Irite Uru Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe nke Ndị M Hụrụ n’Anya
Akụkọ Ndụ
Irite Uru Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe nke Ndị M Hụrụ n’Anya
DỊ KA KATHLEEN COOKE SI KỌỌ
NA 1911, mgbe nne mama m bụ́ Mary Ellen Thompson gara ileta ndị ikwu ya bi na Glasgow, nke dị na Scotland, ọ gara gere okwu ihu ọha Charles Taze Russell, bụ́ onye a ma ama nke so n’òtù Ndị Mmụta Bible. A na-akpọzi ndị òtù a Ndịàmà Jehova. Ihe nne mama m nụrụ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. Mgbe ọ lọghachiri South Africa, ọ kpọtụụrụ Ndị Mmụta Bible nọ na South Africa. O so ná mmadụ iri na isii e mere baptizim ná mgbakọ mbụ Ndị Mmụta Bible nwere na South Africa n’April 1914. Edith, bụ́ nwa nne mama m, nke mesịkwara ghọọ mama m, dị afọ isii mgbe ahụ.
Mgbe Nwanna Russell nwụsịrị na 1916, ọgba aghara batara n’etiti Ndị Mmụta Bible gburugburu ụwa. Ọnụ ọgụgụ Ndị Mmụta Bible ka kwesịrị ntụkwasị obi na Durban siri n’iri isii gbaturuo iri na abụọ. Nne papa m na nwanyị a na-akpọ Ingeborg Myrdal na nwa ya nwoke bụ́ Henry, bụ́ onye na-erubeghị afọ iri abụọ, nke e mekwara baptizim n’oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, sonyeere ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Na 1924, Henry ghọrọ onye ọsụ ụzọ, nke bụ́ ihe a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. O jere ozi n’ọtụtụ ebe ná ndịda Africa ruo afọ ise sochirinụ. Na 1930, Henry na Edith lụrụ, a mụkwara m afọ atọ ka nke ahụ gasịrị.
Ibinyere Ndị Ikwu Anyị
Anyị bitụrụ na Mozambique ruo oge ụfọdụ, ma mesịa kwaga n’ụlọ ndị mụrụ mama m nke dị na Johannesburg na 1939. Nna mama m
enweghị mmasị n’eziokwu Bible, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-emegide nne mama m. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-anabata ndị ọbịa nke ọma. A mụrụ nwanne m nwanyị, bụ́ Thelma, na 1940, mụ na ya mụtakwara otú e si elekọta ndị agadi. Ọtụtụ ugboro, anyị na-anọ ogologo oge ma anyị na-eri nri abalị, na-akọrị ihe ndị mere n’ụbọchị ma ọ bụ ihe ndị mere n’oge ndị gara aga.Ndịàmà na-abịa eleta anyị na-anọ n’ụlọ anyị ruo oge ụfọdụ, karịsịa ndị nke na-eje ozi oge nile. Ha na-eso anyị akọrị ihe ndị mere n’ụbọchị n’oge nri abalị, ihe ndị ha kwuru mekwuru ka anyị nwee mmasị n’ihe nketa ime mmụọ nke ndị mụrụ anyị nyefere anyị. Nke a mere ka ọchịchọ mụ na Thelma nwere ịghọ ndị ọsụ ụzọ dị ka ha sikwuo ike.
E sitere na mgbe anyị dị obere mee ka anyị nwee mmasị ịgụ ihe. Ma mama anyị, ma papa anyị, ma nne mama anyị socha na-agụrụ anyị ihe site n’akwụkwọ ndị na-akọ ezigbo akụkọ ma ọ bụ site na Bible. Ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma bịara mara anyị ahụ́. Papa anyị bụ ohu kọmpịnị (nke a na-akpọzi onyeisi oche ndị nlekọta) nke Ọgbakọ Johannesburg, n’ihi ya, anyị nile na-aga ọmụmụ ihe n’oge. Mgbe ọ bụla e nwere mgbakọ distrikti, papa anyị na-anọ na-ahazi otú mgbakọ ahụ ga-esi gaa, ebe mama anyị na-anọ na-enye ndị bịara mgbakọ ebe ha ga-ebi.
Mgbakọ Distrikti nke Pụrụ Iche Nye Anyị
Mgbakọ distrikti e nwere na 1948 na Johannesburg pụrụ nnọọ iche. Ndị si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, bịara ya. Nke ahụ bụkwa nke mbụ ndị si n’isi ụlọ na-abịara anyị mgbakọ. E kenyere papa anyị iji ụgbọala ya na-akwọgharị Nathan Knorr na Milton Henschel n’oge nile ha ga-anọ ya. Ọ bụkwa ná mgbakọ ahụ ka e mere m baptizim.
Obere oge ka nke a gasịrị, nna papa anyị gwara papa anyị na o wutere ya nke ukwuu na ya sonyere ná ndị kewapụrụ onwe ha n’etiti Ndị Mmụta Bible mgbe Nwanna Russell nwụsịrị. Ọ nwụziri ọnwa ole na ole ka nke ahụ gasịrị. Nne papa m nọgidekwara bụrụ Onyeàmà ruo mgbe o jesịrị ozi elu ala ya na 1955.
Ihe Omume Ndị Kpụziri Ndụ M
Aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile na February 1, 1949. N’oge na-adịghị anya, a mara ọkwa na a ga-enwe mgbakọ mba nile na New York City n’afọ na-esonụ. Anyị nwere obi ụtọ maka ọkwa ahụ a mara. Ọ gụsiri anyị agụụ ike ịga, ma anyị enweghị ego anyị ga-eji gaa. Nna mama m, nwụrụ na February 1950, nne mama m jikwara ego nna mama m hapụụrụ ya kwụọrọ anyị ise ụgwọ anyị ji mee njem ahụ.
Ka ọ fọdụrụ izu ole na ole tupu anyị agawa mgbakọ ahụ, enwetara m akwụkwọ ozi sitere n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York. Ọ bụ akwụkwọ ozi e ji kpọọ m oku ịbịa soro na klas nke iri na isii nke ụlọ
akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ bụ́ Gilead. Ọṅụ juru m obi n’ihi na erubeghịdị m afọ iri na asaa mgbe ahụ. Mgbe akwụkwọ ahụ bidoro, eso m n’ụmụ akwụkwọ iri si South Africa nọ na klas ahụ.Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na February 1951, mmadụ asatọ n’ime anyị lọghachiri South Africa ịbịa jee ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ. N’afọ ise sochirinụ, mụ na onye ozi ala ọzọ ibe m kwusara ozi ọma karịsịa n’obodo nta ebe ndị a na-asụ Afrikaans. Na mmalite, amachaghị m asụ Afrikaans, echetakwara m otu ụbọchị m ji ịnyịnya ígwè na-alọta ma na-ebe ákwá n’ihi na emeghị m nke ọma n’ozi ubi. Ka oge na-aga, amụtara m ịsụ asụsụ ahụ, Jehova gọzikwara mgbalị m.
Ịlụ Di na Ozi Njegharị
Na 1955, amatara m John Cooke. O nyere aka ịmalite ọrụ nkwusa na France, Portugal, na Spen tupu Agha Ụwa nke Abụọ nakwa mgbe a lụsịrị agha ahụ, ọ ghọkwara onye ozi ala ọzọ n’Africa n’afọ ahụ m matara ya. Ka e mesịrị, o dere, sị: “Enwetara m ihe ịtụnanya atọ n’otu izu . . . Otu nwanna nwoke na-emesapụ aka nyere m otu obere ụgbọala; a họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta distrikti; Ahụrụ m otu nwa agbọghọ ihe ya masịrị m.” * Anyị lụrụ na December 1957.
Tupu anyị alụọ, John gwara m na mụ na ya ga na-ebi ndụ obi ụtọ mgbe nile, o mekwara otú ahụ. Anyị letara ọgbakọ ndị dị na South Africa nile, karịsịa ebe ndị isi ojii bi. Kwa izu, ọ na-esiri anyị ike inweta akwụkwọ ikike anyị ga-eji banye n’ebe ndị dị otú ahụ, ma ya fọdụkwa ịrahụ arahụ n’ebe ndị ahụ. Ugboro ole na ole, anyị rahụrụ n’ala otu ụlọ ahịa dịdebere ebe ndị ọcha bi, anyị na-ezo ka ndị na-agafe agafe ghara ịhụ anyị. Anyị na-anọkarị n’ụlọ Ndịàmà bụ́ ndị ọcha ụlọ ha kasị dịrị nso n’ebe anyị na-aga. Site n’ebe ha bi ruo ebe anyị na-aga na-adịkarị ọtụtụ kilomita.
Ihe isi ike ọzọ anyị nwekwara bụ na a na-ewu ụlọ mgbakọ n’ime ọhịa. Anyị gosiri ndị mmadụ
fim Ndịàmà Jehova mepụtara bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ ghọta na anyị bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Anyị na-ebu ígwè na-enye ọkụ aga, ebe ọ bụ na a naghị enwekarị ọkụ eletrik n’ebe ndị ahụ. Anyị na-enwekwa ihe isi ike n’ebe ndị Britain na-achị bụ́ ebe ndị a machibidoro akwụkwọ anyị iwu n’oge ahụ, tinyekwara ihe ịma aka nke ịmụ asụsụ Zulu. N’agbanyeghị ihe ndị a, anyị nwere ọṅụ na anyị nwere ike ijere ụmụnna anyị ozi.N’August 1961, John ghọrọ onye mbụ kụziri ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze nke were izu anọ e nwere na South Africa, bụ́ nke e hiwere iji nyere ndị nlekọta ọgbakọ aka. Ọ bụ ọkà n’izi ihe ma na-eji arụmụka na ihe atụ ndị na-adịghị agbagwoju anya eru n’obi ndị mmadụ. Anyị mere njem ihe fọrọ nke nta ka o ruo otu afọ na ọkara site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ maka klas nke ọ bụla a ga-enwe n’asụsụ Bekee. Ọ bụrụ na John agaa ịkụzi ihe, ana m esoro Ndịàmà nọ ebe ahụ na-aga ozi ọma. Anyị natara akwụkwọ ozi tụrụ anyị n’anya bụ́ nke e ji kpọọ anyị oku ịbịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na South Africa nke dịdewere Johannesburg malite na July 1, 1964.
Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge a, otú ahụ́ si na-eme John malitere ịgbagwoju anyị anya. Ọ rịara ụkwara nta na 1948, mgbe ọ rịasịrị nke ahụ, ume maliteziri ịdị na-agwụ ya n’ahụ́ kwa mgbe kwa mgbe. Ọrịa na-ejitu ya ruo ọtụtụ ụbọchị—ọ naghịkwa enwe ike ime ihe ọ bụla ma ọ bụ ịhụ onye ọ bụla. Otu dọkịta anyị gara na nke ya tupu a kpọọ anyị oku ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ chọpụtara na ihe na-arịa John bụ ịda mbà n’obi.
Ọ gatụghị ekwe anyị omume ịkwụsịlata ozi anyị dị ka dọkịta ahụ tụrụ aro ka anyị mee. N’alaka ụlọ ọrụ, e kenyere John ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, e kenyekwara m ịrụ ná ngalaba na-agụgharị ihe e dere ede. Anyị nwere nnọọ obi ụtọ inwe ọnụ ụlọ nke anyị. John jere ozi n’ógbè ebe ndị a na-asụ Portuguese tupu anyị alụọ, n’ihi ya, na 1967, a gwara anyị ka anyị nyere otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà na-asụ Portuguese aka ikwusa ozi ọma n’ógbè ndị buru nnọọ ibu na-asụ Portuguese ma ndị nke dị na Johannesburg ma ndị nke dị ya gburugburu. Nke a pụtara na m ga-amụkwa asụsụ ọhụrụ ọzọ.
Ebe ọ bụ na ógbè ndị na-asụ Portuguese anọkọtaghị ọnụ, anyị mere ọtụtụ njem—mgbe ụfọdụ, anyị na-aga ihe ruru narị kilomita atọ iji ruo ebe ndị nwere mmasị bi. N’oge a, Ndịàmà na-asụ Portuguese malitere isi Mozambique na-abịa eleta anyị n’oge mgbakọ, nke ahụ nyekwaara ndị ọhụrụ aka. N’ihe dị ka afọ iri na otu anyị kwusara ozi ọma n’ógbè ndị na-asụ Portuguese, obere ìgwè anyị dị ihe dị ka mmadụ iri atọ mụbara ruo ọgbakọ anọ.
Mgbanwe Ndị E Nwere n’Ezinụlọ A Mụrụ M
Ka ihe ndị a nọ na-eme, ụfọdụ ihe gbanwere n’ezinụlọ ndị mụrụ m. Na 1960, nwanne m nwanyị, bụ́ Thelma, lụrụ John Urban, bụ́ onye ọsụ ụzọ si United States. Na 1965, ha so na klas nke iri anọ nke Gilead, ha jekwara ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Brazil ruo afọ iri abụọ na ise. Na 1990, ha laghachiri Ohio iji lekọta ndị mụrụ John, bụ́ ndị na-arịa ọrịa mgbe ahụ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị dị n’ilekọta ndị ọrịa, ha nọgidere n’ozi oge nile ha ruo taa.
Nne mama m jesịrị ozi elu ala ya na 1965, o kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke ruo mgbe ọ nwụrụ mgbe ọ gbara afọ iri itoolu na asatọ. Papa m lara ezumike nká n’afọ ahụ. Ya mere, mgbe a gwara mụ na John ka anyị gaa nye aka n’ógbè ndị na-asụ Portuguese, mama m na papa m wepụtara onwe ha iso anyị gaa. Ha nyere nnọọ aka mee ka ìgwè ahụ kwụsie ike nke na mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, e hiwere ọgbakọ mbụ. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, mama m malitere ịrịa ọrịa cancer, bụ́ nke gburu ya na 1971. Papa m nwụrụ afọ asaa ka mama m nwụsịrị.
Ịnagide Ọrịa John
Ọ bụ n’afọ ndị sochiri 1970 ka ọ bịara doo anyị anya na John agaghị agbake n’ọrịa ya. O jiri nwayọọ nwayọọ hapụsịa ihe ùgwù ndị dị oké ọnụ ahịa o nwere n’ozi Betel, gụnyere iduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche a na-enwe kwa izu
n’ezinụlọ Betel, ọ kwụsịkwara iduzi ihe mmụta dịrị ụbọchị ezinụlọ Betel na-enwe n’ụtụtụ. A gbanwere ebe ọ na-arụ ọrụ site ná Ngalaba Ije Ozi gaa ná Ngalaba Na-ebugharị Akwụkwọ Ozi, mesịakwa gaa n’ilekọta okooko osisi.Ịnụ ọkụ n’obi John nwere n’ozi mere ka o siere ya ike ime mgbanwe. Mgbe ọ bụla m siri ọnwụ na ọ ga-ezurịrị ike, ọ na-eji njakịrị akpọ m agbụ ígwè ya ma makụọ m n’ụzọ na-egosi na ọ hụrụ m n’anya. Anyị mesịrị hụ na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịhapụ ógbè ndị na-asụ Portuguese ma soro ọgbakọ na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’alaka ahụ na-eje ozi.
Ka ọrịa John na-akawanye njọ, ọ bụ nnọọ ihe na-emetụ n’ahụ́ ịhụ otú mmekọrịta ya na Jehova si na-echiwanye anya. Mgbe ọ bụla John tetara n’etiti abalị n’ihi obi ịda mbà, anyị na-akpagide nkata ruo mgbe o nwetara onwe ya ikpegara Jehova ekpere maka enyemaka. O mechaziri mụta ịnagide obi ịda mbà ya nanị ya site n’ịgbalị ikwughachi ihe ndị dị ná Ndị Filipaị 4:6, 7: “Enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla . . . ” Ọ na-enwetazi onwe ya ma malite ikpe ekpere. Mgbe mgbe, ana m eteta ma nọrọ duu na-ele egbugbere ọnụ ya ka ọ na-emegharị mgbe ọ na-arịọsi Jehova arịrịọ ike ka o nyere ya aka.
Alaka ụlọ ọrụ anyị anaghịzi aba anyị, a malitekwara iwu alaka ọhụrụ buru ibu n’ebe ọzọ na-abụghị na Johannesburg. Mụ na John gara ebe ahụ dị nnọọ jụụ ọtụtụ ugboro bụ́ ebe mkpọtụ na-adị n’obodo ukwu na-adịghị na ya, e metọghịkwa ikuku dị ebe ahụ emetọ. Nkwere e kweere ka mụ na John kwaga n’ụlọ ndị ga-anọ nwa oge ruo mgbe a rụchara alaka ọhụrụ ahụ nyeere John aka nke ukwuu.
Ihe Ịma Aka Ndị Ọzọ
Ka John na-enwewanye nsogbu n’iche echiche, ọ bịara na-esiri ya ike ịrụ ọrụ ya. Otú ndị ọzọ si na-enyere John aka metụrụ m nnọọ n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna nwoke na-aga n’ọ́bá akwụkwọ ọhaneze ime nnyocha, ọ na-akpọrọ John. John na-ekponyeju traktị na magazin ndị ọ ga-enyefe ndị mmadụ n’akpa uwe ya. Nke a nyeere John aka inwe mmetụta na ya na-arụpụta ihe nakwa na ya bara uru.
Ọrịa Alzheimer mesịrị mee ka John gharazie ịdị na-agụta ihe e dere ede. Obi dị anyị ụtọ mgbe e wepụtara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nakwa abụ Alaeze na kaseti ndị a na-egere egere. Anyị na-ege ha ugboro ugboro. Ahụ́ anaghị eru John ala ma ọ bụrụ na mụ anọnyereghị ya ma soro ya na-ege ntị, n’ihi ya, ana m eji ọtụtụ awa ndị ahụ m na-eji anọnyere ya akpa ihe. Nke ahụ mere ka anyị nwee ọtụtụ uwe oyi na blanket.
Ka oge na-aga, nsogbu ahụ́ ike John bịara mee ka ọ dị mkpa na m ga na-elekọta ya karịa ka m na-emebu. Ọ bụ ezie na ike ọgwụgwụ anaghị ekwekarị ka m na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ na-amụ ihe, ọ bụ nnọọ ihe ùgwù ilekọta ya ruo n’ọgwụgwụ. Ọgwụgwụ ahụ bịara na 1998 bụ́ mgbe John nwụrụ ka m ku ya n’ahụ́ obere oge ka ọ gbasịrị afọ iri asatọ na ise—ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọgwụgwụ. Ana m atụsi nnọọ anya ike ịhụ ya mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ọrịa ya alaa, ya amaliteghachikwa iche echiche nke ọma.
Inweta Ume Ọhụrụ
Mgbe John nwụsịrị, o siiri m ike inweta onwe m. Ya mere, na May 1999, eletara m nwanne m nwanyị bụ́ Thelma na di ya na United States. Ọ bụ nnọọ ihe obi ụtọ na ihe na-enye ume ọhụrụ izute ọtụtụ ndị enyi anyị anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị anyị metara enyi n’oge anyị gara n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na New York! Nke ahụ gbara m ume nke ukwuu.
Iche nnọọ banyere àgwà nke ndị a m hụrụ anya na-echetaghachiri m ọtụtụ ihe ndị baara m uru. N’ihi ntụziaka ha, ihe nlereanya ha, nakwa enyemaka ha, amụtara m ịgbalị inwekwu ịhụnanya n’ebe ndị mba ọzọ na ndị agbụrụ ọzọ nọ. Amụtara m inwe ndidi, ịtachi obi na ime mgbanwe. Nke kasị mkpa, ahụrụ m na Jehova, bụ́ Onye na-anụ ekpere, nwere obiọma n’ebe m nọ. Ọ dị m otú ọ dịrị ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “Ihe na-agara ya nke ọma, bụ́ onye Ị na-ahọpụta, onye Ị na-emekwa ka ọ bịaruo nso, ka o wee biri n’ogige Gị nile: ka afọ ju anyị n’ezi ihe nke ụlọ Gị.”—Abụ Ọma 65:4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke August 1, 1959, peeji nke 468-472.
[Foto dị na peeji nke 8]
Nne mama m na ụmụ ya ndị nwanyị
[Foto dị na peeji nke 9]
Mụ na ndị mụrụ m mgbe m mere baptizim na 1948
[Foto dị na peeji nke 10]
Mụ onwe m, Albert Schroeder, bụ́ onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead, na ụmụ akwụkwọ itoolu ndị ọzọ si South Africa
[Foto dị na peeji nke 10]
Mụ na John na 1984