia 6:16) Pọl onyeozi kwuru na Kraịst mere ka “ndị bụ́ ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche dị ọcha nye ya, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.” (Taịtọs 2:14) Unu bụ́ ndị na-eto eto nweere onwe unu iji aka unu chọpụta ebe a ga-achọta ndị dị otú ahụ. Ole ndị taa mejupụtara “mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile,” bụ́ nke na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible? Ole ndị taa na-akpa àgwà dị ka Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-akpọsakwa na ọ bụ Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịịrị ụmụ mmadụ? (Aịsaịa 26:2-4) Leruo ihe chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na okpukpe ndị ọzọ na-eme anya ma hụ ma hà kwekọrọ n’ihe Bible chọrọ n’aka ezi ndị ohu Chineke.

19. Gịnị ka ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa kweere?

19 Ọtụtụ nde ndị mmadụ n’ụwa nile, gụnyere ọtụtụ ndị na-eto eto, kwenyesiri ike na ọ bụ ndị e tere mmanụ so ná Ndịàmà Jehova, mejupụtara ‘mba ahụ na-eme ezi omume.’ Ha na-agwa ndị Izrel ime mmụọ a, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Anyị nwere olileanya ma na-ekpesi ekpere ike na unu bụ́ ndị na-eto eto ga-ekpebi isonyere ndị Chineke ma si otú ahụ ‘họrọ ndụ’—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Jehova.—Deuterọnọmi 30:15-20; 2 Pita 3:11-13.

Ntụleghachi

• Gịnị ka nduzi echiche gụnyere?

• Ụdị ozi dị aṅaa ka Jehova na-anakwere?

• Olee ihe e chere n’ihu ndị nile na-eto eto bụ́ ndị ndị nne na nna raara onwe ha nye Jehova zụlitere ịhọrọ?

• Gịnị mere mmadụ ekwesịghị iji n’ihi ihe na-enweghị isi na-eyigharị mgbe ọ ga-eme baptizim?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ònye ka ị ga-ege ntị?

[Foto dị na peeji nke 28]

Olee otú ịrara onwe gị nye Jehova na ime baptizim pụrụ isi bụrụ ihe nchebe nye gị?

[Foto dị na peeji nke 29]

Gịnị na-egbochi gị ime baptizim?