Uwe Ajị Anụ Na Mmekọrịta Anyị Na Chineke
Uwe Ajị Anụ Na Mmekọrịta Anyị Na Chineke
EZE LOUIS NKE ITOOLU nke France yiri otu. Mgbe Sir Thomas More na-amụ ịbụ onye ọkàiwu n’oge ọ ka na-eto eto, nke ya nyeere ya aka ịmụ anya ruo awa iri na itoolu ma ọ bụ iri abụọ kwa ụbọchị ruo ọtụtụ ọnwa. N’ezie, e kwuru na More yiri otu n’ihe ka ukwuu ná ndụ ya nile. Ọbụna mgbe e gburu Thomas Becket, bụ́ Achịbishọp nke Canterbury na Katidral dị na Canterbury, o juru onye ọ bụla anya mgbe a chọpụtara na o nwere nke o ji uwe ya yichie. Gịnị ka mmadụ ndị a a kọrọ akụkọ ha n’akụkọ ihe mere eme nwekọrọ ọnụ? Ha jiri uwe e ji ajị anụ kwaa taa anụ ahụ́ ha ahụhụ.
Uwe ajị anụ bụ uwe e ji ajị ewu kwaa. A na-eyikwasị ya n’ahụ́ nkịtị ka o wee na-adụkasị onye ahụ yi ya ahụ́. Ọ naghịkwa ara ahụ́ igwu eju na ya. E kwuru na Thomas Becket yikọtara uwe ajị anụ nke ya na drọọsụ e jikwara ajị anụ kwaa, ruo mgbe “igwu jupụtara na ya.” Mgbe narị afọ nke iri na isii gasịrị, kama ndị mmadụ iyi uwe e ji ajị ewu kwaa, ụfọdụ họrọziri iyi uwe a na-akwanye waya ndị kapịrị ọnụ bụ́ ndị na-adụkasị onye yi ya ahụ́. Ihe a e ji kwaa uwe ahụ mekwara ka ahụ́ na-agbakasị onye yi ya karịa nke ajị anụ.
Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ihe mere e ji eyi uwe ajị anụ nakwa ụdị ya ndị ọzọ, bụ iji “chịkwaa ọchịchọ anụ ahụ́ na-eme mmehie ma si otú a zụlitekwuo ọchịchọ na àgwà nke ime ihe ga na-amasị Chineke.” Ọ bụghị nanị ndị na-ata ndụ ha ahụhụ n’ihi okpukpe yiri uwe ajị anụ ahụ; ndị nkịtị, gụnyere ndị nọ n’ọkwá ọchịchị yikwara ya. Ọbụna taa ụfọdụ okpukpe ka na-eyi uwe ajị anụ.
Mmadụ iyi uwe ajị anụ ma ọ bụ ịta ndụ ya ahụhụ, ọ̀ na-eme ka ọ bụrụ onye na-atụ egwu Chineke? Ee e, ọ bụghị omume ndị dị otú ahụ ka e ji amata onye na-atụ egwu Chineke. N’ezie, Pọl onyeozi kwuru okwu megide “imeso ahụ́ mmeso n’ụzọ dị ike.” (Ndị Kọlọsi 2:23) * Kama nke ahụ, onye chọrọ ịbụ onye na-atụ egwu Chineke n’ezie ga na-achọsi ihe ọmụma Chineke ike site n’iji ịdị uchu na-amụchi Okwu Chineke anya ma na-etinye ihe ndị ahụ ọ na-amụta n’ọrụ ná ndụ ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Iji tụlekwuo banyere isiokwu a, lee Teta! (Bekee) nke October 8, 1997, “Echiche nke Bible: Mmadụ Ịta Onwe Ya Ahụhụ, Ọ̀ Bụ Ụzọ Isi Nweta Amamihe?”
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 32]
Eze Louis nke Itoolu, n’elu: Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women; Thomas Becket, n’etiti: Site n’akwụkwọ bụ́ Ridpath’s History of the World (Mpịakọta nke Anọ); Thomas More, n’ala ala: Site n’akwụkwọ bụ́ Heroes of the Reformation, 1904