Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Na-ariba Ịba Mba Ama Ga-aghọ Onye Nwere Ezi Uche”

“Onye Na-ariba Ịba Mba Ama Ga-aghọ Onye Nwere Ezi Uche”

“Onye Na-ariba Ịba Mba Ama Ga-aghọ Onye Nwere Ezi Uche”

ILU 23:12 na-ekwu, sị: “Mee ka obi gị baa n’ịdọ aka ná ntị, meekwa ka ntị gị abụọ baa n’okwu ọnụ nile nke ihe ọmụma.” N’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, ‘ịdọ aka ná ntị,’ ma ọ bụ inye mmadụ ọzụzụ ka o wee na-eme omume ọma, na-agụnye ma ịdọ aka ná ntị anyị na-enye onwe anyị ma nke ndị ọzọ na-enye anyị. Ọ dị mkpa ibu ụzọ ghọta ụdị mgbazi a chọrọ na otú e kwesịrị isi mee nke ahụ tupu enyewe ịdọ aka ná ntị. N’ihi ya, “okwu ọnụ nile nke ihe ọmụma,” bụ́ nke sitere n’ebe a pụrụ ịdabere na ya, dị oké mkpa iji nye ịdọ aka ná ntị.

Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu bụ nnọọ ebe magburu onwe ya a pụrụ isi nweta okwu amamihe. Ilu ndị e dekọrọ na ya bụ maka “ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị, . . . ịnara ịdọ aka ná ntị nke inwe uche, na ezi omume na ikpe na izi ezi.” (Ilu 1:1-3) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ‘ịṅa ntị’ n’ilu ndị ahụ. Ilu isi nke 15 nyere nduzi a pụrụ ịdabere na ya n’otú mmadụ pụrụ isi na-achịkwa iwe, jiri ire ya na-eme ihe nke ọma, ma na-eme ka ndị ọzọ mara ihe. Ngwa ka anyị tụlee amaokwu ụfọdụ site n’akwụkwọ Ilu isi nke 15.

Gịnị “Na-eme Ka Ọnụma Laghachi Azụ”?

N’ịkọwa otú okwu ọnụ pụrụ isi kpalie iwe ma ọ bụ ọnụma, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-ekwu, sị: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) “Iwe” bụ okwu e ji akọwa otú obi na-adị mmadụ mgbe e mere ya ihe wutere ya ma ọ bụ otú o si meghachi omume n’ihe ahụ e mere ya. A kọwara “ọnụma” dị ka “oké iwe nke na-esi nnọọ ike nchịkwa.” Olee otú ilu a pụrụ isi nyere anyị aka ịma otú anyị pụrụ isi meghachi omume mgbe onye ọzọ na-ewe iwe nakwa otú anyị pụrụ isi chịkwaa iwe nke anyị?

Okwu na-agba agba ná ntị pụrụ ime ka ọnọdụ ọjọọ kakwuo njọ. N’aka nke ọzọ, ịzaghachi okwu n’ụzọ dị nro na-eme ka iwe dajụọ. Ma, ọ naghị adịkarị mfe ịzaghachi onye iwe ji okwu n’ụzọ dị nro. Otú ọ dị, ọ ga-adị mfe karị ịzaghachi okwu n’ụzọ dị nro ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ghọta ihe mere onye ahụ ji na-ewe iwe. Bible na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” (Ilu 19:11) Ọ pụrụ ịbụ na ihe na-ewe mmadụ iwe bụ n’ihi na o chere na ya abaghị uru ma ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka ndị ọzọ jiri ya kpọrọ ihe. O nwedịrị ike ihe kpasuru ya iwe abụghị ihe anyị kwuru ma ọ bụ ihe anyị mere. Ihe na-emekarị ka ndị mmadụ jiri iwe na-azaghachi anyị n’ozi Ndị Kraịst ọ̀ bụghị n’ihi na a gwara ha ihe na-abụghị eziokwu banyere ihe ndị anyị kweere ma ọ bụkwanụ n’ihi echiche ụfọdụ na-ezighị ezi ndị ha nwere banyere anyị? Ànyị kwesịrị iji olu ike zaghachi, dị ka à ga-asị na onye nwe ụlọ bu anyị n’obi kwuo ihe o kwuru? Ikwu okwu ndị na-akpasu iwe ọbụna mgbe anyị na-enweghị ike ịghọta ngwa ngwa ihe mere mmadụ ji na-ewe iwe, na-egosi na anyị enweghị njide onwe onye. Anyị kwesịrị izere ịzaghachi okwu n’ụzọ dị otú ahụ.

Ndụmọdụ ahụ e nyere ka a na-azaghachi okwu n’ụzọ dị nro dịkwa oké mkpa mgbe anyị na-achịkwa iwe nke anyị. Anyị pụrụ itinye ndụmọdụ dị otú a n’ọrụ site n’ịmụta ịdị na-ekwupụta otú ihe dị anyị n’obi n’ụzọ na-agaghị akpasu onye nụrụ ya iwe. Mgbe anyị na-emeso ndị ezinụlọ anyị ihe, kama ịdị na-ekwu okwu ndị na-agba agba ná ntị ma ọ bụ okwu mkparị, anyị pụrụ ikwupụta otú ihe dị anyị n’obi n’ụzọ dị nwayọọ. Okwu mkparị na-akpalikarị onye a gwara ya ịchọ ịgwagwara. Iji olu dị nro kọọrọ mmadụ otú ihe dị anyị n’obi ga-eme ka ọ ghara iche na anyị na-akparị ya, ọ pụkwara ime ka ọ rịọ mgbaghara.

‘Ire Ndị Maara Ihe Na-eme Ka Ihe Dị Mma’

Mmadụ inye onwe ya ọzụzụ na-emetụta ma otú onye ahụ si ekwu okwu ma ihe ọ na-ekwu. Solomọn kwuru, sị: “Ire ndị maara ihe na-eme ka ihe ọmụma dị mma: ma ọnụ ndị nzuzu na-ekwuwa okwu uche gbagọrọ agbagọ.” (Ilu 15:2) Ọ̀ bụ na anyị adịghị ‘eji ihe ọmụma eme ka ihe dị mma’ mgbe anyị nwere ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka, ma kọọrọ ha banyere nzube Chineke na ndokwa ndị magburu onwe ha o mere? Onye nzuzu adịghị eme nke a n’ihi na ọ maghị ihe.

Tupu Solomọn agaa n’ihu inye ndụmọdụ n’otú e kwesịrị isi jiri ire na-eme ihe, o kwuru ihe ọzọ dị iche nke na-akpali iche echiche. “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ́ ezi mmadụ nche.” (Ilu 15:3) Anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na nke a n’ihi na e mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Chineke maara ma ànyị na-eme ihe ziri ezi. Ọ na-ahụkwa ndị na-eme ihe ọjọọ, ha ga-aza ya ajụjụ.

Solomọn mesikwuru mkpa ire dị nro dị ike, na-ekwu, sị: “Ire nke na-agwọ mmadụ bụ osisi na-enye ndụ: ma omume gbagọrọ agbagọ n’ime ya bụ ntipịa n’ime mmụọ mmadụ.” (Ilu 15:4) Okwu ahụ bụ́ “osisi na-enye ndụ” na-enye echiche nke ọgwụgwọ na iwusi ike. (Mkpughe 22:2) Okwu dị nro nke onye maara ihe na-ekwu na-enye mmụọ nke ndị na-anụ ya ume ọhụrụ. Ọ na-eme ka ha meghachi omume n’ụzọ dị mma. Ma ire aghụghọ ma ọ bụ nke na-ekwu okwu na-agba agba ná ntị na-egwepịa mmụọ nke ndị na-anụ ya.

Ịnara Ịdọ Aka ná Ntị na ‘Ifesa Ihe Ọmụma’

Eze ahụ maara ihe gara n’ihu na-ekwu, sị: “Onye uche ya gbagọrọ agbagọ na-eleli ịdọ aka ná ntị nna ya anya: ma onye na-arịba ịba mba ama ga-aghọ onye nwere ezi uche.” (Ilu 15:5) Olee otú mmadụ ga-esi ‘rịba ịba mba ama’ ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ baara ya mba? Ọ̀ bụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a adịghị egosi na a ga-enyerịrị ya ịdọ aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa iji gbazie ya? N’ezinụlọ, ọ bụ ọrụ dịịrị nne na nna—karịsịa nna—ịdọ nwata aka ná ntị, ọ bụkwa ọrụ dịịrị nwata ịnakwere ịdọ aka ná ntị. (Ndị Efesọs 6:1-3) Otú ọ dị, a na-adọ ndị ohu Jehova nile aka ná ntị site n’otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ. Ndị Hibru 12:6 na-ekwu, sị: “N’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara dị ka nwa ya ihe.” Otú anyị si ele ịdọ aka ná ntị anya na-ekpughe ma ànyị maara ihe ma ànyị bụ ndị nzuzu.

Solomọn kwukwara ihe ọzọ dị iche, ọ sịrị: “Egbugbere ọnụ nke ndị maara ihe na-efesa ihe ọmụma: ma obi ndị nzuzu adịghị eme otú a.” (Ilu 15:7) Ikesa ihe ọmụma dị ka ịgha mkpụrụ. N’oge ochie, onye ọrụ ugbo adịghị akụ mkpụrụ ya nile n’otu ebe. Kama ihe ọ na-eme bụ ịghasa mkpụrụ ole na ole n’otu ebe ruo mgbe ọ ghazuru mkpụrụ n’ubi ahụ dum. Otú ahụ ka ọ dị n’ikesa ihe ọmụma. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị zutere mmadụ n’ozi ubi, ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwu ihe nile anyị maara banyere Bible otu mgbe. Kama nke ahụ, onye maara ihe na-akwa ire ya nga. Ọ ‘na-efesa’ ihe ọmụma ka ọ na-eji nke nta nke nta na-ewepụta nanị otu eziokwu Bible mgbe ọ bụla ọ gara ma kọwaa ya nke ọma, na-eburu otú onye ahụ na-ege ya ntị si na-emeghachi omume n’uche. Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Nlereanya anyị, mere nke a mgbe ọ na-agwa nwanyị Sameria okwu.—Jọn 4:7-26.

Ịkụnye ihe ọmụma na-agụnye ikwu ihe bara uru na nke a ga-amụta ihe na ya. Ka mmadụ wee nwee ike ikwu okwu a pụrụ isi na ya mụta ihe na nke na-agba ume, ọ ghaghị ibu ụzọ chebara ihe ọ chọrọ ikwu echiche. N’ihi ya, “obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.” (Ilu 15:28) Ọ dị nnọọ oké mkpa na okwu anyị ga-adị ka obere mmiri ozuzo nke na-ede ala ma na-aba uru, ọ bụghị dị ka idei mmiri nke na-asọpụsị ihe ọ bụla nọchiiri ya ụzọ!

‘Ịdị Nsọ n’Omume’

Ifesa ihe ọmụma banyere Jehova na nzube ya na ịchụrụ ya “mkpụrụ egbugbere ọnụ” dị ka “àjà otuto” bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya. (Ndị Hibru 13:15) Otú ọ dị, ka Jehova wee nakwere àjà dị otú a, anyị ga-adịrịrị ‘nsọ n’omume anyị nile.’ (1 Pita 1:14-16) Solomọn jiri ilu abụọ dịrịta iche mee ka anyị mata eziokwu a dị oké mkpa. O kwuru, sị: “Àjà ndị na-emebi iwu bụ ihe arụ n’anya Jehova: ma ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ Ya ụtọ. Ihe arụ n’anya Jehova ka ụzọ onye na-emebi iwu bụ: ma onye na-agbaso ezi omume ka Ọ na-ahụ n’anya.”Ilu 15:8, 9.

Olee otú ndị na-agbahapụ ụzọ nke na-eduba ná ndụ si ewere ịdọ aka ná ntị, ma olee ihe ọ ga-arụpụtara ha? (Matiu 7:13, 14) “Ịdọ aka ná ntị ọjọọ dịịrị onye na-ahapụ ụzọ: onye na-akpọ ịba mba asị ga-anwụ.” (Ilu 15:10) Kama ịnakwere ndụmọdụ ndị tozuru okè n’ọgbakọ Ndị Kraịst nyere iji gbazie ha, ụfọdụ ndị na-agbaso ụzọ ndụ ọjọọ na-ahọrọ ịgbahapụ okporo ụzọ nke ezi omume. Nke a bụ nnọọ ihe nzuzu!

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ na-eme ka à ga-asị na ya na-anabata ịdọ aka ná ntị ma nke bụ́ eziokwu abụrụ na ọ kpọrọ ya asị? Nke a bụkwa ihe nzuzu. Eze Izrel kwuru, si: [“Shiol,” NW] na ebe ịla n’iyi dị n’ihu Jehova? Obi ụmụ mmadụ ga-esi aṅaa ghara ịdị n’ihu Ya?” (Ilu 15:11) N’ụzọ ihe atụ, ọ dịghị ihe pụrụ ịdị anya site n’ebe Chineke dị ndụ nọ karịa Shiol, nke bụ́ ili ndị nwụrụ anwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị n’ihu ya. Ọ maara ụdị ndị nile nọ n’ebe ahụ, o nwekwara ike ịkpọlite ha n’ọnwụ. (Abụ Ọma 139:8; Jọn 5:28, 29) Ọ dịịrị nnọọ Jehova mfe ịma ihe dị n’obi ụmụ mmadụ! Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Omume ihu abụọ pụrụ imegharị mmadụ anya ma ọ pụghị imegharị Chineke anya.

Ọ bụghị nanị na onye na-ajụ ịnara ịdọ aka ná ntị kpọrọ ịdọ aka ná ntị asị kamakwa ọ kpọrọ ndị na-enye ya asị. Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ka a baara ya mba.” Iji mesie ihe ọ na-ekwu ike, o kwuziri ihe ọzọ ya na ya yiri, sị: “Ọ bụghị onye maara ihe ka ọ ga-ejekwuru.” (Ilu 15:12) N’ezie, o siri ike onye dị otú ahụ ime ka okporo ụzọ ya zie ezie!

Ọdịnihu Na-enye Obi Ụtọ

Solomọn ji okwu bụ́ “obi” jikọta ilu atọ ọzọ ọ tụrụ. N’ịkọwa otú ọdịdị ihu anyị si egosipụta ihe dị anyị n’obi, eze ahụ maara ihe kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma: ma e ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ.”Ilu 15:13.

Olee ihe pụrụ ime ka obi nwee mwute? Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala [ná mwute].” (Ilu 12:25) Olee otú anyị pụrụ isi ghara ikwe ka nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndu kụda anyị mmụọ? Kama ịnọgide na-eche banyere ọnọdụ ndị anyị maara na enwechaghị ihe anyị ga-eme iji chịkwaa ha, anyị pụrụ ịdị na-atụgharị n’uche anyị otú Jehova siworo gọzie anyị n’ụzọ ime mmụọ ugbu a nakwa ihe ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Nke a ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. Ee, ịbịaru “Chineke onye obi ụtọ” nso ga-emerịrị ka obi anyị nọ ná mwute nwee ọṅụ.—1 Timoti 1:11.

Ọzọkwa, ozi dị na Bible bụ nnọọ ihe nkasi obi na ihe na-enye ọṅụ. Ọbụ abụ ahụ kpọrọ nwoke ‘iwu Jehova na-atọ ụtọ; nke na-atụgharịkwa uche na ya ehihie na abalị’ onye obi ụtọ. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọbụna mgbe anyị nwere mwute, ịgụ Bible na ịtụgharị ihe ọ na-ekwu n’uche ga-agba anyị ume. Ije ozi Chineke nyere anyị ga-emekwara anyị otu ihe ahụ. E mesiri anyị obi ike na “ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.”—Abụ Ọma 126:5.

Solomọn kwuru, sị: “Obi onye nghọta na-achọ ihe ọmụma: ma ọnụ ndị nzuzu na-azụ onwe ya n’uche gbagọrọ agbagọ dị ka anụ ụlọ.” (Ilu 15:14) Ilu a na-eme ka anyị ghọta ọdịiche dị nnọọ n’etiti ndụmọdụ onye maara ihe na nke onye nzuzu. Onye nwere obi na-aghọta ihe na-ebu ụzọ achọ ịmata ihe merenụ tupu ya enyewe ndụmọdụ. Ọ na-ege ntị nke ọma iji ghọta ihe a na-ekwu. Ọ na-eme nnyocha n’Akwụkwọ Nsọ iji chọpụta iwu na ụkpụrụ ndị kwesịrị ekwesị iji mee ihe maka ọnọdụ ahụ. Ọ na-adaberesi ike n’Okwu Chineke na-enye ndụmọdụ ya. Otú ọ dị, onye nzuzu adịghị enye onwe ya nsogbu iji chọpụta eziokwu dị n’ọnọdụ ahụ. Ọ na-ekwupụ ihe ọ bụla batara ya n’uche. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgakwuru ndị maara ihe na ndị nwere ahụmahụ mgbe ọ bụla anyị chọrọ ka a tụọrọ anyị aro, kama ịgakwuru ndị ga-agwa anyị ihe anyị chọrọ ịnụ. Ọ bụ nnọọ ihe dị mma inwe “onyinye n’ụdị mmadụ” n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-achọ ‘ihe ọmụma’ tupu ha enyewe ndụmọdụ!—Ndị Efesọs 4:8.

Ilu ọzọ sochirinụ gosiri uru inwe olileanya na ihe ga-adị mma bara. Eze Izrel bụ́ Solomọn kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke onye e wedara n’ala jọrọ njọ: ma onye obi ya dị mma na-eri oké oriri mgbe nile.” (Ilu 15:15) Ná ndụ, e nwere ma oge obi ụtọ ma oge ihe isi ike, nweekwa ma oge ịṅụrị ọṅụ ma oge ibe ákwá. Ọ bụrụ na anyị na-eche banyere nanị ihe isi ike anyị na-enwe, anyị ga na-enwe mwute mgbe nile, anyị agaghịkwa enwe obi ụtọ ná ndụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-echekarị banyere otú Jehova siworo gọzie anyị na olileanya Chineke nyere anyị, anyị agaghịdị ama na anyị nwere nsogbu ná ndụ, anyị ga-enwetakwa ọṅụ nke obi. Inwe echiche ziri ezi na-eme ka o kwe anyị omume ịnọ na-eri “oké oriri mgbe nile.”

Ya mere, ka anyị were ịdọ aka ná ntị dị ka ihe dị nnọọ oké mkpa. Ka anyị kwe ka ọ na-achịkwa ọ bụghị nanị obi anyị, okwu ọnụ anyị, na otú anyị si akpa àgwà kamakwa otú anyị si ele ihe anya.

[Foto dị na peeji nke 13]

“Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ”

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị nne na nna inye ịdọ aka ná ntị

[Foto dị na peeji nke 15]

“Egbugbere ọnụ nke ndị maara ihe na-efesa ihe ọmụma”