Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• Olee otú Jizọs ga-esi ‘napụta ogbenye’ dị ka Abụ Ọma 72:12 buru n’amụma?

A ga-ekpe onye ọ bụla ikpe ziri ezi mgbe Kraịst ga-amalite ịchị ụwa. A gaghị enwe nrụrụ aka. Ọ bụ agha na-akpatakarị ịda ogbenye, ma Kraịst ga-eweta udo zuru okè. O nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ, ọ ga-emekwa ka mmadụ nile dịrị n’otu. Ọ ga-ahụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe ihe oriri n’ụba. (Abụ Ọma 72:4-16)—5/1, peeji nke 7.

• Olee otú anyị bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi nwee “nkwuwa okwu”? (1 Timoti 3:13; Faịlimọn 8; Ndị Hibru 4:16)

Anyị pụrụ ime nke a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu, site n’ịkụzi ihe na inye ndụmọdụ dị irè mgbe o kwesịrị, nakwa site n’ikpegara Chineke ekpere, na-enwe obi ike na ọ ga-anụ olu anyị ma zaa ekpere anyị.—5/15, peeji nke 14-16.

• N’Iwu Mozis, n’ihi gịnị ka ụfọdụ ọrụ akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ na-arụ ji eme ka mmadụ ‘rụọ arụọ’?

Iwu ndị metụtara ịrụ arụ nke ure na-agbapụ n’akụkụ ahụ́ nwoke ji enwe mmekọahụ, ịhụ nsọ, na ịmụ nwa na-akpata, mere ka ụmụ Izrel na-adị ọcha n’elu ahụ́ ma gbasie nnọọ ike. Ha mekwara ka o doo ụmụ Izrel anya na ọbara dị nsọ ma gosi uru ọbara bara, nke bụ́ iji ya kpuchie mmehie.—6/1, peeji nke 31.

• Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ inwe obi ụtọ, n’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị mma ka ọ tụlee akwụkwọ Abụ Ọma?

Ndị dere Abụ Ọma maara na ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ na Chineke ịdị ná mma. (Abụ Ọma 112:1) Ha mere ka o doo anya na ọ dịghị otú adị m ná mma anyị na onye ọ bụla ọzọ, inwe ihe onwunwe, ma ọ bụ ịrụzu ọtụtụ ihe pụrụ isi mee ka mmadụ nwee ụdị obi ụtọ nke ndị “Jehova bụ Chineke ha” na-enwe. (Abụ Ọma 144:15)—6/15, peeji nke 12.

• Mmekọrịta dị aṅaa pụrụ iche ka ụmụ Izrel oge ochie na Jehova nwere?

Na 1513 T.O.A., Jehova na ndị Izrel malitere inwe mmekọrịta ọhụrụ, ya na ha gbara ndụ. (Ọpụpụ 19:5, 6; 24:7) Onye Izrel ọ bụla a mụziri mgbe nke ahụ gasịrị bụ onye a mụnyere ná mba Chineke họọrọ bụ́ nke a raara nye ya. N’agbanyeghị nke ahụ, onye ọ bụla n’ime ha aghaghị ikpebi n’onwe ya ma ọ̀ ga-ejere Chineke ozi ma ọ bụ na ọ gaghị ejere ya.—7/1, peeji nke 21-22.

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-eme ihe nile “n’enweghị ntamu”? (Ndị Filipaị 2:14)

Ọtụtụ ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na ntamu kpataara ndị Chineke ọtụtụ ihe ọjọọ n’oge gara aga. N’ihi ya, anyị kwesịrị ichesi echiche ike banyere ihe ọjọọ nke ahụ pụkwara ịkpata taa. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe ọchịchọ ịtamu ntamu, anyị kwesịrị ịnọ na nche iji chọpụta mgbe anyị nwewere ọchịchọ a ma kwụsị ya.—7/15, peeji nke 16-17.

• Olee otú anyị si mara na amamihe a kọwara n’Ilu 8:22-31 abụghị amamihe nkịtị?

E kere amamihe ahụ ná mmalite nke ụzọ Jehova. Chineke nọ kemgbe ụwa, ọ dịghịkwa mgbe amamihe kọrọ ya. E keghị amamihe ya eke. Amamihe e kwuru okwu ya n’Ilu 8:22-31 nọ n’akụkụ Chineke “dị ka onye ọkà.” Nke a na-ezo aka n’ebe mmụọ ahụ e kere eke nke mesịrị ghọọ Jizọs nọ, bụ́ onye ya na Chineke rụkọrọ nnọọ ọrụ n’ike ihe. (Ndị Kọlọsi 1:17; Mkpughe 3:14)—8/1, peeji nke 31.