Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-anapụta Onye E Wedara n’Ala

Jehova Na-anapụta Onye E Wedara n’Ala

Jehova Na-anapụta Onye E Wedara n’Ala

“Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.”—ABỤ ỌMA 34:19.

1, 2. Olee nsogbu otu Onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi nwere n’otu oge, n’ihi gịnịkwa ka anyị pụrụ iji nwee mmetụta yiri nke ya?

OTU nwa agbọghọ aha ya bụ Keiko * abụwo Onyeàmà Jehova ruo afọ 20. Ruo oge ụfọdụ, o jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye nkwusa oge nile nke Alaeze Chineke. O ji nnọọ ihe ùgwù ahụ kpọrọ ihe. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya gara aga, obi bịara daa nnọọ Keiko mbà, owu amawakwa ya. O kwuru, sị: “Nanị ihe m mere bụ ibe ákwá.” Iji mee onwe ya obi ụtọ, Keiko tinyere oge dị ukwuu n’ịmụ ihe. O kwuru, sị: “N’agbanyeghị nke ahụ, ịda mbà n’obi ahụ ekweghị akwụsị. O ruru n’ókè nke na m chọrọ ịnwụ.”

2 Ọ̀ dịtụla mgbe ị dara mbà n’obi otú ahụ? Ebe ị bụ Onyeàmà Jehova, ọ dị ọtụtụ ihe mere i kwesịrị iji na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ịsọpụrụ Chineke “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ugbu a, i bi na paradaịs ime mmụọ! Ma, nke ahụ ọ̀ pụtara na ị pụghị ịta ahụhụ ma ọlị? Mbanụ! Bible kwuru, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume.” (Abụ Ọma 34:19) Nke a anaghị eju anyị anya, n’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, nke ahụ na-emetụta anyị nile.—Ndị Efesọs 6:12.

Ihe Ndị Ahụhụ Na-akpata

3. Nye ihe atụ nke ndị ohu Chineke e kwuru banyere ha na Bible bụ́ ndị nwere oké nchekasị.

3 Inwe nchekasị ruo ogologo oge pụrụ ime ka anyị daa mbà n’obi. (Ilu 15:15) Tụlee nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job. Mgbe Job nọ n’oké ahụhụ, o kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Obi jọrọ nnọọ Job njọ. Ruo oge ụfọdụ, o chedịrị na Jehova agbahapụla ya. (Job 29:1-5) Ọ bụghị nanị Job bu ohu Chineke tara oké ahụhụ. Bible gwara anyị na ‘obi luru Hana ilu’ n’ihi na ọ mụtaghị nwa. (1 Samuel 1:9-11) Mgbe ọnọdụ dị n’ezinụlọ Ribeka na-enye ya nsogbu n’obi, o kwuru, sị: “Ike ndụ m agwụsịwo m.” (Jenesis 27:46) Mgbe Devid na-eche banyere mmehie ya, o kwuru, sị: “Ogologo ụbọchị nile ka m jegharịworo na-eyi uwe mkpe.” (Abụ Ọma 38:6) Ihe atụ ole na ole ndị a gosiri nnọọ na ndị ikom na ndị inyom tụrụ egwu Chineke tupu oge Ndị Kraịst nwere oge ndị ha nọ n’oké nchekasị.

4. N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iji ju anyị anya na e nwere “ndị dara mbà” n’etiti Ndị Kraịst taa?

4 Gịnị banyere Ndị Kraịst? Pọl onyeozi hụrụ na ọ dị mkpa ịgwa ndị Tesalonaịka ka ha ‘na-agụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ndị dara mbà” pụrụ ịpụta “ndị nsogbu nke ndụ nọ na-anyịgbu ruo oge ụfọdụ.” Okwu Pọl gosiri na obi dara ụfọdụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọ n’ọgbakọ dị na Tesalonaịka mbà. E nwekwara ndị obi dara mbà n’etiti Ndị Kraịst taa. Ma gịnị mere obi ji ada ha mbà? Ka anyị tụlee ihe atọ na-akpatakarị ya.

Ezughị Okè Anyị Pụrụ Ịkụda Anyị Obi

5, 6. Olee nkasi obi anyị pụrụ inweta ná Ndị Rom 7:22-25?

5 N’adịghị ka ndị na-eme omume rụrụ arụ bụ́ ndị “na-enwekwaghị mmetụta ime omume ọma,” ezughị okè nke ezi Ndị Kraịst na-ewute ha. (Ndị Efesọs 4:19) Ọ pụrụ ịdị ha otú ọ dị Pọl, bụ́ onye dere, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” Pọl tiziri mkpu, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!”—Ndị Rom 7:22-24.

6 Ọ̀ dịtụla mgbe ọ dị gị otú ọ dịịrị Pọl? Ọ dịghị njọ ịmara nnọọ ezughị okè gị, n’ihi na nke ahụ ga-eme ka ị mara otú mmehie dịruru ná njọ ma mee ka i kpebisikwuo ike izere ihe ọjọọ. Ma ọ dịghị mkpa ka ị na-echegbu onwe gị mgbe nile maka ihe ndị i mejọrọ. Mgbe Pọl kwupụtasịrị nchegbu ya, o kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Ndị Rom 7:25) Ee, obi siri Pọl ike na ọbara Jizọs wụsịrị pụrụ ịgbapụta ya ná mmehie o ketara eketa.—Ndị Rom 5:18.

7. Olee ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịghara ichegbubiga onwe ya ókè banyere ọchịchọ ọ na-enwe ime mmehie?

7 Ọ bụrụ na ezughị okè gị na-akụda gị obi, jiri ihe Jọn onyeozi kwuru kasie onwe gị obi, bụ́ onye dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume. Ọ bụkwa àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị nanị maka nke anyị kamakwa maka nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) Ọ bụrụ na ọchịchọ ị na-enwe ime mmehie na-akụda gị obi, na-echeta mgbe nile na Jizọs nwụrụ maka ndị mmehie, ọ bụghị maka ndị zuru okè. N’ezie, “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23.

8, 9. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jụ ịma onwe anyị ikpe?

8 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ n’oge gara aga. O doro anya na ị gwala ya Jehova n’ekpere, ikekwe, i kpeela ekpere banyere ya ugboro ugboro. Ndị okenye ọgbakọ ejiriwo Akwụkwọ Nsọ nyere gị aka. (Jems 5:14, 15) I gosiri nnọọ na i chegharịala nke mere na a chụghị gị n’ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị hapụrụ ọgbakọ ruo oge ụfọdụ, ma gị mesịa chegharịa ma maliteghachi ịkpa ezi àgwà. Ya bụrụ na ị nọ na nke ọ bụla n’ọnọdụ abụọ ahụ e kwuru n’elu, i nwere ike icheta mmehie ndị i mere n’oge gara aga, ya enyewekwa gị nsogbu n’obi. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, cheta na Jehova na-agbaghara ndị ji obi ha nile chegharịa “n’ụba.” (Aịsaịa 55:7) Ọzọkwa, ọ chọghị ka ị nọgide na-enwe mwute. Nke ahụ bụ ihe Setan na-achọ. (2 Ndị Kọrint 2:7, 10, 11) A ga-egbu Ekwensu n’ihi na ọ bụ ihe kwesịịrị ya, ma ọ ga-achọ ka i chee na e kwesịkwara igbu gị. (Mkpughe 20:10) Ekwela ka atụmatụ a Ekwensu na-eme imebi okwukwe gị gaa nke ọma. (Ndị Efesọs 6:11) Kama nke ahụ, ‘guzogide ya’ n’akụkụ a, dị nnọọ ka ị na-eme n’akụkụ ndị ọzọ.—1 Pita 5:9.

9 Mkpughe 12:10, a kpọrọ Setan “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo”—ụmụnna anyị ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọ “na-ebo ha ebubo ehihie na abalị” n’ihu Chineke. Ọ bụrụ na i chebara amaokwu ahụ echiche, ị ga-ahụ na Setan, bụ́ onye ebubo ụgha, ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na i bowe onwe gị ebubo ma na-ama onwe gị ikpe, n’agbanyeghị na Jehova adịghị ebo gị ebubo ma na-ama gị ikpe. (1 Jọn 3:19-22) Olee ihe mere ị ga-eji na-echegbu onwe gị banyere ihe ndị i mejọrọ ruo n’ókè na ị ga-achọ ịkwụsị ime ihe Chineke na-achọ? Ekwela ka Setan mebie mmekọrịta gị na Chineke. Ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka Ekwensu mee ka i chefuo na Jehova bụ onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.”—Ọpụpụ 34:6.

Ihe Ndị Anyị Na-enweghị Ike Ime Pụrụ Ịkụda Anyị Obi

10. Olee otú ihe ndị anyị na-enweghị ike ime pụrụ isi kụda anyị obi?

10 Ụfọdụ Ndị Kraịst na-enwe nkụda obi n’ihi otú ihe ndị ha na-enweghị ike ime si emetụta ozi ha na-ejere Chineke. Ọ̀ dị gị otú ahụ? O nwere ike ịbụ na oké ọrịa, agadi, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ na-egbochi gị itinyeru oge ị na-etinyebu n’ozi. Ee, a gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-azụpụta oge iji jeere Chineke ozi. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ma gịnị ma ọ bụrụ na e nwere nnọọ ezi ihe ndị mere ka ọ ghara ikwe gị omume ijekwu ozi, nke a ana-akụdakwa gị obi?

11. Olee otú ndụmọdụ Pọl dị ná Ndị Galeshia 6:4 pụrụ is baara anyị uru?

11 Bible gbara anyị ume ka anyị ghara ịdị umengwụ kama ka anyị “na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Ndị Hibru 6:12) Anyị ga-enwe ike ime nke a nanị ma ọ bụrụ na anyị atụlee ezi ihe nlereanya ha ma gbalịa iṅomi okwukwe ha. Otú ọ dị, ọ gaghị abara anyị uru iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ na-ezighị ezi ma kwubie na ọ dịghị ihe anyị mere dị mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị itinye ndụmọdụ a Pọl nyere n’ọrụ: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.

12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-aṅụrị ọṅụ n’ozi anyị na-ejere Jehova?

12 Ndị Kraịst nwere ezi ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ, ọbụna mgbe oké ọrịa belatara ihe ha nwere ike ime. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Ndị Hibru 6:10) Ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ ị na-apụghị ịgbanwe emewo ka o siere gị ike ijeru ozi otú i jeburu. Ma, Jehova pụrụ inyere gị aka itinyekwu oge n’akụkụ ụfọdụ nke ozi Ndị Kraịst, dị ka iji telifon agba àmà na ide akwụkwọ ozi. Jide n’aka na Jehova Chineke ga-agọzi gị maka iji obi gị nile na-ejere ya ozi na maka ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ nakwa n’ebe ụmụ mmadụ ibe gị nọ.—Matiu 22:36-40.

“Oge Pụrụ Iche” Pụrụ Ịkụda Anyị Obi

13, 14. (a) Olee otú ‘oge ndị a pụrụ iche’ pụrụ isi kpatara anyị ahụhụ? (b) Olee otú e si ahụ enweghị obi mmadụ taa?

13 Ọ bụ ezie na anyị nwere olileanya ibi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, ugbu a anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ịmara na ihe isi ike ndị a na-enwe ugbu a na-egosi na nnapụta anyị dị nso na-akasi anyị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ ndị gbara anyị gburugburu na-emetụta anyị. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na i nweghị ọrụ? Ọrụ nwere ike ịdị ụkọ, ka ọtụtụ ọnwa na-agafekwa, ị pụrụ ịmalite iche ma Jehova ọ̀ na-ahụkwa ọnọdụ ị nọ na ya ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ na-anụkwa ekpere ndị ị na-ekpegara ya. Ma ọ bụ o nwere ike ịbụ na a kpọrọ gị asị ma ọ bụ na-emegbu gị n’ụzọ ọzọ. Ọbụna ịgụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ akụkọ pụrụ ime ka ọ dị gị otú ọ dịịrị onye ezi omume ahụ bụ́ Lọt, bụ́ onye “nwere oké mwute” (“onye dara mbà n’obi,” Young’s Literal Translation of the Holy Bible) n’ihi omume rụrụ arụ nke ndị gbara ya gburugburu.—2 Pita 2:7.

14 E nwere otu akụkụ nke ụbọchị ikpeazụ a nke anyị na-apụghị ileghara anya. Bible buru amụma na ọtụtụ ndị ga-abụ ndị “na-enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:3) Ịhụnanya adịtụghị n’ọtụtụ ezinụlọ. N’ezie, akwụkwọ bụ́ Family Violence kwuru na “ihe àmà ndị e nwere na-egosi na o yikarịrị ka ọ̀ ga-abụ ndị ezinụlọ mmadụ ga-egbu ya, tie ya ihe, kpasuo ya iwe ma ọ bụ kwaso ya iko karịa onye ọ bụla ọzọ. . . . Nye ụfọdụ ndị toro eto na ụmụaka, ebe e kwesịrị ịhụ ha n’anya, ahụ́ eruokwa ha ala bụ ebe ha kasị nọrọ n’ihe ize ndụ.” Ndị a zụlitere n’ezinụlọ na-adịghị mma nwere ike malite inwe nkụda mmụọ n’ọdịnihu. Gịnị ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ?

15. Olee otú ịhụnanya Jehova si karịa nke mmadụ ọ bụla?

15 Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na ịhụnanya Jehova karịrị nke nne ma ọ bụ nna ọ bụla bụ́ mmadụ! Ọ bụ ezie na nne ma ọ bụ nna gị imegbu ma ọ bụ ịgbahapụ gị pụrụ iwute gị nke ukwuu, ọ gaghị emetụta otú Jehova hụruru gị n’anya. (Ndị Rom 8:38, 39) Cheta na Chineke na-adọta ndị ọ hụrụ n’anya n’ebe ọ nọ. (Jọn 3:16; 6:44) N’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ siworo kpasoo gị àgwà, Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya!

Ihe Ndị Pụrụ Ibelata Nkụda Mmụọ

16, 17. Mgbe mmadụ nwere nkụda mmụọ, gịnị ka ọ pụrụ ime iji nọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ?

16 Ọ dị ihe ndị ị pụrụ ime iji belata nkụda mmụọ. Dị ka ihe atụ, na-ekerechi òkè anya n’ozi Ndị Kraịst. Na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, karịsịa mgbe o yiri ka nkụda mmụọ ekwekwaghị gị odidi. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ọ bụrụ na asịwo m, E wezụgawo ụkwụ m n’ọnọdụ ya, ebere gị na-akwagide m, Jehova. Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 94:18, 19) Ịgụchi Bible anya ga-enyere gị aka iburu okwu ndị na-akasi obi ma na-agba ume n’isi.

17 Ekpere dịkwa mkpa. Ya bụrụgodị na ị pụghị ikwupụtacha otú ọ dị gị n’obi, Jehova maara ihe ị na-achọ ikwu. (Ndị Rom 8:26, 27) Ọbụ abụ ahụ kwuru okwu ndị a na-emesi obi ike: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

18. Olee ihe ndị bara uru onye dara mbà n’obi nwere ike ime?

18 Ịda mbà n’obi ụfọdụ ndị na-enwe bụ ọrịa. * Ọ bụrụ na nke gị bụ ọrịa, gbalịa ilekwasị anya n’ụwa ọhụrụ Chineke nakwa na mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ya bụrụ na ịda mbà n’obi gị ekweghị akwụsị akwụsị, o nwere ike ịdị mma ka ị gaa hụ dọkịta. (Matiu 9:12) Ọ dịkwa mkpa ka ị na-elekọta onwe gị anya. Iri ezigbo nri na imega ahụ́ pụrụ inyere gị aka. Hụ na ị na-ezu ike nke ọma. Adịla na-amụ anya ruo n’ime abalị na-ele telivishọn, zerekwa ụdị ntụrụndụ ndị ga-agwụ gị ike. Nke kasị mkpa, nọgide na-arụ ọrụ Chineke! Ọ bụ ezie na oge Jehova ‘ga-ehichapụ anya mmiri ákwá’ erubeghị, ọ ga-enyere gị aka idi nkụda obi.—Mkpughe 21:4; 1 Ndị Kọrint 10:13.

Ịnọ “n’Okpuru Aka Dị Ike nke Chineke”

19. Olee nkwa Jehova kwere ndị na-ata ahụhụ?

19 Bible na-emesi anyị obi ike na n’agbanyeghị na ihe ọjọọ na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ, “n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19) Olee otú Chineke si eme nke a? Mgbe Pọl onyeozi kpere ekpere ugboro ugboro ka Chineke wepụrụ ya ‘ogwu o nwere n’anụ ahụ́ ya,’ Jehova gwara ya, sị: “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:7-9) Olee nkwa Jehova kwere Pọl, oleekwa nkwa o kwere gị? Nkwa o kwere anyị abụghị na a ga-ewepụrụ anyị nsogbu nile ugbu a, kama na ọ ga-enye anyị ike idi ha.

20. N’agbanyeghị ahụhụ ndị anyị na-ata, olee ihe e kwere anyị ná nkwa na 1 Pita 5:6, 7?

20 Pita onyeozi dere, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ya ruru; ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.” (1 Pita 5:6, 7) Ebe ọ bụ na Jehova na-eche banyere gị, ọ gaghị agbahapụ gị. Ọ ga-enyere gị aka n’agbanyeghị ụdị ahụhụ bịakwasịrị gị. Cheta na Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nọ “n’okpuru aka dị ike nke Chineke.” Ka anyị na-efe Jehova, ọ na-enye anyị ike idi nsogbu. Ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi nye ya, ọ dịghị ihe ga-emebi mmekọrịta anyị na Jehova kpamkpam. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa ma hụ mgbe ọ ga-anapụta nnọọ onye e wedara n’ala kpamkpam!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 A gbanwere aha ahụ agbanwe.

^ par. 18 Ịda mbà n’obi nke bụ́ ọrịa abụghị nkụda mmụọ nkịtị, kama nke ahụ, ọ bụ ọrịa nke na-eme ka mmadụ nọrọ n’oké mwute mgbe nile. Ị chọọ ịgụkwu maka ya, lee Ụlọ Nche nke October 15, 1988, peeji nke 25-29; nke November 15, 1988, peeji nke 21-24; na nke September 1, 1996, peeji nke 30-31.

Ì Chetara?

• N’ihi gịnị ka ọbụna ndị ohu Jehova ji ata ahụhụ?

• Olee ihe ụfọdụ pụrụ ime ka ụfọdụ ndị Chineke nwee nkụda mmụọ?

• Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịnagide nsogbu ndị anyị nwere?

• Olee otú anyị si nọrọ “n’okpuru aka dị ike nke Chineke”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

N’agbanyeghị ahụhụ ndị ohu Jehova na-ata, ha nwere ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ

[Foto dị na peeji nke 28]

Iji telifon agba àmà bụ otu ụzọ anyị ga-esi nye Jehova ihe nile anyị nwere ike inye