“Nke A Bụ Nnọọ Ụzọ Kasị Mma Isi Mechie Agụmakwụkwọ”
“Nke A Bụ Nnọọ Ụzọ Kasị Mma Isi Mechie Agụmakwụkwọ”
OTU onye nkụzi nke na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke dị na Spen dere, sị: “Ruo ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova egosipụtawo nnọọ na ha dị n’otu n’ezie, ha na-akwụwa nnọọ aka ọtọ, okwukwe ha bụkwa a kwaa akwụrụ.” Olee ihe kpaliri onye nkụzi a—bụ́ onye sị na ya ekweghị na Chineke—ide ihe dị otú a?
Ihe kpaliri ya ide ya bụ mgbe a gwara Noemí, bụ́ nwa akwụkwọ nke na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ka o dee edemede nke so n’ule ikpeazụ ya n’ụlọ akwụkwọ. O kpebiri iji isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Yiri Uwe Nwere Triangle Na-acha Pọpụl Pọpụl Hụrụ n’Oge Ọchịchị Nazi,” dee ihe odide ya.
Gịnị mere o ji họrọ isiokwu ahụ? Noemí na-ekwu, sị: “Echere m na m pụrụ iji ohere a gbaara onye nkụzi ga-ahụ maka ihe odide m àmà. Akụkọ banyere otú Ndịàmà Jehova nọ na Nazi Germany si nnọọ nọgidesie ike na-eme ezi ihe n’oge ahụ metụrụ m n’obi. Amaara m na ọ ga-amasịkwa ndị ọzọ.”
Ihe ahụ Noemí dere masịrị ọtụtụ ndị ọzọ karịa nnọọ ka o chere. N’October 5, 2002, edemede ya mere ka e nye ya ihe nrite n’otu asọmpi edemede nke mba ya mere, bụ́ nke dabeere n’ime nchọpụta n’ihe banyere sayensị na ihe ndị metụtara ọhaneze. Ọ bụ ndị prọfesọ iri abụọ sitere na mahadum ndị a ma ama na Spen, nyere ndị mere nke ọma ihe nrite ndị ahụ.
Onye nyere Noemí ihe nrite ya bụ minista okwu mmụta dị n’aka na Spen bụ́ Pilar del Castillo. Noemí jiri ohere ahụ nye minista ahụ otu kaseti vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault. Minista ahụ naara onyinye ahụ n’egbughị oge.
E dere banyere otú Noemí si mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa banyere edemede ya ahụ n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’obodo ya, bụ́ Manresa. Ka a ka na-ekwugodị nke a, onyeisi ụlọ akwụkwọ Noemí kwuru ka e nye ya otu akwụkwọ ihe odide Noemí ka ya tinye ya n’usoro ihe omume a ga-eji echeta afọ iri asaa na ise ụlọ akwụkwọ ahụ gbarala.
Noemí kwuru, sị: “Nke a bụ nnọọ ụzọ kasị mma isi mechie agụmakwụkwọ sekọndrị m. Obi jupụtara m n’ọṅụ mgbe m gụrụ ihe onye nkụzi m bụ́ Maazi Jorge Tomás Calot dere ná mmalite nke akụkọ o dere banyere otú m si mee n’agụmakwụkwọ m. O dere, sị:
“‘Ekweghị m na Chineke dị, ma ọ ga-amasị m ka e mee ka o doo mụ nnọọ anya na Onye a Kachasị Elu, bụ́ onye na-akpali ndị na-efe ya ofufe inwe nnọọ ezigbo “ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi ha nọ dị adị.”’”