Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nleta nke Gbanwere Àgwà nke Otu Nwoke

Nleta nke Gbanwere Àgwà nke Otu Nwoke

Nleta nke Gbanwere Àgwà nke Otu Nwoke

OTU nwa amadị ụmụ agbọghọ abụọ na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova letara dere, sị: “Ọ gụsiri m nnọọ agụụ ike ịkọrọ ndị ezinụlọ m banyere ‘ndị mmụọ ozi’ abụọ Chineke ziteere m.” Izu ole na ole tupu ụmụ agbọghọ ahụ eleta nwa amadị a, nwunye ya nke ya na ya lụworo ruo ihe dị ka afọ iri anọ na ise nwụnahụrụ ya. Nke a gbawakwara ya obi. Ụmụ ya ndị toworo eto akasiela ya nnọọ obi, ma ha na papa ha ebighị nso. Ọ dịbeghị ndị enyi na ndị agbata obi ya bịara leta ya.

Mgbe ụmụ agbọghọ abụọ ahụ letara nwoke a, ọ gwara ha, sị: “Anaghịzi m ekpeli ekpere.” Otú ọ dị, ọnọdụ ya metụrụ ha n’ahụ́. N’ihi ya, ha hapụụrụ ya otu obere traktị nke dabeere na Bible nke isiokwu ya bụ́ Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? Nwoke ahụ gụrụ ya n’abalị ahụ, nke ahụ kasikwara ya obi.

Obere oge ka e mesịrị, Ndịàmà abụọ ahụ gaghachiri n’ụlọ nwoke ahụ. Ha chetara ụdị mwute o nwere n’oge gara aga ha letara ya ma bịa ịhụ ka ọ na-eme. Nwoke ahụ mechara dee, sị: “O riri m nnọọ ọnụ na mmadụ abụọ m na-amatụghị mbụ nwere nnọọ mmasị n’ebe m nọ ma na-eche banyere ọdịmma m.” Ihe ndị ha gụụrụ ya site na Bible gbara ya ume. Ụmụ agbọghọ ahụ gwara ya na ha ga-abịaghachi. Nwa amadị ahụ nwere nnọọ obi ụtọ, nke a kpalikwara ya ide ihe ndị ahụ e hotara n’elu n’akwụkwọ ozi o zigara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ.

Tupu nwoke ahụ akwaga ebe dị nso n’ebe otu n’ime ụmụ ya bi, ọ bịara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ma soro ezinụlọ nke otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ letara ya rie nri. O dere, sị: “Ọ bụ ezie na m na-akwapụ n’ebe a, m ka ga na-echeta ụmụ agbọghọ a na-eto eto na chọọchị unu mgbe nile n’ime obi m na n’ekpere m. N’ikwu eziokwu, ana m ekpezi nnọọ ekpere ugbu a. Àgwà m agbanweela nnọọ. Ụmụ agbọghọ ahụ na-eto eto so nnọọ mee ka nke a kwe omume, m ga-anọgide na-ekele ha.”