Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú anyị si mara na amamihe ahụ a kọwara n’Ilu 8:22-31 na-ekwu banyere Jizọs Kraịst mgbe ọ na-abịabeghị n’ụwa dị ka mmadụ?

Nkọwa ahụ e ji ike mmụọ nsọ kọwaa amamihe, bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Ilu na-agụ, sị: “Jehova nwere m ná mmalite ụzọ Ya, tupu ọrụ Ya nile site na mgbe ahụ. . . . Tupu e mee ka ntọala ugwu nile bamie n’ala, tupu ugwu nta nile adị ka a mụpụtara m: . . . mgbe O doziri eluigwe, n’ebe ahụ ka m nọ: . . . anọkwa m n’akụkụ Ya, dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile; . . . ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a apụghị ịdị na-ekwu banyere amamihe Chineke ma ọ bụ amamihe nkịtị. N’ihi gịnị? N’ihi na e kere amamihe a na-ekwu okwu ya n’ebe a eke dị ka mmalite nke ụzọ Jehova. Jehova Chineke nọ kemgbe ụwa, ọ dịghịkwa mgbe amamihe kọrọ ya. (Abụ Ọma 90:1, 2) Amamihe ya enweghị mmalite; e keghịkwa amamihe ya eke. ‘A mụpụtaghị ya amụpụta.’ Ọzọkwa, e kwuru na amamihe a na-ekwu okwu ma na-eme ihe, nke na-egosi na ọ bụ onye.—Ilu 8:1.

Akwụkwọ Ilu kwuru na ọ dịwo anya amamihe a nọwara n’akụkụ Jehova, bụ́ Onye Okike, dị ka “onye ọkà.” Nke ahụ n’ezie na-egosi na ọ bụ Jizọs. Ogologo oge tupu Jizọs abịa n’ụwa, o soro Jehova rụchie ọrụ anya nke na Okwu Chineke sịrị: “Ọ dị tupu ihe ndị ọzọ nile, e mekwara ka ihe ndị ọzọ nile dịrị site n’aka ya.”—Ndị Kọlọsi 1:17; Mkpughe 3:14.

Ịkọwa Ọkpara Chineke dị ka amamihe kwesịrị nnọọ ekwesị, ebe ọ bụ na ọ bụ Ya bụ onye kpugheere anyị nzube na iwu Jehova ndị amamihe dị na ha. Tupu Jizọs aghọọ mmadụ, ọ bụ Okwu ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke. (Jọn 1:1) A kọwara ya dị ka “ike nke Chineke na amamihe nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 1:24, 30) Lee nnọọ otú e si kọwaa Ọkpara Chineke n’ụzọ mara mma, bụ́ onye nyefere ndụ ya iji gbapụta ụmụ mmadụ n’ihi na ihe banyere ha na-atọ ya ụtọ!—Jọn 3:16.

[Foto dị na peeji nke 31]

“Tupu . . . ugwu nile . . . adị ka a mụpụtara m”