Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Job—Nwoke Nwere Ntachi Obi Ma Kwesị Ntụkwasị obi

Job—Nwoke Nwere Ntachi Obi Ma Kwesị Ntụkwasị obi

Job—Nwoke Nwere Ntachi Obi Ma Kwesị Ntụkwasị obi

“Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ́ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.”—JOB 1:8.

1, 2. (a) Olee ọdachi ndị dakwasịrị Job na mberede? (b) Kọọ otú ndụ Job dị tupu ọdachi adakwasị ya.

Ọ DỊ otu nwoke o yiri ka ihe nile ò zuuru ya—ọ bara ọgaranya, nwee ùgwù, nwee ezi ahụ́ ike, na ezinụlọ nwere obi ụtọ. Ọdachi atọ dakwasịziri ya n’obere oge. N’otu ntabi anya, akụ̀ na ụba ya nile furu. Ka nke ahụ gasịrị, oké ifufe a na-amaghị isi ya gburu ụmụ ya nile. Obere oge ka nke ahụ mesịrị, ọ dara ajọ ọrịa nke mere ka ọ nọrọ n’ahụ́ mgbu n’ihi etuto tokasịrị ya n’ahụ́. Ma eleghị anya, ị matala na onye a na-ekwu okwu ya bụ Job, bụ́ onye akụkọ ya juru n’akwụkwọ ahụ bú aha ya na Bible.—Job, isi 1 na nke 2.

2 Ọ sụrụ ude, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na adị m dị ka m si dị n’ọnwa gara aga.” (Job 3:3; 29:2) Olee onye na-anaghị echeta mgbe ihe dịịrị ya mma mgbe ọdachi dakwasịrị ya? Nke Job bụ na o biri ezi ndụ, nke yiri ka o nweghị nsogbu. Ndị a ma ama na-akwanyere ya ùgwù ma na-abịa ka o nye ha ndụmọdụ. (Job 29:5-11) Ọ bara ọgaranya, ma o kweghị ka ego ya buo ya isi. (Job 31:24, 25, 28) Mgbe ọ hụrụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ma ọ bụ ụmụaka na-enweghị nne na nna, o nyeere ha aka. (Job 29:12-16) Ọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi nye nwunye ya.—Job 31:1, 9, 11.

3. Olee otú Jehova si lee Job anya?

3 Job biri ndụ ezi omume n’ihi na ọ na-efe Chineke. Jehova kwuru, sị: “Ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:1, 8) Ma n’agbanyeghị ezi omume Job, ọdachi tisasịrị ndụ ya na-enweghị nsogbu. Ihe nile ọ tara ahụhụ nweta miri ala, e jikwa ahụ́ ụfụ, ahụhụ, na obi nkoropụ nwaa ya ọnwụnwa.

4. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji baara anyị uru ịtụle ọdachi ndị dakwasịrị Job?

4 N’ezie, ọ bụghị nanị Job bụ ohu Chineke ọdachi dakwasịtụrụla. Ihe ndị na-eme ọtụtụ Ndị Kraịst taa yiri ihe ndị mere Job. N’ihi ya, ọ dị ajụjụ abụọ ọ dị mkpa ka anyị tụlee. Ha bụ: Olee otú icheta ọdachi dakwasịrị Job pụrụ isi nyere anyị aka mgbe ọdachi dakwasịrị anyị? Oleekwa otú ọ pụrụ isi kụziere anyị inwekwu ọmịiko n’ahụ́ ndị na-ata ahụhụ?

Ule nke Ikwesị Ntụkwasị Obi

5. Olee ihe Setan kwuru na ọ bụ ya mere Job ji na-efe Chineke?

5 Ọnọdụ Job gbapụrụ iche. Job amaghị na Ekwensu agwala Chineke na Job ebughị ezi ihe n’obi na-efe Ya. Mgbe Jehova kwuru àgwà ọma ndị Job nwere n’otu nzukọ e nwere n’eluigwe, Setan kwuru, sị: “Ọ́ bụghị gị onwe gị gbawooro ya, gbaakwara ụlọ ya, gbaakwara ihe nile o nwere, ogige gburugburu?” Ihe Setan na-ekwu bụ na ihe mere Job ji na-efe Chineke bụ na ọ na-achọ ọdịmma onwe ya—ihe ahụ o kwuru pụtakwara na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ndị nile na-efe Chineke. Setan gwara Jehova, sị: “Biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:8-11.

6. Olee okwu dị mkpa Setan welitere?

6 Okwu ahụ abụghị obere okwu. Setan kwuru na otú Jehova si na-achị adịghị mma. Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie Chineke iji ịhụnanya na-achị eluigwe na ala? Ka ihe ahụ Setan kwuru bụ́ na ndị Chineke kere na-efe Chineke n’ihi ọdịmma nke onwe ha ọ̀ ga-emecha bụrụ eziokwu? Jehova kwere ka Ekwensu jiri Job gosi ma ihe o kwuru ọ̀ bụ eziokwu, nwee obi ike na ohu Ya ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya. N’ihi ya, ọ bụ Setan wetara ọdachi ndị ahụ dakwasịrị Job ná nsochi ná nsochi. Mgbe mgbalị mbụ Setan mere kụrụ afọ n’ala, o tiri Job ajọ ọrịa. Ekwensu kwuru, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọbụna ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.”—Job 2:4.

7. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị ohu Chineke taa si na-ata ahụhụ ndị yiri ndị nke Job?

7 Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst taa adịghị ata ahụhụ ruru ka nke Job, ha na-enwe ọtụtụ nsogbu. A na-akpagbu ọtụtụ, ma ọ bụ ha ana-enwe nsogbu n’ezinụlọ ha. Ụfọdụ anwụọla n’ihi okwukwe ha. Ihe isi ike ma ọ bụ ọrịa nwere ike na-akpa ụfọdụ n’ime ha aka ọjọọ. N’ezie, anyị ekwesịtụghị iche na ọ bụ Setan n’onwe ya kpatara ọdachi ọ bụla dakwasịrị anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ pụrụ ịbụ ihe ndị anyị mejọrọ ma ọ bụ ọrịa anyị bu pụta ụwa na-akpatara anyị nsogbu ụfọdụ. (Ndị Galeshia 6:7) Ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị ga-agbanahụli ịka nká na ọdachi ndị na-emere onwe ha. Bible mere ka o doo anya na Jehova anaghị eji ụzọ ọrụ ebube echebe ndị ohu ya pụọ ná nsogbu ndị a ugbu a.—Eklisiastis 9:11.

8. Olee otú Setan nwere ike isi chọọ iji nsogbu ndị anyị nwere mee ihe?

8 N’agbanyeghị nke ahụ, Setan nwere ike iji nsogbu ndị dakwasịrị anyị mee ka okwukwe anyị gharazie isi ike. Pọl onyeozi kwuru na ya nwere “ogwu n’anụ ahụ́ [ya], bụ́ mmụọ ozi Setan,” nke nọgidere “na-ama [ya] ụra.” (2 Ndị Kọrint 12:7) N’agbanyeghị ma ọ̀ bụ nsogbu anụ ahụ́, dị ka ahụchaghị ụzọ, ma ọ bụ ihe ọzọ, Pọl ghọtara na Setan nwere ike iji nsogbu ahụ na ahụ́ erughị ala ọ kpataara ya napụ ya ọṅụ na ikwesị ntụkwasị obi ya. (Ilu 24:10) Taa, Setan nwere ike ịkpali ndị ezinụlọ nke ndị Chineke, ụmụ akwụkwọ ibe ha, ma ọ bụ ọbụna ndị ọchịchị aka ike ịkpagbu ha n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.

9. N’ihi gịnị ka ahụhụ na mkpagbu na-ekwesịkarịghị iji ju anyị anya?

9 Olee otú anyị pụrụ isi merie nsogbu ndị a? Ọ bụ site n’ile ha anya dị ka ohere anyị ga-eji gosipụta na ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na isi anyị na-erubere ọchịchị ya abụghị n’elu ọnụ. (Jems 1:2-4) N’agbanyeghị ihe kpatara ahụhụ anyị nọ na ya, anyị ịmata mkpa ọ dị anyị ịnọgide n’akụkụ Chineke ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe ya. Pita onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-agba n’etiti unu, nke na-eme ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ihe a na-amaghị ama na-adakwasị unu.” (1 Pita 4:12) Pọl kọwakwara, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Setan ka na-ekwu na ikwesị ntụkwasị obi nke Ndịàmà Jehova esighị ha n’obi, dị ka o kwuru banyere nke Job. N’ezie, Bible na-egosi na Setan etinyekwuola ihe ná mkpagbu ọ na-akpagbu ndị Chineke n’oge ikpeazụ ndị a.—Mkpughe 12:9, 17.

Ọ Ghọtahiere Ọnọdụ Ya, E Nyekwa Ya Ndụmọdụ Ọjọọ

10. Olee ihe Job na-aghọtaghị?

10 Job amaghị ihe na-eme ya, ọ dịghị anyị otú ahụ. Ọ maghị ihe mere ọdachi ndị a ji dakwasị ya. Job chere na “Jehova nyere, Jehova anarawokwa.” (Job 1:21) Ikekwe, Setan ma ụma gbalịa ime ka Job chee na ahụhụ ọ na-ata si Chineke n’aka.

11. Kọwaa ihe Job mere mgbe ọ na-ata ahụhụ.

11 Job bịara nnọọ nwee nkụda mmụọ, ọ bụ ezie na ọ jụrụ ịgbakụta Chineke azụ, dị ka nwunye ya gwara ya mee. (Job 2:9, 10) Job kwuru, sị: ‘Ihe na-agara ndị na-emebi iwu nke ọma karịa m.’ (Job 21:7-9) Ọ ghaghị ịnọwo na-ajụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe mere Chineke ji ata m ahụhụ?’ Ọ dị mgbe ihe na-agụ ya nnọọ bụ ọnwụ. O tiri mkpu, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I zobe m n’ala mmụọ, ma a sị na I debe m na nzuzo, ruo mgbe iwe Gị laghachiri, ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m!”—Job 14:13.

12, 13. Olee otú ihe ndị enyi atọ Job kwuru si metụta ya?

12 O nwere ndị enyi Job atọ letara ya, ka à ga-asị na ha bịara “igosi ya ebere ha [nwere] n’ahụ́ ya na ịkasi ya obi.” (Job 2:11) Ma, ha mechara bụrụ “ndị nkasi obi na-eweta ọnọdụ ọjọọ.” (Job 16:2) A sị na Job nwere ndị enyi o nwere ike ịkọrọ nsogbu ya, ọ gaara ịbara ya uru, ma mmadụ atọ a mere ka Job nọrọkwuo ná mgbagwoju anya ma kpasukwuo ya iwe.—Job 19:2; 26:2.

13 Mmadụ ga-atụ anya na Job nwere ike ịnọ na-ajụ, sị: ‘Olee ihe mere o ji bụrụ m ka ihe a ga-eme? Olee ihe m mere nke mere ihe a nile ga-eji mee m?’ Azịza ndị enyi ya nyere ya bụ nnọọ azịza nduhie. Ha sịrị na ọ bụ Job ji aka ya kpata ihe na-eme ya n’ihi na o meela oké mmehie. Elifaz jụrụ, sị: “Ònye laworo n’iyi, mgbe ya onwe ya bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ? . . . Dị ka m hụworo anya, ndị na-egwu ajọ ihe dị ka ala ubi, ndị na-aghakwa mmegbu dị ka mkpụrụ ọghịgha, ha na-ewe ya dị ka ihe ubi.”—Job 4:7, 8.

14. Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji kwuo na mgbe ọ bụla mmadụ na-ata ahụhụ na ọ bụ n’ihi na o meela ihe ọjọọ?

14 Ee, anyị nwere ike ịdaba ná nsogbu ma ọ bụrụ na anyị aghaa mkpụrụ maka abamuru nke anụ ahụ́ anyị kama ịgha mkpụrụ maka abamuru nke mmụọ nsọ. (Ndị Galeshia 6:7, 8) N’agbanyeghị nke ahụ, n’ụwa anyị bi na ya ugbu a, anyị nwere ike ịdaba ná nsogbu n’agbanyeghị otú àgwà anyị dị. Ọzọkwa, o nweghị onye nwere ike ikwu na nsogbu agaghị adakwasịli ndị aka ha dị ọcha. Jizọs Kraịst, bụ́ “onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,” nwụrụ ọnwụ ahụhụ n’elu osisi ịta ahụhụ, e gbukwara Jems onyeozi n’ihi ihe o kweere. (Ndị Hibru 7:26; Ọrụ 12:1, 2) Echiche gbagọrọ agbagọ nke Elifaz na ndị enyi ya abụọ mere ka Job zọwa onwe ya ma sie ọnwụ na aka ya dị ọcha. N’agbanyeghị nke ahụ, ebubo ha nọgidere na-ebo Job na ọ na-ata ahụhụ ihe o metara nwere ike imetụtawo otú Job si lee ikpe ziri ezi nke Chineke anya.—Job 34:5; 35:2.

Inweta Enyemaka Mgbe Ihe Na-esiri Anyị Ike

15. Olee echiche ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-ata ahụhụ?

15 Ọ̀ dị ihe akụkọ a na-akụziri anyị? Ọdachi, ọrịa, ma ọ bụ mkpagbu bịakwasịrị anyị nwere ike iyi nnọọ ihe na-ekwesịtụghịrị anyị. Ọ pụrụ iyi ka ndị ọzọ anaghị enwe ọtụtụ n’ime nsogbu ndị ahụ. (Abụ Ọma 73:3-12) Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị ajụjụ ndị a dị mkpa: ‘Ịhụnanya m hụrụ Chineke ọ̀ na-akpali m ife ya n’ọnọdụ ọ bụla? Ọ̀ na-agụ m agụụ inye Jehova ihe ọ ga-eji “zaghachi onye na-ata Ya ụta okwu?”’ (Ilu 27:11; Matiu 22:37) Anyị ekwesịtụghị ikwe ka okwu ndị ọzọ kwuru n’echeghị echiche mee ka anyị nyowe Nna anyị nke eluigwe enyowe. Otu Onye Kraịst rịara ọrịa ruo ọtụtụ afọ kwuru otu mgbe, sị: “Amaara m na ihe ọ bụla Jehova kwere ka o mee, m ga-edili ya. Amaara m na ọ ga-enye m ike m ga-eji die ya. Nke ahụ bụ ihe ọ na-emere m mgbe nile.”

16. Olee otú Okwu Chineke si enyere ndị na-ata ahụhụ aka?

16 A bịa n’ihe metụtara atụmatụ aghụghọ Setan, anyị maara ihe Job na-amaghị. “Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya,” ma ọ bụ atụmatụ ọjọọ ya. (2 Ndị Kọrint 2:11) E wezụga nke ahụ, anyị nwere nnọọ amamihe ga-enyere anyị aka. N’ime Bible, anyị nwere akụkọ banyere ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị diri ụdị ihe isi ike dị iche iche. Pọl onyeozi, bụ́ onye tara ahụhụ karịa ọtụtụ Ndị Kraịst, dere, sị: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Otu Onyeàmà nọ na Europe nke a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ji nri abalị atọ ya gbanwere Bible. O kwuru, sị: “Bible ahụ mesịrị nnọọ baara m ezigbo uru! N’agbanyeghị agụụ na-agụ m, ihe ndị m gụtara na Bible ahụ nyeere mụ na ndị ọzọ aka idi ule ndị e lere anyị n’oge ọjọọ ahụ. Bible ahụ ka dị ruo taa.”

17. Olee ihe ndị Chineke na-enye anyị bụ́ ndị nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu?

17 E wezụga nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị na-agwa anyị otú anyị ga-esi merie nsogbu ndị anyị nwere. Ọ bụrụ na i lee n’akwụkwọ e ji eme nnyocha bụ́ Watch Tower Publications Index, i nwere ike ịhụ ahụmahụ nke Onye Kraịst ibe gị bụ́ onye nwerela nsogbu yiri nke gị. (1 Pita 5:9) O nwekwara ike ịbara gị uru ịkọrọ ndị okenye nwere ọmịiko ma ọ bụ Ndị Kraịst ọzọ tozuru okè nsogbu gị. Nke kasị mkpa bụ na i nwere ike isite n’ekpere nweta enyemaka Jehova na mmụọ nsọ ya. Olee ihe nyeere Pọl aka idi “ụra” ndị Setan nọ na-ama ya? Ihe nyeere ya aka bụ na ọ mụtara ịdabere n’ike Chineke. (2 Ndị Kọrint 12:9, 10) O dere, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.

18. Olee otú Ndị Kraịst ibe anyị pụrụ isi gbaa anyị nnọọ ume?

18 Nke ahụ pụtara na ị pụrụ inweta enyemaka, i kwesịghịkwa ịla azụ ịchọ enyemaka ahụ. Ilu kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” (Ilu 24:10) Otú ahụ akịka nwere ike ịratu ụlọ e ji osisi wuo ka nkụda mmụọ nwere ike ime ka Onye Kraịst kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Iji ghara ịdaba ná nsogbu a, Jehova na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka. Otu mmụọ ozi bịakwutere Jizọs ma mee ka ọ dị ike n’abalị ahụ e jidere ya. (Luk 22:43) Mgbe Pọl na-aga Rom dị ka onye mkpọrọ, o “kelere Chineke ma nwee obi ike” mgbe ụmụnna zutere ya n’Ahịa Apịọs na Ụlọ Atọ nke Ndị Ije. (Ọrụ 28:15) Otu Onyeàmà bụ́ onye Germany ka na-echeta enyemaka o nwetara mgbe o ji ụjọ rute n’ogige ịta ahụhụ dị na Ravensbrück mgbe ọ ka dị afọ iri na ụma. O kwuru, sị: “Otu Onye Kraịst ibe m hụrụ m ozugbo ma nabata m nke ọma. Nwanna nwanyị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi lekọtara m, ọ ghọkwaara m nnọọ nne ma mee ka mmekọrịta mụ na Jehova sikwuo ike.”

“Gosipụta na Ị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi”

19. Olee ihe nyeere Job aka ịghara ịdara Setan?

19 Jehova kọwara Job dị ka nwoke “na-ejidekwa izu okè ya,” onye nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. (Job 2:3) N’agbanyeghị na Job nwere nkụda mmụọ, nakwa na ọ maghị ihe kpatara ahụhụ ọ na-ata, ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ Jehova. Job jụrụ ịgbahapụ ụkpụrụ ezi omume ọ nọgideworo na-agbaso kemgbe ụwa. O kpebisiri ike, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.”—Job 27:5.

20. Olee ihe mere ntachi obi ji baa uru?

20 Ime mkpebi siri ike otú ahụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ọnọdụ anyị nọ na ya—ma ọ bụ mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa, mgbe a na-emegbu anyị, ma ọ bụ mgbe anyị na-ata ahụhụ. Jizọs gwara ọgbakọ dị na Smụana, sị: “Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha. Lee! Ekwensu ga-anọgide na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu, ka unu wee nweekwa mkpagbu [nsogbu, ahụhụ, ma ọ bụ mmegide] ruo ụbọchị iri. Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze bụ́ ndụ.”—Mkpughe 2:10.

21, 22. Ịmara gịnị pụrụ ịkasi anyị obi mgbe a na-akpagbu anyị?

21 N’ụwa a Setan na-achị, a ga-ele ntachi obi na ikwesị ntụkwasị obi anyị ule. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs mesiri anyị obi ike na ka anyị na-elepụ anya n’ọdịnihu, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Ihe dị mkpa bụ igosi na anyị na-ekwesị ntụkwasị obi. Pọl kwuru, sị: “Mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge,” ebe ịdị arọ nke “ebube,” ma ọ bụ ụgwọ ọrụ Jehova kwere anyị ná nkwa, “dị nnọọ ukwuu karị, . . . na-adịrukwa ebighị ebi.” (2 Ndị Kọrint 4:17, 18) Ọbụna ahụhụ Job tara dịruru nwa oge ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ afọ o ji bie ndụ obi ụtọ tupu ọnwụnwa ya na mgbe ọnwụnwa ya gasịrị.—Job 42:16.

22 Ma, a ka nwere mgbe ọ ga-adị anyị ka ọnwụnwa anyị na-agabiga adịghị akwụsị akwụsị, ya eyiekwa ka anyị agaghị edili ahụhụ anyị na-ata. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ihe mere Job pụrụ isi kụzikwuoro anyị ihe banyere inwe ntachi obi. Anyị ga-atụlekwa ụzọ ndị anyị pụrụ isi wusie ndị ọzọ ike mgbe ha na-ata ahụhụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee okwu dị mkpa Setan welitere banyere ikwesị ntụkwasị obi Job?

• N’ihi gịnị ka ahụhụ na-ekwesịkarịghị iji ju anyị anya?

• Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịtachi obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ime nnyocha, ịkọrọ Ndị Kraịst tozuru okè nsogbu anyị, na ikwupụta obi anyị n’ekpere pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi