Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Lekwasị Anya n’Ezi Ihe nke Nzukọ Jehova

Lekwasị Anya n’Ezi Ihe nke Nzukọ Jehova

Lekwasị Anya n’Ezi Ihe nke Nzukọ Jehova

“Ka afọ ju anyị n’ezi ihe nke ụlọ Gị.”—ABỤ ỌMA 65:4.

1, 2. (a) Olee mmetụta ụlọ nsọ ahụ na ọrụ ndị a ga na-arụ na ya ga-enwe n’ebe ndị Chineke nọ? (b) Olee ndokwa ndị Devid mere maka iwu ụlọ nsọ ahụ?

DEVID nke Izrel oge ochie bụ otu n’ime ndị a kasị mara amara e kwuru banyere ha n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru. Onye ọzụzụ atụrụ a, nke bụ́kwa ọbụ abụ, onye amụma, na eze tụkwasịrị Jehova Chineke obi ya nile. Mmekọrịta chiri anya Devid na Jehova nwere kpaliri ya ịchọ iwuru Chineke ụlọ. Ụlọ, ma ọ bụ ụlọ nsọ dị otú ahụ ga-abụ ebe a ga-anọ na-efe ezi ofufe n’Izrel. Devid maara na ụlọ nsọ ahụ na ọrụ a ga na-arụ na ya ga-ewetara ndị Chineke ọṅụ na ngọzi. N’ihi ya, Devid bụrụ abụ, sị: “Ihe na-agara ya nke ọma, bụ́ onye Ị [Jehova] na-ahọpụta, onye Ị na-emekwa ka ọ bịaruo nso, ka o wee biri n’ogige Gị nile: ka afọ ju anyị n’ezi ihe nke ụlọ Gị, bụ́ ebe nsọ nke ụlọukwu Gị.”—Abụ Ọma 65:4.

2 E kweghị ka Devid wuoro Jehova ụlọ. Kama nke ahụ, ọ bụ nwa ya nwoke bụ́ Solomọn ka e nyere ihe ùgwù ahụ. Devid atamughị ntamu n’ihi na e nyere onye ọzọ ihe ùgwù ahụ ya onwe ya chọsiri ike inweta. Ihe bụ́ nnọọ mkpa ya bụ ka e wuo ụlọ nsọ ahụ. O ji obi ya nile kwado ọrụ ahụ site n’inyefe Solomọn ụkpụrụ ụlọ ahụ bụ́ nke Jehova nyere ya. Ọzọkwa, Devid kere ọtụtụ puku ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè ịrụ ọrụ dị iche iche ma nye ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo a ga-eji wuo ụlọ nsọ ahụ.—1 Ihe E Mere 17:1, 4, 11, 12; 23:3-6; 28:11, 12; 29:1-5.

3. Olee àgwà ndị ohu Chineke nwere n’ebe ndokwa ndị e mere maka ezi ofufe dị?

3 Ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi kwadoro ndokwa ndị e mere maka ezi ofufe n’ụlọ Chineke. Dị ka ndị ohu Jehova nke oge a, anyị na-akwadokwa ndokwa ndị e mere maka ofufe n’akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova. Anyị na-esi otú ahụ egosipụta na anyị nwere àgwà yiri nke Devid. Anyị adịghị eme mkpesa. Kama nke ahụ, anyị na-elekwasị anya n’ezi ihe nke nzukọ Chineke. Ì chewo echiche banyere ọtụtụ ezi ihe ndị pụrụ ime ka anyị kelee nnọọ Chineke? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Inwe Ekele Maka Ndị Na-edu Ndú

4, 5. (a) Olee otú “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” si arụzu ọrụ ya? (b) Olee otú obi dị ụfọdụ Ndịàmà maka nri ime mmụọ ha na-enweta?

4 Anyị nwere ezi ihe mere anyị kwesịrị iji kelee Chineke maka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bụ́ ndị Jizọs Kraịst họpụtara maka ilekọta ezinụlọ ya dị n’ụwa. Ohu ahụ nke ndị mejupụtara ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eduzi ọrụ nkwusa ozi ọma, na-ahazi ọmụmụ ihe maka ofufe anyị ma na-eduzi mbipụta nke akwụkwọ dị iche iche dabeere na Bible n’ihe karịrị narị asụsụ anọ. Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile ji nnọọ obi ụtọ na-eri ‘nri ime mmụọ a na-abịa n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Matiu 24:45-47) Ọ dịghị nnọọ ihe mere anyị kwesịrị iji na-atamu ntamu banyere ya.

5 Kemgbe ọtụtụ afọ, otu Onyeàmà Jehova meworo okenye, aha ya bụ Elfi, enwetawo nkasi obi na enyemaka site n’iji ndụmọdụ Akwụkwọ Nso ndị dị n’akwụkwọ òtù ohu ahụ na-ebipụta na-eme ihe. Ekele miri emi Elfi nwere kpaliri ya ide, sị: “Olee ihe m gaara eme ma e wezụga nzukọ Jehova?” Peter na Irmgard abụwokwa ndị ohu Chineke ruo ọtụtụ iri afọ. Obi dị Irmgard ụtọ maka akwụkwọ nile “nzukọ Jehova na-ahụ n’anya ma na-echebara ndị nọ na ya echiche” na-ewepụta. Akwụkwọ ndị a gụnyere ndị e bipụtara maka ndị nwere mkpa pụrụ iche, dị ka ndị nwere nsogbu anya na ndị na-adịghị anụcha ihe.

6, 7. (a) Olee otú e si elekọta ọrụ ọgbakọ dị iche iche na-arụ gburugburu ụwa? (b) Olee ihe ụfọdụ ndị kwuworo banyere akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova?

6 Ndị na-anọchi anya “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi” bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ obere ìgwè ndị ikom e tere mmanụ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị ohu Jehova nwere ahụmahụ ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche iji na-elekọta ihe karịrị iri puku ọgbakọ itoolu na asatọ e nwere gburugburu ụwa. A na-ahọpụta ndị ikom ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ha n’aka ije ozi n’ọgbakọ ndị a dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. (1 Timoti 3:1-9, 12, 13) Ndị okenye na-edu ndú ma na-eji ịhụnanya azụ ìgwè atụrụ Chineke nyere ha ilekọta. Lee ka o si bụrụ ngọzi iso n’ìgwè atụrụ ahụ na inweta ịhụnanya na ịdị n’otu dị n’etiti “òtù ụmụnna dum”!—1 Pita 2:17; 5:2, 3.

7 Kama ndị mmadụ ịnọ na-eme mkpesa, ha na-ekwupụtakarị obi ụtọ ha nwere maka nduzi ndị okenye ọgbakọ ji ịhụnanya na-eduzi ha. Dị ka ihe atụ, tụlee Birgit, Onye Kraịst lụrụla di nke dị afọ iri atọ na ụma. Mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ọ malitere iso ndị enyi ọjọọ, ọ fọkwara nke nta o mee ihe ọjọọ. Ma, ndụmọdụ Bible doro anya ndị okenye nyere ya, na nkwado ndị kwere ekwe ibe ya kwadoro ya, nyeere ya aka ịgbahapụ ihe gaara etinye ya ná nsogbu. Olee otú obi dị Birgit ugbu a? O kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na m ka nọ ná nzukọ Jehova magburu onwe ya.” Andreas, bụ́ onye dị afọ 17 kwuru, sị: “Ihe a bụ nzukọ Jehova n’ezie, nzukọ kasị mma n’ụwa.” Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ekele maka ezi ihe nke akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova?

Ndị Na-edu Ndú Ezughị Okè

8, 9. Olee otú ụfọdụ ndị ha na Devid dịkọrọ ndụ si mee omume, oleekwa ihe Devid n’onwe ya mere n’ihi ya?

8 N’ezie, ndị a họpụtara idu ndú n’ezi ofufe ezughị okè. Ha nile na-emejọ ihe, ụfọdụ n’ime ha nwekwara adịghị ike ndị ha nọgideworo na-arụsị ọrụ ike ịchịkwa. Nke ahụ ò kwesịrị ime ka anyị na-ewe iwe? Mbanụ. Ọbụna ndị e nyere ibu ọrụ dị ukwuu n’Izrel oge ochie mere mmehie ndị dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, Mgbe Devid ka bụ nwa okorobịa, a kpọọrọ ya ịkpọrọ Eze Sọl nsogbu na-akpa aka ọjọọ egwú iji mee ka obi ruo ya ala. Ka e mesịrị, Sọl nwara igbu Devid, bụ́ onye mesịrị gbaa ọsọ maka ndụ ya.—1 Samuel 16:14-23; 18:10-12; 19:18; 20:32, 33; 22:1-5.

9 Ndị Izrel ndị ọzọ ghọkwara aghụghọ. Dị ka ihe atụ, ọchịagha Devid bụ́ Joab gburu onye ikwu Sọl bụ́ Abna. Absalọm kpara nkata ịnapụ nna ya bụ́ Devid ọchịchị. Onye ndụmọdụ Devid nke ọ tụkwasịrị obi, bụ́ Ahitofel, gbara ya mgba okpuru. (2 Samuel 3:22-30; 15:1-17, 31; 16:15, 21) N’agbanyeghị nke ahụ, Devid aghọghị onye ji obi ilu na-eme mkpesa; ọ gbakụtaghịkwa ezi ofufe azụ. N’ezie, kama nke ahụ, o fesiwere Chineke ike. Ahụhụ mere ka Devid tụkwasị nnọọ Jehova obi ma nọgide na-akpa ezi àgwà mgbe ọ gbara ọsọ n’ihi Sọl. N’oge ahụ, Devid bụrụ abụ, sị: “Meere m amara, Chineke, meere m amara; n’ihi na n’ime Gị ka mkpụrụ obi m gbabaworo: ọ bụkwa ná ndò nke nkù Gị abụọ ka m ga-agbaba, ruo mgbe ihe ịla n’iyi ndị a ga-agabiga.”—Abụ Ọma 57:1.

10, 11. Olee ebubo e boro otu Onye Kraịst aha ya bụ Gertrud mgbe ọ bụ nwa agbọghọ, gịnịkwa ka o kwuru banyere ezughị okè nke ndị kwere ekwe ibe ya?

10 Ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-eme mkpesa na aghụghọ dị ná nzukọ Chineke taa. Ma Jehova ma ndị mmụọ ozi ya ma ndị okenye adịghị nke na-anabata ndị ọjọọ na-aghọ aghụghọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ka o sina dị, anyị nile na-alụso ezughị okè mmadụ ọgụ—ezughị okè nke anyị na nke ndị ohu Chineke ndị ọzọ.

11 Mgbe Gertrud, bụ́ onye feworo Jehova ruo ogologo oge, ka bụ nwa agbọghọ, e boro ya ebubo ụgha na ọ na-aghọ aghụghọ, na ọ bụghị onye nkwusa oge nile nke Alaeze Chineke. Gịnị ka o mere? Gertrud ọ̀ tamuru ntamu banyere ebubo ahụ e boro ya? Ee e. Obere oge tupu ya anwụọ n’afọ 2003 mgbe ọ gbara afọ 91, o chetara ihe ndị mere ná ndụ ya ma kọwaa, sị: “Ihe ndị a na ihe ndị mere mgbe ha gasịrị kụziiri m na n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-emejọ, Jehova na-eduzi ọrụ ukwu ya, bụ́ nke o ji anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-arụ.” Mgbe ezughị okè nke ndị ọzọ ha na Gertrud so efe Chineke metụtara ya, o ji obi ya nile kpegara Jehova ekpere.

12. (a) Olee ajọ ihe nlereanya ụfọdụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ setịpụrụ? (b) Na gịnị ka anyị kwesịrị ilekwasị anya?

12 Ebe ọ bụ na ọbụna Ndị Kraịst kasị kwesị ntụkwasị obi ezughị okè, mgbe ohu Jehova a họpụtara ahọpụta mejọrọ ihe, ka anyị nọgide na-eme “ihe nile n’enweghị ntamu.” (Ndị Filipaị 2:14) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mwute ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ihe nlereanya ọjọọ nke mmadụ ole na ole nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ setịpụrụ! Dị ka Jud onye na-eso ụzọ si kwuo, ndị ozizi nke oge ahụ “na-eleda ịbụisi anya, na-ekwujọkwa ndị dị ebube.” Ọzọkwa, ndị mmehie ahụ bụ “ndị ntamu, ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ.” (Jud 8, 16) Ka anyị zere àgwà nke ndị mkpesa ma lekwasị anya n’ezi ihe ndị anyị na-enweta site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi.” Ka anyị jiri ezi ihe nke nzukọ Jehova kpọrọ ihe ma ‘nọgide na-eme ihe nile n’enweghị ntamu.’

“Okwu A Na-awụ Akpata Oyi”

13. Olee ihe ụfọdụ ndị mere mgbe ha nụrụ ozizi ụfọdụ nke Jizọs Kraịst?

13 Ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ tamuru ntamu megide ndị ohu a họpụtara ahọpụta, ma ndị ọzọ tamuru ntamu megide ozizi Jizọs. Dị ka Jọn 6:48-69 si kwuo, Jizọs kwuru, sị: “Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi.” Mgbe ha nụrụ okwu ndị a, “ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya . . . sịrị: ‘Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ igere ya?’” Jizọs maara na “ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu banyere nke a.” Ọzọkwa, “n’ihi nke a ọtụtụ n’ime [ha] laghachiri n’ihe ndị ha hapụrụ ahapụ, kwụsịkwa iso ya na-ejegharị.” Ma ọ bụghị ndị na-eso ụzọ ya nile tamuru ntamu. Lee ihe merenụ mgbe Jizọs jụrụ ndịozi 12 ahụ, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita onyeozi zara ya sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi; anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka ozizi ụfọdụ nke Ndị Kraịst ji akpasu ụfọdụ ndị iwe? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe banyere otu nwoke a kpọrọ Emanuel?

14 N’oge anyị a, ozizi ụfọdụ nke Ndị Kraịst akpasuwo mmadụ ole na ole n’etiti ndị Chineke iwe, ha emewokwa mkpesa megide akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova. N’ihi gịnị ka nke a ji eme? Ihe na-akpatakarị mkpesa dị otú ahụ bụ aghọtaghị ụzọ Chineke si eme ihe. Onye Okike anyị na-eji nwayọọ nwayọọ ekpughere ndị ya eziokwu. N’ihi ya, a ga na-agbaziwanye otú anyị si ghọta Akwụkwọ Nsọ site n’oge ruo n’oge. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ihi mgbazi dị otú ahụ. Mmadụ ole na ole n’ime ha ‘na-abụbiga ndị ezi omume ókè’ ma jụ mgbanwe ndị ahụ. (Eklisiastis 7:16) Nganga pụrụ iso kpata ya, ihe kpatakwaara ya ụfọdụ ndị bụ na ha malitere ịdabere n’echiche nke onwe ha. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ụdị ntamu ahụ na-emebi ihe, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ime ka anyị laghachi n’ụwa ma ọ bụ maliteghachi ime ihe otú ndị ụwa si eme.

15 Dị ka ihe atụ, Emanuel bụbu Onyeàmà nke na-akatọ ụfọdụ ihe ndị ọ gụrụ n’akwụkwọ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bipụtara. (Matiu 24:45) Ọ kwụsịrị ịgụ akwụkwọ anyị, ma mesịa gwa ndị okenye ọgbakọ ya na ya achọkwaghị ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Emanuel bịara chọpụta na ihe nzukọ Jehova na-akụzi bụ nnọọ eziokwu. Ọ kpọtụụrụ Ndịàmà, kweta mmejọ ya, a nabataghachikwa ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, ọ maliteghachiri inwe obi ụtọ.

16. Olee ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ banyere ụfọdụ ozizi Ndị Kraịst?

16 Gịnị ma a nwaa anyị ọnwụnwa ịtamu ntamu n’ihi obi abụọ anyị nwere banyere ozizi ụfọdụ nke ndị Jehova? Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị nwee ndidi. “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi” pụrụ imecha bipụta ihe ga-aza ajụjụ ndị anyị nwere ma mee ka anyị kwụsị inwe obi abụọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịchọ enyemaka nke ndị okenye ọgbakọ Ndị Kraịst. (Jud 22, 23) Ekpere, ọmụmụ ihe onwe onye, na mkpakọrịta nke anyị na ndị ji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe pụkwara inye aka mee ka anyị kwụsị inwe obi abụọ, ọ pụkwara ime ka anyị nwekwuo ekele maka eziokwu Bible ndị na-agba ume anyị mụtaworo site n’aka ndị Jehova ji na-ezi anyị ihe.

Nọgide Na-ele Ihe Anya n’Ụzọ Ziri Ezi

17, 18. Kama ịtamu ntamu, olee àgwà anyị kwesịrị inwe, n’ihi gịnịkwa?

17 N’ezie, ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ ime mmehie, ụfọdụ ndị pụkwara inwe ọchịchọ ime mkpesa ndị na-enweghị isi. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12) Ma ọ bụrụ na anyị abụrụ ndị na-eme mkpesa mgbe nile, anyị ga-etinye mmekọrịta anyị na Jehova Chineke n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịchịkwa ọchịchọ ọ bụla anyị nwere ịtamu ntamu.

18 Kama ịdị na-atamu ntamu banyere ihe ndị na-eme n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịnọgide na-ele ihe anya n’ụzọ ziri ezi ma na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị jiri ọrụ n’aka, nwee ọṅụ, na-atụ egwu Chineke, nwee echiche ziri ezi, ma gbasie ike n’okwukwe. (1 Ndị Kọrint 15:58; Taịtọs 2:1-5) Jehova na-achịkwa ihe nile na-eme n’ọgbakọ ya, Jizọs makwaara ihe nile na-eme n’ọgbakọ nke ọ bụla, otú ahụ o si mara na narị afọ mbụ. (Mkpughe 1:10, 11) Jiri ndidi chere Chineke na Kraịst, onye bụ́ Isi nke ọgbakọ. A pụrụ iji ezi ndị ọzụzụ atụrụ mee ihe idozi ihe ndị pụrụ ịdị mkpa ka e dozie.—Abụ Ọma 43:5; Ndị Kọlọsi 1:18; Titus 1:5.

19. Tupu Alaeze Chineke amalite ịchị ụmụ mmadụ n’ụzọ zuru ezu, olee ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya?

19 N’oge na-adịghị anya, ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-abịa ná njedebe, Alaeze Mezaịa ga-achịkwa ụwa n’ụzọ zuru ezu. Ka ọ dịgodị, lee ka o si dị mkpa ka anyị nile nọgide na-ele ihe anya n’ụzọ ziri ezi! Nke ahụ ga-enyere anyị aka ịmata àgwà ọma nke ndị kwere ekwe ibe anyị, kama ilekwasị anya n’àgwà ọjọọ ha. Ilekwasị anya n’àgwà ọma ha ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Kama ikwe ka ntamu kụda anyị obi, nke ahụ ga-agba anyị ume ma wusie anyị ike n’ọgbakọ.

20. Olee ngọzi ndị inwe echiche ziri ezi ga-eme ka anyị nweta?

20 Inwe echiche ziri ezi ga-emekwa ka anyị nwee ike icheta ọtụtụ ngọzi ndị anyị na-enweta n’ihi iso akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova na-akpakọrịta. Ọ bụ nanị ya bụ ọgbakọ dị n’ụwa nke na-ekwesị ntụkwasị obi nye Eze eluigwe na ala. Olee otú obi dị gị n’ihi nke ahụ na n’ihi ihe ùgwù i nwere iso ná ndị na-efe onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe? Ka àgwà gị dị ka nke Devid, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Gị onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute. Ihe na-agara ya nke ọma, bụ́ onye Ị na-ahọpụta, onye ị na-emekwa ka ọ bịaruo nso, ka o wee biri n’ogige Gị nile: ka afọ ju anyị n’ezi ihe nke ụlọ gị.”—Abụ Ọma 65:2, 4.

Ì Chetara?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee obi ụtọ n’ihi ndị na-edu ndú n’ọgbakọ?

• Olee ihe anyị kwesiri ime mgbe ndị na-edu ndú n’ọgbakọ mejọrọ ihe?

• Olee otú anyị kwesịrị isi lee mgbazi a na-agbazi otú anyị si ghọta Akwụkwọ Nsọ anya?

• Olee ihe ndị pụrụ inyere Onye Kraịst aka ịkwụsị inwe obi abụọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

Devid nyere Solomọn ụkpụrụ a ga-eji wuo ụlọ nsọ ahụ ma jiri obi ya nile kwado ezi ofufe

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-eji obi ụtọ enyere ndị mmadụ aka n’ofufe ha na-efe Chineke