Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’ihi Nwata Nwoke Dị Afọ Itoolu”

“N’ihi Nwata Nwoke Dị Afọ Itoolu”

“N’ihi Nwata Nwoke Dị Afọ Itoolu”

WIESŁAWA bi n’ebe ọdịda anyanwụ Poland. Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara ozi ọma n’ụlọ ya, ọ na-eji olu ọma ekele ha ma gwa ha na ya enweghị ohere. Otu ụbọchị, Samuel dị afọ itoolu na mama ya kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. Wiesława gere ha ntị ma nara magazin kwuru banyere paradaịs a ga-enwe n’elu ala.

Samuel chọrọ ịkpọ Wiesława oku ka ọ bịa ihe omume pụrụ iche e ji echeta ọnwụ Jizọs bụ́ nke nọ na-eru nso n’oge ahụ. N’ihi nke a, mama Samuel sooro ya gaghachi n’ụlọ Wiesława, ná nke ugbu a Samuel ji akwụkwọ ọ ga-eji kpọọ Wiesława oku maka ncheta nke ọnwụ Jizọs. Mgbe Wiesława hụrụ na Samuel jikere nke ọma, ọ sịrị ha chere ka ya bịakwa, ọ bara n’ime ụlọ gaa yiri uwe kwesịrị ekwesị. Mgbe ọ bataghachiri ebe Samuel na mama ya nọ, o gere Samuel ntị, nara ya akwụkwọ ịkpọ oku ahụ ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ nanị m ga-eso bịa ka ọ bụ mụ na di m?” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “M ga-abịa ọ bụrụgodị na di m agaghị abịa. Aga m abịarịrị.” Iji mee ka obi dị Samuel mma, Wiesława bịara n’ụbọchị ahụ a na-echeta ọnwụ Jizọs.

N’oge a na-ekwu okwu ncheta ọnwụ Jizọs, Samuel nọdụrụ ala n’akụkụ Wiesława ma na-egosi ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-agụ. Nke a masịrị Wiesława. Okwu ncheta ọnwụ Jizọs ahụ tọrọ ya ụtọ, o nwekwara obi ụtọ na e jiri okwu ndị dị mfe kọwaa ihe ndị siri ike nghọta. Otú ụmụnna siri nabata ya nnọọ nke ọma ma gosi ya obiọma metụkwara ya n’ahụ́. Kemgbe ahụ Wiesława bịachara ncheta ọnwụ Jizọs, ọ nọgidewo na-enwekwu mmasị n’ihe ndị metụtara ofufe Jehova ma soro Ndịàmà Jehova na-akpachi anya. O kwuru na nso nso a, sị: “Ihere na-eme m na egeghị m unu ntị n’oge ndị gara aga unu bịara n’ụlọ m. Aghaghịkwa m ikweta na nanị ihe mere m ji gee ntị n’ozi unu bụ n’ihi nwatakịrị nwoke dị afọ itoolu.”

Dị ka Samuel bụ́ onye bi na Poland, ọtụtụ ndị ọzọ na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-eto Chineke site n’okwu ọnụ ha nakwa site n’àgwà ọma ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, i nwekwara ike inyere ndị nwere obi eziokwu aka inwe mmasị ijere Jehova ozi.