Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ha Kpọkọrọ Sanhedrin”

“Ha Kpọkọrọ Sanhedrin”

“Ha Kpọkọrọ Sanhedrin”

NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ na ndị ndú ndị Juu amaghị ihe ha ga-eme. Olee ihe ha ga-eme iji kwụsị ọgba aghara a na-enwe banyere Jizọs Kraịst? Ha egbuola ya, ma ugbu a, ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu ebe nile na Jeruselem na a kpọlitela ya n’ọnwụ. Olee otú a ga-esi mechie ha ọnụ? Iji kpebie ihe a ga-eme, nnukwu onye nchụàjà na ndị ya na ha so achị “kpọkọrọ Sanhedrin,” bụ́ ụlọikpe kasị elu nke ndị Juu.—Ọrụ 5:21.

N’oge ahụ n’Izrel, ọ bụ Gọvanọ Pọntiọs Paịlet bụ onye ọchịchị kasị elu. Ma olee mmekọrịta dị n’etiti ndị Sanhedrin na Paịlet? Olee otú ikike Sanhedrin na nke Paịlet hà? Olee ndị mejupụtara òtù Sanhedrin? Gịnịkwa bụ ọrụ òtù ahụ?

Otú Sanhedrin Si Malite

Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “Sanhedrin” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọkọta ọnụ.” Ọ bụ okwu a na-eji eme ihe maka nnọkọ ma ọ bụ nzukọ. N’akụkọ oge ochie nke ndị Juu, a na-ejikarị ya eme ihe maka òtù ikpe, ma ọ bụ ụlọikpe okpukpe.

Ndị dere Talmud, bụ́ nke e ji ọtụtụ narị afọ sochiri mbibi nke Jeruselem n’afọ 70 O.A. chịkọta, kwuru banyere Sanhedrin dị ka òtù e nwere n’oge ochie. Ha chere na ọ bụ okwu e ji eme ihe kemgbe maka ndị ọkà mmụta na-ezukọta ọnụ iji rụrịta ụka banyere ihe ndị metụtara iwu ndị Juu, ha chekwara na ọ malitere mgbe ahụ Mozis kpọkọtara ndị okenye 70 iji nyere ya aka idu ndị Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 11:16, 17) Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekweghị na nke ahụ bụ eziokwu. Ha kwuru na mgbe a malitere inwe ihe yiri Sanhedrin ahụ e nwere na narị afọ mbụ bụ mgbe ndị Peshia malitere ịchị Izrel. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwukwara na òtù nke ndị gụrụ akwụkwọ bụ́ nke ndị dere Talmud kwuru banyere ya eyighị ka ọ̀ bụ òtù Sanhedrin, kama ọ ka yie òtù ndị rabaị e nwere na narị afọ nke abụọ na nke atọ. Ya bụrụ otú ahụ, olee mgbe òtù Sanhedrin malitere?

Bible mere ka anyị ghọta na ndị si Babilọn lọghachi na Juda n’afọ 537 T.O.A. nwere òtù na-achị ha dị ka mba. Nehemaịa na Ezra kwuru banyere ndị isi, ndị okenye, ndị a maara aha ha, na ndị nọchiri anya eze—ikekwe ọ bụ ndị a mesịrị ghọọ ndị Sanhedrin.—Ezra 10:8; Nehemaịa 5:7.

Agbata oge e dechara Akwụkwọ Nsọ Hibru na mgbe e dere Oziọma Matiu bụ oge ndị Juu nọ n’ọgba aghara. N’afọ 332 T.O.A., Alexander Onye Ukwu weghaara Judia. Mgbe Alexander nwụsịrị, alaeze abụọ nke ndị Gris bụ́ ndị nọbu n’okpuru ya malitere ịchị Judia—ndị nke mbụ bụ ndị ezinụlọ Ptolemy, mgbe oge nke ha gasịrị, ndị ezinụlọ Seleucus malitere. Ebe mbụ a kpọtụrụ òtù ndị omeiwu nke ndị Juu aha bụ n’akwụkwọ nke ihe ndị mere n’oge ọchịchị ndị ezinụlọ Seleucus, bụ́ nke malitere n’afọ 198 T.O.A. O yiri ka òtù a enwechaghị ike, ma o mere ka ndị Juu chee na ha na-achị onwe ha.

N’afọ 167 T.O.A., onye ezinụlọ Seleucus bụ́ Eze Antiochus nke Anọ (Epiphanes) nwara ịmanye ndị Juu ịnabata omenala ndị Gris. O merụrụ ụlọ nsọ Jeruselem site n’iji ezì chụọrọ chi ụgha bụ́ Zus àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ ahụ. Nke a kpatara ọgba aghara nke mere ka ndị ezinụlọ Maccabaeus kwatuo ọchịchị ndị ezinụlọ Seleucus na-achị ndị Juu ma hiwe usoro ọchịchị ndị Hasmon. * N’otu oge ahụ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii—bụ́ ndị ndú nke ndị nkịtị bụ́ ndị kwadoro nnupụisi ahụ—naghaara ndị nchụàjà ọchịchị nke mba ahụ.

Ọ bụ otú ahụ ka Sanhedrin nke a kọwara n’Akwụkwọ Nsọ Grik si malite. O mesịrị ghọọ òtù na-achị achị ná mba ahụ na ụlọikpe kasị elu nke na-akọwa iwu ndị Juu.

Otú E Si Kee Ikike

Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ, ọ bụ ndị Rom na-achị Judia. Otú ọ dị, ndị Juu nwetụụrụ onwe ha. Ụkpụrụ ndị Rom na-agbaso bụ ikwe ka ndị nọ n’okpuru ha na-achị onwe ha ruo n’ókè ụfọdụ. N’ihi ya, ndị ọchịchị Rom anaghị etinye anya n’ikpe ndị ụlọikpe ndị Juu na-ekpe, ha na-ezerekwa ha na ha ise okwu n’ihi ọdịiche dị n’omenala mba abụọ ahụ. Ihe mere ndị Rom ji eme otú ahụ bụ iji mee ka e nwee udo n’ógbè ndị dị n’okpuru ha, ndị ógbè ahụ anọgidekwa na-edo onwe ha n’okpuru ha site ná ndị Rom ikwe ka ndị ahụ na-agbaso omenala ha kama ịgbaso nke ndị Rom ma na-achị onwe ha ruo n’ókè ụfọdụ. E wepụ ịhọpụta na iwepụ nnukwu onye nchụàjà—bụ́ onyeisi ndị Sanhedrin—na ikere ndị mmadụ ụtụ isi, ndị Rom na-etinye aka n’ihe ndị Juu na-eme nanị mgbe o metụtara ọchịchị na ọdịmma ha. Dị ka ikpe e kpere Jizọs gosiri, o yiri ka ọ̀ bụ nanị ndị Rom nwere ikike ịma mmadụ ikpe ọnwụ.—Jọn 18:31.

N’ihi ya, ọ bụ ndị Sanhedrin na-ahụ maka ihe ka ukwuu n’ihe gbasara ndị Juu. Ha nwere ndị ọrụ nche bụ́ ndị ha na-edunye ijide ndị mmadụ. (Jọn 7:32) Ndị Rom na-ahapụ ụlọikpe ndị nta ka ha kpee ikpe ndị metụtara obere mpụ na nnupụisi n’iwu obodo. Mgbe ụlọikpe ndị nta na-enweghị ike ikpebi ikpe, ha na-ewegara ya ndị Sanhedrin, bụ́ ndị bụ́ o kwusịa o bie.

Iji jigide ikike ahụ ha nwere, ndị Sanhedrin aghaghị ịhụ na udo dị ma na-akwado ọchịchị ndị Rom. Ma ọ bụrụ na ndị Rom elee anya na ọ dị onye na-agba ọchịchị ha ụkwụ, ha na-etinye aka ma mee otú ọ masịrị ha. Nke ahụ bụ ihe mere mgbe e jidere Pọl.—Ọrụ 21:31-40.

Ndị Na-anọ na Ya

Ndị Sanhedrin na-adị mmadụ 71—nnukwu onye nchụàjà na mmadụ 70 a ma ama ná mba ahụ. N’oge ọchịchị ndị Rom, ọ bụ ndị nchụàjà a ma ama (karịsịa ndị Sadusii), ndị nkịtị bụ́ ndị oké ozu, na ndị odeakwụkwọ gụrụ akwụkwọ bụ́ ndị Farisii na-anọ n’òtù Sanhedrin. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị òtù ụlọikpe ahụ bụ ndị nchụàjà a ma ama na ndị nkịtị bụ́ ndị oké ozu. * Ndị Sadusii anaghị anabata echiche ndị ọzọ, ndị Farisii kwanụ na-anabata echiche ndị ọzọ, ihe kakwa ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nkịtị a ma ama n’obodo. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kwuru na ọ na-esiri ndị Sadusii ike irubere ndị Farisii isi. Pọl ji asọmpi a dị n’etiti ndị Farisii na ndị Sadusii mee ihe mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’ihu ndị Sanhedrin.—Ọrụ 23:6-9.

Otú ndị oké ozu si nọrọ na Sanhedrin na-egosi na o nwere ike ịbụ na onye batahaala n’òtù ahụ, ọ ga-anọgide na ya ruo mgbe ọ ga-anwụ, ya bụrụkwanụ na onye òtù ha anwụọ, o yiri ka ọ̀ bụ ndị nke dị ndụ ga-ahọpụta onye ga-anọchi ya. Akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah kwuru na ndị a ga-anabata n’òtù ahụ aghaghị ịbụ “ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị Izrel bụ́ ndị ndị nchụàjà nwere ike ịlụ ụmụ ha,” ya bụ, ndị Juu nwere ike igosi na ha bụ ezi ndị Juu site n’akwụkwọ ndekọ usoro ọmụmụ ndị Juu. Ebe ọ bụ na ụlọikpe nile dị ná mba ahụ nọ n’okpuru ụlọikpe ukwu a, o yiri ka à na-ebuli ndị ikpe mere nke ọma n’ụlọikpe ndị nta n’ọkwá ịghọ ndị Sanhedrin.

Ebe Ha Na-achị na Ikike Ha Nwere

Ndị Juu na-akwanyere nnọọ Sanhedrin ùgwù, ndị ikpe nke ụlọikpe ndị nta na-anabatakwa ihe ọ bụla Sanhedrin kpebiri, ma ọ́ bụghị ya, a ma ha ikpe ọnwụ. Ọrụ bụ́ isi ụlọikpe ahụ na-arụ bụ ịhụ na ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà ruru eru ịrụ ọrụ ahụ na ịhụ maka ihe ndị metụtara Jeruselem, ụlọ nsọ ya, na ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ. A sị ka a gbasowe iwu, ebe Sanhedrin nwere ikike bụ nanị na Judia. Ma ebe ọ bụ na e lere Sanhedrin anya dị ka o kwusịa o bie n’ihe banyere Iwu ndị Juu, ọ na-atụrụ ndị Juu nile nọ n’ụwa ụkpụrụ nke otú ha ga-esi na-ebi ndụ. Dị ka ihe atụ, nnukwu onye nchụàjà na ndị òtù ya nyere ndị ndú nke ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs ntụziaka ka ha nye aka hụ na e jidere ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 9:1, 2; 22:4, 5; 26:12) N’otu aka ahụ, ndị Juu bịara Jeruselem maka ememe ndị a na-eme kwa afọ na-anụta ihe ndị Sanhedrin kpebiri.

Mishnah kwuru na ọ bụ Sanhedrin na-ekpebi ihe ndị metụtara mba ahụ, ihe a ga-eme ndị ikpe na-ekwenyeghị n’ihe ha kpebiri, na ọ bụkwa ha na-ekpe ndị amụma ụgha ikpe. E kpere Jizọs na Stivin ikpe n’ụlọikpe ahụ mgbe e boro ha ebubo na ha kwuluru Chineke, kpee Pita na Jọn ikpe ebe ahụ mgbe a sịrị na ha na-eduhie mba ahụ, nọrọkwa ebe ahụ kpee Pọl ikpe mgbe e kwuru na o merụrụ ụlọ nsọ ahụ.—Mak 14:64; Ọrụ 4:15-17; 6:11; 23:1; 24:6.

Ikpe Ha Kpere Jizọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya

E wezụga n’Ụbọchị Izu Ike na n’ụbọchị nsọ ndị ọzọ, ndị Sanhedrin na-ezukọ n’obí ha kwa ụbọchị site n’oge a na-achụ àjà ụtụtụ ruo mgbe a na-achụ nke mgbede. Ọ bụ nanị mgbe ìhè dị ka ha na-ekpe ikpe. Ebe ọ bụ na a naghị agwa mmadụ na a mala ya ikpe ọnwụ ruo n’ụbọchị na-esote ụbọchị e kpere ikpe ahụ, a naghị ekpe ụdị ikpe ahụ n’ụbọchị ga-abọta Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ ụbọchị ememe. A na-adọsi ndị akaebe aka ná ntị ike ka ha ghara ịgba àmà ụgha, n’ihi na nke ahụ ga-apụta ịkwafu ọbara nke onye aka ya dị ọcha, nke ahụ abụkwanụghị obere okwu. N’ihi ya, ikpe ahụ e kpere Jizọs na ikpe ahụ a mara ya n’ụlọ Keifas n’abalị bọtara ụbọchị ememe megidere iwu. Nke ka njọ bụ na ndị ikpe ahụ ji aka ha na-achọ ndị àmà ụgha ma manye Paịlet inye iwu ka e gbuo Jizọs.—Matiu 26:57-59; Jọn 11:47-53; 19:31.

Akwụkwọ iwu ndị Juu bụ́ Talmud kwuru na ndị na-ekpe ndị metara ihe ọnwụ ikpe na-eji nwayọọ ekpe ikpe ahụ ma na-achọ otú ha ga-esi kpepụta ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, e sighị otú ahụ kpee Stivin ikpe, e sikwaghị otú ahụ kpee Jizọs ikpe, bụ́ onye ha kpere ikpe tupu ha ekpee Stivin. Nzara Stivin zaara ọnụ ya n’ihu Sanhedrin, mere ka ìgwè ndị na-eme ihe ike tụgbuo ya na nkume. E wezụga na ndị Rom bịara zọpụta Pọl, ma eleghị anya, ọ gakwaara esi otú ahụ nwụọ. N’ezie, ndị ikpe Sanhedrin gbara izu igbu ya.—Ọrụ 6:12; 7:58; 23:6-15.

Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o yiri ka mmadụ ole na ole so n’ụlọikpe ahụ hà na-akwụwa aka ọtọ. Nwa okorobịa onye Juu ahụ bụ́ onye ọchịchị nke ya na Jizọs kwurịtara okwu nwere ike ịbụ na o so ná ndị Sanhedrin. Ọ bụ ezie na akụ̀ na ụba nwoke ahụ ekweghị ya ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ọ ghaghị ịbụ na o nwere àgwà ọma, ebe ọ bụ na Jizọs kpọrọ ya ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Ya.—Matiu 19:16-22; Luk 18:18, 22.

O nwere ike ịbụ na ọ bụ egwu nke ihe ndị ikpe ibe ya ga-ekwu mere Nikọdimọs, bụ́ “onye na-achị ndị Juu,” ji jiri abalị bịakwute Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, Nikọdimọs gbachiteere Jizọs n’ihu ndị Sanhedrin site n’ịjụ ha, sị: “Iwu anyị adịghị ekpe mmadụ ikpe ma ọ́ bụghị ma ò bu ụzọ nụ n’ọnụ ya wee mara ihe ọ na-eme, ka ọ̀ na-ekpe?” Nikọdimọs mechara weta “ngwugwu maịa na ihe otite alo” iji kwado ozu Jizọs maka olili.—Jọn 3:1, 2; 7:51, 52; 19:39.

Josef onye Arimatịa, bụ́ onye ọzọ so ná ndị Sanhedrin, katara obi gwa Paịlet ka o bunye ya ozu Jizọs, o likwara ya n’ili ọhụrụ ya. Josef nọ “na-echere alaeze Chineke,” ma egwu ndị Juu ekweghị ya ka o gosipụta onwe ya dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs. Ma ezigbo ihe Josef mere bụ na ọ kwadoghị atụmatụ ọjọọ ndị Sanhedrin mere igbu Jizọs.—Mak 15:43-46; Matiu 27:57-60; Luk 23:50-53; Jọn 19:38.

Onye ọzọ so na Sanhedrin bụ́ Gameliel ji amamihe gwa ndị ikpe ibe ya ka ha hapụ ndị na-eso ụzọ Jizọs aka. Ọ gwara ha, sị: “Ma ọ bụghị ya, a pụrụ ịhụ, ma eleghị anya, na unu bụ n’ezie ndị na-alụso Chineke ọgụ.” (Ọrụ 5:34-39) Olee ihe mere na ụlọikpe ahụ ekweghị na Chineke na-akwado Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya? Kama ndị Sanhedrin ga-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ, ha chere, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama? Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha nile ga-etinye okwukwe na ya, ndị Rom ga-abịakwa weghara ma ebe anyị ma mba anyị.” (Jọn 11:47, 48) Agụụ ịnọ n’ọkwá ọchịchị mere ka ụlọikpe ndị Juu ahụ ghara ikpe ikpe ziri ezi. N’otu aka ahụ, kama ndị ndú okpukpe ahụ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gwọrọ ndị mmadụ ọrịa, ‘ekworo jupụtara ha obi.’ (Ọrụ 5:17) Dị ka ndị ikpe, ha kwesịrị ịdị na-atụ egwu Chineke ma na-ekpe ikpe ziri ezi, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị arụrụala na ndị na-adịghị akwụwa aka ha ọtọ.—Ọpụpụ 18:21; Deuterọnọmi 16:18-20.

Ikpe Chineke

N’ihi otú ndị Izrel si nupụ isi n’Iwu Chineke na ọjụjụ ha jụrụ Mezaịa ahụ, Jehova mesịrị jụ mba ahụ ma kwụsị iwere ha dị ka ndị ọ họpụtara. N’afọ 70 O.A., ndị Rom bibiri obodo Jeruselem na ụlọ nsọ ya ma kposaa ọchịchị nile nke ndị Juu, mesịakwa kposaa Sanhedrin.

Onyeikpe Jehova họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-ekpebi ma ò nwere onye so na Sanhedrin narị afọ mbụ ahụ e kwesịrị ịkpọlite n’ọnwụ na ndị n’ime ha mehiere megide mmụọ nsọ. (Mak 3:29; Jọn 5:22) Anyị ji n’aka na Jizọs ga-ekpe nnọọ ikpe ziri ezi mgbe ọ na-eme mkpebi ahụ.—Aịsaịa 11:3-5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Iji gụọ maka ndị Maccabaeus na ndị Hasmon, lee Ụlọ Nche nke November 15, 1998, peeji nke 21-24, na nke June 15, 2001, peeji nke 27-30.

^ par. 16 Mgbe Bible kwuru banyere “ndị isi nchụàjà,” ọ pụtara nnukwu ndị nchụàjà, ma onye nọ n’ọkwá ahụ mgbe ahụ ma ndị nke nọrọ na ya n’oge gara aga na ndị si n’ezinụlọ ndị ruru eru iwepụta ndị ga-anọ n’ọkwá ndị dị elu n’etiti ndị nchụàjà n’ọdịnihu.—Matiu 21:23.