Okpukpe È Nwere Uru Ọ Na-aba?
Okpukpe È Nwere Uru Ọ Na-aba?
“ONYE chọrọ ịbụ ezigbo mmadụ ga-abụ ezigbo mmadụ ma ọ̀ bara chọọchị ma ọ baghị chọọchị!” Nke a bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-echekarị. E nwere ọtụtụ ndị na-akwụwa aka ha ọtọ na ndị na-emepụrụ ndị ihe na-esiri ike ma ha enweghị mmasị n’okpukpe. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe na-aga chọọchị, n’agbanyeghị na ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na ha kweere na Chineke. * Ọbụna ná mba ndị dị na Latin America, ọ bụ nanị ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ ise nke ndị Katọlik na-agachi chọọchị anya.
Dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ na-eche, ikekwe gị onwe gị pụrụ ịdị na-eche na okpukpe adịchaghị mkpa iji bụrụ ezigbo mmadụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị n’ebe ụfọdụ ejighịzi okpukpe kpọrọ ihe dị ka ha jibu ya kpọrọ. Gịnị mere ọtụtụ ndị enweghịzi mmasị n’okpukpe? Ọ̀ ga-ekwe omume mmadụ ịbụ ezigbo mmadụ n’enweghị mmasị n’okpukpe? È nwere okpukpe nke pụrụ ịbara gị uru?
Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Kwụsị Ịga Chọọchị
Ruo ọtụtụ narị afọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị Krisendọm kweere na ihe Chineke chọrọ n’aka anyị bụ ka anyị na-erubere ya isi. Ha na-aga chọọchị iji nweta ngọzi Chineke, site n’ikere òkè n’ememe dị iche iche nke ndị ụkọchukwu na-eduzi ma ọ bụ site n’ịgbaso nduzi nke ndị pastọ. N’eziokwu, ọtụtụ ndị maara banyere omume ihu abụọ e nwere n’okpukpe. Ọtụtụ ndị maara nke ọma òkè okpukpe keere n’agha ndị a lụrụ, ha makwaara banyere omume rụrụ arụ ndị ụkọchukwu ụfọdụ na-eme. Ma ihe ka ọtụtụ chere na okpukpe n’onwe ya adịghị njọ. Otú ihe ndị a na-eme na chọọchị si dịrị omimi na otú ndị chọọchị si eme nsọ nsọ nakwa ememe na egwú ndị a na-akụ na chọọchị dọọrọ mmasị nke ọtụtụ ndị ọzọ; ọbụna egwu a na-eyi ndị mmadụ banyere ọkụ ala mmụọ, bụ́ ozizi na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ, kpaliri mmasị ụfọdụ ndị ọzọ. Ka oge na-aga, ọtụtụ ihe ndị maliteziri ime na chọọchị gbanwere otú ọtụtụ ndị si ele chọọchị anya.
Ozizi evolushọn bịaziri ghọọ ihe na-ewu ewu. Ụfọdụ ekwetazie na ndụ esiteghị n’aka Chineke kama na ọ malitere ná mberede. Ihe ka n’ọtụtụ okpukpe enweghị ike ịkọwara ndị mmadụ n’ụzọ doro anya na ọ bụ Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Tụkwasị na nke a, ka a bịaziri na-enwe ọganihu na nkà na ụzụ, chọpụta ụzọ ndị ka bụrụ ọkpọka e si agwọ ọrịa, usoro ime njem na usoro nkwurịta okwu ndị bụ́ ịgba, ndị mmadụ cheweziri na sayensị pụrụ ịgwọta nsogbu ọ bụla. Ọzọkwa, e chere na ndị ọkà ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ na-enye ntụziaka bara uru karịa nke chọọchị na-enye. Chọọchị n’onwe ya emeghịkwanụ ka o doo ndị mmadụ anya na irubere iwu Chineke isi bụ ụzọ kasị mma isi bie ndụ.—Jems 1:25.
Iji dọtaghachi mmasị ndị mmadụ nwere n’okpukpe, ọtụtụ chọọchị gbanwere ozizi ha. Ndị ụkọchukwu na ndị pastọ kwụsịrị ịkụzi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-erubere ya isi. 2 Timoti 4:3.
Ọtụtụ n’ime ha maliteziri ịkụzi na ọ bụ onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Iji dọta ọtụtụ mmadụ na chọọchị ha, ụfọdụ ndị ụkọchukwu malitere ịkụzi na Chineke na-anabata onye ọ bụla n’agbanyeghị otú onye ahụ si ebi ndụ. Ozizi dị otú ahụ na-echetara anyị amụma Bible buru, sị: “A ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anagide ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, n’ikwekọ n’ọchịchọ nke ha, ha ga-akpọkọjuru onwe ha ndị ozizi iji mee ka ntị ha na-akọ ha ọkọ.”—Kama ozizi dị otú ahụ ịdọta ndị mmadụ, o mere ka ha gharazie inwe mmasị n’okpukpe. Ha bịaziri na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na chọọchị na-enwe obi abụọ banyere ike Chineke nwere ike ihe na amamihe Chineke nwere ime iwu, oleekwanụ uru ịga chọọchị baara m? Olee ihe mere m ga-eji na-enye onwe m nsogbu ịkụziri ụmụ m ihe banyere okpukpe?’ Ndị nọ na-agbalị ibi ezigbo ndụ maliteziri ile okpukpe anya dị ka ihe na-adịghị mkpa. Ha kwụsịrị ịga chọọchị, ha adịghịzikwa eji okpukpe akpọrọ ihe. Oleezi ebe mmiri si banye n’opi ụgbọgụrụ nke na ihe kwesịrị ịdị mma dịzi njọ? Bible nyere azịza na-eju afọ.
A Na-eme Ihe Ọjọọ n’Aha Okpukpe
Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst oge mbụ aka ná ntị na ụfọdụ mmadụ ga-eji aha okpukpe na-eme ihe ọjọọ. O kwuru, sị: “Nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro, ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie ma na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:29, 30) Otu onye nke kwuru “ihe ndị gbagọrọ agbagọ” bụ ọkà mmụta okpukpe nke chọọchị Roman Katọlik bụ́ Augustine. Jizọs kụziiri ụmụazụ ya otú ha ga-esi soro ndị ọzọ tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ iji mee ka ha kweta n’ihe Bible kwuru. Ma Augustine gbagọrọ ihe Jizọs kwuru na Luk 14:23, bụ́ “Rụgidekwa ha ka ha bata,” ịpụta na ọ dị mma iji ike na-atọghata ndị mmadụ. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 28:23, 24) Augustine jiri okpukpe mee ihe iji chịkwaa ndụ ndị mmadụ.
Ọ bụ Setan, bụ́ mmụọ ozi nupụrụ isi, na-akpata ojiji e ji okpukpe na-eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma nakwa omume rụrụ arụ nile jupụtara na ya. Ọ kpaliri ndị okpukpe nke narị afọ mbụ ịgbalị imerụ ọgbakọ Ndị Kraịst. Bible kwuru banyere ndị dị otú ahụ, sị: “Ndị dị otú ahụ bụ ndịozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, na-enwogha onwe ha ịbụ ndịozi nke Kraịst. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya, n’ihi na Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị oké ihe ma ọ bụrụ na ndị ozi ya anọgidekwa na-enwogha onwe ha ịbụ ndị ozi nke ezi omume.”—2 Ndị Kọrint 11:13-15.
Setan ka na-eji okpukpe nke na-azọrọ na ya na-agbaso nzọụkwụ Kraịst, nke na-ekwu na ya na-eme ezi omume, nakwa nke na-azọrọ na ya na-akụziri ndị mmadụ ihe, na-eme ihe iji mee ka ndị mmadụ na-ebi ndụ dị ka Setan si chọọ kama ibi ndụ dị ka Chineke si chọọ. (Luk 4:5-7) Ikekwe, ị chọpụtala na ọtụtụ ndị ụkọchukwu taa na-eji okpukpe ebuli onwe ha elu site n’ịza oké aha, na-anapụta ndị chọọchị ha ego. Ndị ọchịchị ejirikwala okpukpe mee ka ụmụ amaala ha kweta iji onwe ha chụọ àjà n’agha.
Ekwensu na-eji nnọọ okpukpe eme ihe karịa ka ọtụtụ mmadụ maara. Ị pụrụ ịdị na-eche na ọ bụ mmadụ Mkpughe 12:9; 1 Jọn 5:19) Olee otú Chineke si ele okpukpe nke ndị ụkọchukwu na ndị ọchịchị ji na-eme ihe iji dọtara onwe ha ndị mmadụ, anya?
ole na ole ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na-ejere Setan ozi. Ma dị ka Bible si kwuo, “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan . . . na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” Bible kwukwara, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (‘Gịnị Ka M Ji Ya Eme?’
Ọ bụrụ na ihe na-eme n’ụfọdụ chọọchị Krisendọm na-awụ gị akpata oyi, mara na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile enwetụghị mmasị na ha. Krisendọm na-ekwu na ya na Chineke gbara ndụ; Izrel oge ochie kwukwara otu ihe ahụ. O nweghị nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ha. Jehova ga-ama Krisendọm ikpe dịkwa ka ọ mara Izrel oge ochie. Jehova sịrị: “Ha jụrụ ige ntị n’okwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m. Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke unu si n’obodo Sheba bubata, eme? . . . Aja nile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.” (Jeremaịa 6:19, 20, Baịbụlụ Nsọ nke IBS) Chineke adịghị anara ofufe ndị ihu abụọ na-efe ya. Ememe na ekpere ha amasịghị ya. Ọ gwara Izrel, sị: ‘Mkpụrụ obi m akpọwo mgbe nile unu a kara aka asị: ha aghọwo ibu dị arụ n’ahụ́ m, ike iburu ha agwụwo m. Ọzọ, mgbe unu na-agbasa ọbụ aka unu abụọ, M ga-ezonahụ unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ.’—Aịsaịa 1:14, 15.
Ememe ndị a na-emeburu chi ụgha dị iche iche bụ́ ndị ndị chọọchị weghaara ma kpọzie ha ememe Ndị Kraịst hà na-atọ Jehova ụtọ? Ọ̀ na-anụ ekpere nke ndị ụkọchukwu bụ́ ndị na-agwagbu ozizi Kraịst? Chineke ọ̀ na-anabata okpukpe na-adịghị erube isi n’iwu ya? Ya doo gị anya na ọ na-ele ememe chọọchị dị iche iche na-eme taa anya dị nnọọ ka o si lee àjà Izrel oge ochie chụụrụ ya, bụ́ nke o kwuru, sị: ‘Gịnị ka m ji ya eme?’
N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-enwe nnọọ mmasị n’ezi ofufe nke ndị obi ha ziri ezi na-efe ya. Obi na-atọ Chineke ụtọ mgbe ndị mmadụ gosipụtara ekele maka ihe nile ọ na-enye ha. (Malakaị 3:16, 17) Ya mere, ì nwere ike ịbụ ezigbo mmadụ ma ọ bụrụ na ị dịghị efe Chineke? À ga-ele onye na-adịghị emere nne na nna ya hụrụ ya n’anya ihe ọ bụla anya dị ka ezigbo mmadụ? Onye na-adịghị emere Chineke ihe ọ bụla ọ̀ pụrụ ịbụ ezigbo mmadụ? Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na anyị kwesịrị inwe nnọọ mmasị n’ezi Chineke ahụ, bụ́ onye na-enye ndụ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ezi ofufe si ewetara Chineke nsọpụrụ nakwa otú o si abara anyị uru.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 ‘Mmasị ndị mmadụ nwere n’okpukpe malitere ịnyụ ka ọkụ n’ọtụtụ mba n’afọ ndị sochiri 1960.’—The Decline of Christendom in Western Europe, 1750-2000.
[Foto dị na peeji nke 4]
Chọọchị ò nyela ihe àmà doro anya na ọ bụ Chineke kere ihe nile?
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Onye sị na ya na-anọchite anya Chineke ò kwesịrị itinye aka n’ihe dị otú a?
[Foto dị na peeji nke 5]
Olee otú Chineke si ele ụdị ememe a anya?
[Ebe E Si Nweta Foto]
AP Photo/Georgy Abdaladze