Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Dịghị Akwanyere Ọtụtụ Ndị Ùgwù Ruuru Ha

A Dịghị Akwanyere Ọtụtụ Ndị Ùgwù Ruuru Ha

A Dịghị Akwanyere Ọtụtụ Ndị Ùgwù Ruuru Ha

“N’oge nile m nọrọ n’ogige ịta ahụhụ, ọ dịghị ụzọ ọ bụla a na-esighị kparịa ndị mmadụ.”—MAGDALENA KUSSEROW REUTER, ONYE DỊ NDỤ PỤTA N’OGIGE ỊTA AHỤHỤ NDỊ NAZI.

N’AGBANYEGHỊ na arụ ndị Nazi kpara n’ogige ịta ahụhụ ha n’Agha Ụwa nke Abụọ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, nke ahụ abụghị mgbe mbụ ọ bụghịkwa mgbe ikpeazụ e mesoro ndị mmadụ ihe n’ụzọ mkparị. Ọ bụrụ na anyị enyochaa ihe ndị mere n’oge gara aga na ndị nke na-eme ugbu a, anyị ga-ahụ nnọọ otu ihe a doro anya: Ọ dịwo anya ụmụ mmadụ nọworo na-akparị ibe ha.

Otú ọ dị, iji obi ọjọọ emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ mkparị akwụsịghị n’ihe ndị mere n’oge gara aga. A ka na-ahụ ha n’ụzọ dịgasị iche iche na-apụtachaghị ìhè. Cheedị banyere nwatakịrị nke a na-eme akaje n’ihi otú ụkwụ, aka, ma ọ bụ ahụ́ ya dị. Ma ọ bụ onye si mba ya kwagaa mba ọzọ bụ́ onye a na-eme akaje n’ihi omenala obodo ya. Ma ọ bụ onye a na-asọ oyi n’ihi ụcha akpụkpọ ahụ́ ya ma ọ bụ n’ihi mba o si na ya. Ndị na-eme omume ndị dị otú a pụrụ iwere ya dị ka ihe egwuregwu, ma obi mgbawa na mkparị omume dị otú ahụ na-ewetara ndị a na-emeso ya abụghị ihe ọchị.—Ilu 26:18, 19.

Gịnị Bụ Ùgwù Mmadụ?

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara ùgwù dị ka ‘mmadụ inwe mmetụta na ya bara uru, na a na-asọpụrụ ya, ma ọ bụ na e ji ya kpọrọ ihe.’ N’ihi ya, ùgwù mmadụ gụnyere ma otú anyị si ele onwe anyị anya ma otú ndị ọzọ si emeso anyị ihe. Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe pụrụ imetụta otú anyị si ele onwe anyị anya, ihe ndị ọzọ na-eche banyere anyị na otú ha si emeso anyị ihe na-emetụta ọnọdụ anyị ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị.

E nwere ndị ogbenye, ndị na-enweghị onye na-agbachitere ha na ndị na-enweghị ka ọ ha ha n’ebe nile. Otú ọ dị, ịnọ n’ọnọdụ ndị dị otú a adịchaghị eme ka mmadụ na-ele onwe ya anya dị ka onye na-abachaghị uru. Ọ bụ otú ndị ọzọ si emeso ibe ha ihe pụrụ ime ka ọ dị ụfọdụ ka ha abaghị uru. Ọ dị nnọọ mwute na ọ bụ ndị nọ n’ọnọdụ kwesịrị imere ebere ka a na-emesokarị ihe n’ụzọ mkparị. Okwu ndị dị ka “onye na-abaghị uru,” “onye na-erughị inweta ihe,” nakwa “onye iberibe” bụ okwu mkparị ndị a na-agwakarị ndị agadi, ndị ogbenye, ma ọ bụ ndị isi ma ọ bụ ahụ́ na-ezuchaghị okè.

Olee ihe mere ndị mmadụ ji akparịkarị ibe ha? Ọ̀ dị mgbe a ga na-akwanyere mmadụ nile ùgwù ruuru ha? Isiokwu na-esonụ na-enye azịza na-eju afọ sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.