Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mara Ihe Ma Tụọ Egwu Chineke

Mara Ihe Ma Tụọ Egwu Chineke

Mara Ihe Ma Tụọ Egwu Chineke

“Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.”—ILU 9:10.

1. Olee ihe mere o ji e siri ọtụtụ ndị ike ịghọta ihe ịtụ egwu Chineke bụ?

E NWERE mgbe ndị mmadụ na-ele ya anya dị ka ezigbo ihe ma a kọwaa ha dị ka ndị na-atụ egwu Chineke. Taa, ọtụtụ ndị na-ele ịtụ egwu Chineke anya dị ka ihe mgbe ochie na ihe siri ike nghọta. Ha pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya, gịnị mere m ga-eji na-atụ ya egwu?’ Ha na-ele egwu anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị, ọbụnadị dị ka ihe na-ama ahụ́ jijiji. Otú ọ dị, dị nnọọ ka anyị ga-ahụ, ịtụ egwu Chineke n’ụzọ ziri ezi gụnyere ọtụtụ ihe, ọ bụghị nanị mmetụta mmadụ na-enwe.

2, 3. Gịnị ka ịtụ egwu Chineke n’ụzọ ziri ezi gụnyere?

2 N’otú Bible si jiri ịtụ egwu Chineke mee ihe, e lere ya anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị. (Aịsaịa 11:3) Ọ bụ inye Chineke nsọpụrụ ruuru ya na ịkwanyere ya ùgwù n’ụzọ miri emi, ọchịchọ siri ike nke ịghara ime ihe ga-ewute ya. (Abụ Ọma 115:11) Ọ gụnyere ịnakwere ụkpụrụ omume nke Chineke setịpụrụ na ịgbasochi ya anya nakwa ọchịchọ nke ime ihe ndị Chineke sị na ha ziri ezi na ịghara ime ndị nke ọ sị na ha ezighị ezi. Otu akwụkwọ ntụaka mere ka ọ pụta ìhè na mmadụ ịtụ Chineke egwu n’ụzọ ziri ezi na-egosi na onye ahụ “na-eche banyere Chineke tupu ya emee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime bụ́ nke na-eme ka onye ahụ na-akpa àgwà dị ka onye maara ihe, meekwa ka ọ ghara itinye aka n’ụdị omume ọjọọ ọ bụla.” N’ụzọ dabara adaba, Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.”—Ilu 9:10.

3 N’ezie, ịtụ egwu Chineke na-emetụta ọtụtụ ihe mmadụ na-eme ná ndụ. Ọ bụghị nanị na ọ na-eme ka mmadụ nwee amamihe, kamakwa, ọ na-eme ka mmadụ nwee ọṅụ, udo, ọganihu, ogologo ndụ, olileanya, ntụkwasị obi, na obi ike. (Abụ Ọma 2:11; Ilu 1:7; 10:27; 14:26; 22:4; 23:17, 18; Ọrụ 9:31) Ya na okwukwe na ịhụnanya nwere njikọ chiri anya. N’ezie, ọ gụnyere ihe nile metụtara mmekọrịta anyị na Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị. (Deuterọnọmi 10:12; Job 6:14; Ndị Hibru 11:7) Ịtụ egwu Chineke na-agụnye mmadụ ikwenyesi ike na Nna anyị nke eluigwe na-eche banyere onye ọ bụla n’ime anyị nakwa na ọ dị njikere ịgbaghara anyị mmejọ anyị. (Abụ Ọma 130:4) Ọ bụ nanị ndị ajọ mmadụ na-achọghị ichegharị kwesịrị ịdị na-atụ oké egwu maka ihe Chineke ga-eme ha. *Ndị Hibru 10:26-31.

Ịmụ Ịtụ Egwu Jehova

4. Olee ihe pụrụ inyere anyị aka ‘ịmụta ịtụ egwu Jehova’?

4 Ebe ọ bụ na ịtụ egwu Chineke dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha ma nweta ngọzi Chineke, olee otú anyị pụrụ isi “mụta ịtụ egwu Jehova” n’ụzọ kwesịrị ekwesị? (Deuterọnọmi 17:19) E dekọrọ ihe atụ nke ndị ikom na ndị inyom tụrụ egwu Chineke n’Akwụkwọ Nsọ iji ‘zie anyị ihe.’ (Ndị Rom 15:4) Ka anyị tụlee ndụ nke otu n’ime ndị a e nyere ihe atụ ha n’Akwụkwọ Nsọ iji nyere anyị aka ịghọta ihe ịtụ egwu Chineke pụtara n’ezie. Ihe atụ anyị ga-atụle bụ nke Eze Devid nke Izrel oge ochie.

5. Olee otú ọrụ ilekọta atụrụ si nye aka kụziere Devid ịtụ egwu Jehova?

5 Jehova jụrụ eze mbụ nke Izrel, bụ́ Sọl, n’ihi na ọ tụrụ egwu mmadụ kama ịtụ egwu Chineke. (1 Samuel 15:24-26) N’aka nke ọzọ, otú Devid si bie ndụ na otú ya na Jehova si mekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya gosiri na ọ bụ nwoke na-atụ egwu Chineke n’ezie. N’oge Devid na-eto eto, ọ na-anọkarị n’ọhịa na-elekọta atụrụ nna ya. (1 Samuel 16:11) Ọ ghaghị ịbụ na ọtụtụ abalị Devid nọrọ n’ọhịa na-elekọta atụrụ nna ya nyeere ya aka ịmụta ịtụ egwu Jehova. Ọ bụ ezie na ihe Devid hụrụ bụ nanị akụkụ dị nta nke mbara igwe, o ruru ná nkwubi okwu ziri ezi—Chineke ruru eru ka anyị sọpụrụ ya ma too ya. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?”—Abụ Ọma 8:3, 4.

6. Olee otú obi dị Devid mgbe ọ matara na Jehova dị ukwuu?

6 Mgbe Devid jiri otú ọ dịruru ná nta tụnyere mbara igwe, nke ahụ kpaliri nnọọ mmasị ya. Kama nke ahụ ga-emenye ya ụjọ, ọ kpaliri ya inye Jehova otuto ma mee ka o kwuo, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” (Abụ Ọma 19:1) Ụdị egwu a Devid na-atụ Chineke mere ka ọ bịarukwuo Jehova nso ma mee ka ọ chọọ ịmụta ụzọ zuru okè nke Jehova na ịgbaso ya. Cheedị nnọọ otú obi dị Devid mgbe ọ bụgaara Jehova abụ, sị: “Onye ukwu ka Ị bụ, Ị na-arụkwa oké ọrụ dị iche iche: Gị onwe gị bụ Chineke, nanị Gị. Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.”—Abụ Ọma 86:10, 11.

7. Olee otú ịtụ egwu Chineke si nyere Devid aka ịlụso Golaịat ọgụ?

7 Mgbe ndị Filistia bịara ibuso ndị Izrel agha, dike ha, bụ́ Golaịat nke dị ihe dị ka mita atọ n’ogologo, kparịrị ndị Izrel, na-agwa ha, sị: ‘Kpọpụtanụ otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ! Ọ bụrụ na o merie m, anyị ga-abụ ndị ohu unu.’ (1 Samuel 17:4-10) Ụjọ tụrụ ma Sọl ma ndị agha ya nile, ma ụjọ atụghị Devid. Ọ maara na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ịtụ egwu, ọ bụghị mmadụ n’agbanyeghị otú onye ahụ siruru n’ike. Devid gwara Golaịat, sị: ‘Mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha bịakwute gị, ka mkpọkọta a nile wee mara na ọ bụghị mma agha na ube ka Jehova ji azọpụta: n’ihi na Jehova nwe agha nke a.’ Site n’enyemaka Jehova, Devid ji èbè ya na otu okwute gbuo dike ahụ.—1 Samuel 17:45-47.

8. Gịnị ka ihe atụ nke ndị tụrụ egwu Chineke n’oge Bible na-akụziri anyị?

8 Ọ pụrụ ịbụ na anyị na-eche ihe mgbochi ma ọ bụ ndị iro siri nnọọ ike dị ka ndị nke Devid zutere ihu. Gịnị ka anyị pụrụ ime? Anyị pụrụ imeri ha dị nnọọ ka Devid na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie meriri ndị nke ha, ha ji egwu Chineke merie ha. Egwu Chineke dị ike karịa egwu mmadụ. Ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Nehemaịa, gbara ndị Izrel ibe ya, bụ́ ndị ndị iro ha nọ na-enye nsogbu, ume, sị: “Unu atụla egwu ha: chetanụ Onyenwe anyị, Nke dị ukwuu dịkwa egwu.” (Nehemaịa 4:14) Jehova nyeere Devid, Nehemaịa, na ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi aka ịrụzu ọrụ o nyere ha. Ọ bụrụ na anyị atụọ egwu Chineke, anyị pụkwara ịrụzu nke anyị.

Iji Egwu Chineke Na-eche Nsogbu Ihu

9. Olee ihe ndị bịakwasịrị Devid nke gosiri na ọ na-atụ egwu Chineke?

9 Mgbe Devid gbusịrị Golaịat, Jehova mere ka o merie ọtụtụ ndị ọzọ. A kpaliri Sọl ekworo ji ịnwa ịtụgbu Devid. Mgbe nke ahụ na-enweghị isi, o ji aghụghọ nwaa igbu Devid ma mesịa kpọrọ ndị agha ya na-achụgharị Devid iji hụ na o gburu ya. Ọ bụ ezie na Jehova agwalarị Devid na ọ ga-abụ eze, ruo ọtụtụ afọ, Devid nọ na-agbagharị, na-alụ ọgụ ma na-echere ka oge Jehova ga-eji chie ya eze ruo. N’ihe a nile bịakwasịrị Devid, o gosiri na ya na-atụ egwu ezi Chineke ahụ.—1 Samuel 18:9, 11, 17; 24:2.

10. Olee otú Devid si gosi na ya na-atụ egwu Chineke mgbe ọ nọ n’ọnọdụ dị ize ndụ?

10 N’otu oge Devid na-agba ọsọ ndụ, ọ gbagara na nke Ekish, bụ́ eze nke obodo ndị Filistia bụ́ Gat, nke bụ́ obodo Golaịat. (1 Samuel 21:10-15) Ndị ohu eze kpọrọ Devid onye iro mba ha. Gịnị ka Devid mere n’ọnọdụ ahụ dị ize ndụ? Ọ gwara Jehova ihe nile dị ya n’obi n’ekpere. (Abụ Ọma 56:1-4, 11-13) N’agbanyeghị na Devid mere ka à ga-asị na ọ bụ onye ara, ọ maara n’ezie na ọ bụ Jehova napụtara ya. Otú Devid si jiri obi ya nile dabere n’ebe Jehova nọ ma nwee obi ike na Jehova, gosiri na Devid bụ n’ezie nwoke na-atụ egwu Chineke.—Abụ Ọma 34:4-6, 9-11.

11. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-atụ egwu Chineke mgbe nsogbu bịaara anyị, dị nnọọ ka Devid mere?

11 Dị ka Devid, anyị pụrụ igosi na anyị na-atụ egwu Chineke site n’inwe obi ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere anyị na ya ga-eme ka anyị merie nsogbu ndị na-abịara anyị. Devid kwuru, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) Nke a apụtaghị na anyị ga-enyefe nnọọ Jehova nsogbu anyị ma ghara ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime banyere ya, na-echezi ka Jehova rụọrọ anyị ọrụ ebube. Devid ekpeghị ekpere ka Chineke nyere ya aka ma gazie nọrọ nkịtị. O jiri ikike ọkpụkpụ aka na ọgụgụ isi Jehova nyere ya mee ihe iji merie nsogbu bịara ya. Devid maara na nanị mgbalị mmadụ apụghị ime ka ya dozie nsogbu ahụ. Anyị kwesịkwara ịma nke ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe nile anyị nwere ike ime, anyị ga-ahapụrụ Jehova nke fọdụrụnụ. N’eziokwu, mgbe mgbe, enweghị oké ihe anyị pụrụ ime ma ọ̀ bụghị ịdabere n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ n’oge dị otú a ka anyị na-egosipụta nnọọ na anyị na-atụ egwu Chineke. Okwu a Devid ji obi ya dum kwuo pụrụ ịkasi anyị obi: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.”—Abụ Ọma 25:14.

12. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ekpere anyị na-ekpegara Chineke kpọrọ ihe, oleekwa àgwà anyị na-ekwesịtụghị ịkpa?

12 Ya mere, anyị kwesịrị iji ekpere anyị na-ekpegara Chineke na mmekọrịta anyị na ya kpọrọ ihe. Mgbe anyị na-agakwuru Jehova n’ekpere, anyị “aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6; Jems 1:5-8) Ọ bụrụkwa na o nyere anyị aka, anyị kwesịrị ‘igosi onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele,’ dị ka Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ. (Ndị Kọlọsi 3:15, 17) Anyị agatụghị adị ka ndị ahụ otu Onye Kraịst e tere mmanụ nke nwere ahụmahụ kwuru banyere ha, sị: “Ha na-ele Chineke anya dị ka odibo e nwere n’eluigwe. Mgbe e nwere ihe dị ha mkpa, ha na-efere ya aka ka ọ bịa ozugbo. Ha nwetahaala ihe ha chọrọ, ha na-agwa ya ka ọ gawa.” Onye nwere àgwà dị otú a adịghị atụ egwu Chineke.

Mgbe A Na-atụghị Egwu Chineke

13. Olee mgbe Devid na-akwanyeghịrị Iwu Chineke ùgwù?

13 Aka Jehova nyeere Devid n’oge ọ nọ ná nsogbu mere ka Devid na-atụ egwu Chineke n’ụzọ miri emi, o mekwara ka ntụkwasị obi o nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike. (Abụ Ọma 31:22-24) Otú ọ dị, ọ dị ugboro atọ pụtara nnọọ ìhè Devid na-atụghị egwu Chineke, nke ahụ rụpụtakwara ihe ọjọọ. Nke mbụ bụ mgbe o mere ndokwa ka e jiri ụgbọala buru igbe ọgbụgba ndụ Jehova gaa Jeruselem kama ndị Livaị ibu ya n’ubu ha, dị ka Iwu Chineke si kwuo. Mgbe Ụza bụ́ onye nọ na-eduzi ụgbọala ahụ jidere Igbe ahụ aka ka ọ ghara ịda, ọ nwụrụ ozugbo n’ihi “mmehie ya.” Ọ bụ ezie na Ụza mehiere n’ụzọ dị ukwuu ma ihe kpatara ọdachi ahụ bụ na Devid akwanyeghịrị Iwu Chineke ùgwù dị ka o kwesịrị. Ịtụ egwu Chineke pụtara ime ihe dị ka O si chọọ.—2 Samuel 6:2-9; Ọnụ Ọgụgụ 4:15; 7:9.

14. Gịnị ka ọnụ Devid gụrụ ụmụ Izrel rụpụtara?

14 Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan kpaliri Devid ịgụ ndị agha Izrel ọnụ. (1 Ihe E Mere 21:1) Ihe ahụ Devid mere gosiri na ọ tụghị egwu Chineke, nke ahụ kpatara ọnwụ nke iri puku ndị Izrel asaa. Ọ bụ ezie na Devid chegharịrị, ya na ndị ya nile tara ahụhụ n’ihi ihe ahụ o mere.—2 Samuel 24:1-16.

15. Gịnị mere Devid ji kwaa iko?

15 Oge ọzọ Devid na-atụghị egwu Chineke dubara ya n’iso Bat-sheba, bụ́ nwanyị Yuraịa, kwaa iko. Devid maara na ịkwa iko ma ọ bụ inwe anyaukwu n’ebe nwunye nwoke ibe ya nọ dị njọ. (Ọpụpụ 20:14, 17) Nsogbu Devid malitere mgbe ọ hụrụ Bat-sheba ka ọ na-asa ahụ́. Ịtụ Chineke egwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị gaara akpali Devid iwepụ anya ya na uche ya n’ahụ́ nwanyị ahụ ozugbo ma chewe ihe ọzọ. Kama Devid ime nke ahụ, dị ka ihe siri na ya pụta na-egosi, ọ nọgidere ‘na-ele ya anya’ ruo mgbe agụụ nwanyị ahụ mere ka o chefuo ịtụ egwu Chineke. (Matiu 5:28; 2 Samuel 11:1-4) Devid chefuru na ya na Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya.—Abụ Ọma 139:1-7.

16. Olee ihe ọjọọ ndị bịara Devid n’ihi mmehie ya?

16 Iko ahụ Devid na Bat-sheba kwara mere ka Bat-sheba tụrụ ime ma mụta nwa nwoke. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, Jehova zigara onye amụma ya bụ́ Netan ka ọ gaa tụọ Devid mmehie ya n’anya. Mgbe Devid matara onwe ya, ọ maliteghachiri ịtụ egwu Chineke, o chegharịkwara. Ọ rịọrọ Jehova ka ọ ghara ịhapụ ya ma ọ bụ napụ ya mmụọ nsọ Ya. (Abụ Ọma 51:7, 11) Jehova gbaghaara Devid ma belata ntaramahụhụ ya, ma o chebeghị Devid pụọ n’ihe ọjọọ nile si n’ihe o mere pụta. Nwa ahụ a mụụrụ Devid nwụrụ, malitekwa mgbe ahụ gaa n’ihu, ihe na-akpata obi mgbawa na ọdachi nọgidere na-akpa ezinụlọ Devid aka ọjọọ. Leenụ nnọọ nnukwu ihe funahụrụ Devid n’ihi ịkwụsịtụ ịtụ egwu Chineke!—2 Samuel 12:10-14; 13:10-14; 15:14.

17. Nye ihe atụ obi mgbawa nke ime ihe ọjọọ pụrụ iweta.

17 Taa, ịghara ịtụ egwu Chineke n’ụzọ anyị si eme omume pụkwara iwetara anyị nnukwu nsogbu ndị na-adịte aka. Cheedị banyere obi mgbawa otu nwunye na-akatabeghị ahụ́ nwere mgbe ọ matara na di ya bụ́ Onye Kraịst nọ na-akwa iko mgbe ọ na-arụ ọrụ ná mba ofesi. Akpata oyi wụrụ ya, o wutekwara ya nke ukwuu nke na o hulatara isi ya ma bewe ákwá. Ogologo oge ha aṅaa ka ọ ga-ewe nwoke ahụ tupu nwunye ya amalitekwa ịtụkwasị ya obi na ịkwanyere ya ùgwù ọzọ? A pụrụ izere ọdachi dị otú ahụ site n’iji ezi obi na-atụ egwu Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:18.

Ịtụ Egwu Chineke Na-eme Ka Anyị Ghara Ime Ihe Ọjọọ

18. Olee ihe bụ ebumnobi Setan, oleekwa ihe ndị o ji arụ ọrụ?

18 Setan na-agbalịsi nnọọ ike ịhụ na o mere ka àgwà ndị mmadụ retọọ, ọ chọsikwara ike imerụ ezi Ndị Kraịst. Iji mee nke ahụ, ọ na-eji ihe ndị na-ewebata ihe n’obi na n’uche anyị eme ihe, ya bụ, anya na ntị anyị. (Ndị Efesọs 4:17-19) Olee ihe ị ga-eme mgbe ị hụrụ foto rụrụ arụ, mgbe ị nụrụ okwu rụrụ arụ, ma ọ bụ mgbe i zutere ndị na-eme omume rụrụ arụ na mberede?

19. Olee otú egwu Chineke si nyere otu Onye Kraịst aka imeri ọnwụnwa bịaara ya?

19 Tụlee ihe banyere André *, ọ bụ okenye ọgbakọ, bụrụkwa nna na dọkịta na Europe. Mgbe André na-arụ ọrụ abalị n’ụlọ ọgwụ, ụmụ nwanyị ndị ya na ha na-arụ ọrụ na-adụpanyekarị mpempe akwụkwọ e sere obi mmadụ na pilo ya, na-arịọ ya ka ya na ha nwee mmekọahụ. André jụwapụrụ isi iso ha nwee mmekọahụ. Iji gbanahụ nsogbu ahụ, ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ ebe ahụ ma chọta ọrụ n’ebe ọzọ. Ịtụ egwu Chineke ghọọrọ ya ihe amamihe dị na ya, o nwetakwara ọtụtụ ngọzi, André na-ejezi ozi nwa oge n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ya.

20, 21. (a) Olee otú ịtụ egwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka ịghara ime mmehie? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Mmadụ ịnọgide na-eche banyere ihe ọjọọ pụrụ ime ka onye ahụ dị njikere iji mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ya na Jehova gbanwere ihe na-erughịịrị ya. (Jems 1:14, 15) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Jehova, anyị agaghị agakwuru ndị ga-emebi omume ọma anyị, anyị agaghịkwa aga ebe ga-anwa anyị ọnwụnwa itinye aka n’omume ọjọọ ma ọ bụ tinye aka n’ihe omume ma ọ bụ ntụrụndụ pụrụ imerụ omume ọma anyị. (Ilu 22:3) N’agbanyeghị ihe ihere nke ahụ ga-ewetara anyị ma ọ bụ ihe anyị ga-achụ n’àjà, ọ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ịbụ ndị iro Chineke. (Matiu 5:29, 30) Ịtụ egwu Chineke gụnyere nnọọ ịghara ịma ụma na-etinye onwe anyị n’ọnọdụ pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa itinye aka n’omume rụrụ arụ, gụnyere ikiri ụdị ọ bụla nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, kama anyị kwesịrị ime ka anya anyị “si n’ile ihe efu gabiga.” Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-eme ka ‘anyị dị ndụ’ ma nye anyị ihe nile dị anyị mkpa.—Abụ Ọma 84:11; 119:37.

21 N’eziokwu, ịtụ egwu Chineke mgbe nile bụ ihe amamihe dị na ya. Ọ na-ewetakwa ezigbo obi ụtọ. (Abụ Ọma 34:9) A ga-eme ka nke a dokwuo anya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Olee Otú Ị Pụrụ Isi Tụọ Chineke nke Ịhụnanya Egwu?” nke dị na Teta! nke January 8, 1998, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 19 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee àgwà Ndị Kraịst a gụnyere n’ịtụ egwu Chineke?

• Olee otú egwu Chineke si emeri egwu mmadụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele ekpere anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

• Olee otú ịtụ egwu Chineke pụrụ isi mee ka anyị ghara imehie?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Devid mụtara ịtụ egwu Chineke mgbe ọ na-ekiri ihe ndị Jehova kere

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Olee ihe ị ga-eme mgbe ọnwụnwa bịaara gị?