“Meenụ Ka Chineke Mara Ihe Unu Na-arịo”
“Meenụ Ka Chineke Mara Ihe Unu Na-arịo”
“N’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.”—NDỊ FILIPAỊ 4:6.
1. Ònye ka anyị nwere ihe ùgwù ịgwa okwu, oleekwa ihe mere nke ahụ ji bụrụ ihe magburu onwe ya?
Ọ BỤRỤ na ị chọọ ịhụ onye na-achị obodo gị, gịnị ka a ga-agwa gị? Ndị na-arụ n’ọfịs ya pụrụ iji obiọma gwa gị okwu, ma ọ ga-esi ike ka e kwe ka ị hụ onye ọchịchị ahụ n’onwe ya. Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ n’ebe Onye ọchịchị kachasịnụ nke mmadụ nile, bụ́ Jehova Chineke, onye bụ́ Ọkaaka eluigwe na ala nọ. Anyị pụrụ isi n’ebe ọ bụla anyị nọ kpegara ya ekpere, anyị pụkwara ime otú ahụ n’oge ọ bụla. Ọ na-anakwere ekpere ọ bụla e kpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ilu 15:29) Nke ahụ magburu nnọọ onwe ya! Ọ̀ bụ na ekele anyị nwere maka nke a ekwesịghị ịkpali anyị ikpegara Onye ahụ ruru nnọọ eru ịza “Onye na-anụ ekpere” ekpere mgbe nile?—Abụ Ọma 65:2.
2. Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka ka ekpere anyị wee bụrụ nke Chineke na-anakwere?
2 Otú ọ dị, mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee ụdị ekpere Chineke na-anakwere?’ Bible kwuru otu ihe dị ezigbo mkpa ka ekpere anyị wee bụrụ nke a ga-anakwere. O kwuru, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ee, dị ka a kọwara n’isiokwu bu ụzọ, otu isi ihe dị mkpa iji bịaruo Chineke nso bụ okwukwe. Chineke dị njikere ịnakwere ekpere nke ndị na-ekpeku ya ekpere, ma ha aghaghị iji okwukwe mee nke ahụ, ha aghaghịkwa iji ezi obi rụọ ezi ọrụ.
3. (a) Dị ka ekpere nke ndị ohu Chineke n’oge ochie si gosi, ihe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịrịọ n’ekpere? (b) Ụdị ekpere ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ikpe?
3 Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume n’oge ya, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Na Bible, e nwere ihe atụ nke ọtụtụ ndị bụ́ ndị mere ka Chineke mara ihe na-enye ha nsogbu n’obi. Ụfọdụ n’ime ha bụ Hana, Ịlaịja, Hezekaịa, na Daniel. (1 Samuel 2:1-10; 1 Ndị Eze 18:36, 37; 2 Ndị Eze 19:15-19; Daniel 9:3-21) Anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ha. Rịbakwa ama na okwu Pọl gosiri na e nwere ụdị ekpere dị iche iche. O kwuru okwu banyere ikele ekele, ya bụ, ekpere anyị ji ekele Chineke maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Anyị pụkwara ito ya n’ekpere a. Ịrịọsi arịrịọ ike chọrọ ịdị umeala n’obi n’aka anyị. Anyị pụrụ ịkpọ ihe anyị na-arịọ aha. (Luk 11:2, 3) Nna anyị nke eluigwe ga-enwe obi ụtọ ịza ekpere ọ bụla anyị kpere na nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a.
4. Ọ bụ ezie na Jehova maara mkpa anyị, n’ihi gịnị ka anyị ka ji kwesị ịrịọ ya ihe na-akpa anyị?
4 Ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ bụ na Jehova amaghị mkpa anyị nile?’ Ee, ọ maara. (Matiu 6:8, 32) Oleezi ihe mere ọ ka ji chọọ ka anyị na-arịọ ya ha arịọ? Tụlee ihe atụ a: Onye ahịa pụrụ ịchọ inye ụfọdụ ndị ahịa ya onyinye. Otú ọ dị, iji nweta onyinye a, ndị ahịa ya ahụ aghaghị ịbịakwute ya iji nata onyinye ha. Ndị na-adịghị njikere ime mgbalị inweta onyinye ahụ na-egosi n’ezie na ha enweghị ekele maka onyinye ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ịghara ịrịọ ihe dị anyị mkpa n’ekpere ga-egosi na anyị enweghị ekele maka ihe ndị Jehova na-enye. Jizọs sịrị: “Rịọnụ, unu ga-anatakwa.” (Jọn 16:24) Site n’ime otú a, anyị na-egosi na anyị dabeere n’ebe Chineke nọ.
Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Kpegara Chineke Ekpere?
5. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ikpe ekpere n’aha Jizọs?
5 Jehova adịghị eti ọtụtụ iwu ndị tara akpụ banyere otú a ga-esi na-ekpe ekpere. Otú o sina dị, ọ dị mkpa ka anyị mụta ụzọ kwesịrị ekwesị isi kpegara Chineke ekpere, bụ́ nke a kọwara na Bible. Dị ka ihe atụ, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.” (Jọn 16:23) N’ihi ya, a chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs, na-aghọta na ọ bụ nanị site na Jizọs ka Chineke na-agọzi ụmụ mmadụ.
6. Olee otú anyị kwesịrị isi nọrọ mgbe anyị na-ekpe ekpere?
6 Olee otú anyị kwesịrị isi nọrọ mgbe anyị na-ekpe ekpere? Bible ekwughị kpọmkwem otú anyị kwesịrị isi nọrọ kpee ekpere tupu a zaa ekpere anyị. (1 Ndị Eze 8:22; Nehemaịa 8:6; Mak 11:25; Luk 22:41) Ihe dị mkpa bụ iji ezi obi na-ekpeku Chineke ekpere.—Joel 2:12, 13.
7. (a) Gịnị ka “amen” pụtara? (b) Olee otú e kwesịrị isi jiri ya mee ihe n’ekpere?
7 Gịnị banyere iji okwu ahụ bụ́ “amen” na-eme ihe? Akwụkwọ Nsọ na-egosi na nke a na-abụkarị ụzọ kasị daba adaba isi mechie ekpere anyị, karịsịa mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ihu ọha. (Abụ Ọma 72:19; 89:52) N’ụzọ bụ́ isi, okwu Hibru bụ́ ʼa·menʹ pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kọwara na ihe mere e ji asị “Amen” ma e kpechaa ekpere bụ iji “kwenye n’ihe e kpere n’ekpere, ma na-arịọ ka ha mezuo.” Ya mere, site n’ịsị “Amen,” mgbe o kpechara ekpere, onye ahụ kpere ekpere na-egosi na ihe o kpere n’ekpere si ya n’obi. Mgbe nwanna na-edu ọgbakọ n’ekpere sịrị “Amen” ka o kpechara ekpere, ndị na-ege ya ntị pụkwara iso ya sị “Amen” n’olu dara ụda ma ọ bụ n’obi ha iji gosi na ha kwenyesiri ike n’ihe o kwuru.—1 Ndị Kọrịnt 14:16.
8. Olee otú ụfọdụ ekpere anyị na-ekpe pụrụ isi yie nke Jekọb ma ọ bụ Ebreham, gịnịkwa ka nke a ga-egosi banyere anyị?
8 E nwere mgbe ụfọdụ Chineke na-ahapụ ka anyị gosi otú ihe anyị na-ekpe n’ekpere dịruru anyị mkpa. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee ka Jekọb oge ochie, bụ́ onye ya na mmụọ ozi gbagidere mgba ruo chi ọbụbụ ka e wee gọzie ya. (Jenesis 32:24-26) Ma ọ bụkwanụ ihe ụfọdụ pụrụ ime ka ọ dị mkpa ka anyị mee ka Ebreham, bụ́ onye rịọrọ Jehova arịrịọ ugboro ugboro n’ihi Lọt na ndị ezi omume ndị ọzọ nwere ike ịnọ na Sọdọm. (Jenesis 18:22-33) N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị pụrụ ịrịọ Jehova banyere ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nye anyị, na-arịọ ya ka o meere anyị ha n’ihi ikpe ziri ezi ya, obiọma ya, na ebere ya.
Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịrịọ n’Ekpere
9. Gịnị kwesịrị ịbụ isi ihe anyị ga-arịọ maka ya mgbe anyị na-ekpe ekpere?
9 Cheta na Pọl sịrị: “N’ihe nile . . . meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6) N’ihi ya, anyị pụrụ ikwu ihe ọ bụla na-akpa anyị mgbe anyị na-ekpe ekpere onwe anyị. Otú ọ dị, ihe mbụ anyị kwesịrị itinye n’ekpere kwesịrị ịbụ ihe ndị metụtara Jehova. Daniel setịpụrụ ezi ihe nlereanya ná nke a. Mgbe ndị Izrel tara ahụhụ n’ihi mmehie ha, Daniel rịọrọ Jehova ka o meere ha ebere. Ọ sịrị: “Anọla ọdụ: n’ihi Gị onwe gị, Chineke m, n’ihi na aha Gị ka a kpọkwasịrị obodo Gị na ndị Gị.” (Daniel 9:15-19) Ekpere anyị ọ̀ na-egosi na ido aha Jehova nsọ na mmezu nke uche ya bụ ihe dị oké mkpa nye anyị dị ka ekpere Daniel gosiri?
10. Olee otú anyị si mara na o kwesịrị ekwesị ikpe ekpere banyere ihe ndị na-akpa anyị?
10 Otú o sina dị, o kwesịkwara ekwesị ịrịọ maka ihe ndị na-akpa anyị. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ikpe ekpere ka anyị ghọtakwuo ihe ndị dị omimi metụtara Jehova dị ka ọbụ abụ ahụ mere. O kpere ekpere, sị: “Mee ka m ghọta ihe, m ga-echebekwa iwu Gị; m ga-ewerekwa obi m nile debe ya.” (Abụ Ọma 119:33, 34; Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Jizọs ‘kpesiri ekpere ike ma rịọkwa Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ.’ (Ndị Hibru 5:7) O si otú a gosipụta na o kwesịrị ekwesị mmadụ ịrịọ ka e nye ya ume mgbe ọ na-eche ihe isi ike ma ọ bụ ọnwụnwa ihu. Mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ekpere nlereanya ahụ, Jizọs gụnyere ihe ndị pụrụ ịbụ mkpa nke onye ahụ na-ekpe ekpere, ihe ndị dị ka mgbaghara mmehie na ihe oriri nke ụbọchị.
11. Olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịghara ịda n’ọnwụnwa?
11 N’ekpere nlereanya ahụ, Jizọs gụnyere arịrịọ bụ́: “Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:9-13) O mesịrị nye ndụmọdụ, sị: “Nọgidenụ na-eche nche ma na-ekpe ekpere mgbe nile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” (Matiu 26:41) Ekpere dị oké mkpa mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ihu. A pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ileghara ụkpụrụ Bible anya. Ndị na-abụghị Ndịàmà pụrụ ịkpọ anyị ka anyị sonyere ha n’ihe omume ndị na-ekwesịghị Ndị Kraịst. Ha pụrụ ịgwa anyị ka anyị mee ihe megidere ụkpụrụ ziri ezi. N’oge ndị dị otú a, anyị kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ Jizọs nyere bụ́ ka anyị na-ekpe ekpere. Anyị kwesịrị ime nke a tupu anyị echee ọnwụnwa dị otú ahụ ihu na mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ahụ ihu. Anyị ga-anọ n’ekpere a rịọ Chineke ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ịda n’ọnwụnwa.
12. Olee ihe ndị na-akpata nchegbu bụ́ ndị pụrụ ịkpali anyị ikpe ekpere, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’aka Jehova?
12 Ndị ohu Chineke taa na-enwe ọtụtụ nrụgide na nchegbu. Ọrịa na ihe mwute pụrụ ime ka ọtụtụ na-enwe nchegbu. Ihe ike a na-eme gburugburu anyị na-eme ka ndụ sie ike obibi. Ụkọ ego na-eme ka o sie ike ịkpata ihe e ji ebi ndụ. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi ịmara Abụ Ọma 102:17 na-ekwu banyere Jehova, sị: “O chewo ekpere nke onye na-enweghị ihe ihu, O ledaghịkwa ekpere ha anya.”
na Jehova na-ege ntị mgbe ndị ohu ya kpegaara ya ihe ndị a n’ekpere.13. (a) Olee ihe ndị na-akpa mmadụ bụ́ ndị e kwesịrị itinye n’ekpere? (b) Kọọ otu ihe atụ nke ụdị ekpere dị otú ahụ?
13 N’ezie, ihe ọ bụla na-emetụta ozi anyị na-ejere Jehova ma ọ bụ mmekọrịta anyị na ya, kwesịrị ka e tinye ya n’ekpere. (1 Jọn 5:14) Ọ bụrụ na ị chọrọ ime mkpebi banyere onye ị ga-alụ ma ọ bụ ọrụ ị ga-arụ ma ọ bụ banyere ịmụba ozi gị, alala azụ ikpegara Chineke ekpere maka ihe ndị a, na-arịọ ya maka nduzi. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ nọ na Philippines chọrọ ịbanye n’ozi oge nile. Ma, o nweghị ọrụ ọ ga-eji na-enyere onwe ya aka. O kwuru, sị: “N’otu Saturday, ekpegaara m Jehova ekpere kpọmkwem banyere ịsụ ụzọ. Ka e mesịrị n’ụbọchị ahụ, mgbe m na-ekwusa ozi ọma, enyere m otu nwa agbọghọ akwụkwọ. N’ụzọ tụrụ m n’anya, nwa agbọghọ ahụ kwuru, sị: ‘Gaa n’ụlọ akwụkwọ anyị n’isi ụtụtụ Monday.’ Ajụrụ m ya, sị, ‘Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’ Ọ kọwara na e nwere ọrụ a na-achọ onye ga-amalite ịrụ ya ngwa ngwa. Agara m, e wekwara m n’ọrụ ozugbo. Ihe a nile mere ngwa ngwa.” Ọtụtụ Ndịàmà nọ n’akụkụ nile nke ụwa enwewo ahụmahụ ndị yiri nke a. N’ihi ya, alala azụ ịgwa Chineke otú ọ dị gị n’obi n’ekpere!
Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Anyị Emee Mmehie?
14, 15. (a) Gịnị mere mmadụ ekwesịghị ịla azụ ikpe ekpere ọbụna ma a sị na o mee mmehie? (b) E wezụga ikpe ekpere n’onwe ya, gịnị ọzọ ga-enyere onye ahụ aka ịgbake?
14 Olee otú ekpere pụrụ isi nyere mmadụ aka ma ọ bụrụ na onye ahụ mere mmehie? N’ihi ihere, ụfọdụ ndị mere mmehie na-ala azụ ikpe ekpere. Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ihe amamihe dị na ya ime. Iji maa atụ: Ndị na-akwọ ụgbọelu maara na ọ bụrụ na ha efuo ụzọ, ha pụrụ ịkpọtụrụ ndị na-eduzi ụgbọelu ka ha nyere ha aka. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye ahụ na-akwọ ụgbọelu ekweghị akpọtụrụ ndị ahụ na-eduzi ụgbọelu n’ihi na ihere na-eme ya na ya furu ụzọ? Nke ahụ pụrụ ịkpata ọdachi! N’ụzọ yiri nke ahụ, onye mere mmehie nke ihere gbochiri ikpegara Chineke ekpere pụrụ ịdaba ná nsogbu ka njọ. Ihere ijide mmadụ n’ihi mmehie o mere ekwesịghị igbochi onye ahụ ịgwa Jehova okwu. Chineke na-agwadị ndị mere mmehie dị oké njọ ka ha kpekuo ya ekpere. Aịzaịa onye amụma gwara ndị mere mmehie n’oge ya ka ha kpọkuo Jehova, “n’ihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụba.” (Aịsaịa 55:6, 7) Tupu Chineke emee nke a, onye ahụ kwesịrị ibu ụzọ mee ka ‘ihu Jehova jụrụ’ site n’ibu ụzọ wetuo onwe ya ala, kwụsị mmehie ọ na-eme, ma gosipụta ezi nchegharị.—Abụ Ọma 119:58; Daniel 9:13.
15 E nwere ihe ọzọ mere ekpere ji dị mkpa mgbe mmadụ mere mmehie. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems kwuru okwu banyere onye chọrọ enyemaka ime mmụọ, sị: “Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, . . . Jehova ga-emekwa ka o bilie.” (Jems 5:14, 15) Ee, onye mere mmehie kwesịrị iji aka ya kwupụtara Jehova mmehie ya n’ekpere, ma ọ pụkwara ịgwa ndị okenye ọgbakọ ka ha kpeere ya ekpere. Nke ahụ ga-enyere ya aka ịgbake n’ụzọ ime mmụọ.
Otú E Si Aza Ekpere
16, 17. (a) Olee otú Jehova si aza ekpere? (b) Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-egosi na ekpere na ọrụ nkwusa nwere njikọ chiri anya?
16 Olee otú e si aza ekpere? A pụrụ ịza ụfọdụ ngwa ngwa na n’ụzọ pụtara ìhè. (2 Ndị Eze 20:) Ụfọdụ na-egbutụ oge, ọ pụkwara isi ike ịghọta mgbe a zara ha. Dị ka Jizọs gosiri n’ihe atụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ onye nọgidere na-arịọ onyeikpe ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa anyị ịnọgide na-arịọ Chineke arịrịọ. ( 1-6Luk 18:1-8) Otú ọ dị, ka obi sie anyị ike na mgbe ọ bụla anyị kpere ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke, ọ dịghị mgbe Jehova ga-asị anyị: “Kwụsị inye m nsogbu.”—Luk 11:5-9.
17 Ọtụtụ mgbe, ndị Jehova ahụwo ka a zara ekpere ha. Nke a na-emekarị n’ihe banyere ozi ọma anyị na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, ụmụnna nwanyị abụọ nọ na Philippines na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Bible n’otu ime obodo nke dị ná mba ahụ. Mgbe ha nyere otu nwanyị otu traktị, anya mmiri juru ya anya. O kwuru, sị: “N’abalị gara aga, ekpegaara m Chineke ekpere ka o zite onye ga-akụziri m Bible, echekwara m na nke a bụ azịza nke ekpere m.” Ka obere oge gasịrị, nwanyị ahụ malitere ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ná mba ọzọ dị ná Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, otu nwanna nwoke na-atụ ụjọ ikwusa ozi ọma n’ụlọ ebe e nwere ndị nche. Otú ọ dị, o kpegaara Jehova ekpere, kata obi, ma banye n’ụlọ ahụ. Ọ kụrụ aka n’otu ọnụ ụzọ, otu nwa agbọghọ apụta. Mgbe nwanna nwoke ahụ kọwara ihe mere o ji bịa, nwa agbọghọ ahụ malitere ibe ákwá. O kwuru na ya anọwo na-achọ Ndịàmà Jehova nakwa na ya ekpeela ekpere ka Chineke nyere ya aka ịchọta ha. Nwanna nwoke ahụ ji obi ụtọ nyere ya aka ịchọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ókèala ya.
18. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a zaa ekpere anyị? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ejiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekpe ekpere?
18 Ekpere bụ ndokwa magburu onwe ya n’ezie. Jehova dị njikere ige anyị ntị na ịza ekpere anyị. (Aịsaịa 30:18, 19) Ma, anyị kwesịrị ileru anya iji mata mgbe Jehova zara ekpere anyị. O nwere ike agaghị aza ya n’ụzọ anyị tụrụ anya ya mgbe nile. Otú ọ dị, mgbe anyị chọpụtara na Jehova na-eduzi anyị, ka anyị ghara ichefu ikele ya na inye ya otuto. (1 Ndị Tesalonaịka 5:18) Ọzọkwa, ya adịla mgbe ị ga-echefu ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́: “N’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” Ee, were ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agwa Chineke okwu. Ọ bụrụ na ị nọgide na-eme nke a, ị ga-ahụ mmezu nke ihe Pọl kwuru banyere ndị a na-aza ekpere ha. Ọ sịrị: “Udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
• Ụdị ekpere ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ikpe?
• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?
• Olee ihe ndị anyị kwesịrị itinye n’ekpere?
• Olee uru ekpere na-aba mgbe mmadụ mere mmehie?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ikpe ekpere site n’obi dum na-enyere anyị aka ịghara ịda mgbe a nwara anyị ọnwụnwa
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Anyị na-esi n’ekpere ekele Chineke, akọrọ ya ihe bụ́ mkpa anyị, ma na-arịọ ya arịrịọ