Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Site Taa Gawa, Ekwerela M na Chineke Dị”

“Site Taa Gawa, Ekwerela M na Chineke Dị”

“Site Taa Gawa, Ekwerela M na Chineke Dị”

OTU nwanyị onye Ukraine aha ya bụ Alexandra, nke bi na Prague, Czech Republic, si ọrụ na-ala otu ụbọchị. Mgbe o rutere n’otu ebe ụgbọala na-akwụsị, ọ hụrụ otu obere akpa ka a na-agbagharị ya ụkwụ. Mgbe ọ tụtụlitere akpa ahụ ma nyoba anya n’ime ya, o kwetaghị ihe anya ya hụrụ. Ọ hụrụ ùkwù akwụkwọ ego koruna 5,000! Ọ dịghị onye nọ ya nso yiri ka ọ̀ na-achọ akpa ahụ. Ebe ọ bụ na Alexandra bụ onye ala ọzọ bi na Czech Republic, inweta ihe ọ ga-eri na-esiri ya ike. Gịnị ka ọ ga-eme?

Mgbe Alexandra lọrutere ụlọ, o gosiri nwa ya nwanyị, bú Victoria, akpa ahụ. Ha chọgharịrị n’ime akpa ahụ ma hà ga-ahụ aha na adres nke onye nwe ya, ma ọ dịghị nke ha hụrụ. Otú ọ dị, e nwere otu mpempe akwụkwọ dị n’ime akpa ahụ nke e dere nọmba ụfọdụ na ya. E dere otu nọmba ihe ndekọ ego n’otu akụkụ nke mpempe akwụkwọ ahụ, n’akụkụ ya nke ọzọ, e nwere nọmba ndị ọzọ. E nwekwara mpempe akwụkwọ dị n’ime akpa ahụ nke e dere ihe a ga-enye otu ụlọ akụ̀ dị n’obodo ahụ na otu mpempe akwụkwọ nke e dekwasịrị n’elu ya “koruny 330,000” (ihe dị ka $10,000, U.S.). Nke ahụ bụ kpọmkwem ego ole dị n’ime akpa ahụ.

Alexandra gbalịrị iji ihe o chere bụ́ nọmba fon ọ hụrụ n’akpa ahụ kpọọ ụlọ akụ̀ ahụ, ma o nweghị isi. N’ihi ya, ya na nwa ya nwanyị gara n’ụlọ akụ̀ ahụ ma kọọrọ ha ihe merenụ. Ha jụrụ ajụjụ banyere nọmba ihe ndekọ ego ahụ ha hụrụ n’ime akpa ahụ. Otú ọ dị, ụlọ akụ̀ ahụ enweghị ihe ndekọ ego nwere nọmba ahụ. N’echi ya, Alexandra ji nọmba ọzọ dị n’ime akpa ahụ lọghachi. N’ezie, e nwere nwanyị na-etinye ego n’ụlọ akụ̀ ahụ onye nke ahụ bụ nọmba ihe ndekọ ego ya. Alexandra na Victoria kpọtụụrụ nwanyị ahụ, nwanyị ahụ kwetakwara na ego ahụ funahụrụ ya. Mgbe ha nile mechara hụ onwe ha, nwanyị ahụ kelere ha nke ọma ma jụọ ha, sị, “Ego ole ka m ga-akwụ unu maka iweghachiri m ego a?”

Victoria zara ya, sị: “Ọ dịghị ego ị ga-akwụ anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ego ahụ, anyị gaara ewere ya.” O ji obere asụsụ Czech ọ mụtara kọwaara ya, sị: “Ihe mere anyị ji weghachiri gị ego a bụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Akọnuche anyị e ji Bible zụọ anaghị ekwe anyị iwere ihe na-abụghị nke anyị.” (Ndị Hibru 13:18) Nwanyị ahụ ji ọṅụ kwuo, sị, “Site taa gawa, ekwerela m na Chineke dị.”