Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Jikọọ Ezinụlọ Anyị Ọnụ n’Ikpeazụ!

E Jikọọ Ezinụlọ Anyị Ọnụ n’Ikpeazụ!

Akụkọ Ndụ

E Jikọọ Ezinụlọ Anyị Ọnụ n’Ikpeazụ!

DỊ KA SUMIKO HIRANO SI KỌỌ

Achọtawo m ụzọ kasị isi bie ndụ, achọkwara m ka di m sonyere m. Afọ iri anọ na abụọ ga-agafe tupu nke ahụ emee.

MỤ NA di m lụrụ na 1951, mgbe m dị afọ iri abụọ na otu. Anyị mụtara ụmụ abụọ n’ime afọ anọ sochirinụ, o yiri nnọọ ka m nwere obi ụtọ ná ndụ.

Otu ụbọchị na 1957, nwanne m nwanyị nke tọrọ m gwara m na otu onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na-abịa eleta ya. Ọ bụ ezie na nwanne m nwanyị bụ onye Buddha, ọ malitere iso onye ozi ala ọzọ ahụ na-amụ Bible, ọ gbakwara m ume ka m mụwa Bible. Ekwetara m. Echere m na ebe ọ bụ na m bụ onye Protestant, m ga-enwe ike ịgwa Ndịàmà Jehova ihe ndị na-abụghị eziokwu n’ime ihe ndị ha na-akụzi.

N’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na ihe m maara na Bible dị nnọọ nta. O nwere mgbe m jụrụ onye ozi ala ọzọ ahụ, sị, “Ònye bụ Jehova a?” Anụtụbeghị m ka e ji aha ahụ mee ihe na chọọchị m. Onye ozi ala ọzọ ahụ nke aha ya bụ Daphne Cooke (onye mechaziri zawa Pettitt), gụụrụ m Aịsaịa 42:8, bụ́ ebe kwuru hoo haa na Jehova bụ aha Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. Daphne jiri Bible zaa ajụjụ m nile.

Ajụrụ m onye ụkọchukwu nke chọọchị m ajụjụ ndị ahụ m jụrụ Daphne. Ọ gwara m, sị: “Ịjụ ajụjụ bụ mmehie. Nanị kwere ihe a gwara gị.” Ọ bụ ezie na echeghị m na ịjụ ajụjụ bụ mmehie, ruo ọnwa isii, agara m chọọchị n’ụtụtụ Sunday ọ bụla ma gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’ehihie.

Otú nke A Si Metụta Alụmdi na Nwunye M

Ihe m na-amụta na Bible tọrọ m ụtọ, ana m akọkwara ya di m, bụ́ Kazuhiko. Ana m akọrọ ya ihe ndị m mụtara mgbe ọ bụla m mụsịrị Bible na mgbe ọ bụla m lọtara ọmụmụ ihe. Nke a mere ka mụ na ya nwetụwa esemokwu. Ọ chọghị ka m ghọọ Onyeàmà Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ịmụ Bible na-atọ m nnọọ ụtọ nke na m gara n’ihu n’ọmụmụ ihe m ma soro Ndịàmà na-akpakọrịta.

Tupu mụ agawa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ọ bụla, ana m esiri Kazuhiko nri kasị amasị ya, ma ọ malitere ịdị na-aga eri nri n’ụlọ nri. Obi anaghị adị ya mma ma m lọta ọmụmụ ihe, ọ dịghịkwa atụpụrụ m ọnụ. Obi na-adịtụ ya mma ma ọ bụrụ na abalị abụọ ma ọ bụ atọ agaa, ma ọ bụkwanụ mgbe ahụ obi dịtụrụ ya mma ka m kwesịrị ịga ọmụmụ ihe ọzọ.

N’oge a, amalitere m ịrịa ụkwara nta, bụ́ ọrịa nke gburula ọtụtụ mmadụ n’ezinụlọ di m. Nke a nyere Kazuhiko nsogbu n’obi nke ukwuu, ọ gwakwara m na m pụrụ ime ihe ọ bụla m chọrọ ma ọ bụrụ na mụ agbakee. Nanị ihe m rịọrọ ya bụ ka ọ ghara igbochi m ịdị na-aga nzukọ ndị ahụ a na-enwe kwa izu. O kwere.

O were m ọnwa isii iji gbakee, ma ejiri m oge ahụ mụọ nnọọ Bible. Elere m ma m̀ ga-achọta ebe ozizi Ndịàmà na-emegiderịta onwe ha, nke na ọ bụrụgodị na m achọta nanị otu, m ga-akwụsị ịmụ ihe. Ọ dịghị nke m chọtara. Kama nke ahụ, achọpụtara m na ọ bụ ndị Chọọchị Protestant na-ezi ozizi ndị na-emegiderịta onwe ha. Abịara m ghọta na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi, ahụkwara m na idebe iwu ya bara uru.

Mgbe m gbakechara, di m mezuru nkwa o kwere, ọ dịghịzikwa egbochi m ịga ọmụmụ ihe. Anọgidere m na-eme ka mmekọrịta mụ na Chineke sikwuo ike, na May 1958, e mere m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ gụsiri m agụụ ike ka ezinụlọ m sonyere m n’ife ezi Chineke ahụ.

Inyere Ụmụ M Aka Inwe Ọganihu Ime Mmụọ

Mụ na ụmụ m na-esokarị aga ọmụmụ ihe na ozi ọma, ma e nwere ihe ụfọdụ merenụ bụ́ ndị mere ka m kweta na ha na-aghọta ihe ha na-amụta na Bible. Otu ụbọchị, nwa m nwoke dị afọ isii, bụ́ Masahiko, nọ na-egwuri egwu n’ámá. Anụrụ m oké ụzụ na onye na-eti mkpu. Otu onye agbata obi m tiiri mkpu gbabata n’ụlọ m ma kwuo na ụgbọala akụtuola nwa m. Ajụrụ m ya, sị, ọ̀ nwụọla? Agbalịrị m jide onwe m ka m na-agbapụ èzí. Mgbe m hụrụ ịnyịnya ígwè ya kụrisiri akụrisị, ụjọ jidere m, mgbe ahụ, ahụziri m ka ọ na-abịakwute m, o merụtụrụ ahụ́. Ọ gbakụrụ m ma kwuo, sị, “Mama, ọ bụ Jehova nyeere m aka, ọ̀ kwa ya?” Ịhụ na ọ dị ndụ na ịnụ okwu ndị a magburu onwe ha o kwuru mere ka anya mmiri gbapụ m n’anya.

N’ụbọchị ọzọ anyị nọ na-aga ozi ọma, anyị gakwuru otu agadi nwoke bụ́ onye tiri mkpu, sị: “Olee ihe mere iji na-adọkpụgharị nwatakịrị otú a sị na ị na-aga ozi ọma? Ebere ya na-eme m.” Tupu m zaghachi, Tomoyoshi dị afọ asatọ gwara ya, sị: “Papa ukwu, mama m adịghị amanye m ikwusa ozi ọma. Ana m ekwusa ozi ọma n’ihi na achọrọ m ijere Jehova ozi.” Agadi nwoke ahụ legidere ya anya n’ekwughị ihe ọ bụla ọzọ.

Ụmụ m enweghị nna n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị m n’ubu ịkụziri ha eziokwu Bible, ọ bụ ezie na m ka nwekwara ọtụtụ ihe m na-amụtabeghị. Abịara m nwee ịhụnanya na okwukwe n’ebe Jehova nọ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi. Agbalịkwara m isetịpụrụ ha ezi ihe nlereanya. Ana m ekele Jehova kwa ụbọchị n’ihu ụmụ m. Ana m akọrọ ha ahụmahụ ndị m nwetara n’ozi ubi. Nke a gbara ha ume. Mgbe e mesịrị jụọ ha ihe mere ha ji ghọọ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ha zara, sị, “Anyị hụrụ na ọrụ ọsụ ụzọ na-enye mama anyị ọṅụ, anyị chọkwara inwe ọṅụ.”

Ana m agbalịsi ike ịghara ịkatọ papa ha ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ nọ n’ọgbakọ. Abịara m chọpụta na mụ ịkatọ ndị ọzọ pụrụ imetụta ụmụ m n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ pụrụ ime ka ha ghara ịkwanyere ma onye ahụ a na-akatọ ma onye na-akatọ akatọ ùgwù.

Imeri Ihe Ndị Na-egbochi Ọganihu Ime Mmụọ

Na 1963, ọrụ di m mere ka anyị kwaga Taiwan. Ọ gwara m na m ga-akpata nsogbu ma ọ bụrụ na m ekwusawara ndị Japan nọ n’ógbè ahụ ozi ọma. Ọ ga-eme ka e zighachi anyị Japan, nke ahụ ga-akpatakwara ụlọ ọrụ ya nsogbu. Ọ chọghị ka anyị na Ndịàmà na-akpakọrịta.

Na Taịwan, a na-eji Chinese eduzi ọmụmụ ihe nile. Ndịàmà nọ ebe ahụ, nabatara anyị nke ọma. Ekpebiri m ịmụ Chinese ka m wee nwee ike ịdị na-agbara ndị obodo ahụ àmà kama ịgbara ndị Japan. Apụrụ m isi otú a zere nsogbu ndị ahụ di m kwuru banyere ha.

Mkpakọrịta nke anyị na Ndịàmà nọ na Taiwan wusiri anyị ike. Otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ aha ha bụ́ Harvey na Kathy Logan nyeere anyị nnọọ aka. Nwanna Logan ghọọrọ ụmụ m nna n’ụzọ ime mmụọ. O gosiri ha na ijere Jehova ozi abụghị ihe na-adịghị eweta ọṅụ na ihe na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ekwetara m na ọ bụ na Taiwan ka ụmụ m nọ kpebie ijere Jehova ozi.

Tomoyoshi na Masahiko gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị America dị na Taiwan, bụ́ ebe ha nọrọ mụọ Bekee na Chinese. Ụlọ akwụkwọ ahụ ha gara kwadebere ha maka ozi ha ga-eje n’ọdịnihu dị ka ndị ozi nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ana m ekele nnọọ Jehova maka ịgbanwe ihe gaara abụrụ anyị oge siri ike ka ọ bụrụ oge na-eweta ngọzi ndị na-adịgide adịgide. Ka ezinụlọ anyị nọsịrị afọ atọ na ọkara na Taiwan, anyị laghachiri Japan. Afọ ndị ahụ bụ afọ ndị anyị na-agaghị echefu echefu.

Ugbu a, ụmụ m dị afọ iri na ụma, ha na-achọkwa ịnọrọ onwe ha. Ejiri m ọtụtụ awa soro ha tụgharịa uche n’ụkpụrụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, Jehova nyekwaara ha aka ịgafe oge ahụ siri nnọọ ike. Tomoyoshi malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị. O nyeere mmadụ anọ aka ịrara onwe ha nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptizim n’afọ ole na ole ndị mbụ ọ malitere ịsụ ụzọ. Masahiko gbasoro nzọụkwụ nwanne ya nwoke ma malite ịsụ ụzọ ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị. O nyeere mmadụ anọ na-eto eto aka ịghọ Ndịàmà n’afọ anọ ndị mbụ ọ malitere ịsụ ụzọ.

Jehova gọzikwuru ụmụ m. Tomoyoshi mụụrụ di nke otu nwanyị m nyeere aka ịmụta eziokwu Bible ihe. Ụmụ ha ndị nwanyị abụọ ghọkwara Ndịàmà. Tomoyoshi mesịrị lụọ nke okenye, aha ya bụ Nobuko, Masahiko lụkwara nke nta, aha ya bụ Masako. Tomoyoshi na Nobuko na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Masahiko na Masako na-ejekwa ozi ala ọzọ na Paraguay.

Di M Ejiri nke Nta nke Nta Mee Mgbanwe

Di m enweghị mmasị n’okpukpe anyị n’afọ ndị mbụ ahụ, ma anyị hụrụ ihe àmà ndị na-egosi na ọ gbanwewala. Mgbe ndị ọzọ na-emegide m, ọ na-agbachitere ihe ndị m kwere ma kwado nnọọ eziokwu Bible n’amaghị ama. O nyeere Ndịàmà nọ ná mkpa aka. N’okwu dị mkpirikpi o kwuru n’agbamakwụkwọ nke otu n’ime ụmụ anyị, o kwuru, sị: “Ọrụ kasị mma e nwere bụ ịkụziri ndị mmadụ ụzọ kasị mma isi bie ndụ, ọ bụkwa ya kasị sie ike. Ụmụ m na ndị nwunye ha ahọrọwo ọrụ a sikarịsiri ike dị ka ọrụ ha ga-arụ. Biko nyerenụ ha aka.” Ihe ndị a nile mere ka m chewe na ọ ga-esorịrị anyị jeere Jehova ozi.

Emere m ndokwa ka Ndịàmà ibe m na-abịa n’ụlọ anyị ka ya na ha na-anọrị. Ana m akpọ Kazuhiko ka ọ bịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na mgbakọ, na-akpọkwa ya ka ọ bịa n’oge a na-echeta ọnwụ Kraịst. Ọ na-abịa ha mgbe ọrụ ya kwere ya, ọ bụ ezie na o jighị obi ya abịa. Ọtụtụ mgbe, echere m na o nwere ike ikwe ka a mụọrọ ya Bible, ya mere, agwara m ndị okenye ka ha na-abịa n’ụlọ anyị. Ma ọ jụrụ na ya agaghị amụ. Anọ m na-eche ihe bụ́ nsogbu ya.

Okwu Pita onyeozi gbatara m n’uche: “Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, ka, ọ bụrụ na o nwere ndị na-adịghị erubere okwu ahụ isi, e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nke nwunye ha, n’ihi ịbụ ndị jiworo anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.” (1 Pita 3:1, 2) Achọpụtara m na ọ bụghị mgbe nile ka m gbasoro ndụmọdụ ahụ. Iji mezuo nnọọ ihe a Pita kwuru, ọ dị m mkpa ime ka mmekọrịta mụ na Jehova sikwuo ike.

Na 1970, amalitere m ịsụ ụzọ iji mee ka mmekọrịta mụ na Jehova sikwuo ike. Afọ iri gafere, afọ iri abụọ agafeekwa, ma ọ dịghị mgbanwe ọ bụla di m mere ife Jehova. Otu oge, onye m na-amụrụ Bible gwara m, sị: “Ama m na ọ ga-esiri gị ike inyere ndị ọzọ aka ebe ị na-enwedịghị ike inyere di gị aka.” Nke ahụ kụdara m mmụọ, ma o meghị ka m kwụsị ozi m.

Ka ọ na-erule ná mgwụsị nke afọ ndị 1980, ndị mụrụ anyị akala ezigbo nká. Ilekọta ha na ịrụzu ọrụ ndị ọzọ dịịrị m ghọrọ ihe na-agwụ nnọọ ike. Ruo ọtụtụ afọ, ha nile megidere nkwenkwe m dị ka Onye Kraịst, ma agbalịrị m igosi ha ịhụnanya ókè m nwere ike. Tupu mama m dị afọ iri itoolu na isii anwụọ, ọ gwara m, sị: “Sumiko, ọ bụrụ na a kpọlite m n’ọnwụ, aga m esonyere okpukpe gị.” Nke a mere ka m ghọta na mgbalị ndị m mere aghọbeghị ihe efu.

Di m hụrụ ihe nile m meere ndị mụrụ anyị. Iji gosi na obi dị ya ụtọ, ọ malitere bịachiwe ọmụmụ ihe anya. O mere nke a ruo ọtụtụ afọ ma ọ dịghị ezigbo ọganihu o nwere n’ijere Jehova ozi. Anọgidere m na-agbalị ime ihe ga-amasị ya. Ana m akpọ ma ndị enyi ya ma ndị si mba ọzọ ya na ha na-achụkọ nta ego oriri n’ụlọ anyị. Ana m eso ya ma ọ gawa ịtụrụ ndụ. Mgbe e wetulatara awa a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ ruo n’awa iri asaa kwa ọnwa, oge m ji anọnyere ya bịara bukwuo ibu.

Ịla Ezumike Nká Eweta Mgbanwe

Di m lara ezumike nká na 1993. Echere m na ọ ga-enwezi ohere ịmụ Bible. Ma o kwuru na ife Chineke nanị n’ihi na ya nwere ohere ga-abụ ịkparị Chineke. Kama nke ahụ, o kwuru na ya ga-efe Chineke mgbe obi ya kpaliri ya ime otú ahụ nakwa na m ekwesịghị ịmanye ya ife Chineke.

Otu ụbọchị, Kazuhiko jụrụ m ma m̀ ga-enwe ike ịhapụtụ Jehova ma jiri ndụ m fọdụrụnụ lekọtawa ya. Nke a wutere m, n’ihi na anọwo m na-emere ya ihe nile m nwere ike imere ya kemgbe anyị lụrụ. Agbalịsiwo m ike ime ka o nwee obi ụtọ, ma o chere na oge m na-etinye n’ozi Jehova karịrị nke m na-ewepụtara ya. Mgbe m chesịrị banyere nke ahụ ruo oge ụfọdụ, agwara m ya na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ m maara m nwere ike imekwuru ya. Ma ọ bụrụ na ọ ga-esonyere m n’ihe m na-eme, anyị ga-amalite ibi ndụ ọhụrụ nke na-enye obi ụtọ, bụ́ nke na-agaghị adịru nanị afọ ole na ole kama nke na-agaghị agwụ agwụ. Di m azaghị ihe ọ bụla ruo ọtụtụ ụbọchị. N’ikpeazụ, ọ jụrụ m, sị: “Ị̀ ga-amụwaranụ m Bible?” Obi m na-ejupụta n’ọṅụ mgbe ọ bụla m chetara okwu ndị ahụ.

Ihe mbụ m mere bụ ime ndokwa ka otu okenye mụwara di m ihe, ma ọ gwara m, sị, “Ọ dịghị onye ga-amụrụ m ihe ma ọ bụghị gị.” Ya mere, anyị malitere ịmụ Bible kwa ụbọchị. Ebe ọ bụ na m nọ n’ọgbakọ na-eji Chinese eme ihe, di m ana-asụkwa Chinese nke ọma, anyị jiri Chinese na-amụ Bible. Anyị gụkọkwara Bible ọnụ ma gụchaa Bible dum n’ihe na-erughị otu afọ.

N’oge a, otu okenye nọ n’ọgbakọ ahụ na-eji Chinese eme ihe, na nwunye ya, nwere mmasị n’ebe mụ na di m nọ. Ọ bụ ezie na ụmụ anyị tọrọ ha, ha ghọrọ ezigbo ndị enyi anyị. Ọtụtụ Ndịàmà ndị ọzọ nwekwara mmasị pụrụ iche n’ebe di m nọ. Ha na-egosi anyị afọ ọma ma soro Kazuhiko na-akparịta ụka dị ka à ga-asị na ọ bụ papa ha. Nke ahụ mere ka o nwee nnọọ obi ụtọ.

Otu ụbọchị, e weteere anyị akwụkwọ e ji kpọọ anyị oku maka ịbịa agbamakwụkwọ a ga-eme n’ọgbakọ anyị, ọ bụ aha di m ka e dere n’elu akwụkwọ ozi ahụ. Otú ahụ e si ghọta na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ metụrụ ya nnọọ n’ahụ́, ya ekpebiekwa na ya ga-aga. N’oge na-adịghị anya, ya na Ndịàmà bịara dị nnọọ ná mma, otu okenye malitekwara ịmụrụ ya Bible. Ọmụmụ Bible ya, ịga ọmụmụ ihe, na ịhụnanya o nwere n’ebe ọgbakọ nọ nyeere ya aka inwe ọganihu n’ọgbakọ.

E Jikọọ Ezinụlọ Anyị Ọnụ n’Ikpeazụ

Na December 2000, e mere di m baptizim iji gosipụta na ọ rarawo onwe ya nye Jehova. Ụmụ m na nwunye ha mere nnọọ ogologo njem iji hụ ihe ịtụnanya a. O were afọ iri anọ na abụọ, ma e mechara jikọọ ezinụlọ anyị ọnụ.

Ugbu a n’ụtụtụ ọ bụla, anyị abụọ na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma gụkọọ Bible ọnụ. Kwa ụbọchị, anyị na-ekwurịta ihe ndị metụtara ozi anyị ma na-ekere òkè n’ozi Jehova. Ugbu a, di m bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ, o jikwa Chinese kwuo okwu ihu ọha n’oge na-adịbeghị anya. Ana m ekele nnọọ Jehova n’ihi ijikọta anyị n’otu. Mụ na ndị ezinụlọ m na ndị enyi m na-atụ anya ịkwado aha Jehova na ọbụbụeze ya ruo mgbe ebighị ebi.

[Map dị na peeji 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

CHINA

DEMOCRATIC PEOPLE’S REPUBLIC OF KOREA

REPUBLIC OF KOREA

Oké Osimiri Japan

JAPAN

Tokyo

Oké Osimiri nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ China

TAIWAN

Taipei

[Foto dị na peeji nke 12]

Mụ na ndị ezinụlọ m na 1958, nke bụ́ afọ e mere m baptizim

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ndị enyi dị ka Harvey na Kathy Logan mere ka ọchịchọ anyị nwere ife Jehova sikwuo ike mgbe anyị si Tokyo kwaga Taipei

[Foto dị na peeji nke 15]

Taa, e jikọtara ezinụlọ m n’otu n’ezi ofufe