Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Chineke Anyị Pụrụ Ịnapụta Anyị’

‘Chineke Anyị Pụrụ Ịnapụta Anyị’

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”

‘Chineke Anyị Pụrụ Ịnapụta Anyị’

A HAZIRI ememe ahụ ka ọ dị ebube. E guzobere nnukwu ihe oyiyi e ji ọlaedo kpụọ n’ala Dura nke dị larịị, bụ́ nke yiri ka ọ̀ dị nso n’obodo Babilọn. A gaje ịgbape ihe oyiyi ahụ n’otu ememe pụrụ iche nke ndị isi ọchịchị ga-abịa, ha ga-akpọkwa isiala nye ihe oyiyi ahụ mgbe ha nụrụ ụda ngwá egwu dị iche iche. Eze Nebukadneza nke Babilọn enyewo iwu ka a tụba onye ọ bụla nke jụrụ ife ihe oyiyi ahụ n’ime oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Olee onye ga-anwa anwa nupụ isi n’iwu ahụ?

Ọ tụrụ ndị nọ ebe ahụ n’anya mgbe mmadụ atọ na-atụ egwu Jehova ma na-efe ya ofufe—Shedrak, Mishak, na Abednego—na-akpọghị isiala. Ha maara na ime otú ahụ bụ ha ịkwụsị ife nanị Jehova Chineke. (Deuterọnọmi 5:8-10) Mgbe a gwara ha ka ha kọwaa ihe mere ha ji jụ ife ihe oyiyi ahụ, ha gwara Nebukadneza n’atụghị egwu, sị: “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ Onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka Ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na Ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:17, 18.

Mgbe a tụbara ndị Hibru atọ ahụ n’oké ọkụ ahụ, ọ bụ nanị ọrụ ebube Chineke rụrụ zọpụtara ha. Chineke zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa chebe ndị ohu Ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma ha ekwerela ọnwụ kama inupụrụ Jehova isi. * Mkpebi ha yiri nke ndịozi Jizọs Kraịst mere ihe karịrị narị afọ isii ka e mesịrị, mgbe ha nọ n’ihu ụlọikpe ukwu nke ndị Juu ma kwuo, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ihe Ndị Dị Mkpa Anyị Ga-amụta na Ya

Shedrak, Mishak, na Abednego setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya nke okwukwe, nrubeisi, na ịkwesị ntụkwasị obi. Ndị Hibru atọ ahụ nwere okwukwe na Jehova. Akọnuche ha e ji Akwụkwọ Nsọ zụọ ekweghị ha itinye aka n’ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị ma ọ bụ ife mba. Ndị Kraịst nke oge a na-atụkwasịkwa Chineke obi ha nile. Akọnuche ha e ji Bible zụọ na-eduzi ha, ha na-ajụkwa ikere òkè n’ofufe ụgha ma ọ bụ n’ememe ndị na-emebi iwu na ụkpụrụ Chineke.

Ndị Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tụkwasịrị Jehova obi ma jụ ịkwụsị irubere ya isi n’ihi oké aha, ọkwá, ma ọ bụ otuto ọ bụla Alaeze Ukwu Babilọn pụrụ inye ha. Ụmụ okorobịa ahụ dị njikere ịta ahụhụ ma nwụọ kama imebi mmekọrịta ha na Chineke. Dị ka Mozis bụ́ onye dịrị ndụ tupu oge ha, ha ‘nọgidere na-eguzosi ike dị ka hà na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.’ (Ndị Hibru 11:27) Ma Jehova ọ̀ ga-anapụta ha n’ọnwụ ma ọ bụ na ọ gaghị anapụta ha, mmadụ atọ ahụ kpebisiri ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya kama imebi okwukwe ha iji zọpụta ndụ ha. O yiri ka ọ̀ bụ ihe nlereanya ha ka Pọl onyeozi na-ekwu banyere ya mgbe o kwuru banyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ‘nagidere ike nke ọkụ.’ (Ndị Hibru 11:34) Ndị ohu Jehova na-egosipụtakwa ụdị okwukwe na nrubeisi ahụ mgbe a na-ele ikwesị ntụkwasị obi ha ule n’oge a.

Ihe mere Shedrak, Mishak, na Abednego na-akụzikwara anyị na Chineke na-agọzi ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye ya. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: ‘Jehova adịghị ahapụ ndị ebere Ya.’ (Abụ Ọma 37:28) Taa, anyị agaghị atụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube iji zọpụta anyị dị ka o meere ndị Hibru atọ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ inwe obi ike na, n’agbanyeghị ihe isi ike dakwasịrị anyị, Nna anyị nke eluigwe ga-enyere anyị aka. Chineke nwere ike iwepụrụ anyị nsogbu ahụ, nye anyị ike iji die ya, ma ọ bụ kpọlite anyị n’ọnwụ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Jọn 5:28, 29) Mgbe ọ bụla e lere ikwesị ntụkwasị obi anyị ule, anyị ahọrọkwa irubere Chineke isi karịa mmadụ, okwukwe, nrubeisi, na ikwesị ntụkwasị obi anyị na-emeri.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, July/August.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ MAARA?

• Ọ fọrọ nke nta ka ndị Hibru atọ ahụ ruo afọ 30 mgbe e lere ikwesị ntụkwasị obi ha ule.

• O yiri ka è mere ka oké ọkụ ahụ dị ọkụ otú o nwere ike ịdịru n’ọkụ.—Daniel 3:19.