Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uto Na-enye Obi Ụtọ n’Obodo Mara Mma nke Mmiri Gbara Gburugburu

Uto Na-enye Obi Ụtọ n’Obodo Mara Mma nke Mmiri Gbara Gburugburu

Uto Na-enye Obi Ụtọ n’Obodo Mara Mma nke Mmiri Gbara Gburugburu

AHỊHỊA ndụ na osisi ndị jupụtara na Taiwan na-adọrọ nnọọ mmasị nke ndị letara obodo ahụ mmiri gbara gburugburu. Ahịhịa osikapa na-esite n’ịcha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ mgbe a kụrụ ya ọhụrụ gaa n’ịcha odo odo mgbe a na-aghọ ya. Oké ọhịa na-ekpuchi akụkụ ugwu dị iche iche. N’adịghị ka obodo ndị mepere emepe bụ́ ebe ndị mmadụ jubigara ókè, ahịhịa ndụ na osisi ndị jupụtara n’ubi na n’ugwu na-adọrọ nnọọ mmasị ikiri. E kwuwerị, ọ bụ ya bụ ihe kpaliri onye mbụ si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nke hụrụ ebe a mmiri gbara gburugburu ịkpọ ya Ilha Formosa, ma ọ bụ “Obodo Mara Mma nke Mmiri Gbara Gburugburu.”

N’ezie, Taiwan bụ obodo mara mma nke mmiri gbara gburugburu ma o bughị ibu—ọ dị narị kilomita atọ na iri itoolu nanị n’ogologo na ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii n’obosara. Ugwu ndị dị elu kpuchiri ọtụtụ ebe n’obodo ahụ miri gbara gburugburu. Yü Shan (Ugwu Morrison) dị elu karịa Ugwu Fuji dị na Japan ma ọ bụ Ugwu Cook dị na New Zealand. Ihe karịrị nnọọ nde mmadụ 22 bi na Taiwan bi n’obere ala ndị dị n’akụkụ oké osimiri bụ́ ndị gbara ugwu ndị dị n’etiti obodo ahụ gburugburu.

Ụdị Uto Ọhụrụ

Otú ọ dị, e nwere ụdị uto ọzọ na-apụtawanye ìhè na Taiwan—mmụba nke ọrụ Ndịàmà Jehova. Nke a na-apụta ìhè n’ịnụ ọkụ n’obi ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ụmụaka, na-egosi ozugbo ha matara ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ọ na-akpali mmasị ịhụ ka ọnụ ọgụgụ nke ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova na nzube ya na-amụba.

Uto na-eme ka e nwee mkpa iwu ihe owuwu ndị ọhụrụ. Na December 1990, a zụtara ala iji wusakwuo alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ụlọ ọrụ nke mbụ dị na Taipei abakwaghị aba ịnọ na ya lekọta ọrụ nke otu puku ndị nkwusa, narị asaa na iri asaa na asaa e nwere na Taiwan n’oge ahụ. Ka ndị ọrụ afọ ofufo si mba ọzọ na ndị obodo ahụ, ma ndị agadi ma ụmụaka, rụsichara ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ, e wuchara ihe owuwu ọhụrụ ahụ mara mma dị na Hsinwu ma dị njikere iji ya malite ọrụ n’August 1994. N’oge ahụ, e nwere puku ndị nkwusa abụọ, narị ise na iri na ise. Ugbu a ihe karịrị afọ iri gasịrịla, ọnụ ọgụgụ ahụ amụbaala okpukpu abụọ, gafee puku ndị nkwusa ise na narị ise, ihe karịkwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ na-ekwusa ozi ọma dị ka ndị ozi oge nile kwa ọnwa. Anyị ekwesịtụghị ichefu ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ bụ́ ndị dị ka “igirigi” ụtụtụ na-akụ ahụ́ jụụ.—Abụ Ọma 110:3.

Uto Ime Mmụọ n’Etiti Ndị Na-eto Eto

Ọtụtụ n’ime ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ ebe a ka bụ nnọọ ụmụaka. Ụfọdụ n’ime ha ka nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo dị n’ebe ugwu Taiwan, a kpọrọ otu di na nwunye òkù ịbịa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke mbụ ha bụ́ ebe Ndịàmà Jehova na-anọ amụta otú e si akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Ọ tụrụ di na nwunye ahụ n’anya ịhụ otu nwata nwoke aha ya bụ Weijun ka o ji nkà gụọ Bible n’elu ikpo okwu karịa nnọọ otú ọtụtụ ndị toro eto ga-esi gụọ ya. N’ọmụmụ ihe ndị ọzọ ha gara ka e mesịrị, ọ tọrọ ha nnọọ ụtọ ịhụ na ọbụnadị ụmụaka ndị na-amalitebeghị akwụkwọ na-aza ajụjụ ndị a pụrụ ịmụta ihe na ha. Di na nwunye a kwuru banyere otú obere ụmụaka si akpa ezi àgwà n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Gịnị mere ndị a na-eto eto ji lekwasị nnọọ anya n’ịmụ Bible n’obodo a ọtụtụ ndị bi na ya na-ekpe okpukpe Buddha na Tao? Ọ bụ n’ihi na ndị mụrụ ha bụ́ Ndị Kraịst etinyewo ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ ma zụlite ezinụlọ nwere obi ụtọ nke ihe nile ha na-eme hiwere isi ná mmekọrịta ha na Jehova. N’ihi na ndị mụrụ Weijun na-agbalị nnọọ ime ka ọmụmụ Bible ezinụlọ ha na ozi ubi ha na-atọ ụtọ, nwanne Weijun nke nwoke na nke nwanyị bụ́ ndị tọrọ ya aghọọla Ndịàmà e mere baptizim. N’oge na-adịbeghị anya mgbe Weijun kwuru na ya chọrọ iso gaa ozi ọma, nne ya kwuru na magazin obere nwa a nyeferela n’ọnwa ahụ karịrị nke ndị ọzọ nile nọ n’ezinụlọ ha nyefere ma a gụkọta ha ọnụ. N’ezie, ọ na-enwe mmasị ikwu banyere Bible, ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na ịgwa ndị ọzọ ihe ndị ọ mụtara.

Ka Ha Na-eto

Olee otú ndị na-eto eto dị otú ahụ na-eme ka ha na-eto? Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-anọgide na-ahụ nnọọ Jehova na ozi Ndị Kraịst n’anya. Dị ka ihe atụ, Huiping bụ nwa akwụkwọ. Otu ụbọchị, onye nkụzi ha kwuru na e nwere otu okpukpe na-anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara ma na ya amaghị ndị ha bụ. Mgbe a gbasara akwụkwọ, Onye Kraịst a na-eto eto kọwaara onye nkụzi ya na ndị ahụ bụ Ndịàmà Jehova, ma kọwaara ya ihe mere ha na-ejighị ekwe ka a mịnye ha ọbara.

Onye nkụzi ọzọ gosiri vidio kwuru banyere ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Vidio ahụ kwuru banyere 1 Ndị Kọrint 6:9, ma onye nkụzi ahụ kwuru na Bible akagbughị nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwanyị idina nwanyị. Huiping kọwakwaara onye nkụzi ahụ ihe Chineke kwuru banyere omume dị otú ahụ.

Mgbe nwa klas Huiping bụ́ Shuxia na-akwadebe ihe odide ya banyere ime ihe ike n’ezinụlọ, Huiping nyere ya Teta! nke November 8, 2001, nke isiokwu dị n’ihu ya bụ, “Enyemaka Maka Ndị Inyom A Na-eti Ihe” ma kọwaara ya na magazin ahụ kwuru ọtụtụ ihe ndị dabeere na Bible banyere ihe ahụ ọ na-achọ ide. N’ikpeazụ, Shuxia ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ya na Huiping na-ekwusaziri ndị ọzọ ozi ọma.

Ọtụtụ Ndị Kraịst nọ n’ụlọ akwụkwọ maara na ọ dịghị mfe ime ka a mara ha dị ka ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Karịsịa n’ime obodo. Ndị ọgbọ Zhihao na-eji ya eme ihe ọchị n’ihi okpukpe ya na ozi ọma ọ na-ekwusa. O kwuru, sị: “Enwere m nkụda mmụọ nke na ana m atụ ụjọ ịhụ ụmụ klas m mgbe m nọ n’ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ha na-adị iri akọ m ọnụ!” Otu ụbọchị, onye nkụzi Zhihao gwara ya ka ọ gwa ụmụ klas ya banyere okpukpe ya. Zhihao kwuru, sị: “Ekpebiri m iji Jenesis isi 1 malite okwu m ma zazie ajụjụ ndị dị ka: Ònye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya? Nakwa Olee otú mmadụ si bịa dịrị? Ozugbo m malitere ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ụfọdụ n’ime ha chịwara m ọchị ma na-ekwu na ihe m kweere enweghị isi. Ma, agara m n’ihu ma kwuchaa okwu m. Mgbe e mesịrị, enwetara m ohere ịgwa ụfọdụ n’ime ụmụ klas m okwu n’otu n’otu banyere ọrụ anyị na ihe anyị kweere. Ugbu a, ha hụ m n’ozi ọma, ha anaghịzi achị m ọchị!”

Zhihao kwukwara, sị: “Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m bụ Ndịàmà, anyị na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụtụtụ. Anyị na-amụkwa Bible ma na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ọ bụ ya mere m ji nwee ike ịka obi ịgwa ndị ka pụrụ ịdị na-akọ m ọnụ mgbe m na-akụziri ndị ọzọ eziokwu ndị na-eme obi ụtọ dị na Bible, okwu.”

Tingmei bụ nwa akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ ọrụ aka nke ndị nwanyị. Ọ dị mgbe ụmụ klas ya ụfọdụ gwara ya ka o soro ha na ụmụ akwụkwọ ndị nke nwoke nọ n’ụlọ akwụkwọ ọzọ gaa mkpagharị. Ọ hụrụ na ụdị mkpakọrịta ahụ nwere ike iduba mmadụ n’ime omume rụrụ arụ, n’ihi ya ọ jụrụ ịga. Ha kpọrọ ya ọtụtụ ugboro, n’agbanyeghị na ọ na-akọwara ụmụ klas ya isiokwu ndị mara mma dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. * Ụmụ agbọghọ ahụ kwara ya emo, na-ekwu na ọ maghị ebe a nọ. Otú ọ dị, a bịara hụ ihe mere o ji dị mkpa ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible mgbe otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ tụụrụ ime ma sikwopụ ya. Tingmei kwuru, sị: “Ime uche Jehova emeela ka m nwee akọnuche dị ọcha. N’ihi ya, enwere m ọṅụ, obi na-erukwa m nnọọ ala.”

Imeri Ihe Ndị Na-egbochi Uto

Ruiwen bụ otu n’ime ezigbo ndị enyi Tingmei. Mgbe Ruiwen ka bụ obere nwa, o chere na ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na ịga ozi ubi bụ nanị ọrụ na-agwụ ike. Otú ọ dị, mgbe ọ hụrụ ọdịiche dị n’ịhụnanya sitere n’obi nke ndị nọ n’ọgbakọ ya na ọbụbụenyi elu ọnụ nke ụmụ klas ya, ọ bịara doo ya anya na ya kwesịrị ime mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ya. Ruiwen malitere izi ụmụ akwụkwọ ibe ya ozi ọma, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọtara nke ọma ihe o kwesịrị ime. Ọ malitere ịsụ ụzọ inye aka, na-eji ihe karịrị awa 50 eje ozi n’ọnwa. O mesịrị malite ozi ọsụ ụzọ oge nile, na-eji ihe karịrị awa 70 eje ozi n’ọnwa. Ruiwen kwuru, sị: “Amaghị m otú m ga-esi kelee Jehova. Ọ dịghị mgbe m gwụrụ ya ike. N’agbanyeghị na m mere ihe ndị wutere ya, ọ nọgidere na-ahụ m n’anya. Nne m na ndị ọzọ mụ na ha nọ n’ọgbakọ hụkwara m n’anya otú ahụ. Ugbu a m na-eduziri mmadụ ise ọmụmụ Bible, echere m na m na-arụ ọrụ kasị enye obi ụtọ.”

N’otu ụlọ akwụkwọ kọleji dị n’ime obodo, a họpụtara ụmụaka abụọ bụ́ Ndịàmà ịga nọchite anya ụlọ akwụkwọ ha n’asọmpi ịgba egwú ọdịnala. Mgbe ha chọpụtara ihe dị n’asọmpi ahụ, Ndịàmà ahụ chere na iso na ya ga-emebi akọnuche ha dị ka Ndị Kraịst. Mgbe ha gbalịrị ịkọwa otú ha si lee ya anya ma rịọ ka e wepụ ha, a jụrụ arịrịọ ha. Kama nke ahụ, ndị nkụzi ha gwara ha na ebe ọ bụ na a họpụtala ha, na ha ga-agarịrị ya. Ebe Ndịàmà ahụ na-eto eto na-achọghị imebi akọnuche ha, ha si n’Intanet degara ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ akwụkwọ ozi ma kọwaara ha nsogbu ha. Ọ bụ ezie na a zaghachighị ụmụaka ahụ akwụkwọ ozi ha, n’oge na-adịghị anya, ụlọ akwụkwọ ahụ natara ntụziaka ka ha ghara ịmanye onye ọ bụla isonye n’asọmpi dị otú ahụ. Lee ka ụmụaka a si nwee obi ụtọ ịhụ na ọzụzụ sitere na Bible ha nwetara emewo ka ha nwee ezi akọnuche ma nye ha ike ịjụ ihe ọjọọ!

Ọ na-atọ nnọọ ọbụna ndị nwere nkwarụ ụtọ ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya ha dabeere na Bible. Minyu nwere ahụ́ mkpọnwụ kemgbe a mụrụ ya. Ebe ọ na-enweghị ike iji aka ya sapee ebe ndị ọ chọrọ ịgụ na Bible, ọ na-eji ire ya asape ya. Mgbe ọ na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ na-edinara n’oche ogologo na-adịghị elu, onye na-enyere ya aka ga-anọkwa n’oche dị ala ma jidere ya maịkrofon. Lee otú o si eme ụmụnna obi ụtọ ịhụ mgbalị Minyu na-eme iji mee ihe omume ndị a!

Mgbe Minyu chọrọ ịghọ onye nkwusa Alaeze, ụmụnna nwanyị ụfọdụ n’ọgbakọ ya mụrụ otú e si eji telifon ekwusa ozi ọma iji nyere ya aka. Ọ na-eji ire ya apị nọmba telifon, ụmụnna nwanyị ndị ahụ ana-edekọrọ ya ihe ndị e kwuru na fon. Ọrụ ahụ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ ghọrọ ọsụ ụzọ inyeaka, na-eji awa 50 ruo 60 agwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke kwa ọnwa site na telifon. E nweela ụfọdụ ndị naara ya akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma kwe ka ọ na-emere ha nletaghachi site na fon. Ugbu a, ọ na-eduziri mmadụ atọ o ji fon nweta ọmụmụ Bible.

Ee, dị ka igirigi na-akụ jụụ n’ahụ́, ụmụ okorobịa—na ụmụ agbọghọbịa—nọ n’ọgbakọ 78 nke Ndịàmà Jehova dị na Taiwan ji obi ha nile na ịnụ ọkụ n’obi na-ewegara ọtụtụ nde mmadụ juru n’obodo a mmiri gbara gburugburu ozi ọma na-enye ndụ nke Alaeze ahụ. Nke a bụ nanị akụkụ dị nta nke mmezu zuru ụwa ọnụ nke amụma Bible bụ́: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị; n’ịma mma nile nke ịdị nsọ, site n’afọ nke ụtụtụ; Gị nwe igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa gị.” (Abụ Ọma 110:3) Lee ka ndị a na-eto eto si bụrụ ihe agbamume nye ndị agadi ha na ha na-eso ekwusa ozi ọma, nke kasịkwa mkpa bụ na ha na-ewetara Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, ọṅụ!—Ilu 27:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

A CHỌKWURU ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE

N’ihi mmụba e nwere na Taiwan, e nwewo mkpa dị ukwuu maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi gịnị? N’ihi na e wezụga n’ime ime obodo ụfọdụ, ọ na-esi ike inweta ala kwesịrị ekwesị iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze. E wezụga nke ahụ, ala dị oké ọnụ, iwu ndị na-achịkwa ihe ndị a ga-ewu n’ógbè dị iche iche sikwara ike. N’obodo ndị ka mepee emepe, nanị ihe ụmụnna nwere ike ime bụ ịzụ ụlọ ndị e jibu mere ọfịs ma jiri ha mere Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’agbanyeghị nke ahụ, uko nke ihe ka ọtụtụ n’ọfịs ndị ahụ dị nnọọ ala, ụgwọ a na-akwụ na ha buru ibu, a naghị ekwe ka ọtụtụ mmadụ bata na ha, ma ọ bụ e nwee ihe ndị ọzọ na-eme ka ha ghara ịdị mma iji ha mere Ụlọ Nzukọ Alaeze.

N’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ ndị na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova nọ na Taiwan enwewo ike iwu ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. A ka na-achọ ala ndị ọhụrụ ka Ndịàmà na-egosi na ha dị njikere inye onyinye ego maka ha nakwa ịmụtakwu otú e si ewu ihe iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze na ha.