Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụọ Egwu Jehova Ma Nwee Obi Ụtọ

Tụọ Egwu Jehova Ma Nwee Obi Ụtọ

Tụọ Egwu Jehova Ma Nwee Obi Ụtọ

“Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ onye obi ụtọ] ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova.”—ABỤ ỌMA 112:1.

1, 2. Olee ihe egwu Jehova pụrụ iweta?

OBI ỤTỌ anaghị adị mfe nnweta. Ihe bụ́ isi na-eme ka mmadụ nwee ezi obi ụtọ bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ emee nhọrọ ndị ziri ezi, mee ihe ndị ziri ezi, ma ghara itinye aka n’ihe ọjọọ. Onye kere anyị, bụ́ Jehova, enyewo anyị Okwu ya, bụ́ Bible, iji kụziere anyị otú anyị ga-esi bie ndụ kachasị mma. Ọ bụrụ na anyị achọọ nduzi Jehova ma gbasoo ya, si otú ahụ gosi na anyị na-atụ egwu Chineke, anyị pụrụ n’ezie inwe afọ ojuju na obi ụtọ.—Abụ Ọma 23:1; Ilu 14:26.

2 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atụ ndị dị na Bible na ndị nke oge a bụ́ ndị na-egosi otú egwu Chineke si enyere mmadụ aka imeri ọnwụnwa nke ime ihe na-ezighị ezi ma mee ka onye ahụ nwee obi ike ime ihe ziri ezi. Anyị ga-ahụ na egwu Chineke pụrụ iwetara anyị obi ụtọ site n’ịkpali anyị ịgbanwe ụzọ ndụ anyị dị nnọọ ka Eze Devid mere. Anyị ga-ahụkwa na egwu Jehova bụ ihe nketa dị nnọọ oké ọnụ ahịa nke ndị nne na nna pụrụ inyefe ụmụ ha. N’ezie, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ onye obi ụtọ] ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova.”—Abụ Ọma 112:1.

Inweghachi Obi Ụtọ

3. Olee ihe nyeere Devid aka ichegharị site ná mmehie ndị o mere?

3 Dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọ dị ugboro atọ Devid na-atụghị egwu Chineke, nke ahụ mekwara ka o mehie. Ma otú o si nabata ịdọ aka ná ntị Jehova gosiri nnọọ na ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke. Nsọpụrụ ọ na-asọpụrụ Chineke kpaliri ya ikweta mmejọ ya, gbanwee ụzọ ndụ ya, ma mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ọ bụ ezie na ihe ndị ahụ o mere wetaara ya na ndị ọzọ ahụhụ, nchegharị ya sitere n’obi mere ka Jehova nọgide na-akwado ya ma na-agọzi ya. Ihe atụ Devid pụrụ nnọọ ime ka Ndị Kraịst taa bụ́ ndị pụrụ ịdaba ná mmehie dị oké njọ nwee obi ike.

4. Olee otú egwu Chineke pụrụ isi nyere mmadụ aka inweghachi obi ụtọ?

4 Tụlee ihe atụ Sonja. * Ọ bụ ezie na ọ bụ onye ozi oge nile, Sonja malitere iso ndị na-akpa àgwà ọjọọ, ọ kpara àgwà na-ekwesịghị Ndị Kraịst, a chụkwara ya n’ọgbakọ. Mgbe Sonja ghọtara onwe ya, o mere ihe nile o kwesịrị ime iji mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ka oge na-aga, a nabataghachiri ya n’ọgbakọ. N’ihe a nile merenụ, ọ dịtụghị mgbe Sonja kwụsịrị inwe ọchịchọ ijere Jehova ozi. O mesịrị maliteghachi ozi oge nile. Ka e mesịrị, ọ lụrụ ezigbo Onye Kraịst bụ́ okenye, o ji obi ụtọ soro di ya na-eje ozi ugbu a n’ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ na-ewute Sonja na ọ dị mgbe ọ kwụsịtụrụ ibi ndụ dị ka Onye Kraịst, o nwere obi ụtọ na egwu Chineke nyeere ya aka ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma.

Ọ Ka Mma Ịta Ahụhụ Karịa Ime Mmehie

5, 6. Kọwaa otú Devid si ghara igbu Sọl ugboro abụọ nakwa ihe mere o ji ghara ime otú ahụ.

5 Ọ na-aba uru karịsịa mgbe ịtụ egwu Chineke gbochiri mmadụ imedị mmehie. Nke ahụ mere nnọọ n’ebe Devid nọ. N’otu oge, mgbe Sọl na puku ndị agha atọ ya nọ na-achụgharị Devid, Sọl banyere n’otu ọgba ebe Devid na ndị ikom ya zoro. Ndị ikom Devid gbara ya ume ka o gbuo Sọl. Ọ̀ bụghị Jehova nyere Devid ajọ onye iro ya a n’aka? Devid jiri nwayọọ nwayọọ bịarute n’ebe Sọl dina ma chabiri ọnụ ọnụ uwe Sọl. N’ihi na Devid na-atụ egwu Chineke, ihe ahụ o mere nke na-abụchaghị oké ihe nyere ya nsogbu n’obi. Devid chụsara ndị ikom ya obi dị ọkụ, na-asị: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova; m gaghị eme onyenwe m, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, ihe a ma ọlị.” *1 Samuel 24:1-7.

6 N’otu oge ka nke ahụ gasịrị, Sọl na ndị ikom ya mara ụlọikwuu ha n’abalị, “oké ụra nke Jehova dakwasịrị” ya na ndị ikom ya. Devid na nwa nwanne ya nwanyị ụjọ na-adịghị atụ, bụ́ Abishaị, gara guzoro n’etiti Sọl na ndị ikom ya na-ehi ụra. Abishaị chọrọ igbu Sọl ozugbo. Devid gbochiri Abishaị ime nke ahụ, na-asị: “Ònye ka ikpe na-amaghị n’isetị aka ya megide onye Jehova e tere mmanụ?”—1 Samuel 26:9, 12.

7. Gịnị mere Devid emehieghị mgbe o nwere ohere igbu Sọl?

7 Gịnị mere Devid egbughị Sọl ugboro abụọ o nwere ohere ime otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-atụ egwu Jehova karịa ka ọ na-atụ egwu Sọl. N’ihi egwu ziri ezi Devid na-atụ Chineke, ọ dị njikere ịta ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ọ ga-eme otú ahụ kama imehie. (Ndị Hibru 11:25) Obi siri ya nnọọ ike na Jehova ga-elekọta ndị ohu Ya nakwa ya onwe ya bụ́ Devid. Devid maara na irubere Chineke isi na ịtụkwasị ya obi ga-ewetara ya obi ụtọ na ọtụtụ ngọzi, ebe ileghara Chineke anya ga-eme ka Chineke jụ ya. (Abụ Ọma 65:4) Ọ makwaara na Chineke ga-emezu nkwa Ya nke bụ́ ichi Devid eze ma jiri aka Ya wepụ Sọl n’oge Ọ chọrọ.—1 Samuel 26:10.

Ịtụ Egwu Chineke Na-eweta Obi Ụtọ

8. Olee otú àgwà Devid kpara mgbe ọ nọ ná nsogbu si bụrụ ihe nlereanya?

8 Dị ka Ndị Kraịst, anyị pụrụ ịtụ anya na a ga-akwa anyị emo, kpagbuo anyị, ọtụtụ ule ndị ọzọ pụkwara ịbịara anyị. (Matiu 24:9; 2 Pita 3:3) Mgbe ụfọdụ, ọbụnadị anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ inwe nghọtahie. Otú ọ dị, anyị maara na Jehova na-ahụ ihe nile, na-anụ ekpere anyị nakwa na mgbe oge ya ruru, ọ ga-edozi nsogbu ahụ dị ka uche ya si dị. (Ndị Rom 12:17-21; Ndị Hibru 4:16) Ya mere, kama ịdị na-atụ egwu ndị mmegide, anyị na-atụ egwu Chineke ma na-elegara ya anya ịnapụta anyị. Dị ka Devid, anyị adịghị abọrọ onwe anyị ọbọ, anyị adịghịkwa ahapụ ime ihe ziri ezi iji zere ịta ahụhụ. Nke a na-emesị wetara anyị obi ụtọ. N’ụzọ dị aṅaa?

9. Nye ihe atụ otú egwu Chineke pụrụ isi mee ka mmadụ nwee obi ụtọ n’agbanyeghị mmegide.

9 Otu onye ozi ala ọzọ nọ n’Africa nke jeworo ozi ogologo oge kọrọ, sị: “Ana m echeta otu nwanna nwanyị na nwa ya nwanyị bụ́ ndị jụrụ ịzụ kaadị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst. Ìgwè ụmụ nwoke tiri ha ọ dị ndụ ọnwụ ka mma ma gwazie ha ka ha laa. Ka ha na-ala, nwanna nwanyị ahụ gbalịrị ịgụgụ nwa ya nwanyị na-ebe ákwá, nke nọkwa na-ajụ mama ya ihe mere ihe a ji mee ha. Obi adịghị ha mma mgbe ahụ, ma ha nwere akọnuche dị ọcha. Ka e mesịrị, ha nwere obi ụtọ na ha rubeere Chineke isi. Ọ bụrụ na ha zụrụ kaadị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, ìgwè ahụ gaara aṅụrị ọṅụ. Ndị ikom ahụ gaara enye ha mmanya ọtọ bịrịbịrị ma gụrụ egwú kpọlaa ha. Ma nwata nwanyị ahụ na mama ya maara na ọ bụrụ na ha azụọ kaadị ahụ, ọ ga-apụta na ha emebiela okwukwe ha, nke ahụ gakwaara ewutewo ha nke ukwuu.” Egwu ha na-atụ Chineke mere ka ha gbanahụ nke a.

10, 11. Olee ezi ihe si n’egwu otu nwanyị tụrụ Chineke pụta?

10 Ịtụ egwu Chineke pụkwara ime ka mmadụ nwee obi ụtọ mgbe ọ na-eche ule metụtara ịdị nsọ nke ndụ ihu. Mgbe Mary dị ime nwa ya nke atọ, dọkịta gbara ya ume ka o sikwopụ ime ahụ. Dọkịta ahụ kwuru, sị: “Ndụ gị nọ n’ihe ize ndụ. Ahụ́ ike gị pụrụ ịghasasị ma ị maghị ihe i mere, ị gaghịkwa anọfe otu ụbọchị. Nwa gị ga-anwụkwa. N’agbanyeghị ihe ọ bụla e mere, e jighị n’aka na ahụ́ ga-ezu nwa ahụ okè ma ọ bụrụdị na ọ dị ndụ.” Mary na Ndịàmà Jehova anọwo na-amụ Bible ma o mebeghị baptizim. Mary kwuru, sị: “Ihe ọ bụla ọ sọkwara ya mee, ekpebiela m ijere Jehova ozi, ekpebisikwara m ike ịnọgide na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ.”—Ọpụpụ 21:22, 23.

11 N’oge nile ahụ Mary dị ime, ọ nọgidere na-amụ Bible ma na-elekọta ezinụlọ ya. N’ikpeazụ, ọ mụrụ nwa ahụ. Mary kọrọ, sị: “O sitụụrụ m ike n’oge m na-amụ nwa nke atọ ahụ karịa oge m mụrụ abụọ ndị mbụ, ma enweghị m oké nsogbu.” Ịtụ egwu Chineke mere ka Mary nwee akọnuche dị ọcha, e mekwara ya baptizim n’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị. Mgbe nwa nwoke ahụ ọ mụrụ tolitere, ọ mụtakwara ịtụ egwu Jehova, ọ na-eje ozi ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova.

‘Mee Onwe Gị Ka Ị Dị Ike n’Ime Jehova’

12. Olee otú egwu Chineke si wusie Devid ike?

12 Egwu Devid tụrụ Jehova mere ihe karịrị igbochi ya ime ihe ọjọọ. O wusiri ya ike ime mkpebi amamihe dị na ya ngwa ngwa n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Devid na ndị ikom ya biri na Ziklag nke dị n’ọhịa ndị Filistia ruo otu afọ na ọnwa anọ. (1 Samuel 27:5-7) N’otu oge mgbe Devid na ndị ikom ya na-anọghị ya, ndị Amalek na-akwakọrọ ngwongwo ndị mmadụ gbara obodo ahụ ọkụ ma kpọrọ ndị nwunye Devid na ndị nke ndị ikom ya na ụmụ ha na ìgwè ewu na atụrụ ha. Mgbe Devid na ndị ikom ya lọtara ma hụ ihe merenụ, ha bere ákwá. Mwute ha kpataara ha ọnụma, ha kwukwara na ha ga-atụgbu Devid. Ọ bụ ezie na nke ahụ wutere Devid, ọ daghị mbà. (Ilu 24:10) Egwu ọ na-atụ Chineke mere ka ọ gakwuru Jehova, ‘o mekwara onwe ya ka ọ dị ike n’ime Jehova.’ Chineke nyeere Devid na ndị ikom ya aka ịchụkwute ndị Amalek ma nata ha ihe nile ha kwakọọrọ.—1 Samuel 30:1-20.

13, 14. Olee otú egwu Chineke si nyere otu Onye Kraịst aka ime mkpebi ziri ezi?

13 Ndị ohu Chineke taa na-echekwa ọnọdụ ndị ga-achọ ka ha tụkwasị Jehova obi ma jiri obi ike mee mkpebi ngwa ngwa ihu. Were Kristina dị ka ihe atụ. Mgbe Kristina na-eto eto, ya na Ndịàmà Jehova mụrụ Bible. Ma ọ chọrọ ịghọ ọkà n’ịpị pịyano, ọ gbasikwara mbọ ike maka nke ahụ. Ọzọkwa, ihere ịga ozi ọma na-eme ya, ụjọ na-atụkwa ya ime ihe ndị o kwesịrị ime ma ya mechaa baptizim. Ka Kristina nọgidere na-amụ Okwu Chineke, ọ malitere ịhụ mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ ya. Ka ọ na-amụ ịtụ egwu Jehova, ọ ghọtakwara na Jehova na-achọ ka ndị ohu ya ji obi ha nile, uche ha nile, mkpụrụ obi ha nile, na ike ha nile hụ ya n’anya. (Mak 12:30) Nke a kpaliri ya ịrara ndụ ya nye Jehova ma mee baptizim.

14 Kristina rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka inwe ọganihu ime mmụọ. Kristina kọwara, sị: “Amaara m na onye na-apị pịyano na-anọ n’ije mgbe mgbe, ọ na-enwetakwa ọrụ ruru narị anọ kwa afọ. Ya mere, ekpebiziri m ịghọ onye nkụzi ka m wee nwee ike ịdị na-akpata ihe m ga-eji na-enyere onwe m aka ma na-eje ozi oge nile.” N’oge ahụ, a họpụtalarị Kristina ịpị pịyano nke mbụ ya n’ụlọ egwú ọhaneze a kasị mara amara n’obodo ya. Ọ na-akọ, sị: “Pịyano mbụ m pịrị ghọọrọ m nke ikpeazụ.” Kristina alụọlarị di. Di ya bụ okenye ọgbakọ. Ya na di ya na-eje ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Obi dị ya ụtọ na Jehova nyere ya ike ime mkpebi ziri ezi, nakwa na ya pụrụ iji oge ya na ume ya jeere Jehova ozi.

Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa

15. Gịnị ka Devid chọrọ inyefe ụmụ ya, oleekwa otú o si mee nke ahụ?

15 Devid dere, sị: “Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: egwu Jehova ka m ga-ezi unu.” (Abụ Ọma 34:11) Dị ka nna, Devid bu n’obi inye ụmụ ya ihe nketa kasị dị oké ọnụ ahịa o nwere—egwu ziri ezi nke Jehova. Site n’okwu ọnụ nakwa n’omume, Devid kọwara Jehova dị ka Chineke na-ahụ n’anya, nke na-elekọta ndị ya na Nna nke na-agbaghara ụmụ elu ala ya mmehie ha, ọ bụghị dị ka onye na-achọ oké ihe n’aka ụmụ ya na onye na-eyi mmadụ egwu, nke dị njikere imesi onye ọ bụla datụrụ iwu ya ike. Devid jụrụ, sị: “Mmehie emehieworo n’amaghị ama, ònye ga-aghọta ha?” Iji gosi na ya nwere obi ike na ihe Jehova na-eme abụghị ịnọ na-enyochapụta ebe ndị mmadụ mejọrọ, ọ gbakwụnyeziri, sị: “Gụọ m n’onye ikpe ihe nzuzo nile na-amaghị.” Obi siri Devid ike na ọ bụrụ na ya emee ihe nile ya nwere ike, na Jehova pụrụ ịnakwere ma okwu o kwuru ekwu ma echiche ya.—Abụ Ọma 19:12, 14.

16, 17. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi kụziere ụmụ ha ịtụ egwu Jehova?

16 Devid bụụrụ ndị nne na nna taa ihe ilereanya. Ralph, bụ́ onye ya na nwanne ya nwoke na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, kwuru, sị: “Otú ndị mụrụ anyị si zụlite anyị mere ka anyị nwee mmasị n’eziokwu ahụ. Mgbe anyị nọ na-eto eto, ọ bụrụ na ha ekwuwe ihe metụtara ọgbakọ, ha na-ekwe ka anyị tinye ọnụ, nke ahụ mekwara ka anyị na-anụ ọkụ n’obi maka eziokwu ahụ dịkwa ka ha. Ha mere ka anyị mata na anyị pụrụ ịrụpụta ezigbo ihe n’ozi Jehova. N’ezie, ruo ọtụtụ afọ, ezinụlọ anyị biri n’obodo ebe e nwere nnọọ mkpa maka ndị nkwusa Alaeze ma nye aka hiwe ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ.

17 “Ihe mere anyị ji nọgide na-ejere Jehova ozi abụghị n’ihi na ha tiiri anyị iwu ndị tara akpụ anyị ga-agbaso kama ọ bụ n’ihi na anyị chọpụtara na nye ndị mụrụ anyị, Jehova bụ onye dị adị na onye obiọma na onye na-emere nnọọ ndị mmadụ ihe ọma. Ha chọsiri ike ịmata Jehova nke ọma karị na ime ihe na-atọ ya ụtọ, anyị mụtakwara ihe site n’egwu ziri ezi ha na-atụ Chineke na otú ha si hụ ya n’anya. Ọbụna mgbe anyị mere ihe ọjọọ, ndị mụrụ anyị adịghị eme ka anyị chee na Jehova ahụghịzi anyị n’anya; ha adịghịkwa eji iwe machie anyị ime ihe ụfọdụ. Ihe ha na-emekarị bụ ịnọwa anyị ọdụ ma soro anyị kwurịta ihe ahụ merenụ, mgbe ụfọdụkwa, anya mmiri na-apụ mama anyị n’anya ka ọ na-agbalị iru n’obi anyị. Nke ahụ rụpụtakwara ihe. Anyị mụtakwara site n’omume na n’okwu ọnụ nke ndị mụrụ anyị na ịtụ egwu Jehova bụ ezigbo ihe nakwa na ịbụ otu n’ime Ndịàmà ya bụ ihe ọṅụ na ihe na-enye obi ụtọ, ọ bụghị ibu arụ.”—1 Jọn 5:3.

18. Gịnị ka anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị atụọ egwu ezi Chineke?

18 Okwu ndị a na-esonụ so ‘n’okwu ikpeazụ nke Devid,’ anyị na-agụ, sị: “Onye na-achị mmadụ bụ onye ozi omume, ọ na-achị n’egwu Chineke. Ọ dịkwa ka ìhè ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-awa.” (2 Samuel 23:1, 3, 4) Solomọn, bụ́ nwa Devid na onye nọchiri ya, ghọtara ihe ahụ nna ya kwuru, n’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya “obi na-anụ ihe” nakwa ikike nke “ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.” (1 Ndị Eze 3:9) Solomọn ghọtara na ịtụ egwu Jehova bụ ihe amamihe dị na ya na ihe na-enye obi ụtọ. Ka e mesịrị, o ji okwu ndị a chịkọta ihe dị n’akwụkwọ Eklisiastis: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile. N’ihi na ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.” (Eklisiastis 12:13, 14) Ọ bụrụ na anyị egee ntị ná ndụmọdụ ahụ, anyị ga-achọpụta n’ezie na “ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova” abụghị nanị amamihe na obi ụtọ kamakwa “akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.

19. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta “egwu Jehova”?

19 Site n’ihe atụ ndị dị na Bible na ahụmahụ ndị nke oge a, anyị na-ahụ na egwu ziri ezi nke Chineke na-akpali ezi ndị ohu Jehova ịnọgide na-eme nke ọma. Ihe egwu Chineke na-eme abụghị nanị igbochi anyị ime ihe na-agaghị amasị Nna anyị nke eluigwe kama ọ na-enyekwara anyị aka iji obi ike na-alụ ọgụ megide ndị iro anyị, na-emekwa ka anyị nwee ume idi ule na ihe isi ike ndị na-abịara anyị. Ya mere, ka anyị nile ma ndị okenye ma ụmụaka, na-agụsi Okwu Chineke ike, na-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụta na ya, ma na-abịaru Jehova nso mgbe nile site n’ekpere sitere n’obi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ bụghị nanị na anyị ga-achọta “ihe ọmụma Chineke” kamakwa anyị ga-aghọta “egwu Jehova.”—Ilu 2:1-5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwere aha ndị ahụ.

^ par. 5 Nke a nwere ike ịbụ otu n’ime ahụmahụ ndị kpaliri Devid ide Abụ Ọma nke 57 na nke 142.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

Olee otú egwu Chineke pụrụ isi

• nyere onye mere mmehie dị oké njọ aka ịgbake?

• wetara mmadụ obi ụtọ n’agbanyeghị ule na mkpagbu?

• wusie anyị ike ime uche Chineke?

• ghọọrọ ụmụ anyị ihe nketa dị oké ọnụ ahịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Egwu Jehova gbochiri Devid igbu Eze Sọl

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Egwu Chineke bụ ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ndị mụrụ ụmụ pụrụ inyefe ụmụ ha