Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Onye A Hụrụ n’Anya Kwụsịrị Ijere Jehova Ozi

Mgbe Onye A Hụrụ n’Anya Kwụsịrị Ijere Jehova Ozi

Mgbe Onye A Hụrụ n’Anya Kwụsịrị Ijere Jehova Ozi

MARK na Louise bụ Ndịàmà Jehova. * Ha jiri ịhụnanya na nlezianya kụziere ụmụ ha Akwụkwọ Nsọ dị nnọọ ka Bible gbara ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha mee. (Ilu 22:6; 2 Timoti 3:15) Ma ọ dị nnọọ mwute na mgbe ụmụ ha topụtara, ọ bụghị ha nile nọgidere n’ọgbakọ. Louise kwuru, sị: “O wutere m na ụmụ ahụ kwụsịrị ijere Jehova ozi. Ọ na-agbawa m obi kwa ụbọchị. Obi anaghị adị m mma mgbe ndị ọzọ na-akọ banyere ụmụ ha, anya mmiri na-amalitekwa ịgba m.”

N’ikwu eziokwu, ndị òtù ezinụlọ kwesịrị ntụkwasị obi na-enwe nnọọ mwute mgbe onye òtù ezinụlọ ha pụrụ n’ọgbakọ ma biwezie ndụ rụrụ arụ. Irene kwuru, sị: “Ahụrụ m nwanne m nwanyị n’anya nke ukwuu. Aga m emere ya ihe ọ bụla m nwere ike imere ya iji hụ na ọ bataghachiri n’ọgbakọ!” Maria, bụ́ onye nwanne ya nwoke pụrụ n’ọgbakọ ma na-ebizi ndụ rụrụ arụ kwuru, sị: “Ọ dịghịrị m mfe idi ya n’ihi na ahụrụ m ya nnọọ n’anya. Ọ na-ewute m na ọ dịghị anọ ná nnọkọ ndị buru ibu ezinụlọ anyị na-enwe.”

Gịnị Mere O Ji Esi Ike Idi Ya?

Gịnị mere o ji ewute Ndị Kraịst ma ọ bụrụ na nwa ha ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ha hụrụ n’anya apụọ n’ọgbakọ? Ọ bụ n’ihi na ha maara na Akwụkwọ Nsọ kwere ndị nọgidere na-ejere Jehova ozi nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala. (Abụ Ọma 37:29; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3-5) Ha na-atụ anya iso di ha ma ọ bụ nwunye ha, ụmụ ha, ndị mụrụ ha, ụmụnne ha na ụmụ ụmụ ha, nweta ngọzi ndị a. Ọ na-ewute ha ma ọ bụrụ na ha echeta na ndị ha hụrụ n’anya bụ́ ndị pụworo n’ọgbakọ nwere ike ha agaghị eso enweta ngọzi ndị ahụ. Abịakwa n’ihe banyere ndụ Ndị Kraịst na-adị ugbu a, ha maara na ụkpụrụ na iwu ndị Jehova tọrọ bụ maka ọdịmma ha. N’ihi ya, ọ na-ewute nnọọ Ndị Kraịst ịhụ ka ndị ha hụrụ n’anya na-agha mkpụrụ ga-amịpụtara ha ihe ndị na-elu ilu.—Aịsaịa 48:17, 18; Ndị Galeshia 6:7, 8.

O nwere ike isiri ndị ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị ha hụrụ n’anya na-apụtụbeghị n’ọgbakọ ike ịghọta otú o si agbawa obi. Ọ na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ. Louise kwuru, sị: “Ịnọrọ ọdụ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anọgidewo na-esikwuru m ike ma ọ bụrụ na m ahụ ka ndị nne na nna so ụmụ ha na-achị ọchị ma na-ekwurịta okwu. Ana m anọ ná mwute mgbe ọ bụla m gara ihe omume kwesịrị inye m obi ụtọ n’ihi na anyị ezughị ezu.” Mgbe otu okenye chetaghachiri oge nwa nwunye ya pụrụ n’ọgbakọ ruo afọ anọ, o kwuru, sị: “Ọbụna oge ndị kwesịrị iweta obi ụtọ ghọrọ oge mwute. Ọ bụrụ na m azụtara nwunye m ihe ma ọ bụ kpọrọ ya gaa ịtụrụ ndụ ná ngwụsị izu, ọ na-amalite ibe ákwá ma o cheta na nwa ya esoghị anyị na-enwe obi ụtọ.”

Ndị Kraịst dị otú a hà na-enwe mwute karịa otú ha kwesịrị inwe? Ọ bụchaghị otú ahụ. N’ezie, ihe ha na-eme pụrụ iyitụ àgwà Jehova bụ́ onye e kere mmadụ n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26, 27) Gịnị ka nke a pụtara? Ọ dị mma, olee otú ọ dịịrị Jehova mgbe ndị ya bụ́ ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi? Anyị ghọtara site n’ihe Abụ Ọma 78:38-41 kwuru na o wutere Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, o jiri ndidi dọọ ha aka ná ntị ma nye ha ntaramahụhụ. Ọ nọgidekwara na-agbaghara ha mgbe ọ bụla ha chegharịrị. O doro nnọọ anya na Jehova nwere mmasị n’ebe ihe ndị o kere eke nọ, ndị bụ́ ‘ọrụ aka ya,’ ọ dịghịkwa agbahapụ ha ngwa ngwa. (Job 14:15; Jona 4:10, 11) O kenyekwara ụdị àgwà a n’ime ụmụ mmadụ, karịsịa n’etiti ndị òtù ezinụlọ. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụ mmadụ ga-enwe mwute n’ihi onye ikwu ha ha hụrụ n’anya nke pụrụ n’ọgbakọ.

N’eziokwu, onye a hụrụ n’anya ịpụ n’ọgbakọ so n’otu n’ime ọnwụnwa ndị tara akpụ na-abịara ezi Ndị Kraịst. (Ọrụ 14:22) Jizọs kwuru na ịnakwere ozi ya ga-akpata nkewa n’ezinụlọ ụfọdụ. (Matiu 10:34-38) Nke a apụtaghị na ozi ndị dị na Bible na-akpata nkewa n’ezinụlọ. Kama ọ bụ ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị nke pụrụ n’ọgbakọ na-akpata nkewa site n’ịjụ onye òtù ezinụlọ ha, na-eleghara ya anya, ma ọ bụkwanụ na-emegide ya n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst. Otú ọ dị, obi dị anyị ụtọ na Jehova adịghị ahapụ ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi n’enyereghị ha aka ịnagide ọnwụnwa ndị na-abịara ha. Ọ bụrụ na ị ka na-eru uju n’ihi onye ị hụrụ n’anya nke pụrụ n’ọgbakọ, olee ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inyere gị aka ịnagide ya ma mee ka i nwetatụ ọṅụ na afọ ojuju?

Ịnagide Ya

“Site n’iwuli onwe unu elu . . . , debenụ onwe unu n’ịhụnanya Chineke.” (Jud 20, 21) N’adabere n’ọnọdụ ị nọ na ya, o nwere ike bụrụ na ọ dịghị ihe ị pụrụ ime ugbu a iji nyere onye òtù ezinụlọ gị pụrụ n’ọgbakọ aka. Otú o sina dị, ị pụrụ ma kwesị iwulite onwe gị nakwa ndị òtù ezinụlọ gị ndị ọzọ ka nọ n’ọgbakọ elu. Veronica, bụ́ onye mụrụ ụmụ nwoke atọ ma abụọ n’ime ha akwụsị ijere Jehova ozi kwuru, sị: “E chetaara mụ na di m na ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike na-efe Jehova, anyị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ịnabataghachi ụmụ anyị mgbe ha ghọtara onwe ha. Olee ebe nwa mmefu ahụ gaara anọ ma a sị na nna ya anọghị n’ọnọdụ dị mma iji nabataghachi ya?”

Iji mee ka mmekọrịta gị na Jehova sie ike, ọ ga-adị mkpa ka ị nọgide na-eji ihe ndị metụtara ezi ofufe kpọrọ ihe. Nke a na-agụnye ịmụchi Bible anya na ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ruo n’ókè ọ bụla ọnọdụ gị kwere mee, wepụta onwe gị inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka. N’eziokwu, ọ pụrụ isiri gị ike ná mmalite. Veronica chetara, sị: “Ihe mbụ gbatara m n’obi bụ ịnọpụrụ onwe m iche dị ka anụ merụrụ ahụ́. Ma di m siri ọnwụ na anyị ga-anọgide na-emechi ihe ndị metụtara ezi ofufe anya. Ọ hụrụ na anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya. Ọ na-achọ m obi ike dị ukwuu iji gaa mgbakọ na izute ndị mmadụ. Ma ịga mgbakọ mekwuru ka anyị na Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. Karịsịa, ọ bụ mgbakọ ahụ wusikwuru nwa anyị nwoke nke ka nọ n’ọgbakọ ike.”

Maria, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chọpụtara na ịgachi ozi ọma anya na-enye aka, ọ na-amụkwara mmadụ anọ Bible ugbu a. N’otu aka ahụkwa, Laura kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na m ka na-ebe ákwá n’ụbọchị ọ bụla, ana m ekele Jehova n’agbanyeghị na enwebeghị m ihe ịga nke ọma ụfọdụ ndị nne na nna nwerela n’ịzụ ụmụ, enwere m ozi Bible bụ́ nke na-enyere ezinụlọ aka n’oge ikpeazụ ndị a.” Ken na Eleanor, bụ́ ndị ụmụ ha ndị toworo eto pụrụ n’ọgbakọ, haziri ihe omume ha ma kwaga n’ebe e nwere mkpa maka ndị nkwusa Alaeze iji malite ozi oge nile. Nke a enyeworo ha aka ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma zere ịbụ ndị na-anọ ná mwute oge nile.

Nọgide na-enwe olileanya. Ịhụnanya “na-enwe olileanya ihe nile.” (1 Ndị Kọrịnt 13:7) Ken, bụ́ onye a ka kpọpụrụ aha kwuru, sị: “Mgbe ụmụ anyị pụrụ n’ọgbakọ, o yiri m ka ha anwụọla. Ma otú m si ele ihe anya gbanwere mgbe nwanne m nwanyị nwụrụ. Obi dị m ụtọ na ụmụ m anwụbeghị n’ụzọ nkịtị nakwa na Jehova na-ele ma hà ga-alọghachikwute ya.” N’ezie, ihe ndị meworo eme egosiwo na ọtụtụ ndị pụrụ n’ọgbakọ na-emecha lọghachite.—Luk 15:11-24.

Zere ịta onwe gị ụta. Ndị nne na nna karịsịa nwere ike ileghachi anya azụ ma na-akwa ụta na ha emechaghị ihe ha kwesịrị ime n’ihe ụfọdụ. Otú ọ dị, isi ihe e mere ka ọ pụta ìhè n’Ezikiel 18:20 bụ na ọ bụ onye ahụ mehierenụ ka Jehova ga-ajụ ajụjụ banyere ihe o mere, ọ bụghị ndị mụrụ ya. Ọ bụ ihe na-adọrọ nnọọ mmasị ịmata na n’agbanyeghị na akwụkwọ Ilu kwuru ọtụtụ ihe banyere ọrụ ndị nne na nna nwere ịzụlite ụmụ ha n’ụzọ ziri ezi, ọ dọrọ ụmụ aka ná ntị ihe karịrị ugboro anọ ka ha na-ege ndị mụrụ ha ntị ma na-erubere ha isi. Ee, ọ bụ ọrụ ụmụ ịnakwere ọzụzụ dabeere na Bible ndị nne na nna ha na-ezughị okè na-enye ha. Eleghị anya, i mere ihe nile i nwere ike ime n’oge ahụ. Ma, ọ bụrụgodị na ọ ka dị gị ka ò nwere ihe ụfọdụ ị na-emezighị nakwa na ụta dịịrị gị, nke ahụ apụtachaghị na ọ bụ n’ihi ihe ahụ mere onye ị hụrụ n’anya ji pụọ n’ọgbakọ. A sị ka e kwuwe ya, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ga-esi n’ịkwa “m makwaara” apụta. Mụta ihe site n’ihe ndị ahụ ị na-emezighị, emeghachikwala ha ọzọ, rịọkwa Jehova ka ọ gbaghara gị. (Abụ Ọma 103:8-14; Aịsaịa 55:7) Mgbe ahụ, echekwala banyere ihe gara aga, kama chewezie banyere ihe ndị ị ga eme n’ọdịnihu.

Ewerela ndị ọzọ iwe. E nwere ike ụfọdụ ndị agaghị ama otú ha ga-esi dowe ọnụ gbaa gị ume ma ọ bụ kasie gị obi, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ha hụrụ n’anya apụtụbeghị n’ọgbakọ. E wezụga nke a, otú ndị mmadụ si agba ndị ọzọ ume ma ọ bụ na-akasi ha obi dịgasị iche iche. Ya mere, ọ bụrụ na ụfọdụ ekwuo ihe were gị iwe, tinye ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ́ nke dị ná Ndị Kọlọsi 3:13 n’ọrụ: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”

Kwanyere ndokwa Jehova mere maka ịdọ aka ná ntị ùgwù. Ọ bụrụ na ọgbakọ dọrọ onye ikwu gị aka ná ntị, cheta na nke a bụ ndokwa Jehova mere nakwa na ọ bụ maka ọdịmma anyị nile, tinyere onye ahụ kpara àgwà ọjọọ. (Ndị Hibru 12:11) N’ihi ya, ya adịkwala mgbe ị ga-echetụ n’echiche ịkatọ ndị okenye so dọọ ya aka ná ntị ma ọ bụkwanụ mkpebi ahụ ha mere. Chetakwa na a na-arụzu ihe kasị mma site n’ime ihe n’ụzọ Jehova, ma nanị ihe ịkatọ ndokwa ndị Jehova mere pụrụ ime bụ ịkpatakwu nsogbu.

Mgbe a napụtasịrị ụmụ Izrel n’Ijipt, Mozis nọgidere na-eje ozi dị ka onyeikpe. (Ọpụpụ 18:13-16) Ebe ọ bụ na n’okwu ikpe, a ga-enwe ma onye meririnụ ma onye e meriri emeri, o doro nnọọ anya na ọ bụghị mmadụ nile ka ikpe Mozis ga-amasịcha. Ikekwe, ihe dugara ụfọdụ ndị n’inupụrụ Mozis isi bụ n’ihi ịgba ihe ndị Mozis kpebiri ụkwụ. Otú ọ dị, Jehova ji Mozis na-edu ndị Ya, ọ bụghịkwa Mozis ka ọ tara ahụhụ kama ọ bụ ndị ahụ nupụrụ isi na ndị ezinụlọ ha bụ́ ndị kwadoro ha. (Ọnụ Ọgụgụ 16:31-35) Taa, nke a na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịkwanyere ndị okenye ùgwù ma kwenyere mkpebi ndị ha mere.

Banyere nke a, Delores chetara otú o si siere ya ike ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ndị okenye dọrọ nwa ya nwanyị aka ná ntị. O kwuru, sị: “Ihe nyeere m aka bụ ịdị na-agụ ugboro ugboro isiokwu ndị kwuru banyere izi ezi nke ndokwa ndị Jehova mere. Ewepụtara m otu akwụkwọ iche iji na-edetu isi ihe nakwa isiokwu ndị ga-enyere m aka idi ihe ahụ merenụ ma nọgide na-ejere Jehova ozi.” Ka anyị lee ihe ọzọ dị mkpa ga-enyere anyị aka idi ya mgbe onye anyị hụrụ n’anya pụrụ n’ọgbakọ.

Kwupụta otú ọ dị gị n’obi. I nwere ike ịgakwuru otu enyi gị ma ọ bụ abụọ bụ́ ndị ị tụkwasịrị obi ma kọọrọ ha otú ọ dị gị n’obi. Ka ị na-eme nke a, họrọ ndị enyi gị ị maara na ha ga-enyere gị aka ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi. N’ezie, ọ ga-akacha mma ma ọ bụrụ na ị ‘wụsịara Jehova obi gị’ n’ekpere. * (Abụ Ọma 62:7, 8) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ maara nnọọ otú o si na-ewute gị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iche na ị na-enwe mwute gabiga ókè. A sị ka e kwuwe, ọ bụghị gị pụrụ n’ọgbakọ. Gwa Jehova otú o si dịrị gị n’obi n’ekpere ma rịọ ya ka o nyere gị aka ịghara inwe mwute gabiga ókè.—Abụ Ọma 37:5.

Ka oge na-aga, eleghị anya ị ga-enwe ike ịchịkwa mmetụta ndị ị na-enwe n’ụzọ ka mma. Ka ọ dịgodị, adala mbà ná mgbalị ndị ị na-eme ịdị na-eme ihe ga-amasị Nna gị nke eluigwe, ya adịkwala mgbe ị ga-eche na mgbalị ndị ị na-eme bụ na nkịtị. (Ndị Galeshia 6:9) Chetakwa na ọ bụrụkwa na anyị apụọ n’ọgbakọ, anyị ka ga na-enwekwa nsogbu. N’aka nke ọzọ, Jehova ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị anyị na-enwe ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-erubere ya isi. Ya mere, nwee obi ike na Jehova maara otú nsogbu gị haruru, ọ ga-anọgidekwa na-enye gị ume dị gị mkpa n’oge kwesịrị ekwesị iji die ha.—2 Ndị Kọrịnt 4:7; Ndị Filipaị 4:13; Ndị Hibru 4:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 19 N’ihe banyere ikpe ekpere maka onye ikwu a chụrụ n’ọgbakọ, lee Ụlọ Nche nke December 1, 2001, peeji nke 30-31.

[Igbe dị na peeji nke 19]

Ụzọ Isi Die Ya

◆ “Site n’iwuli onwe unu elu . . . , debenụ onwe unu n’ịhụnanya Chineke.”—Jud 20, 21.

◆ Nọgide na-enwe olileanya. —1 Ndị Kọrịnt 13:7.

◆ Zere ịta onwe gị ụta.—Ezikiel 18:20.

◆ Ewerela ndị ọzọ iwe.—Ndị Kọlọsi 3:13.

◆ Kwanyere ndokwa Jehova mere maka ịdọ aka ná ntị ùgwù. —Ndị Hibru 12:11.

◆ Kwupụta otú ọ dị gị n’obi. —Abụ Ọma 62:7, 8.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

Ị̀ Kwụsiwo Ijere Jehova Ozi?

Ya bụrụ otú ahụ, ihe ọ bụla ọ sọkwara ya bụrụ ihe kpatara ya, mmekọrịta gị na Jehova na ọdịnihu magburu onwe ya i nwere dị n’ihe ize ndụ. Ikekwe, i bu n’obi na ị ga-abataghachi n’ọgbakọ. Ị̀ na-arụsi ọrụ ike ugbu a iji bataghachi? Ka ị̀ na-eyigharị oge ị ga-eji bataghachi? Chetakwa na Amagedọn ji oké ọsọ na-abịa. Ọzọkwa, ndụ a na-adị ugbu a dị nnọọ mkpụmkpụ, e jighịkwa ya n’aka. Ị maghịdị ma ị̀ ga-adị ndụ ruo echi. (Abụ Ọma 102:3; Jems 4:13, 14) Otu nwoke a chọpụtara na o bu ọrịa nke ga-egburịrị ya kwuru, sị: “Ọrịa a bịara m ka m na-ejere Jehova ozi oge nile, ọ bụghị n’ihi ibi ndụ ọjọọ. M cheta nke ahụ ugbu a, ọ na-akasi m obi.” Chetụdị otú ọ gaara adị nwoke a ma a sị na ọrịa ahụ bịara ya mgbe ọ na-ekwu, sị, “Otu ụbọchị, m ga-alaghachikwuru Jehova!” Ọ bụrụ na ị kwụsịwo ijere Jehova ozi, ugbu a bụ oge kasị mma ịbataghachi.

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ịnọgide na-eji ihe ndị metụtara ezi ofufe akpọrọ ihe pụrụ inyere gị aka ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi