Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nọgidenụ Na-eme Ihe n’Enweghị Ntamu’

‘Nọgidenụ Na-eme Ihe n’Enweghị Ntamu’

‘Nọgidenụ Na-eme Ihe n’Enweghị Ntamu’

“Nọgidenụ na-eme ihe nile n’enweghị ntamu.”—NDỊ FILIPAỊ 2:14.

1, 2. Olee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Ndị Kraịst nọ na Kọrint na ndị nke nọ na Filipaị, n’ihi gịnịkwa?

PỌL ONYEOZI jara nnọọ ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ dị na Filipaị mma n’akwụkwọ ozi o degaara ha n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ọ jara ndị kwere ekwe ibe ya nọ n’obodo ahụ mma n’ihi mmesapụ aka na ịdị uchu ha, o gosiri ọṅụ o nwere maka ọrụ ọma ha na-arụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl chetaara ha ka ha ‘nọgide na-eme ihe nile n’enweghị ntamu.’ (Ndị Filipaị 2:14) N’ihi gịnị ka onyeozi ahụ ji nye ha ndụmọdụ a?

2 Pọl maara ihe ntamu pụrụ iduba mmadụ na ya. Afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, o chetaara ọgbakọ dị na Kọrint na ịtamu ntamu pụrụ ịkpata ihe ọjọọ. Pọl kwuru na mgbe ndị Izrel nọ n’ọzara, ha kpasuru Jehova iwe ugboro ugboro. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inwe ọchịchọ ime ihe ọjọọ, site n’ikpere arụsị na ịkwa iko, site n’itinye Jehova n’ule, na site n’ịtamu ntamu. Pọl gbara Ndị Kọrint ume ka ha mụta ihe n’ihe atụ ndị a. O dere, sị: “Unu abụkwala ndị na-atamu ntamu, dị nnọọ ka ụfọdụ n’ime ha tamuru, wee bụrụ ndị onye mbibi ahụ lara n’iyi.”—1 Ndị Kọrint 10:6-11.

3. Gịnị mere okwu banyere ntamu ga-eji adọrọ mmasị anyị taa?

3 Dị ka ndị ohu Jehova nke oge a, anyị na-egosi mmụọ yiri nke ọgbakọ ahụ dị na Filipaị. Anyị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ, anyị nwekwara ịhụnanya n’etiti onwe anyị. (Jọn 13:34, 35) Ma, n’ihi ihe ọjọọ ịtamu ntamu kpataara ndị Chineke n’oge gara aga, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji chebara ndụmọdụ a echiche: “Nọgidenụ na-eme ihe nile n’enweghị ntamu.” Ka anyị buru ụzọ tụlee ndị tamuru ntamu e kwuru banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ahụ, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ anyị pụrụ ime iji ghara ikwe ka ntamu mebiere anyị ihe taa.

Nzukọ Ọjọọ Atamuo Ntamu Megide Jehova

4. Olee otú ndị Izrel si tamuo ntamu n’ọzara?

4 E ji okwu Hibru nke pụtara ‘ịtamu ntamu, ntakwu, ma ọ bụ ime mkpesa’ mee ihe na Bible n’ihe banyere ihe ndị mere mgbe ndị Izrel nọrọ afọ 40 n’ọzara. Mgbe ụfọdụ, ọnọdụ ndị Izrel nọ na ya ejughị ha afọ, ha gosipụtakwara ya site n’ịtamu ntamu. Dị ka ihe atụ, nanị izu ole na ole mgbe a napụtasịrị ha n’ịbụ ohu n’Ijipt, “nzukọ nile nke ụmụ Izrel wee tamuo ntamu megide Mozis, megidekwa Erọn.” Ndị Izrel mere mkpesa banyere nri, sị: “Ọ ga-adị anyị nnọọ mma ma a sị na anyị nwụrụrị n’aka Jehova n’ala Ijipt, mgbe anyị nọdụrụ n’akụkụ ite anụ, mgbe anyị rijuru nri afọ; n’ihi na unu emewo ka anyị pụta baa n’ọzara nke a, iwere agụụ mee ka mkpọkọta nke a nile nwụọ.”—Ọpụpụ 16:1-3.

5. Mgbe ndị Izrel tamuru ntamu, onye n’ezie ka ha na-atamu ntamu megide?

5 N’ezie, Jehova lekọtara ndị Izrel site n’igbo mkpa ha nile n’ọzara ahụ, jiri ịhụnanya nye ha nri na mmiri. Ọ dịtụghị mgbe agụụ chọrọ ịgụgbu ndị Izrel n’ọzara ahụ. Ma, n’ihi na ha enweghị afọ ojuju, ha bịara mee ka ndị ihe na-esiri oké ike ma malite ịtamu ntamu. Ọ bụ ezie na ọ bụ Mozis na Erọn ka ndị Izrel tamuru ntamu megide, ma Jehova weere ya na ọ bụ Ya ka ha tamuru ntamu ahụ megide. Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Jehova na-anụ ntamu unu onwe unu na-atamu megide Ya: ma anyị onwe anyị bụ gịnị? ha abụghị imegide anyị, bụ́ ntamu unu na-atamu, kama imegide Jehova.”—Ọpụpụ 16:4-8.

6, 7. Dị ka Ọnụ Ọgụgụ 14:1-3 gosiri, olee otú àgwà ndị Izrel si gbanwee?

6 Obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Izrel tamukwara ntamu ọzọ. Mozis zipụrụ ndị ikom 12 ịga ledoo Ala Nkwa ahụ. Mmadụ iri n’ime ha kọrọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ mgbe ha lọtara. Gịnị si n’ime ya pụta? “Ụmụ Izrel nile wee tamuo ntamu megide Mozis, megidekwa Erọn: nzukọ ahụ nile wee sị ha, Ọ ga-adị anyị nnọọ mma ma a sị na anyị anwụrụwo n’ala Ijipt, ma ọ bụ n’ọzara nke a! Ọ ga-adị anyị nnọọ mma ma a sị na anyị anwụrụwo! Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Jehova na-eme ka anyị baa n’ala nke a [Kenan], ịda site ná mma agha? Ndị inyom anyị na ụmụntakịrị anyị ga-aghọ ihe nlụta n’agha: ọ́ gaghị adị anyị mma ịlaghachi n’Ijipt?”—Ọnụ Ọgụgụ 14:1-3.

7 Lee ka àgwà ndị Izrel siworo gbanwee! Obi ụtọ ha nwere na mbụ maka ntọhapụ a tọhapụrụ ha n’Ijipt na nnapụta a napụtara ha n’Oké Osimiri Uhie kpaliri ha ịbụ abụ otuto nye Jehova. (Ọpụpụ 15:1-21) Otú ọ dị, mgbe ihe sitụụrụ ndị Chineke ike n’ọzara, ha amalitekwa ịtụ ndị Kenan ụjọ, ha kwụsịrị ikele Chineke ma malite ime mkpesa. Kama ikele Chineke maka ime ka ha nwere onwe ha, ha tara Ya ụta n’ihi ihe ha lere anya n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ahụhụ. N’ihi ya, ntamu ahụ ha tamuru gosiri na ha enweghị ezi ekele maka ihe ndị Jehova meere ha. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji sị: “Ruo ole mgbe ka M ga-anagide nzukọ ọjọọ nke a nke na-atamu ntamu megide m?”—Ọnụ Ọgụgụ 14:27; 21:5.

Ntamu na Narị Afọ Mbụ

8, 9. Kwuo ntamu ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

8 Ndị ahụ e kwuru tamuru ntamu n’elu bụ ìgwè mmadụ ndị o doro anya na ha kwupụtara enweghị afọ ojuju ha n’ihu ọha. Otú ọ dị, mgbe Jizọs Kraịst nọ na Jeruselem maka Ememe Ụlọ Ntu n’afọ 32 O.A., “ọtụtụ ndị n’etiti ìgwè mmadụ ahụ na-atakwunyere ibe ha okwu.” (Jọn 7:12, 13, 32) Ha nọ na-agba izu banyere Jizọs, ụfọdụ na-asị na ọ bụ ezigbo mmadụ, ndị ọzọ na-asị na ọ bụghị.

9 N’oge ọzọ, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gara n’ụlọ Livaị, ma ọ bụ Matiu, onye ọnaụtụ. “Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha malitere ịtamuru ndị na-eso ụzọ ya ntamu, na-asị: ‘Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ?’” (Luk 5:27-30) Na Galili, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, “ndị Juu malitere ịtamu ntamu megide [Jizọs] n’ihi na ọ sịrị: ‘Abụ m achịcha ahụ nke si n’eluigwe bịa.’” Ọbụna iwe were ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya n’ihi ihe ahụ o kwuru, ha malitekwara ịtamu ntamu.—Jọn 6:41, 60, 61.

10, 11. N’ihi gịnị ka ndị Juu na-asụ Grik ji tamuo ntamu, oleekwa otú ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụrụ isi rite uru n’ụzọ e si mee ihe banyere mkpesa ahụ?

10 Ntamu a tamuru ngwa ngwa Pentikọst afọ 33 O.A. gasịrị, ka rụpụta ezi ihe. Ọtụtụ ndị ọhụrụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị si n’ebe ndị na-abụghị Izrel nọ nnọọ na-eri ma na-aṅụ n’ihi ọbịa ndị kwere ekwe ibe ha nọ na Judia na-ele ha, ma nsogbu bilitere n’ihi otú e si ekesa ihe ndị e nwere. Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị: “Ndị Juu na-asụ Grik malitere ịtamu ntamu megide ndị Juu na-asụ Hibru, n’ihi na a na-eleghara ndị inyom ha di ha nwụrụ anya ná nkesa a na-eme kwa ụbọchị.”—Ọrụ 6:1.

11 Ndị a tamuru ntamu adịghị ka ndị Izrel ahụ nọ n’ọzara. Ndị Juu ahụ na-asụ Grik ejighị n’ihi ọdịmma onwe ha tamuo ntamu banyere ọnọdụ nke ha. Ha mere ka a mata anya a na-eleghara mkpa nke ụfọdụ ndị inyom di ha nwụrụ. Ọzọkwa, ndị ahụ tamuru ntamu akpataghị ọgba aghara ma kwugide Jehova. Ha kọọrọ ndịozi mkpa ha, bụ́ ndị mere ndokwa ka e gboo mkpa ahụ ozugbo n’ihi na mkpesa ha mere ziri ezi. Lee ka ndịozi ahụ si setịpụrụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa ezi ihe nlereanya! Ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ndị a na-akpachara anya ịghara ‘ikwuchipụ ntị ha n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike.’—Ilu 21:13; Ọrụ 6:2-6.

Zere Ihe Ọjọọ Ntamu Na-akpata

12, 13. (a) Nye ihe atụ nke ihe ntamu na-akpata. (b) Gịnị pụrụ ịkpali mmadụ ịtamu ntamu?

12 Ihe ka ọtụtụ n’ihe atụ ndị ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ anyị tụlere gosiri na ntamu kpataara ndị Chineke ọtụtụ ihe ọjọọ n’oge gara aga. N’ihi ya, anyị kwesịrị ichesi echiche ike banyere ihe ọjọọ nke ahụ pụkwara ịkpata taa. Otu ihe atụ pụrụ inyere anyị aka ịghọta ya. Ụdị ígwè dị iche iche na-ata nchara. Ọ bụrụ na e leghara ígwè anya mgbe ọ malitere ịta nchara, ọ pụrụ ịtagide nchara ruo mgbe ọ na-agaghịzi aba uru ọ bụla. Ihe mere e ji atụfu ọtụtụ ụgbọala abụghị na injin ha adịghịzi mma, kama ọ bụ n’ihi na ígwè ndị e ji mee ha ataala nnọọ nchara nke na ụgbọala ndị ahụ adịghịzi mma ọgbụgba. Olee otú anyị pụrụ isi jiri nke a tụnyere ịtamu ntamu?

13 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ ịtamu ntamu, dị nnọọ ka ụfọdụ ígwè si ata nchara. Anyị kwesịrị ịnọ na nche iji chọpụta mgbe ọchịchọ a pụtawara ìhè. Ahụhụ na-eme ka anyị nwekwuo ọchịchọ ịtamu ntamu ọbụna otú mmiri na nnu si eme ka ígwè taa nchara ngwa ngwa. Nchegbu pụrụ ime ka obere iwe ghọọ ọnụma. Ka ọnọdụ ndị mmadụ n’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a na-akawanye njọ, o yiri ka ihe ndị pụrụ ịkpata ntamu hà ga na-amụba. (2 Timoti 3:1-5) N’ihi ya, otu ohu Jehova pụrụ ịmalite ịtamu ntamu megide onye nke ọzọ. Ihe ndị pụrụ ịkpata ya nwere ike ịbụ obere ihe, dị ka mgbakasị ahụ́ n’ihi mmejọ, ikike, ma ọ bụ ihe ùgwù ndị onye nke ọzọ nwere.

14, 15. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chịkwaa ọchịchọ anyị nwere ịtamu ntamu?

14 N’agbanyeghị ihe kpasuru anyị iwe, ọ bụrụ na anyị emeghị ihe ọ bụla banyere ọchịchọ anyị nwere ịtamu ntamu, ọ pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị ọ na-adịghị ihe na-eju ha afọ ma mee ka anyị na-atamu ntamu mgbe nile. Ee, ntamu pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke kpamkpam. Mgbe ndị Izrel tamuru ntamu banyere ọnọdụ ha n’ọzara, ha gara n’ihu ruo n’ókè nke ịkatọ Jehova. (Ọpụpụ 16:8) Ka nke ahụ ghara ime anyị mgbe ọ bụla!

15 A pụrụ ibelata ígwè ịta nchara site n’ite ya nnọọ ágbá nakwa ịkụchasị ebe ndị ahụ tara nchara ma tee ha ágbá ozugbo a chọpụtara ha. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị achọwala ime mkpesa, anyị pụrụ ịchịkwa ọchịchọ ahụ site n’ikpegara Jehova ekpere banyere ya ozugbo. N’ụzọ dị aṅaa?

Na-ele Ihe Anya Otú Jehova Si Ele Ha

16. Olee otú anyị pụrụ isi merie ọchịchọ anyị nwere ime mkpesa?

16 Ịtamu ntamu na-eme ka anyị na-eche banyere nanị onwe anyị na nsogbu anyị, na-emekwa ka anyị leghara ngọzi ndị anyị na-enweta dị ka Ndịàmà Jehova, anya. Ọ bụrụ na anyị achọọ ịkwụsị ime mkpesa, ọ dị anyị mkpa iburu ngọzi ndị a n’obi mgbe nile. Dị ka ihe atụ, onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. (Aịsaịa 43:10) Anyị na Jehova pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya, anyị pụrụ ịgwa ya okwu mgbe ọ bụla dị ka “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2; Jems 4:8) Anyị na-ebi ndụ nwere nnọọ nzube ugbu a n’ihi na anyị ghọtara ihe iseokwu ọbụbụeze eluigwe na ala ma na-echeta na anyị nwere ihe ùgwù nke ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (Ilu 27:11) Anyị pụrụ ikerechi òkè anya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst na-eme ka anyị nwee akọnuche dị ọcha. (Jọn 3:16) Ihe ndị a bụ ngọzi ndị anyị na-enweta n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla anyị pụrụ ịnọ na ya.

17. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbalịa ịdị na-ele ihe anya otú Jehova si ele ha, ọbụna ma a sị na e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa?

17 Ka anyị gbalịa ịdị na-ele ihe anya otú Jehova si ele ha, ọ bụghị nanị otú anyị si ele ha. Ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) A sịgodị na e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji eme mkpesa, Jehova maara banyere ya. Ọ pụrụ idozi okwu ahụ ozugbo. Gịnịzi mere o ji ekwe mgbe ụfọdụ ka anyị nọgide na-ata ahụhụ? Ọ pụrụ ịbụ iji nyere anyị aka ịzụlite àgwà ọma ndị dị ka ntachi obi, ndidi, okwukwe, na ogologo ntachi obi.—Jems 1:2-4.

18, 19. Nye ihe atụ nke otú a pụrụ isi die ihe isi ike n’emeghị mkpesa.

18 Anyị idi ihe isi ike n’emeghị mkpesa abụghị nanị na ọ na-emezikwu àgwà anyị, kamakwa, ọ pụrụ ime ka ndị na-ahụ anyị nwee mmasị n’àgwà anyị. N’afọ 2003, otu ìgwè Ndịàmà Jehova ji bọs mee njem si Germany gaa Hungary maka mgbakọ distrikti. Onye na-anya bọs ahụ abụghị Onyeàmà, ọ kachakwaghị ya obi iso Ndịàmà nọọ ụbọchị iri. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke njem ahụ, ọ gbanwere obi ya kpamkpam. N’ihi gịnị?

19 Ọ dị ọtụtụ ihe na-agaghị otú e chere ha na njem ahụ. Ma, Ndịàmà ahụ adịtụghị mgbe ha mere mkpesa. Onye ọkwọ ụgbọala ahụ sịrị na ha bụ ndị njem kasị mma ya buturula! N’ezie, o kwere nkwa na mgbe ọzọ Ndịàmà bịara n’ụlọ ya, na ya ga-anabata ha ma gee ha ntị nke ọma. Lee ka ndị ahụ o bu si dọta mmasị ya site ‘n’ime ihe nile n’enweghị ntamu’!

Mgbaghara Na-eme Ka A Dị n’Otu

20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-agbaghara ibe anyị?

20 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa megide onye kwere ekwe ibe anyị? Ọ bụrụ na okwu ahụ dị oké mkpa anyị kwesịrị iji ụkpụrụ dị n’okwu Jizọs, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 18:15-17, mee ihe. Ma, nke a agaghị adị mkpa mgbe nile, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná mkpesa ndị anyị na-enwe ime bụ banyere obere ihe. Gịnị ma i lee ọnọdụ ahụ anya dị ka ohere i nwere iji gbaghara mmadụ? Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) Ànyị dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ? Jehova ó nweghị ezi ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa banyere anyị? N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-emere anyị ebere ma na-agbaghara anyị ugboro ugboro.

21. Olee otú ntamu pụrụ isi metụta ndị na-ege ya?

21 N’agbanyeghị ụdị iwe pụrụ ịdị na-ewe anyị, ntamu agaghị edozi okwu ahụ. Okwu Hibru nke pụtara “ịtamu ntamu” pụkwara ịpụta “ime mkpesa.” Ma eleghị anya, ahụ́ adịghị eru anyị ala ịnọ n’ebe onye na-atamu ntamu mgbe nile nọ, anyị na-agbalịkwa ịghara ịkpa ya nso. Otú ahụ ahụ́ na-adịghị eru anyị ala ma anyị na onye na-atamu ntamu mgbe nile nọrọ ka ọ na-adịkwa ndị na-ege anyị ntị ma ọ bụrụ na anyị ana-atamu ntamu ma ọ bụ na-eme mkpesa mgbe nile. N’ezie, ọ pụrụ ịgbakasị ha ahụ́ ruo n’ókè nke na ha ga na-eze anyị eze! Ime mkpesa pụrụ ime ka ndị ọzọ gee anyị ntị, ma ọ gatụghị eme ka ha ghọọ ndị enyi anyị.

22. Gịnị ka otu nwa agbọghọ kwuru banyere Ndịàmà Jehova?

22 Ịgbaghara ndị ọzọ mmehie ha na-eme ka a dịrị n’otu—nke bụ́ ihe ndị ohu Jehova ji kpọrọ oké ihe. (Abụ Ọma 133:1-3) N’otu mba dị na Europe, otu nwa agbọghọ onye Katọlik dị afọ 17 degaara alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova akwụkwọ iji gosi mmasị o nwere n’ebe Ndịàmà nọ. O kwuru, sị: “Ọ bụ ya bụ nanị òtù m maara na ịkpọasị, anyaukwu, ekweghị ibe nọrọ, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ma ọ bụ adịghị n’otu adịghị ekewa ndị nọ na ya.”

23. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Ekele anyị nwere maka ngọzi ime mmụọ nile anyị na-enweta dị ka ndị na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe ga-enyere anyị aka ime ka anyị dịrị n’otu ma zere ịtamu ntamu megide ndị ọzọ banyere ihe ndị dịịrị ha. Isiokwu na-eso nke a ga-egosi anyị otú àgwà ndị Chineke na-akụziri anyị inwe ga-esi gbochie anyị ịtamu ụdị ntamu kadị njọ—ya bụ, ịtamu ntamu megide akụkụ elu ala nke nzukọ Jehova.

Ì Chetara?

• Olee ihe ndị ịtamu ntamu gụnyere?

• Olee ihe a pụrụ iji mee ihe atụ nke mmetụta ntamu na-enwe?

• Olee ihe pụrụ inyere anyị aka imeri ọchịchọ anyị nwere ịtamu ntamu?

• Olee otú anyị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ pụrụ isi nyere anyị aka ịghara ịtamu ntamu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 14]

Ndị Izrel tamuru nnọọ ntamu megide Jehova!

[Foto dị na peeji nke 17]

Ị̀ na-agbalị ile ihe anya otú Jehova si ele ha?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ịgbaghara ndị ọzọ mmehie ha na-eme ka Ndị Kraịst dịrị n’otu