Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ọzọ Na-abụghị Bible nke Kwuru na E Nwere Ndị A Kpọrọ Izrel

Ebe Ọzọ Na-abụghị Bible nke Kwuru na E Nwere Ndị A Kpọrọ Izrel

Ebe Ọzọ Na-abụghị Bible nke Kwuru na E Nwere Ndị A Kpọrọ Izrel

N’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Cairo dị n’Ijipt, e nwere otu ogidi nkume e ji echeta mmeri dị iche iche Fero Merneptah meriri n’agha. Ndị ọkà mmụta na-eche na Fero a nke bụ́ nwa nke 13 nke Ramses nke Abụọ chịrị n’agbata afọ 1212 na 1202 T.O.A.—nke bụ́ ná ngwụsị nke oge Ndị Ikpe n’Izrel oge ochie. Ahịrị abụọ ikpeazụ nke ihe e dere na nkume Merneptah ahụ kwuru, sị: “Anyị emeriela Kenan ma kwakọrọ ihe nile dị na ya. Anyị ewegharala Ashkelọn, were Giza, meekwa ka Yano‘am ghọọ mkpọmkpọ ebe. Anyị emeela ka Izrel tọgbọrọ n’efu, ọ dịghị ụmụ ya fọrọnụ.”

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Izrel” pụtara n’ebe a? N’ihe odide ndị Ijipt na-adị n’ụdị ihe osise, a na-akanye akara ndị a na-adịghị akpọpụta akpọpụta n’okwu dị iche iche iji gosi ụdị okwu ha bụ. Akwụkwọ bụ́ The Rise of Ancient Israel kọwara, sị: ‘A kanyere okwu atọ n’ime okwu anọ ahụ a kpọrọ aha n’elu—bụ́ Ashkelọn, Giza na Yanoam—akara na-agwa anyị na ha bụ obodo. . . . Otú ọ dị, akara nke a kanyere n’Izrel na-egosi na ọ bụ ndị mmadụ.’

Olee uru ihe odide a bara? Hershel Shanks, bụ́ onye editọ na onye na-ede akwụkwọ, zara, sị: “Ogidi Nkume Merneptah ahụ gosiri na e nwere ndị a na-akpọ Izrel n’afọ 1212 T.O.A., gosikwa na ọ bụghị nanị na fero Ijipt ahụ maara ha, kamakwa na o chere na mmeri o meriri ha ruru eru iji ya etu ọnụ.” William G. Dever, bụ́ prọfesọ nke ndị ọkà mmụta ihe ochie nke ụlọ ọrụ Near Eastern, kwuru, sị: “Ogidi nkume Merneptah na-agwa anyị hoo haa, sị: E nwere ndị bi na Kenan kpọrọ onwe ha ‘Izrel,’ n’ihi ya kwa, ndị Ijipt akpọọ ha ‘Izrel’—a sịkwanụ ka e kwuwe, ndị Ijipt a abụghị ndị ga-achọ ịgbachitere Bible, ọ dịkwanụghị otú ha ga-esi kwuo na e nwere ndị bụ́ ndị ‘Izrel’ mgbe a na-enweghị ha iji too onwe ha.”

Mgbe mbụ e ji okwu ahụ bụ́ Izrel mee ihe na Bible bụ mgbe e kwuru na ọ bụ aha a gụrụ nna ochie ahụ bụ́ Jekọb. A bịara mara ụmụ ndị ụmụ 12 nke Jekọb mụtara dị ka “ụmụ Izrel.” (Jenesis 32:22–28, 32; 35:9, 10) Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ma onye amụma bụ́ Mozis ma Fero nke Ijipt ji aha ahụ bụ́ “Izrel” mee ihe mgbe ha na-ekwu banyere ụmụ ụmụ Jekọb ndị a. (Ọpụpụ 5:1, 2) Ogidi nkume Merneptah bụ ebe kasị ochie a maara na-abụghị Bible nke kwuru na e nwere ndị a kpọrọ Izrel.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ogidi nkume Merneptah

Ọ bụrụ na e jikọta akara atọ ahụ ọnụ—osisi na nwoke na nwanyị nọ ọdụ—ọ ga-apụta na Izrel bụ ndị mba ọzọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Mba Ijipt, Cairo, Ijipt/Giraudon/The Bridgeman Art Library