Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Anụwo Banyere Ntachi Obi Job”

“Unu Anụwo Banyere Ntachi Obi Job”

“Unu Anụwo Banyere Ntachi Obi Job”

“Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.”—JEMS 5:11.

1, 2. Olee ule otu di na nwunye bi na Poland gabigara?

O RUBEGHỊ otu afọ HARALD ABT ghọrọ Onyeàmà Jehova mgbe ndị agha Hitler weghaara Danzig (nke bụ́zi Gdańsk) bụ́ nke dị n’ebe ugwu Poland. Ihe bịaziri siere nnọọ ezi Ndị Kraịst bi ebe ahụ ike, n’ezie, ndụ ha nọ n’ihe ize ndụ. Ndị Gestapo gbalịrị ịmanye Harald ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ na-ekwu na ọ bụkwaghị Onyeàmà, ma ọ jụrụ. Mgbe Harald nọsịrị izu ole na ole n’ụlọ mkpọrọ, a kpọfere ya n’ogige ịta ahụhụ dị na Sachsenhausen, bụ́ ebe e yiri ya egwu ma tie ya ihe ugboro ugboro. Otu onye agha gosiri Harald mpio anwụrụ ọkụ nke ebe a na-anọ akpọ ndị mmadụ ọkụ ma gwa ya, sị, “N’abalị 14 na-abịa abịa, ya bụrụ na ị hapụghị okpukpe gị, anwụrụ ọkụ gị ga-esi ebe ahụ kwụrụ lakwuru Jehova gị ahụ.”

2 Mgbe e jidere Harald, nwunye ya, bụ́ Elsa, ka na-enye nwa ha nwanyị dị ọnwa iri ara. Ma ndị Gestapo ahapụghị Elsa. N’oge na-adịghị anya, a napụrụ ya nwa ya ma kpọga ya n’ogige ọnwụ dị n’Auschwitz. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nwụghị n’ọtụtụ afọ o ji nọọ ebe ahụ, dịkwa ka Harald na-anwụghị. Gaa n’Ụlọ Nche nke October 15, 1980, iji gụkwuo banyere otú ha si tachie obi. Harald dere, sị: “Ná ngụkọta, anọwo m afọ 14 ná ndụ m n’ogige ịta ahụhụ na n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe m nwere na Chineke. Ndị mmadụ ajụwo m, sị: ‘Nwunye gị ò nyeere gị aka idi ihe a nile?’ N’ezie o nyeere m nnọọ aka! Site ná mmalite, amaara m na ọ dịghị ihe ga-eme ka ọ kwụsị ife Chineke, ịmara nke ahụ nyekwara m ike idi mkpagbu m. Amaara m na ọ ga-akara ya mma ịhụ na m nwụrụ karịa ịhụ na m nweere onwe m n’ihi na akwụsịrị m ife Chineke. . . . Elsa tara ahụhụ dị ukwuu n’afọ ndị o ji nọọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Germany.”

3, 4. (a) Olee onye ihe nlereanya ya pụrụ ịgba Ndị Kraịst ume ịtachi obi? (b) N’ihi gịnị ka Bible ji agba anyị ume ịtụle ihe mere Job?

3 Ọ dịtụghị mfe ịtachi obi mgbe anyị na-ata ahụhụ. Ọtụtụ Ndịàmà nọrọla n’ọnọdụ ahụ ga-agwa gị otú ahụ. Ọ bụ ya mere Bible ji adụ Ndị Kraịst nile ọdụ, sị: “Werenụ ndị amụma, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Jehova, dị ka ihe nlereanya nke nhụjuanya na inwe ndidi.” (Jems 5:10) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a kpagbuola ọtụtụ ndị ohu Chineke n’enweghị ihe kpatara ya. Ihe nlereanya nke “oké ìgwè ndị àmà [a]” pụrụ ịgba anyị ume ịnọgide jiri ntachi obi na-agba ọsọ Ndị Kraịst anyị.—Ndị Hibru 11:32-38; 12:1.

4 Na Bible, Job bụ ihe atụ nke ntachi obi. Jems dere, sị: “Lee! Anyị na-akpọ ndị tachiworo obi ndị obi ụtọ. Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Ihe mere Job na-egositụ anyị otú Jehova ga-esi gọzie ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye ya. Nke ka mkpa bụ na ọ na-eme ka anyị mata eziokwu ndị ga-abara anyị uru n’oge ihe isi ike. Akwụkwọ Job na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a: Mgbe a na-ele anyị ule, n’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji gbalịa ịghọta nke ọma ihe kpatara ya? Olee àgwà ndị na-enyere anyị aka ịtachi obi? Olee otú anyị pụrụ isi wusie Ndị Kraịst ibe anyị na-ata ahụhụ ike?

Ịghọta Nnọọ Ihe Kpatara Ya

5. Olee isi ihe anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe a na-ele anyị ule ma ọ bụ na-anwa anyị ọnwụnwa?

5 Mgbe ihe siiri anyị ike, iji nọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ofufe anyị na-efe Chineke, ọ dị anyị mkpa ịghọta nke ọma ihe kpatara ihe isi ike ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, nsogbu anyị nwere ike ime ka anyị leghara ihe ndị metụtara ofufe anyị anya. Ihe kasị mkpa bụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Nna anyị nke eluigwe na-arịọ anyị arịrịọ nke onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iburu n’obi. Ọ rịọrọ, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Nke ahụ bụ nnọọ oké ihe ùgwù! N’agbanyeghị adịghị ike anyị na ezughị okè anyị, anyị pụrụ ime ka Onye Okike anyị ṅụrịa ọṅụ. Anyị na-eme nke ahụ mgbe ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ule na n’ọnwụnwa. Ezi ịhụnanya Ndị Kraịst na-atachiri ihe nile obi. Ọ dịghị ada ada.—1 Ndị Kọrint 13:7, 8.

6. Olee otú Setan si ata Jehova ụta, oleekwa otú ịta ụta ya ruru?

6 Akwụkwọ Job mere ka o doo anya na ọ bụ Setan bụ onye na-ata Jehova ụta. O gosikwara obi ọjọọ nke mmụọ ọjọọ a a na-adịghị ahụ anya nwere na otú o si agụ ya agụụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke. Ihe mere Job na-egosi na Setan na-ebo ndị ohu Jehova nile ebubo na ha na-efe Ya n’ihi ọdịmma nke onwe ha, ọ na-achọkwa igosi na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ ịjụ oyi. Ọ taala Chineke ụta ruo ọtụtụ puku afọ. Mgbe a chụpụrụ Setan n’eluigwe, otu olu si n’eluigwe kọwara ya dị ka “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo” ma kwuo na ọ na-ebo ha ebubo ahụ “ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị.” (Mkpughe 12:10) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi, anyị ga-egosi na ebubo ndị ahụ ọ na-ebo anyị bụ ụgha.

7. Olee ihe kasị mma anyị pụrụ ime banyere ike ọgwụgwụ anụ ahụ́?

7 Anyị aghaghị icheta na Ekwensu ga-achọ iji nsogbu ọ bụla dakwasịrị anyị mee ihe iji mee ka anyị gbakụta Jehova azụ. Olee mgbe ọ nwara Jizọs ọnwụnwa? Ọ bụ mgbe agụụ ji Jizọs ka o busịrị ọnụ ọtụtụ ụbọchị. (Luk 4:1-3) Otú ọ dị, ike Jizọs nwere n’ihi mmekọrịta nke ya na Jehova nyeere ya aka imeri nnọọ ọnwụnwa Ekwensu. Lee ka o si dị mkpa iji ike sitere n’aka Chineke merie ike ọgwụgwụ anụ ahụ́ nke ọrịa ma ọ bụ ịka nká pụrụ ịkpata! Ya bụrụgodị na “mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi,” ike anaghị agwụ anyị n’ihi na “a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime ahụ́ na-adịghachi ọhụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”—2 Ndị Kọrint 4:16.

8. (a) Olee otú echiche na-ezighị ezi pụrụ isi mebiere anyị ihe? (b) Olee ọnọdụ uche Jizọs nwere?

8 Ọzọkwa, echiche na-ezighị ezi nwere ike ịchọ imebi mmekọrịta mmadụ na Chineke. Mmadụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee ihe mere Jehova ji kwe ka ụdị ihe a mee?’ Onye a kpasoro àgwà ọjọọ nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere nwanna ji mee m ụdị ihe a?’ Echiche ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị leghara isi ihe kpatara nsogbu ahụ anya ma lekwasịzie anya n’ọnọdụ anyị. Iwe Job wesara ndị enyi ya atọ echiche ha na-ezighị ezi yiri ka ọ̀ kpataara Job obi erughị ala otú ahụ ọrịa ya si kpaa anụ ahụ́ ya aka ọjọọ. (Job 16:20; 19:2) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi gosiri na iwe iwe ruo ogologo oge pụrụ ‘inye Ekwensu ohere.’ (Ndị Efesọs 4:26, 27) Kama Ndị Kraịst iwesowe ndị mmadụ iwe ma ọ bụ ichewe ihe ndị e mejọrọ, ọ ga-akara ha mma iṅomi Jizọs site n’ịnọgide “na-enyefe [onwe ha] n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe n’ezi omume,” bụ́ Jehova Chineke. (1 Pita 2:21-23) Inwe ụdị “ọnọdụ uche” Jizọs pụrụ ịbụ isi ihe ga-echebe anyị mgbe Setan na-alụso anyị ọgụ.—1 Pita 4:1.

9. Olee nkwa siri ike Chineke kwere anyị banyere nsogbu ndị anyị na-enwe na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị?

9 Nke kasị mkpa bụ na anyị ekwesịtụghị iche na nsogbu anyị na-enwe na-egosi nnọọ na Chineke na-eweso anyị iwe. Nghọtahie dị otú ahụ kpataara Job obi erughị ala mgbe ndị sịrị na ha bịara ịkasi ya obi ji okwu ọjọọ na-asa ya ahụ́. (Job 19:21, 22) Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Kama Jehova ịnwawa anyị ọnwụnwa, o kwere anyị nkwa inyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla dakwasịrị anyị nakwa imere anyị ụzọ mgbapụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịakwutere anyị. (Abụ Ọma 55:22; 1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ bụrụ na anyị abịa Chineke nso mgbe anyị nọ ná nsogbu, anyị ga-enwe ike ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi ma guzogidelie Ekwensu.—Jems 4:7, 8.

Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

10, 11. (a) Olee ihe nyeere Job aka ịtachi obi? (b) Olee otú inwe ezi akọnuche si nyere Job aka?

10 N’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ Job nọ na ya—nke gụnyere okwu ọjọọ nke ndị nkasi obi ụgha ya na-agwa ya na amaghị nnọọ ihe kpatara ọdachi dakwasịrị ya—Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta ná ntachi obi ya? O doro anya na isi ihe nyeere ya aka ịtachi obi bụ na o kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova. “Ọ na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:1) Nke ahụ bụ otú o si bie ndụ ya. Job jụrụ ịgbakụta Jehova azụ, ma mgbe ọ na-aghọtaghị ihe mere ihe ji siwere ya ike na mberede. Job kweere na ya kwesịrị ife Chineke ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ihe siri ike.—Job 1:21; 2:10.

11 Ezi akọnuche Job nwere kasikwara ya obi. Mgbe o yiri ka ndụ ya ọ̀ na-abịa ná njedebe, ọ kasiri onwe ya obi n’ihi na ọ maara na ya emeela ihe nile ya nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka, na ya agbasochiela ụkpụrụ ezi omume Jehova anya, nakwa na ya ezerela ụdị ofufe ụgha ọ bụla.—Job 31:4-11.

12. Olee ihe Job mere banyere aka Elaịhu nyeere ya?

12 Ma ọ dịkwarịị Job mkpa ka a gbazie ya olu n’akụkụ ụfọdụ. O jikwa obi umeala nabata enyemaka ahụ—nke bụ́ ihe ọzọ nyeere ya aka ịtachi obi. Job ji nkwanye ùgwù gee ntị na ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Elaịhu nyere ya, ọ nabatakwara olu Jehova gbaziri ya. O kwetara, sị: “M [gosiwo] ihe nke m na-adịghị aghọta. . . . M na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.” (Job 42:3, 6) N’agbanyeghị na Job ka na-arịa ọrịa mgbe ahụ, ọ ṅụrịrị ọṅụ na mgbazi ndị a emeela ka ya bịakwuo Chineke nso. Job kwuru, sị: “Amawo m na [Jehova] pụrụ ime ihe nile.” (Job 42:2) N’ihi otú Jehova si kọwaara ya ịdị ukwuu Ya, Job ghọtakwuru nnọọ otú ya onwe ya peruru mpe n’iji onwe ya tụnyere Onye Okike.

13. Olee otú ime ebere si baara Job uru?

13 Nke ikpeazụ bụ na Job setịpụụrụ anyị ihe nlereanya pụtara ìhè n’ime ebere. Ndị nkasi obi ụgha ya kpasuru nnọọ Job iwe, ma mgbe Jehova gwara Job ka o kpee ekpere n’isi ha, o mere otú ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova gwọrọ Job ọrịa ya. (Job 42:8, 10) O doro anya na obi ilu agaghị enyere anyị aka ịtachi obi, ma ịhụnanya na ime ebere ga-enyere anyị aka. Ịkwụsị ibu iwe n’obi na-eme ka obi ruo anyị ala, ọ na-emekwa ka anyị nweta ngọzi Jehova.—Mak 11:25.

Ndị Ndụmọdụ Maara Ihe Bụ́ Ndị Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

14, 15. (a) Olee àgwà ndị ga-enyere onye ndụmọdụ aka ịkasi ndị ọzọ obi? (b) Kọwaa ihe mere Elaịhu ji nyeliere Job aka.

14 Ihe ọzọ anyị pụrụ ịmụta n’akwụkwọ Job bụ uru ndị ndụmọdụ maara ihe bara. Ndị dị otú ahụ na-abụ ụmụnne ‘a mụrụ banyere ahụhụ.’ (Ilu 17:17) Ma, ihe mere Job na-egosi na ụfọdụ ndị ndụmọdụ nwere ike ịkụda mmadụ obi kama ịkasi ya obi. Ezi onye ndụmọdụ kwesịrị inwe ọmịiko n’ahụ́ onye ọ na-adụ ọdụ, kwanyere ya ùgwù, jirikwa obiọma mesoo ya omume, dị ka Elaịhu mere. O nwere ike ịdị mkpa ka ndị okenye na ndị ọzọ tozuru okè gbazie echiche nke ụmụnna ndị nsogbu na-anyịgbu, ha nwere ọtụtụ ihe ha nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Job ka ha na-enye ụdị ndụmọdụ ahụ.—Ndị Galeshia 6:1; Ndị Hibru 12:12, 13.

15 Ọ dị ọtụtụ ihe anyị na-amụta n’otú Elaịhu si mee ihe. O gere ntị ruo ogologo oge n’okwu ndị hiere ụzọ ndị enyi atọ Job kwuru tupu ya azaghachi ha. (Job 32:11; Ilu 18:13) Elaịhu kpọrọ Job aha mgbe ọ na-agwa ya okwu ma jiri nwayọọ gwa ya okwu dị ka enyi. (Job 33:1) Elaịhu eleghị onwe ya anya ka ọ̀ ka Job, dị ka ndị ndụmọdụ ụgha atọ Job mere. O kwuru, sị: “Site n’ụrọ ka a kpụrụ m, ọbụna mụ onwe m.” Ọ chọghị ịtụkwasị ihe n’ahụhụ Job nọ na ya site n’ikwu okwu n’echeghị echiche. (Job 33:6, 7; Ilu 12:18) Kama Elaịhu ịkatọ àgwà Job kpaburu, ọ jara ya mma maka ezi omume ya. (Job 33:32) Nke kasị mkpa bụ na Elaịhu lere ihe anya otú Chineke si lee ya, o nyekwaara Job aka iburu n’uche na ọ dịghị mgbe Jehova ga-ekpe ikpe na-ezighị ezi. (Job 34:10-12) Ọ gbara Job ume ichere Jehova, kama ịgbalịwa igosi ezi omume nke ya. (Job 35:2; 37:14, 23) Ndị okenye ọgbakọ na ndị ọzọ pụrụ nnọọ ịmụta ihe na nke ahụ.

16. Olee otú ndị ndụmọdụ ụgha atọ Job si ghọọ ngwá ọrụ Setan?

16 Ndụmọdụ Elaịhu nke amamihe dị na ya dị nnọọ iche n’okwu ndị na-agba agba Elifaz, Bildad, na Zofa gwara Job. Jehova gwara ha, sị: “Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m.” (Job 42:7) Ya bụrụgodị na ha kwuru na ha bu ezi ihe n’obi, ha bụ ngwá ọrụ Setan kama ịbụ ezi ndị enyi. Site nnọọ ná mmalite, ha atọ kweere na ọ bụ Job ka ụta dịịrị maka ahụhụ ọ na-ata. (Job 4:7, 8; 8:6; 20:22, 29) Elifaz kwuru na Chineke atụkwasịghị ndị ohu ya obi, nakwa na ọ gbasaghị Ya ma ànyị mere ezi omume ma ọ bụ na anyị emeghị. (Job 15:15; 22:2, 3) Elifaz bodịrị Job ebubo mmehie ndị Job na-emeghị. (Job 22:5, 9) Elaịhu kwanụ nyeere Job aka ile ihe anya otú Chineke si ele ya, nke bụ́kwanụ ihe onye ji ịhụnanya na-enye mmadụ ndụmọdụ na-ebu n’obi mgbe nile.

17. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe a na-ele anyị ule?

17 Ọ dị ihe ọzọ akwụkwọ Job na-akụziri anyị banyere ntachi obi. Chineke anyị na-ahụ n’anya na-ahụ ọnọdụ anyị, ọ na-agụkwa ya agụụ inyere anyị aka n’ụzọ dị iche iche, o nwekwara ikike zuru ezu iji mee otú ahụ. Anyị eburula ụzọ kwuo banyere ahụmahụ Elsa Abt. Chebara ihe a o mechara kwuo echiche: “Tupu e jide m, otu nwanna nwanyị detaara m akwụkwọ ma kwuo na mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa siri ike, mmụọ nsọ Jehova na-eme ka obi ruo anyị ala. Echere m na ọ ghaghị ịbụ na o tinyetụrụ ya nnu na ose. Ma mgbe a kpagburu m, abịara m mata na ihe o kwuru bụ eziokwu. Ọ na-eme nnọọ otú ahụ. O siri ike ịghọta ya ma ọ bụrụ na o mebeghị gị. Ma o mere m. Jehova na-enyere ndị ohu ya aka.” Ihe Elsa na-ekwu abụghị ihe Jehova nwere ike ime ma ọ bụ ihe o mere ọtụtụ puku afọ gara aga n’oge Job. Ọ na-ekwu banyere oge anyị. Ee, “Jehova na-enyere ndị ohu ya aka!”

Obi Ụtọ Na-adịrị Onye Na-atachi Obi

18. Olee uru ntachi obi Job baara ya?

18 Ọtụtụ n’ime anyị agaghị enweta mkpagbu siri ike ka nke Job. Ma n’agbanyeghị ule ụwa a mere ka ọ bịakwasị anyị, anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, dị ka Job mere. N’ezie, ntachi obi mere ka ndụ Job ka mma. Ọ nụchara Job, mee ka o zuo ezuo n’àgwà ya. (Jems 1:2-4) O mere ka mmekọrịta ya na Chineke sikwuo ike. Job ji obi ya nile kwuo, sị: “Site n’ọnụnụ ntị ka m nụrụ Gị; ma ugbu a anya m ahụwo Gị.” (Job 42:5) E mere Setan onye ụgha n’ihi na o melighị ka Job gbakụta Jehova azụ. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, Jehova ka kpọrọ Job onye ezi omume kwesịrị nṅomi. (Ezikiel 14:14) Ikwesị ntụkwasị obi na ntachi obi ya ka na-akpali ndị Chineke iṅomi ya taa.

19. Olee ihe mere i ji chee na ntachi obi bara uru?

19 Mgbe Jems degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi banyere ntachi obi, o kwuru banyere afọ ojuju ntachi obi na-eweta. O jikwa ihe atụ Job chetara ha na Jehova na-agọzi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ụba. (Jems 5:11) Anyị na-agụ na Job 42:12, sị: “Jehova gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” Chineke nyeghachiri Job ihe ndị funahụrụ ya okpukpu abụọ, ọ dịkwara ogologo ndụ ma nwee obi ụtọ. (Job 42:16, 17) N’otu aka ahụ, anyị agatụghị echeta ihe mgbu, ahụhụ, ma ọ bụ obi erughị ala ọ bụla anyị nwere n’ụwa dị ugbu a n’ụwa ọhụrụ Chineke, n’ihi na a ga-ewepụwo ha kpamkpam. (Aịsaịa 65:17; Mkpughe 21:4) Anyị anụwo banyere ntachi obi Job, anyị ekpebiwokwa na site n’enyemaka Jehova, anyị ga-eṅomi ihe nlereanya Job. Bible na-ekwe anyị nkwa, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ, nke Jehova kwere ndị nọgidere na-ahụ ya n’anya ná nkwa.”—Jems 1:12.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka obi Jehova ṅụrịa?

• Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji kwubie na ihe kpatara nsogbu ndị anyị nwere bụ na Chineke na-eweso anyị iwe?

• Olee ihe ndị nyeere Job aka ịtachi obi?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Elaịhu n’iwusi ndị kwere ekwe ibe anyị ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Ezi onye ndụmọdụ na-enwe ọmịiko n’ahụ́ onye ọ na-adụ ọdụ, na-akwanyere ya ùgwù ma jiri obiọma na-emeso ya ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Elsa na Harald Abt