Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Beruk Odeakwụkwọ Jeremaịa nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Beruk Odeakwụkwọ Jeremaịa nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Beruk Odeakwụkwọ Jeremaịa nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi

Ị̀ MAARA “Beruk nwa Neraịa”? (Jeremaịa 36:4) Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị n’isiakwụkwọ anọ dị na Bible ka a kpọtụrụ ya aha, ndị na-agụ Bible maara ya nke ọma dị ka odeakwụkwọ Jeremaịa onye amụma na ezigbo enyi ya. Ha biri na Juda n’afọ 18 ikpeazụ tupu a dọrọ obodo ahụ n’agha, bụ́ mgbe nsogbu juru n’obodo ahụ, ha hụrụ mgbe ndị Babilọn bibiri Jeruselem kpamkpam n’afọ 607 T.O.A., nakwa mgbe ndị Juu gbagara Ijipt ka mbibi ahụ gasịrị.

Ihe abụọ e ji aka akwụkwọ ozi akara a chọtara n’afọ ndị na-adịbeghị anya * bụ́ ndị e jiri mee ihe na narị afọ nke asaa T.O.A. ndị e dere “Nke Odeakwụkwọ bụ́ Berekhyahu [aha Hibru Beruk], nwa Neriyahu [aha Hibru Neraịa],” n’elu ya, emeela ka ndị ọkà mmụta nwee mmasị ịmatakwu ihe banyere onye a e kwuru banyere ya na Bible. Ònye bụ Beruk? Olee ụdị ezinụlọ o si na ya, olee ebe ọ gụruru akwụkwọ, oleekwa ọkwá ọ nọrọ na ya? Olee ihe nkwado siri ike ọ kwadoro Jeremaịa na-egosi? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ya? Ka anyị chọpụta azịza nke ajụjụ ndị ahụ site n’ịtụle ihe Bible na akụkọ ihe mere eme kọrọ banyere ya.

Ezinụlọ Ya na Ọkwá Ya

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta taa kweere na Beruk si n’ezinụlọ ndị odeakwụkwọ a ma ama na Juda. Ọ dị ọtụtụ ihe ha na-ekwu mere ha ji kwubie otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Bible turu Beruk aha pụrụ iche, nke bụ́ “odeakwụkwọ.” Akwụkwọ Nsọ kwukwara na nwanne ya nwoke, bụ́ Seraia, nọ n’ọkwá dị elu n’obí Eze Zedekaịa.—Jeremaịa 36:32; 51:59.

Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Philip J. King dere banyere ndị odeakwụkwọ nke oge Jeremaịa, sị: “Ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị ji ide akwụkwọ mere aka ọrụ, bụ ndị a ma ama na Juda ná ngwụsị nke narị afọ nke asaa na ná mmalite nke narị afọ nke isii T.O.A. . . . Ọ bụ ndị a ma ama n’ọchịchị na-anọ n’ọkwá ahụ.”

Ọzọkwa, ihe e dere na Jeremaịa isi 36, bụ́ nke anyị ga-atụle n’ụzọ zuru ezu, yiri ka ọ̀ na-egosi na Beruk nwere ike ịgakwuru ndị ndụmọdụ eze, nakwa na e nyere ya ikike ịba n’ebe iri nri, ma ọ bụ n’obí, Gemaraịa, bụ́ onyeisi ma ọ bụ onye nọ n’ọkwá ọchịchị. Ọkà mmụta Bible bụ́ James Muilenberg kwadoro nke a site n’ikwu, sị: “Beruk nwere ike ịba n’obí onye odeakwụkwọ ahụ n’ihi na ọ bụ ihe ruuru ya, o sokwa ná ndị ọchịchị gbakọtaranụ iji nụrụ ihe dị mkpa a chọrọ ịgụpụta n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ọ bụ ya na ndị isi ibe ya nọ.”

Akwụkwọ bụ́ Corpus of West Semitic Stamp Seals kwuru ihe ọzọ na-egosi ọkwá Beruk nọ na ya, sị: “Ebe ọ bụ na a hụrụ ọtụtụ ihe ndị isi ndị ọzọ ji aka akwụkwọ ozi akara n’otu ebe ahụ a hụrụ nke Berekhyahu, o ziri ezi ikwu na Beruk ma ọ bụ Berekhyahu na ndị isi ndị ọzọ ahụ nọ n’otu ọkwá.” Ihe ndekọ ndị e nwere yiri ka hà na-egosi na Beruk na nwanne ya nwoke bụ́ Seraịa bụ ndị isi nyeere onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jeremaịa aka n’oge ọgba aghara ahụ dị na Juda tupu e bibie Jeruselem.

Ịkwado Jeremaịa n’Ihu Ọha

Ọ bụrụ na a gụọ ya na mgbe ihe ji mee, mgbe mbụ a kpọtụrụ Beruk aha bụ na Jeremaịa isi 36, “n’afọ nke anọ nke Jehoiakim,” ma ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 625 T.O.A. N’oge ahụ, Jeremaịa ejeela ozi dị ka onye amụma ruo ihe dị ka afọ 23.—Jeremaịa 25:1-3; 36:1, 4.

Jehova gwara Jeremaịa mgbe ahụ, sị: “Were n’onwe gị akwụkwọ mpịakọta, dee n’ime ya okwu nile nke M gwaworo gị imegide Izrel, na imegide Juda, na imegide mba nile, . . . site n’ụbọchị Josaịa, wee ruo taa.” Ihe ndekọ ahụ kwukwara, sị: “Jeremaịa wee kpọọ Beruk nwa Neraịa; Beruk wee dere n’ọnụ Jeremaịa okwu nile nke Jehova.”—Jeremaịa 36:2-4.

N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Beruk? Jeremaịa gwara ya, sị: “Mụ onwe m bụ onye e gbochibidoworo; apụghị m ịba n’ụlọ Jehova.” (Jeremaịa 36:5) O doro anya na e kweghị ka Jeremaịa banye n’ogige ụlọ nsọ ahụ bụ́ ebe a ga-anọ gụọ ozi ahụ Jehova ziri, ikekwe n’ihi na ozi ndị mbụ o ziri kpasuru ndị isi iwe. (Jeremaịa 26:1-9) O doro anya na Beruk bụ onye ji obi ya nile na-efe Jehova, o ‘mekwara dị ka ihe nile si dị nke Jeremaịa, bụ́ onye amụma, nyere ya n’iwu.’—Jeremaịa 36:8.

Idetu ịdọ aka ná ntị a nọworo na-enye kemgbe afọ 23 were oge, ma eleghịkwa anya, Jeremaịa cheere ruo oge kwesịrị ekwesị. Ma na November ma ọ bụ December 624 T.O.A., Beruk ji nkwuwa okwu “gụọ n’akwụkwọ ahụ okwu nile nke Jeremaịa n’ụlọ Jehova, n’ime ụlọ Gemaraịa . . . , ná ntị ndị Izrel nile.”—Jeremaịa 36:8-10.

Maịkaịa nwa Gemaraịa gwara nna ya na ndị isi ndị ọzọ ihe merenụ, ha kpọziri Beruk ka ọ bịa gụghachiri ha akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị: “O ruo, mgbe ha nụsịrị okwu ndị a nile, na ha tụrụ oké egwu, onye na ibe ya, ha wee sị Beruk, Anyị aghaghị igosi eze okwu ndị a nile. . . . Jee, zobe onwe gị, gị onwe gị na Jeremaịa; ekwekwala onye ọ bụla mara ebe unu onwe unu nọ.”—Jeremaịa 36:11-19.

Mgbe Eze Jehoiakim nụrụ na ọ bụ Jeremaịa gwara Beruk ihe ndị ahụ o dere, o ji iwe dọkaa akwụkwọ mpịakọta ahụ, tụba ya n’ọkụ ma nye ndị na-ejere ya ozi iwu ka ha jide Jeremaịa na Beruk. Jehova gwara ndị ikom abụọ ahụ ka ha depụtaghachi akwụkwọ mpịakọta ahụ n’ebe ha zoro.—Jeremaịa 36:21-32.

O doro anya na Beruk maara ihe ize ndụ dị n’ọrụ a. Ọ ghaghị ịbụ na ọ maara banyere egwu e yiri Jeremaịa afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Ọ ghaghịkwa ịbụ na ọ nụla ihe mere Uraịa, bụ́ onye buru amụma “dị ka okwu nile nke Jeremaịa si dị” ma Eze Jehoiakim egbuo ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Beruk dị njikere iji nkà ya na adị m ná mma nke ya na ndị ọchịchị kwado Jeremaịa n’ọrụ a.—Jeremaịa 26:1-9, 20-24.

Achọrọla Onwe Gị “Ihe Ukwu”

Mgbe Beruk na-ede akwụkwọ mpịakọta nke mbụ ahụ, o nwere nkụda mmụọ. Ọ kwara arịrị, sị: “Biko, ahụhụ na-adịrị m! n’ihi na Jehova atụkwasịwo ihe mwute n’elu ihe mgbu m; adọgbuwo m onwe m n’ọrụ n’ize ume m, ma achọtaghị m izu ike.” Olee ihe kpataara ya obi erughị ala a?—Jeremaịa 45:1-3.

A gwaghị anyị ihe ọ bụla kpatara ya kpọmkwem. Ma gbalịa iji anya nke uche gị hụ ọnọdụ Beruk nọ na ya. Ichetara ndị Izrel na Juda ịdọ aka ná ntị ndị e nyerela ha kemgbe afọ 23 aghaghị imewo ka o doo nnọọ anya na ha ahapụla Jehova na ofufe ya. Mkpebi Jehova mere ibibi Jeruselem na Juda na ime ka mba ahụ gaa bie na Babilọn afọ 70—bụ́ ihe Jehova kwuru n’otu afọ ahụ, nke o nwekwara ike ịbụ na ọ dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ—aghaghị ịwụwo Beruk akpata oyi n’ahụ́. (Jeremaịa 25:1-11) E wezụga nke ahụ, nkwado siri ike ọ na-akwado Jeremaịa n’oge nsogbu a pụrụ ime ka e wepụ ya n’ọkwá ya ma chụọ ya n’ọrụ.

N’agbanyeghị ihe kpatara ya, Jehova mere ihe n’onwe ya iji nyere Beruk aka iburu ikpe ọmụma na-abịanụ n’obi. Jehova kwuru, sị: “Ihe nke M wuworo ka Mụ onwe m na-akwada, ọzọ, ihe nke M kụworo n’ubi ka Mụ onwe m na-efopụ; ọbụna ala nke a nile.” Ọ dụziri Beruk ọdụ, sị: “Ma gị onwe gị, ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha.”—Jeremaịa 45:4, 5.

Jehova ekwughị kpọmkwem ihe “ihe ukwu” ndị a bụ, ma Beruk aghaghị ịmawo ma ọ̀ bụ ịchọ ọdịmma onwe ya, ịchọ ịghọ onye a ma ama, ka ọ̀ bụ ịchọ ịba ọgaranya. Jehova dụrụ ya ọdụ ka ọ hụ ihe otú ha dị ma cheta ihe na-aga ime n’ọdịnihu: “M gaje ime ka ihe ọjọọ bịakwasị anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, . . . ma M ga-enye gị ndụ gị ka ọ bụrụ ihe nkwata n’ebe nile ị ga-eje.” A ga-echebere Beruk ihe kasị mkpa o nwere, nke bụ́ ndụ ya n’agbanyeghị ebe o jere.—Jeremaịa 45:5.

Mgbe Bible kọsịrị ihe ndị a dị na Jeremaịa isi 36 na nke 45, bụ́ ndị mere malite n’afọ 625 ruo 624 T.O.A., mgbe ọzọ ọ kọrọ ihe banyere Beruk bụ ọnwa ole na ole tupu ndị Babilọn ebibie Jeruselem na Juda n’afọ 607 T.O.A. Olee ihe mere mgbe ahụ?

Beruk Akwado Jeremaịa Ọzọ

Mgbe ọzọ Bible kpọrọ Beruk aha bụ mgbe ọ na-ekwu banyere otú ndị Babilọn si nọchibido Jeruselem. Jeremaịa nọ “ka onye e gbochibidoro n’ogige ụlọ nche” mgbe Jehova gwara ya ka ọ zụnara nwanne nna ya ala ya dị n’Anatọt iji gosi na ndị Chineke ga-alọghachi n’ala ha. A kpọrọ Beruk ka o nye aka dee akwụkwọ nkwekọrịta ya.—Jeremaịa 32:1, 2, 6, 7.

Jeremaịa kọwara, sị: “M wee dee aha m n’akwụkwọ ala ahụ, kaa ya akara, kpọọ ndị àmà, tụọkwara ya ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. M wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ, ma nke a kara akara, . . . ma nke ghere oghe: m wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ nye Beruk.” O nyeziri Beruk iwu ka o tinye akwụkwọ nzụta ala ndị a n’ite ụrọ ma mechie ọnụ ya iji chebe ha. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na mgbe Jeremaịa kwuru na ya ‘dere’ akwụkwọ ala ahụ, ọ ga-abụ na ọ gwara Beruk ihe ọ ga-ede, Beruk, bụ́ onye ji ide akwụkwọ mere aka ọrụ edezie ya edee.—Jeremaịa 32:10-14; 36:4, 17, 18; 45:1.

Beruk na Jeremaịa gbasoro ihe iwu chọrọ n’oge ha. Otu n’ime ihe ndị iwu chọrọ n’oge ahụ bụ inwe akwụkwọ nkwekọrịta abụọ maka ala. Akwụkwọ bụ́ Corpus of West Semitic Stamp Seals kọwara, sị: “A na-akpọ akwụkwọ nkwekọrịta nke mbụ ahụ ‘akwụkwọ nkwekọrịta e kechiri ekechi’ n’ihi na a na-afụkọta ya afụkọta ma jiri ihe e ji aka akwụkwọ ozi akara kechie ya; ọ na-abụ nkwekọrịta mbụ ahụ e dere ede. . . . Nke abụọ, bụ́ nke a na-akpọ ‘akwụkwọ nkwekọrịta ghere oghe’ bụ nke e si na nke ahụ e kechiri ekechi, bụ́ nke e dere nkwekọrịta ahụ na ya, depụtaghachi, ihe e jikwa eghewe ya oghe bụ ka onye chọrọ ịgụ ya gụọ ya. Nke bụ́ na a na-enwe ihe odide abụọ, nke mbụ ahụ e dere ede na nke e si na ya depụtaghachi, bụ́ ndị a na-ede n’ibé papaịrọs abụọ dị iche iche.” Ihe ndị e gwupụtara n’ala egosiwo na a na-etinye akwụkwọ nkwekọrịta ndị ahụ n’ite ụrọ.

N’ikpeazụ, ndị Babilọn weghaara Jeruselem, gbaa ya ọkụ, dọrọkwa mmadụ nile nọ na ya n’agha ma e wezụga ndị ogbenye ole na ole. Nebukadneza mere Gedalaịa gọvanọ. E gburu Gedalaịa ọnwa abụọ ka e mesịrị. Ndị Juu fọrọ afọ mere atụmatụ ịkwaga Ijipt, n’agbanyeghị na Jeremaịa dụrụ ha ọdụ site n’ike mmụọ nsọ ka ha ghara ịga, ọ bụkwa mgbe a na-akọ akụkọ a ka a kpọrọ Beruk aha ọzọ.—Jeremaịa 39:2, 8; 40:5; 41:1, 2; 42:13-17.

Ndị ndú ndị Juu gwara Jeremaịa, sị: “Okwu ụgha ka gị onwe gị na-ekwu: Jehova, bụ́ Chineke anyị, eziteghị gị ịsị, Unu abala n’Ijipt ịnọ dị ka ọbịa n’ebe ahụ: kama Beruk nwa Neraịa na-akpali gị imegide anyị, ka ha wee mee ka anyị nwụọ, meekwa ka anyị jee biri na Babilọn.” (Jeremaịa 43:2, 3) O yiri ka ebubo ahụ ọ̀ na-egosi na ndị ndú ndị Juu kweere na ọ bụ Beruk na-agwa Jeremaịa ihe ọ na-eme. Ọ̀ ga-abụ n’ihi na ha chere na n’ihi ọkwá Beruk ma ọ bụ n’ihi na ya na Jeremaịa abụrụla enyi ruo ogologo oge na ọ bụghị nanị odeakwụkwọ ka ọ bụụrụ onye amụma ahụ? Ma eleghị anya, ma n’agbanyeghị ihe ndị ndú ndị Juu ahụ chere, ozi ahụ sitere n’aka Jehova.

N’agbanyeghị aka a dọrọ ha ná ntị, ndị Juu fọrọ afọ gawara Ijipt ma kpọrọ “Jeremaịa, bụ́ onye amụma, na Beruk nwa Neraịa.” Jeremaịa dere, sị: “Ha wee baa n’ala Ijipt; n’ihi na ha egeghị ntị n’olu Jehova: ha wee bịaruo Tahpanhes,” bụ́ obodo dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri Naịl, bụ́kwa nke dịdebere Ugwu Saịnaị. Nke ahụ bụ ebe ikpeazụ a kpọrọ Beruk aha na Bible.—Jeremaịa 43:5-7.

Olee Ihe Anyị Pụrụ Ịmụta n’Aka Beruk?

E nwere ọtụtụ ihe dị mkpa anyị pụrụ ịmụta n’aka Beruk. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ anyị pụrụ ịmụta bụ otú o si dị njikere iji nkà ya na ọmụma ọ maara ndị mmadụ jeere Jehova ozi, n’agbanyeghị ihe ndị ga-esi na ya pụta. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova taa—ma ndị nwoke ma ndị nwanyị—nwere otu mmụọ ahụ, na-eji nkà ha arụ ọrụ na Betel, n’iwu ihe, nakwa n’ọrụ ndị dị ka ndị a. Olee otú ị pụrụ isi nwee àgwà yiri nke Beruk?

Mgbe e chetaara Beruk na mgbe ọdịda Juda na-eru nso abụghị oge iji chọwara onwe ya “ihe ukwu,” o doro anya na ọ naara ndụmọdụ ahụ, n’ihi na o mesịrị nweta ndụ ya dị ka ihe nkwata. Ọ dị mma inye onwe anyị ndụmọdụ a, n’ihi na anyị onwe anyị bikwa n’ụwa nke na-abịa ná njedebe. Ihe Jehova kwere anyị ná nkwa bụ otu ihe ahụ o kwere Beruk ná nkwa—na ọ ga-echebe ndụ anyị. Ànyị ga-anabata ndụmọdụ ahụ otú Beruk si nabata ya?

Ọ dịkwa ihe ọzọ bara uru anyị pụrụ ịmụta n’akụkọ a. Beruk nyeere Jeremaịa na nwanne nna ya aka ịgbaso ihe iwu chọrọ mgbe nwanne nna Jeremaịa resịrị Jeremaịa ala, n’agbanyeghị na ndị ikom abụọ ahụ bụ ụmụnne. Nke a bụ ebe Ndị Kraịst ha na ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị na-abanye n’atụmatụ achụmnta ego ga-elere anya iji mata ihe ha kwesịrị ime. Ịgbaso ihe nlereanya a nke ide nkwekọrịta achụmnta ego ede kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, baa uru, ma na-egosi ịhụnanya.

Ọ bụ ezie na e kwughị ọtụtụ ihe banyere Beruk na Bible, Ndị Kraịst kwesịrị ịtụle ihe nlereanya ya taa. Ị̀ ga-agbaso ihe nlereanya nke odeakwụkwọ Jeremaịa a kwesịrị ntụkwasị obi?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ihe e ji aka akwụkwọ ozi akara bụ obere kpụrụkpụrụ ihe e ji ụrọ kpụọ a na-eji ejigide eriri e ji kechie akwụkwọ ozi. A na-ebikwasị aha onye nwe ya ma ọ bụ onye zitere akwụkwọ ozi ahụ n’elu ụrọ ahụ.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ihe Beruk ji aka akwụkwọ ozi akara

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe e ji aka akwụkwọ ozi akara: Site n’ikike a natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Izrel, Jeruselem