‘Anyị Apụghị Ịkwụsị Ikwu Banyere Jizọs’
“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”
‘Anyị Apụghị Ịkwụsị Ikwu Banyere Jizọs’
IHE a na-aga ịkọ ugbu a mere n’afọ 33 O.A., ebe ọ nọkwa mee bụ ná nnukwu ụlọikpe ndị Juu dị na Jeruselem. Ụlọikpe Sanhedrin na-achọ ikpe mmadụ 12 na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ikpe. N’ihi gịnị? N’ihi na ha nọ na-ekwusa banyere Jizọs. Ndịozi bụ́ Pita na Jọn guzo n’ihu ụlọikpe ahụ nke ugboro abụọ ha. Nke a bụ nke mbụ ndịozi ndị nke ọzọ na-awụcha n’ụlọikpe a.
Nnukwu onye nchụàjà chetaara ndịozi 12 ahụ iwu ụlọikpe ahụ nyere mgbe ahụ o kpere Pita na Jọn ikpe. N’oge ahụ, mgbe e nyere ndịozi bụ́ Pita na Jọn iwu ka ha kwụsị izi ihe banyere Jizọs, ha zara ụlọikpe ahụ, sị: “Ma ò ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị kama ige Chineke ntị, kpebienụ n’onwe unu. Ma nye anyị, anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụworo ma nụ.” Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs kpesịrị ekpere ka Chineke nye ha obi ike, ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 4:18-31.
Ebe nnukwu onye nchụàjà ahụ hụrụ na egwu mbụ o yiri ha arụpụtaghị ihe ọ bụla, n’ikpe nke abụọ a, ọ gwara ha, sị: “Anyị nyesịrị unu iwu ike ka unu kwụsị ịnọgide na-ezi ihe na-adabere n’aha a, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, lee! unu emejupụtawo Jeruselem n’ozizi unu, unu kpebikwara iweta ọbara nwoke a n’isi anyị.”—Ọrụ 5:28.
Ha Mere Mkpebi Siri Ike
N’iji obi ike zaghachi, Pita na ndịozi ndị ọzọ sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ezie, kama anyị ga-erubere ụmụ mmadụ isi, anyị aghaghị irubere Jehova isi mgbe ihe mmadụ chọrọ ka anyị mee megidere iwu ndị Jehova nyere. *
Ndị Sanhedrin kwesịrị ikwenyere mkpebi ahụ ndịozi ahụ mere irubere Chineke isi. Ọ bụrụ na a jụọ ha ma è kwesịrị irubere Chineke isi, ndị ndú ndị Juu a kwesịrị iji otu olu zaa, sị: “Rubere Chineke isi.” A sị ka e kwuwe, ha kweere na Chineke bụ Onyenwe eluigwe na ala.
O doro anya na Pita kwuchitere ọnụ ndịozi nile, wee kwuo na a bịa n’ihe metụtara ozi ha, na ha ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ. O si otú ahụ gosi na ebubo ahụ e boro ndịozi na ha anaghị erube isi bụ ụgha. Ndị Sanhedrin amụtala site n’akụkọ mba ha na o nwere oge ndị o doro anya na o kwesịrị ekwesị ka e rubere Chineke isi karịa mmadụ. Ndị inyom abụọ na-aghọ nwa n’Ijipt tụrụ egwu Chineke, ọ bụghị egwu Fero, site n’ichebe ụmụ nwoke ndị inyom Hibru mụrụ. (Ọpụpụ 1:15-17) Eze Hezekaịa rubeere Jehova isi ma jụ irubere Eze Senakerib isi mgbe e yiri ya egwu iji mee ka ọ chịlie aka elu. (2 Ndị Eze 19:14-37) Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke òtù Sanhedrin maara nke ọma, mesiri ya ike na Jehova na-atụ ndị ya anya n’aka irubere ya isi.—1 Samuel 15:22, 23.
A Gọziri Ha n’Ihi Nrubeisi Ha
Ihe àmà gosiri na ma ọ dịghị ihe ọzọ, okwu ahụ bụ́ “anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ” metụrụ otu onye n’ime ndị ikpe nke ụlọikpe ukwu ahụ n’ahụ́. Gameliel, bụ́ onyeikpe a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu na Sanhedrin, mere ka ndị Ọrụ 5:34-39.
nọ n’ụlọikpe ahụ gee ntị na ndụmọdụ amamihe dị na ya nke ọ gbanyeere ha n’izu. Gameliel chetaara ha ihe ndị mere n’oge gara aga iji mee ka ha mara na ọ bụ ihe nzuzu imegide ọrụ nke ndịozi ahụ. O mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Unu etinyela aka n’ihe metụtara ndị a, kama hapụnụ ha; . . . ma ọ bụghị ya, a pụrụ ịhụ, ma eleghị anya, na unu bụ n’ezie ndị na-alụso Chineke ọgụ.”—Okwu a amamihe dị na ya nke Gameliel kwuru mere ka ụlọikpe ukwu ahụ hapụ ndịozi ahụ. N’agbanyeghị na ha pịara ndịozi ahụ ihe, ndịozi ahụ ekweghị ka ihe a merenụ menye ha ụjọ. Kama nke ahụ, Bible kwuru, sị: “Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—Ọrụ 5:42.
Lee otú e si gọzie ndịozi ahụ n’ihi ha ịnọgide na-ekwenye na ọchịchị Chineke bụ ọchịchị kasịnụ! Ezi Ndị Kraịst nke oge a kwenyekwara otu ihe ahụ. Ndịàmà Jehova nọgidere na-ewere Jehova dị ka Onye Ọchịchị Kasị Elu. Ọ bụrụ na a gwa ha mee ihe megidere ntụziaka Chineke, ha na-azaghachi dị ka ndịozi ahụ zara, nke bụ́: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, September/October.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ọ̀ Dịtụla Mgbe I Chere, Sị?
Olee otú Luk bụ́ onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi si mata ihe Gameliel kwuru mgbe ya na ndị Sanhedrin na-agba izu? O nwere ike ịbụ na Chineke ji ike mmụọ nsọ kpugheere Luk ihe Gameliel kwuru. O nwekwara ike ịbụ na, Pọl (onye bụ́bu otu n’ime ụmụ akwụkwọ Gameliel) gwara Luk ihe Gameliel kwuru. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Luk jụtara otu n’ime ndị ikpe nke ụlọikpe ukwu ahụ nke na-ekwenyere Ndị Kraịst ihe Gameliel kwuru.