Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ofufe nke Baara Gị Uru

Ofufe nke Baara Gị Uru

Ofufe nke Baara Gị Uru

ỌBỤ abụ bụ́ Esaf kwuru, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.” O chetụrụ echiche iṅomi ndị gbahapụrụ Chineke iji nwee ike ibi ndụ otú ọ masịrị ha. Ma mgbe Esaf bịara chee echiche banyere uru ịbịaru Chineke nso bara, o kpebiri na nke ahụ ga-akara ya mma. (Abụ Ọma 73:2, 3, 12, 28) Ezi ofufe ọ̀ ga-abara gị uru taa? N’ụzọ dị aṅaa?

Ife ezi Chineke ahụ ofufe na-enyere gị aka ịghara nnọọ ịdị na-eche banyere nanị onwe gị. N’ihi otú “Chineke nke ịhụnanya” si kee anyị, ndị na-eche banyere nanị onwe ha agatụghị enwe obi ụtọ. (2 Ndị Kọrint 13:11) Jizọs kụziri otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere otú e si kee mmadụ mgbe o kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụ ya mere o ji atọ anyị ụtọ imere ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị ihe. Ma, obi ụtọ kasịnụ na-abịa site n’imere Chineke ihe. Anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya karịa ka anyị hụrụ onye ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị nọ n’afọ ndụ dịgasị iche iche achọpụtawo na ife Chineke ofufe site n’ime ihe ndị ọ sịrị ka anyị na-eme na-eweta nnọọ afọ ojuju.—1 Jọn 5:3.

Inwe Nzube ná Ndụ

Ezi ofufe bakwaara gị uru n’ihi na ọ na-eme ka ndụ gị nwee nzube. O nwere ike ị chọpụtala na mmadụ na-enwekarị obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ rụpụta ihe bara uru. Ọtụtụ mmadụ nwere ihe mgbaru ọsọ ná ndụ, ọ pụrụ ịbụ ihe metụtara ezinụlọ ha, ndị enyi ha, achụmnta ego ha, ma ọ bụ ntụrụndụ. Ihe ndị a adịchaghị ewetara ha obi ụtọ n’ihi na ndụ bụ ihe a na-ejighị n’aka. (Eklisiastis 9:11) Otú ọ dị, ezi ofufe na-enyere gị aka inweta nzube ka elu ná ndụ, nke na-anọgide na-enye gị obi ụtọ ọbụna mgbe ihe ndị ọzọ na-ewetaraghị gị obi ụtọ.

Ezi ofufe na-agụnye ịmara Jehova na iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Ndị na-efe ezi ofufe na-abịaru nnọọ Chineke nso. (Eklisiastis 12:13; Jọn 4:23; Jems 4:8) Ọ pụrụ isiri gị ike iche na ị ga-amata Chineke ruo n’ókè nke na ọ ga-aghọ enyi gị. Ma ọ bụrụ na ị tụgharịa uche n’akụkọ banyere otú o si mesoo ndị mmadụ, ọ bụrụkwa na i chebara ihe ndị o kere echiche, ị pụrụ n’ezie ịghọta ụdị onye ọ bụ. (Ndị Rom 1:20) Ọ bụrụkwa na ị gụọ Okwu Chineke, ị pụrụ ịghọta ihe mere anyị ji nọrọ ebe a, ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, otú ọ ga-esi kwụsị nhụjuanya, nke kasịkwa akpali akpali bụ́ na ị ga-ahụ otú ị ga-esi kere òkè dị mkpa n’imezu nzube Chineke. (Aịsaịa 43:10; 1 Ndị Kọrint 3:9) Ọ bụrụ na ị ghọta ihe ndị a, ị ga-ahụ ezi ihe mere ị ga-eji nọgide na-adị ndụ!

Ịghọ Ezigbo Mmadụ

Ezi ofufe baara gị uru n’ihi na ọ na-eme ka ị ghọọ ezigbo mmadụ. Ọ bụrụ na ị na-efe ezi ofufe, ọ ga-eme ka ịzụlite àgwà ndị ga-eme ka gị na ndị mmadụ na-emekọrịta ihe n’udo. Site n’aka Chineke na n’aka Ọkpara ya, ị ga-amụta ịkwụwa aka ọtọ, iji obiọma na-ekwu okwu, nakwa ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. (Ndị Efesọs 4:20–5:5) Ọ bụrụ na ị mata Chineke nke ọma ruo n’ókè nke ịhụ ya n’anya, nke ahụ ga-akpali gị iṅomi ya. Bible na-ekwu, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, nọgidekwanụ na-eje ije n’ịhụnanya.”—Ndị Efesọs 5:1, 2.

Ọ́ bụghị ihe obi ụtọ na ndị na-eṅomi ịhụnanya Chineke gbara anyị gburugburu? Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na ife ezi Chineke ahụ abụghị ihe mmadụ na-eme nanị ya. Ọ na-eme ka gị na ndị ọzọ hụrụ ihe ziri ezi n’anya na-emekọrịta ihe. N’ezie, ọ pụrụ isitụrụ gị ike ịnabata echiche nke isonye n’òtù okpukpe. Ma dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, nsogbu ihe ka n’ọtụtụ okpukpe nwere abụghị na ha bụ òtù e hiwere ehiwe, kama ọ bụ na a hazighị ha n’ụzọ ziri ezi nakwa n’ụzọ ha ga-arụpụta ihe bara uru. Ọtụtụ òtù okpukpe adịghị agbaso ụzọ Kraịst. Ọ bụ Jehova n’onwe ya haziri ndị ya ka ha nwee ike ịrụpụta ihe bara uru. Bible na-ekwu, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) Dị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ chọpụtarala, gị onwe gị pụkwara ịchọpụta na ọ bụrụ na i soro Ndị Kraịst a haziri nke ọma na-akpakọrịta ga-eme ka ị na-ele ihe anya n’ụzọ ka mma.

Olileanya Maka Ọdịnihu

Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Chineke na-ahazi ndị na-efe ya ezi ofufe ka ha nwee ike ịgabiga ọgwụgwụ usoro ihe a iji nweta ụwa ọhụrụ nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya.’ (2 Pita 3:13; Mkpughe 7:9-17) Ofufe nke baara gị uru na-eme ka i nwee olileanya, bụ́ nke dị mmadụ mkpa iji nwee obi ụtọ. Ụfọdụ na-enwe olileanya na ọdịnihu ga-adị mma ma ọ bụrụ na gọọmenti akwụsie ike, achụmnta ego ha ana-aga nke ọma, ha enwee ezigbo ahụ́ ike ma jirikwa obi ụtọ laa ezumike nká. Ma ọ bụ ole na ole n’ime ihe ndị a, ma ọ bụrụgodị na e nwee nke ọ bụ, na-eme ka mmadụ nwee olileanya na ya ga-enwe obi ụtọ n’ọdịnihu. N’aka nke ọzọ, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị enwewo olileanya na Chineke dị ndụ.”—1 Timoti 4:10.

Ọ bụrụ na ị chọsie ike, ị ga-achọta ndị na-efe ezi ofufe. N’ụwa taa nke kewasịrị ekewasị, ịhụnanya na ịdị n’otu e nwere n’etiti Ndịàmà Jehova na-eme ka ha gbapụ iche. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha si ná mba nile nke ụwa ma bụrụ ndị a zụlitere n’ebe dịgasị iche iche; n’agbanyeghị nke ahụ, ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ na nke ha nwere n’ebe Jehova nọ mere ka ha dịrị n’otu. (Jọn 13:35) Ha na-akpọ gị ka ị bịa jiri anya gị hụ ihe ha hụrụ. Esaf dere, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.”—Abụ Ọma 73:28.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị pụrụ ịbụ enyi Chineke