Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Bịakwute “Onye Na-anụ Ekpere”?

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Bịakwute “Onye Na-anụ Ekpere”?

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Bịakwute “Onye Na-anụ Ekpere”?

“Gị Onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.”—ABỤ ỌMA 65:2.

1. Gịnị ka ụmụ mmadụ ji dị iche n’ihe ndị ọzọ nile e kere eke, ohere dịkwa aṅaa ka nke a mere ka anyị nwee?

N’IME puku kwuru puku ihe ndị dị ndụ nọ n’elu ala, ọ bụ nanị ụmụ mmadụ nwere ike ife Onye kere ihe nile ofufe. Ọ bụ nanị ụmụ mmadụ ghọtara na ha kwesịrị ife Chineke ofufe, ọ bụkwa nanị ha nwere ọchịchọ ime otú ahụ. Nke a na-eme ka anyị nwee ohere magburu onwe ya iso Nna anyị nke eluigwe na-emekọrịta ihe.

2. Gịnị ka mmehie mere mmekọrịta mmadụ na Onye kere ya?

2 Chineke kere mmadụ otú ọ ga-enwe ike iso Onye kere ya na-ekwurịta okwu. Mgbe e kere Adam na Iv, ha enweghị mmehie. N’ihi ya, ha nwere ike ịgwa Chineke okwu n’atụghị egwu, dị ka nwatakịrị pụrụ isi gwa nna ya okwu. Otú ọ dị, mmehie mere ka ihe ùgwù ahụ magburu onwe ya funahụ ha. Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, nke a mekwara ka ha na ya gharazie ịdị ná mma. (Jenesis 3:8-13, 17-24) Nke a ọ̀ pụtara na ụmụ Adam, bụ́ ndị na-ezughị okè, na Chineke apụghị ikwurịta okwu? Ee e, Jehova ka na-ekwe ka ya na ha na-ekwurịta okwu ma nke ahụ ga-enwe isi nanị ma ọ bụrụ na ha emee ihe ndị ọ chọrọ n’aka ha. Gịnị ka ha bụ?

Ihe Ndị A Chọrọ Iji Bịakwute Chineke

3. Olee otú ụmụ mmadụ na-eme mmehie kwesịrị isi bịakwute Chineke, oleekwa ihe atụ mere ka nke a pụta ìhè?

3 Otu ihe mere n’etiti abụọ n’ime ụmụ Adam na-enyere anyị aka ịghọta ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ ọ bụla na-ezughị okè nke chọrọ ịbịakwute ya. Ma Ken ma Ebel gbalịrị ịbịakwute Chineke site n’ịchụrụ ya àjà. A nabatara nke Ebel ma a nabataghị nke Ken. (Jenesis 4:3-5) Gịnị kpatara nke a? Ndị Hibru 11:4 na-asị: “Site n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken, bụ́ okwukwe nke e sitere na ya gbaa àmà banyere ya na ọ bụ onye ezi omume.” Ya mere, o doro anya na okwukwe dị mkpa iji bịakwute Chineke. Ihe Jehova gwara Ken gosikwara anyị ihe ọzọ a chọrọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe?” Ee, Chineke gaara anabata mgbalị Ken mere ịbịakwute ya ma a sị na Ken na-eme nke ọma. Otú ọ dị, Ken jụrụ ndụmọdụ Chineke, gbuo Ebel, ma ghọọ onye a jụrụ ajụ. (Jenesis 4:7-12) N’ụzọ dị otú a, e mere ka o doo anya site ná mmalite nke mmadụ na okwukwe na ime ihe ọma dị mkpa ma ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịbịakwute Chineke.

4. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịakwute Chineke?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịakwute Chineke anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta na anyị bụ ndị mmehie. Mmadụ nile emehiewo, mmehie na-egbochikwa mmadụ ịbịakwute Chineke. Jeremaịa onye amụma dere banyere ndị Izrel, sị: “Anyị onwe anyị ejehiewo nupụkwa isi . . . I werewo igwe ojii kpuchie Onwe gị, ka ekpere anyị wee ghara ịgabiga.” (Abụ Ákwá 3:42, 44) N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ emehiewo, Chineke anọwo kemgbe ụwa na-egosi na ya dị njikere ịnụ ekpere nke ndị ji okwukwe na ezi obi na-abịakwute ya nakwa ndị na-erube isi n’iwu ya. (Abụ Ọma 119:145) Olee ndị bụ́ ndị a, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ekpere ha?

5, 6. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Ebreham si bịakwute Chineke?

5 Otu n’ime ha bụ Ebreham. Chineke nabatara mgbalị Ebreham mere ịbịakwute ya. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Chineke kpọrọ Ebreham, “enyi m.” (Aịsaịa 41:8) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Ebreham si bịakwute Chineke? Nna ochie a kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ Jehova ajụjụ banyere onye nketa, na-asị: “Gịnị ka Ị ga-enye m, ebe mụ onwe m gaje ịgba aka nwa si n’ụwa laa?” (Jenesis 15:2, 3; 17:18) N’oge ọzọ, o kwupụtara nchegbu o nwere ma è nwekwara ndị a ga-azọpụta mgbe Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe megide Sọdọm na Gọmọra. (Jenesis 18:23-33) Ebreham rịọkwara Jehova arịrịọ maka ndị ọzọ. (Jenesis 20:7, 17) Dịkwa ka Ebel mere, Ebreham chụrụ àjà mgbe ụfọdụ iji bịakwute Jehova.—Jenesis 22:9-14.

6 N’oge ndị a nile, Ebreham gwara Jehova okwu n’atụghị egwu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na ọ naghị eji egwu agwa Jehova okwu, o lere onwe ya anya dị ka onye na-adịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Onye kere ya. Rịba ama okwu o ji nkwanye ùgwù kwuo bụ́ nke dị na Jenesis 18:27. Ọ sịrị: “Biko, lee, ejisiwo m ike ịgwa Onyenwe anyị okwu, mụ onwe m, nke bụ́ ájá na ntụ.” Nke a bụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke anyị kwesịrị iṅomi.

7. Ihe ndị dị aṅaa ka ndị nna ochie ndị e kwuru banyere ha kpegaara Jehova n’ekpere?

7 Ndị nna ochie kpere ekpere banyere ihe ndị dịgasị iche iche, Jehova nụkwara olu ha. Jekọb kwere Jehova nkwa n’ekpere ya. Mgbe ọ rịọsịrị Chineke ka o nyere ya aka, o ji obi ya kwe nkwa, sị: “Ihe nile ị ga-enye m, aghaghịkwa m inye Gị otu ụzọ n’ụzọ iri.” (Jenesis 28:20-22) Ka e mesịrị, mgbe Jekọb na-aga izute nwanne ya nwoke, ọ rịọrọ Jehova ka o chebe ya. Ọ sịrị: “Biko, napụta m n’aka nwanne m, n’aka Ịsọ: n’ihi na mụ onwe m na-atụ egwu ya.” (Jenesis 32:9-12) Nna ochie bụ́ Job kpegaara Jehova ekpere n’ihi ndị ezinụlọ ya, ọbụna na-achụ àjà n’ihi ha. Mgbe ndị enyi atọ Job mehiere n’ihi ihe ha ji ọnụ ha kwuo, Job kpere ekpere n’ihi ha, “Jehova wee hụ Job ihu ọma.” (Job 1:5; 42:7-9) Akụkọ ndị a na-enyere anyị aka ịmata ihe ndị anyị pụrụ ịrịọ Jehova n’ekpere. Anyị na-ahụkwa na Jehova dị njikere ịnụ ekpere nke ndị na-ekpegara ya ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Otú Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ Kwuru A Ga-esi Na-abịakwute Jehova

8. Mgbe ọgbụgba ndụ iwu ahụ ka dị irè, olee otú e si agwa Jehova banyere okwu ndị metụtara ndị Izrel?

8 Mgbe Jehova napụtasịrị mba Izrel n’Ijipt, o soro ha gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Iwu ahụ kwuru otú a ga-esi na-abịakwute Chineke site n’aka ndị nchụàjà a họpụtara ahọpụta. E kenyere ụfọdụ ndị Livaị ịrụrụ ndị Izrel ọrụ dị ka ndị nchụàjà. Mgbe nsogbu bilitere ná mba ahụ, onye na-anọchite anya ha—mgbe ụfọdụ ọ na-abụ eze ma ọ bụ onye amụma—na-agwa Chineke banyere nsogbu ahụ n’ekpere. (1 Samuel 8:21, 22; 14:36-41; Jeremaịa 42:1-3) Dị ka ihe atụ, mgbe a na-arara ụlọ nsọ ahụ nye, Eze Solomọn ji obi ya dum kpegara Jehova ekpere. Jehova gosikwara na ya nabatara ekpere Solomọn site n’ime ka ebube Ya jupụta n’ụlọ nsọ ahụ ma kwuo, sị: “Ntị m abụọ ga na-aṅakwa ntị, n’ekpere nke ebe a.”—2 Ihe E Mere 6:12-7:3, 15.

9. Gịnị ka a chọrọ ka e mee iji nwee ike ịbịakwute Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ebe nsọ ahụ?

9 N’Iwu ahụ Jehova nyere Izrel, o kwuru ihe a chọrọ ka e mee tupu a bịakwute ya n’ebe nsọ ahụ. Gịnị ka ọ bụ? Tụkwasị n’ịchụ ụmụ anụmanụ n’àjà, a chọrọ ka nnukwu onye nchụàjà sureere Jehova ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụtụtụ na kwa uhuruchi. Ka e mesịrị, ndị nchụàjà nọ n’okpuru nnukwu onye nchụàjà rụkwara ọrụ a n’oge ndị ọzọ na-abụghị n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụrụ na ndị nchụàjà arụghị ọrụ a bụ́ nke na-egosi na ha na-akwanyere Jehova ùgwù, Jehova agaghị anabata ozi ha na-eje.—Ọpụpụ 30:7, 8; 2 Ihe E Mere 13:11.

10, 11. Olee ihe àmà ndị na-egosi na Jehova nabatara ekpere nke ndị kpegaara ya ekpere n’onwe ha?

10 N’Izrel oge ochie, ọ̀ bụ nanị site n’aka ndị Chineke họpụtara ka e si abịakwute Jehova? Ee e, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Jehova nabatara ekpere ndị mmadụ kpere n’onwe ha. N’ekpere ahụ Solomọn kpere mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ nye, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Ekpere ọ bụla, arịrịọ amara ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị Gị nile, bụ́ Izrel . . . o wee gbasaa ọbụ aka ya abụọ n’ebe ụlọ a dị: Gị onwe gị sikwa n’eluigwe . . . nụrụ.” (2 Ihe E Mere 6:29, 30) Ihe ndekọ Luk na-agwa anyị na mgbe Zekaraịa, bụ́ nna Jọn Onye Na-eme Baptizim, na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ọtụtụ ndị ọzọ na-efe Jehova ofufe, ndị na-abụghị ndị nchụàjà, nọ “na-ekpe ekpere n’èzí.” O yiri ka à na-ahụkarị ndị mmadụ ka ha nọ n’èzí ụlọ nsọ ahụ na-ekpe ekpere ka a na-esurere Jehova ihe nsure ọkụ n’ebe ịchụ àjà e ji ọlaedo mee.—Luk 1:8-10.

11 Ya mere, mgbe e si otú a bịakwute Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ na-enwe obi ụtọ ịnabata arịrịọ a na-arịọ ya site n’aka ndị na-anọchite anya mba ahụ dum nakwa site n’aka ndị mmadụ bụ́ ndị kpegaara ya ekpere n’onwe ha. Anyị anọghịzi n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ taa. Otú o sina dị, anyị pụrụ ịmụta ụfọdụ ihe ndị dị oké mkpa banyere ekpere site n’otú ndị Izrel oge ochie si kpegara Chineke ekpere.

Ịbịakwute Chineke Site n’Aka Kraịst

12. Ndokwa dị aṅaa ka e mere ka Ndị Kraịst wee nwee ike ịbịakwute Jehova?

12 Ugbu a, anyị bi n’oge Ndị Kraịst. E nweghịzi ụlọ nsọ nkịtị bụ́ ebe ndị nchụàjà na-anọchite anya ndị Chineke nile ma ọ bụ ebe anyị ga na-ele anya na-ekpegara Chineke ekpere. Otú o sina dị, Jehova ka mere ndokwa otú anyị ga-esi na-ekpegara ya ekpere. Olee ndokwa ọ bụ? Mgbe e tere Kraịst mmanụ na 29 O.A. ma họpụta ya dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, ụlọ nsọ ime mmụọ malitere ịdị irè. * Ụlọ nsọ ime mmụọ a bụ ndokwa ọhụrụ e mere maka ịbịakwute Jehova iji fee ya ofufe na-adabere n’àjà Jizọs Kraịst chụrụ iji kpuchiere anyị mmehie anyị.—Ndị Hibru 9:11, 12.

13. Olee otú ụlọ nsọ dị na Jeruselem na ụlọ nsọ ime mmụọ si yie onwe ha ma a bịa n’ihe banyere ekpere?

13 Ọtụtụ ihe ndị e ji mara ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, gụnyere ihe ndị metụtara ekpere a nọ ebe ahụ kpee, na-ese nnọọ onyinyo ndokwa e mere maka ụlọ nsọ ime mmụọ. (Ndị Hibru 9:1-10) Dị ka ihe atụ, gịnị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke e surere n’ụtụtụ na n’uhuruchi n’elu ebe ịchụàjà a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke dị n’Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ sere onyinyo ya? Dị ka akwụkwọ Mkpughe si gosi, “ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ahụ pụtakwara ekpere ndị nsọ.” (Mkpughe 5:8; 8:3, 4) E nyere Devid ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị.” (Abụ Ọma 141:2) Ya mere, n’oge Ndị Kraịst, ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ na-anọchi nnọọ anya ekpere na otuto ndị Jehova na-anakwere.—1 Ndị Tesalonaịka 3:10.

14, 15. (a) Olee otú ndị e tere mmanụ si abịakwute Jehova? (b) Oleekwa otú “atụrụ ọzọ” ahụ si abịakwute Jehova?

14 Ònye pụrụ ịbịakwute Chineke n’ụlọ nsọ ime mmụọ a? N’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị nchụàjà na ndị Livaị nwere ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi n’ogige nke dị n’ime, ma ọ bụ nanị ndị nchụàjà na-abanye n’Ebe Nsọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe, nwere ọnọdụ ime mmụọ pụrụ iche nke ogige ahụ dị n’ime na Ebe Nsọ ahụ soro onyinyo ya, bụ́ nke na-enyere ha aka ikpegara Chineke ekpere na inye ya otuto.

15 Gịnị banyere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, “atụrụ ọzọ” ahụ? (Jọn 10:16) Aịzaịa onye amụma kwuru na ndị sitere n’ọtụtụ mba ga-abịa ife Jehova ofufe “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Aịsaịa 2:2, 3) O dekwara na “ụmụ ala ọzọ” ga-arapara Jehova n’ahụ́. N’igosi na ya dị njikere ịnabata ha, Chineke kwuru, sị: “M ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m.” (Aịsaịa 56:6, 7) Mkpughe 7:9-15 nyekwuru nkọwa banyere nke ahụ na-ekwu banyere “oké ìgwè mmadụ” ndị si ná “mba nile,” bụ́ ndị zukọtara ife Chineke ofufe na ikpeku ya ekpere “ehihie na abalị,” ka ha na-eguzo n’ogige nke dị n’èzí ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi na ndị ohu Chineke nile taa pụrụ ikpegara Chineke ekpere n‘atụghị ụjọ, na-enwe nnọọ obi ike na ọ ga-anụ ekpere ha!

Olee Ekpere Ndị A Na-anakwere?

16. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Ndị Kraịst narị afọ mbụ ma a bịa n’ihe banyere ekpere?

16 Ndị Kraịst oge mbụ ji ekpere kpọrọ ihe. Olee ihe ndị ha kpegaara Jehova n’ekpere? Ndị okenye ọgbakọ rịọrọ maka nduzi mgbe ha na-ahọpụta ndị ga-enye aka n’ịhazi ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. (Ọrụ 1:24, 25; 6:5, 6) Epafras kpere ekpere maka ndị kwere ekwe ibe ya. (Ndị Kọlọsi 4:12) Ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem kpere ekpere maka Pita mgbe a tụrụ ya mkpọrọ. (Ọrụ 12:5) Ndị Kraịst narị afọ mbụ rịọrọ Chineke ka o mee ka ha nwee nkwuwa okwu n’agbanyeghị mkpagbu a na-akpagbu ha. Ha sịrị: “Jehova, leba anya n’iyi egwu ha, nyekwa ndị ohu gị ikike ịnọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.” (Ọrụ 4:23-30) Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-arịọ Chineke maka amamihe mgbe a na-anwa ha ọnwụnwa. (Jems 1:5) Ị̀ na-etinye ihe ndị dị otú a n’ekpere ndị ị na-ekpegara Jehova?

17. Ole ndị ka Jehova na-aza ekpere ha?

17 Chineke adịghị aza ekpere nile. Oleezi otú anyị pụrụ isi kpee ekpere obi esie anyị ike na a ga-aza ya? Ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị Chineke ṅara ntị n’ekpere ha n’oge gara aga ji ezi obi kpegara ya ekpere. Ha gosipụtara okwukwe ha site n’ịrụ ezi ọrụ. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-aṅa ntị n’ekpere nke ndị kpegaara ya ekpere n’ụzọ dị otú a.

18. Gịnị ka a chọrọ n’aka Ndị Kraịst ka e wee za ekpere ha?

18 E nwere ihe ọzọ a chọrọ n’aka anyị. Pọl onyeozi kọwara nke a, na-asị: “Site n’aka ya anyị . . . nwere ike ịbịaru Nna ahụ nso site n’otu mmụọ.” Ònye ka Pọl na-ekwu banyere ya mgbe o dere, sị, “site n’aka ya”? Ọ bụ Jizọs Kraịst. (Ndị Efesọs 2:13, 18) Ee, ọ bụ nanị site n’aka Jizọs ka anyị pụrụ ikpegara Nna ahụ ekpere n’enweghị ihe mgbochi.—Jọn 14:6; 15:16; 16:23, 24.

19. (a) Olee mgbe ihe nsure ọkụ na-esi ísì isi ụtọ a na-esure n’Izrel malitere ịsọ Jehova oyi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi hụ na ekpere anyị bụ ihe nsure ọkụ na-esi Jehova ísì ụtọ?

19 Dị ka e kwuru ná mmalite, ihe nsure ọkụ na-esi ísì isi ụtọ nke ndị nchụàjà bụ́ ndị Izrel surere na-anọchi anya ekpere nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị Chineke na-anakwere. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, Jehova na-asọ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke ndị Izrel na-esurere ya oyi. Ihe mere o ji na-asọ ya oyi bụ n’ihi na ndị Izrel nọ na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì isi ụtọ n’ụlọ nsọ ahụ ma nọrọ n’elu ya na-akpọ isi ala nye arụsị. (Ezikiel 8:10, 11) N’otu aka ahụ taa, ekpere nke ndị sị na ha na-efe Jehova ma nọrọ n’otu oge ahụ na-eme ihe megidere iwu ya, na-esi ya ísì ọjọọ. (Ilu 15:8) Ya mere, ka anyị nọgide na-ebi ndụ dị ọcha n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ ka ekpere anyị wee bụrụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Chineke. Jehova na-enwe mmasị n’ekpere nke ndị na-agbaso ụzọ ezi omume ya. (Jọn 9:31) Otú ọ dị, a ka nwere ajụjụ ụfọdụ ndị chọrọ azịza. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere? Gịnị ka anyị pụrụ ịdị na-ekpe n’ekpere? Oleekwa otú Chineke si aza ekpere anyị? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi bịakwute Chineke n’ụzọ ọ na-anakwere?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ndị nna ochie n’ụzọ anyị si ekpe ekpere?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’ekpere nke Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ?

• Olee mgbe ekpere anyị na-adị ka ihe nsure ọkụ na-esi Chineke ísì ụtọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

N’ihi gịnị ka Chineke ji nara àjà Ebel ma ọ naraghị nke Ken?

[Foto dị na peeji nke 24]

‘Mụ onwe m bụ ájá na ntụ’

[Foto dị na peeji nke 25]

‘Aghaghị m inye gị otu ụzọ n’ụzọ iri ha’

[Foto dị na peeji nke 26]

Ekpere gị ọ̀ dị ka ihe nsure ọkụ na-esi Jehova ísì ụtọ?