O Mere Agadi Ma Owu Anaghị Ama Ya
O Mere Agadi Ma Owu Anaghị Ama Ya
MGBE ọtụtụ mmadụ mere agadi, ha na-enwe nkwarụ, ha na-anọkwa nanị ha. Ihe ndị dị otú ahụ emeghị Fernand Rivarol, bụ́ onye nwụrụ mgbe ọ dị afọ 95 na Geneva, Switzerland. Fernand Rivarol bi nanị ya, n’ihi na nwunye ya anwụọla, nwa ya nwanyị lụrụ di bikwa n’ụlọ nke ya. Ọ bụ ezie na ọ naghịzi apụtakarị èzí, owu anaghị ama ya. Ọtụtụ mgbe, ọ na-anọ n’otu tebụl dị na palọ ya ma jiri telifon na-akpọ ndị mmadụ ka ya na ha kwurịta banyere Chineke.
Mgbe Fernand dị ndụ, ọ dị mgbe a kpọchiri ya akpọchi. N’ihi gịnị? Ngwa ngwa Fernand na nwunye ya ghọsịrị Ndịàmà Jehova n’afọ 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Europe. Fernand nọgidesiri ike ná mkpebi ya dabeere na Bible nke bụ́ na ya agaghị emerụ mmadụ ahụ́. N’ihi nke ahụ, a chụrụ ya n’ọrụ, tụọkwa ya mkpọrọ ọtụtụ ugboro—mkpọrọ were afọ ise na ọkara ma a gụkọta ha—bụ́ mgbe ya na nwunye ya na obere nwa ha nwanyị na-anọghị.
Mgbe Fernand chetara ihe ndị mere ya n’oge gara aga, o kwuru, sị: “N’anya ọtụtụ mmadụ, o yiri ka m̀ hapụrụ ezigbo ọrụ m na-arụ ma leghara ezinụlọ m anya. Ndị mmadụ lere m anya dị ka onye iberibe ma meso m ihe dị ka onye omekome. Otú o sina dị, mgbe m chetara afọ ndị ahụ anyị nọ n’ihe isi ike, ihe m na-echeta karịsịa bụ otú Jehova si kwado ma nyere anyị aka. Ọtụtụ afọ agaala kemgbe ahụ, ma m ka tụkwasịrị Jehova obi m nile otú m si tụkwasị ya n’oge ahụ.”
Okwukwe a Fernand nwere kpaliri ya iji telifon kọọrọ ndị ọzọ olileanya ya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na mmadụ gosiri mmasị mgbe ọ na-ezi ya ozi ọma, ọ na-ezigara onye ahụ akwụkwọ e ji amụ Bible. Mgbe e mesịrị, ọ na-akpọghachi onye ahụ iji hụ ma akwụkwọ ahụ ọ̀ masịrị ya. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-azaghachi site n’idetara ya akwụkwọ ozi iji gosi ekele ha nwere, nke ahụ na-eme ya nnọọ obi ụtọ.
Onye dị ka Fernand pụrụ ịkpọtụrụ gị n’ebe i bi. Gee ntị n’ihe ọ chọrọ ịgwa gị iji mata ihe ndị o kweere. Obi na-adị Ndịàmà Jehova ụtọ mgbe nile ịkọrọ gị ihe ndị ha kweere.