“Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
“Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
“Ndị Katọlik na-akụzi Ihe Anọ Ikpeazụ Na-eme Mmadụ: Ọnwụ, Ikpe, Ọkụ Ala Mmụọ, Eluigwe.”—Akwụkwọ bụ́ Catholicism, nke George Brantl chịkọtara.
Ị̀ CHỌPỤTARA na ụwa esoghị n’ihe anọ ndị ahụ a kpọrọ aha na-eme mmadụ? Nke ahụ abụghị ihe ijuanya n’ihi na Chọọchị Katọlik, nakwa ọtụtụ okpukpe ndị ọzọ, na-akwado nkwenkwe ahụ bụ́ na otu ụbọchị, a ga-ebibi ụwa. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Dictionnaire de Théologie Catholique, kọwara nke a mgbe ọ na-akọwa okwu bụ́ “Ọgwụgwụ Ụwa,” sị: “Chọọchị Katọlik kweere ma na-akụzi na ụwa a dị ugbu a nke Chineke kere agaghị adịru mgbe ebighị ebi.” Otu akwụkwọ katkizim ọhụrụ nke ndị Katọlik kwukwara otu ihe a, ọ sịrị: “Ụwa anyị . . . ga-apụrịrị n’anya.” Ma ọ bụrụ na a gaje ibibi ụwa, gịnị banyere nkwa ndị dị na Bible maka paradaịs elu ala?
Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na ụwa ga-aghọ paradaịs n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, onye amụma bụ́ Aịzaịa kọwara ụwa na ndị bi Aịsaịa 65:21, 22) Ndị Juu, bụ́ ndị Chineke kwere nkwa ndị a, kweere na otu ụbọchị, ala ha—n’ezie, ụwa dum—ga-aghọ paradaịs ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ndụ obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
n’ime ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Abụ Ọma nke 37 kwuru banyere olileanya a. Ọ sịrị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:11) Amaokwu a adịghị ekwu banyere iweghachi mba Izrel ibi n’Ala Nkwa ahụ ruo obere oge. Otu abụ ọma ahụ kapịrị okwu ahụ ọnụ, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) * Ị̀ hụrụ na abụ ọma a kwuru na ndụ ebighị ebi n’elu ala gaje ịbụ ihe a ga-eji kwụọ “ndị dị umeala n’obi” ụgwọ? Otu Bible French kwuru na okwu ahụ bụ́ “umeala n’obi” “nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ pụtara karịa okwu ndị e ji asụgharị ya; ọ pụtakwara ndị ihe ọjọọ dabaara, ndị na-ata ahụhụ ma ọ bụ ndị a na-akpagbu n’ihi Yahweh, ndị dị obi umeala ma na-erubere Chineke isi.”
Ọ̀ Bụ n’Ụwa Ka Ọ̀ Bụ n’Eluigwe?
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs kwere nkwa na-echetara anyị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ e kwuru banyere ya n’elu, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5, Bible Nsọ nke Union Version) Ụwa gajekwa ịbụ ihe a ga-eji kwụghachi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa na ya na-akwadebere ha ebe “n’ụlọ Nna [ya],” nakwa na ha ga-eso ya nọrọ n’eluigwe. (Jọn 14:1, 2; Luk 12:32; 1 Pita 1:3, 4) Oleezi otú anyị kwesịrị isi ghọta nkwa ndị e kwere maka ngọzi ndị a ga-enweta n’ụwa? Nkwa ndị ahụ hà ka dị irè taa, oleekwa ndị ga-enweta ha?
Ndị ọkà mmụta Bible dị iche iche na-ekwu na “ụwa” Jizọs kwuru banyere ya n’Ozizi Elu Ugwu ya na ọbụna nke e kwuru n’Abụ Ọma nke 37 abụghị ụwa nkịtị. Mgbe F. Vigouroux na-akọwa amaokwu ndị a n’akwụkwọ bụ́ Bible de Glaire, o kwuru na ha bụ “ihe atụ nke eluigwe na nke Chọọchị.” Onye France na-eme nchọpụta banyere Bible bụ́ M. Lagrange kwuru na nkwa a e kwere “apụtaghị na ndị dị nwayọọ n’obi ga-eketa ụwa nke ha bi na ya, ma ọ bụ n’ọnọdụ dị ugbu a ma ọ bụ n’ọnọdụ zuru okè karị, kama ọ pụtara na ha ga-ebi n’otu ebe, n’agbanyeghị ebe o nwere ike ịbụ, nke bụ́ n’alaeze eluigwe.” Onye ọzọ na-eme nchọpụta kwuru na amaokwu ndị ahụ “ji ụwa na-eme ihe atụ nke eluigwe.” Ndị ọzọkwa kwuru na “e ji ala nkwa ahụ, bụ́ Kenan, mee ihe atụ, nakwa na ọ na-anọchi anya obodo nke dị n’eluigwe, bụ́ alaeze Chineke, nke bụ́ nkwa e kwere ndị dị nwayọọ n’obi. Nke ahụ bụkwa ihe okwu ahụ dị n’Abụ Ọma nke 37 na n’ebe ndị ọzọ pụtara.” Ma, ànyị kwesịrị ikwu ozugbo na nkwa ndị Chineke kwere emetụtaghị ụwa nkịtị?
Nzube Ebighị Ebi Maka Ụwa
Ná mmalite, a kpọrọ nnọọ ụwa aha ná nzube Chineke maka ụmụ mmadụ. Onye ọbụ abụ dere, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Nke ahụ pụtara na nzube mbụ nke Chineke maka ụmụ mmadụ metụtara ụwa, ọ bụghị eluigwe. Jehova nyere di na nwunye mbụ ahụ ọrụ ime ka ụwa nile dị ka ubi Iden ahụ. (Jenesis 1:28) Nzube a abụghị maka nwa oge. Jehova gosipụtara n’Okwu ya na ụwa ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, mgbe o kwuru, sị: “Otu ọgbọ alaa, ọgbọ ọzọ abịa; ma ụwa na-eguzoru mgbe ebighị ebi.”—Eklisiastis 1:4; 1 Ihe E Mere 16:30; Aịsaịa 45:18.
Nkwa Chineke na-emezurịrị, n’ihi na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ọ na-ahụkwa na o mezuru ha. Onye so dee Bible ji otú mmiri si ezo ma na-alaghachikwa n’urukpuru mee ihe atụ iji kọwaa na nkwa Chineke ga-emezurịrị. O kwuru, sị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; . . . otú a ka okwu m dị [okwu Chineke] nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọro m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” (Aịsaịa 55:10, 11) Chineke kwere ụmụ mmadụ nkwa. Oge ụfọdụ nwere ike ịgafe tupu nkwa ndị ahụ emezuo, ma ha ga-emezurịrị. Ha ‘na-alaghachikwute’ ya mgbe ha mezuru ihe nile o kwuru.
Ọ tọrọ nnọọ Jehova “ụtọ” ike ụwa maka ụmụ mmadụ. Ná ngwụsị nke ụbọchị nke isii o ji kee ihe, o kwuru na ihe nile dị “mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Ime ka ụwa ghọọ paradaịs so ná nzube Chineke nke a na-emezubeghị. N’agbanyeghị nke ahụ, nkwa Chineke ‘agaghị alaghachikwute ya n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo.’ Nkwa nile e kwere maka ịdị ndụ zuru okè n’elu ala, bụ́ ebe ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’udo na n’obi iru ala, ga-emezu.—Abụ Ọma 135:6; Aịsaịa 46:10.
Nzube Chineke Ga-emezurịrị
Mmehie nke nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, gbochitụrụ nzube mbụ nke Chineke nke bụ́ ime ka ụwa ghọọ paradaịs. A chụpụrụ ha n’ubi ahụ mgbe ha nupụsịrị isi. Ha si otú ahụ tufuo ohere nke iso mezuo nzube Chineke nke ime ka ụmụ mmadụ zuru okè biri n’ụwa paradaịs. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke mere ndokwa iji mezuo nzube ya. Olee otú o si mee nke a?—Jenesis 3:17-19, 23.
Ihe ahụ mere n’Iden yiri nwoke malitere iwu ụlọ n’ala mara nnọọ mma. Ka ọ tọsịrị ntọala ụlọ ahụ, otu onye bịara mebie ntọala ụlọ ahụ. Kama nwoke ahụ ịhapụ ụlọ ahụ ọ na-ewu, o mere ihe iji hụ na o wuchara ụlọ ahụ. Ya bụrụgodị na ihe a merenụ nyekwuru ya ọrụ ma rikwuo ya ego, o meghị ka ọ bụrụ iberibe na ọ malitere iwu ụlọ ahụ.
N’otu aka ahụ, Chineke mere ndokwa iji hụ na o mezuru nzube ya. Oge na-adịghị anya ka nne na nna anyị mbụ mehiesịrị, o kwere ụmụ ha otu nkwa—“mkpụrụ” nke ga-emezi ihe mebiri emebi. N’imezu amụma a, akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ ahụ bịara bụrụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, onye bịara n’ụwa ma jiri ndụ ya chụọ àjà iji zụtaghachi ụmụ mmadụ. (Ndị Galeshia 3:16; Matiu 20:28) Ozugbo a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe, ọ ga-aghọ Eze nke Alaeze ahụ. Ọ bụ ya bụ onye bụ́ isi dị nwayọọ n’obi nke ga-eketa ụwa, ya na ndị kwesịrị ntụkwasị obi a họpụtara ahọpụta bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe iso ya chịa n’Alaeze a. (Abụ Ọma 2:6-9) Ka oge na-aga, ọchịchị a ga-amalite ịchị ụwa iji mezuo nzube mbụ nke Chineke ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Ọtụtụ nde ndị dị nwayọọ n’obi “ga-eketa ụwa” n’ihi na ha ga-erite uru n’ọchịchị nke Alaeze ahụ dị n’aka Jizọs Kraịst na ndị ha na ya ga-eso chịa.—Jenesis 3:15; Daniel 2:44; Ọrụ 2:32, 33; Mkpughe 20:5, 6.
“Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
N’otu ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ, e kwuru banyere nzọpụta a a ga-azọpụta ndị mmadụ gaa n’ebe abụọ dị iche, bụ́ eluigwe na ụwa. Ọ hụrụ ndị eze nọ n’ocheeze n’eluigwe bụ́ Mkpughe 5:9, 10) Rịba àmà ọrụ abụọ ndị a ga-arụ iji mezuo nzube Chineke—nke bụ́ ime ka ụwa bụrụghachi paradaịs ná nduzi nke Alaeze eluigwe nke Jizọs Kraịst na ndị ibe ya ga-achị. Ndokwa ndị a sitere n’aka Chineke ga-eme ka e nwee ike ime ka ụwa mesịa bụrụghachi Paradaịs n’ikwekọ ná nzube mbụ nke Chineke.
ndị a họọrọ site n’etiti ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi. Bible kwuru kpọmkwem na ndị a ha na Kraịst ga-eso chịa ‘gaje ịchị ụwa dị ka ndị eze.’ (N’ekpere nlereanya Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) Ekpere a, ọ̀ ga-aba uru ma ọ bụrụ na a ga-ebibi ụwa ma ọ bụ, ma ọ bụrụ na ụwa bụ nanị ihe atụ nke eluigwe? N’otu aka ahụ, ọ̀ dị uru ọ bara ma ọ bụrụ na ndị ezi omume nile agaa eluigwe? Ihe bụ́ uche Chineke banyere ụwa pụtara ìhè n’Akwụkwọ Nsọ, malite n’akụkọ nke otú o si kee ihe ruo n’ọhụụ ndị dị ná Mkpughe. Ụwa ga-aghọ ihe Chineke zubere ka ọ ghọọ—paradaịs. Nke a bụ uche Chineke nke o kwere nkwa imezu. Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa na-ekpe ekpere ka uche Chineke ahụ mezuo.
Ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ ihe Onye Okike, bụ́ Chineke onye ‘na-agbanwebeghị,’ zubere ná mmalite. (Malakaị 3:6; Jọn 17:3; Jems 1:17) Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, magazin a, bụ́ Ụlọ Nche, akọwaala ihe abụọ a Chineke ga-emezu ná nzube ya. Nke a na-eme ka anyị ghọta nkwa ndị Chineke kwere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ime ka ụwa bụrụghachi paradaịs. Anyị na-arịọ gị ka ị tụlekwuo okwu a, site na gị na Ndịàmà Jehova ikwurịta ya ma ọ bụ site n’idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ọ bụ ezie na ọtụtụ nsụgharị Bible kpọrọ okwu Hibru ahụ bụ́ ‘eʹrets “ala” kama ịkpọ ya “ụwa,” ọ dịghị ihe mere a ga-eji kwuo na nanị ihe okwu ahụ bụ́ ‘eʹrets dị n’Abụ Ọma 37:11, 29 pụtara bụ ala e nyere mba Izrel. Akwụkwọ bụ́ Old Testament Word Studies nke William Wilson dere, kọwara ‘eʹrets dị ka “ụwa, ma ebe e bi ebi ma ebe a na-ebighị ebi; ọ bụrụ na e tinye ya okwu ụfọdụ, ọ na-apụta akụkụ ụfọdụ nke ala ma ọ bụ mba.” N’ihi ya, ihe mbụ okwu Hibru ahụ pụtara bụ mbara ala anyị, ma ọ bụ ụwa, elu ala.—Lee Ụlọ Nche (Bekee), January 1, 1986, peeji nke 31.
[Foto dị na peeji nke 4]
Bible na-ekwu hoo haa na ụwa ga-aghọ Paradaịs n’ọdịnihu
[Foto dị na peeji nke 7]
Ekpere nlereanya Jizọs ọ̀ dị uru ọ bara ma ọ bụrụ na ụwa gaje ịpụ n’anya?