Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu

EZE SOLOMỌN nke Izrel oge ochie ‘pụrụ ịtụ puku ilu atọ.’ (1 Ndị Eze 4:32) Ọ̀ dị ebe anyị nwere ike ịgụ okwu ya ndị amamihe dị na ha? Ee, ọ dị. Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, nke e dechara n’ihe dị ka afọ 717 T.O.A., bu ọtụtụ ilu Solomọn. Ọ bụ nanị isi abụọ ikpeazụ nke Ilu ka e kwuru na ọ bụ ndị ọzọ dere ha—ya bụ Agua nwa Jake na Lemuel bụ́ eze. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ kweere na Lemuel bụ aha ọzọ a na-akpọ Solomọn.

E nwere nzube abụọ e ji chịkọta okwu ndị e ji ike mmụọ nsọ kwuo n’akwụkwọ Ilu—nzube ndị ahụ bụ “ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị.” (Ilu 1:2) Ilu ndị a na-enyere anyị aka inweta amamihe, nke bụ́ inwe ike ịhụ ihe nke ọma na iji ihe ọmụma merie nsogbu. Ha na-adọkwa anyị aka ná ntị, ma ọ bụ na-azụ anyị ịkpa ezi àgwà. Ige ilu ndị a ntị na iji ihe ndị ha na-ekwu na-eme ihe pụrụ imetụta obi anyị, mee ka anyị nwekwuo obi ụtọ, meekwa ka ihe gaara anyị nke ọma ná ndụ.—Ndị Hibru 4:12.

‘NWETA AMAMIHE, JIDEKWA ỊDỌ AKA NÁ NTỊ’

(Ilu 1:1–9:18)

Solomọn kwuru, sị: “Amamihe na-eti mkpu n’èzí.” (Ilu 1:20) Olee ihe mere anyị kwesịrị iji gee ntị n’olu ya na-ada ụda na nke a na-anụ nke ọma? Isi nke 2 gwara anyị ọtụtụ uru ndị anyị ga-erite site n’inweta amamihe. Isi nke 3 kwuru otú mmadụ ga-esi bụrụ enyi Jehova. Solomọn kwuziri, sị: “Isi ihe ka amamihe bụ; nweta amamihe: ee, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Jide ịdọ aka ná ntị aka; ahala ya aka.”—Ilu 4:7, 13.

Olee ihe ga-enyere anyị aka ịjụ ụzọ rụrụ arụ nke ụwa? Ilu isi 5 zara ajụjụ ahụ site n’ịgwa anyị ka anyị jiri izuzu mee ihe ma mata ihe ndị ụwa ji arata ndị mmadụ ime ihe ọjọọ. Ihe ọzọ anyị kwesịkwara ichebara echiche bụ ihe ọjọọ ndị ime omume rụrụ arụ na-akpata. Isi nke 6 dọrọ anyị aka ná ntị banyere omume ndị nwere ike ime ka anyị na Jehova gharakwa ịdị ná mma. Isi nke 7 kpughere nnọọ otú onye na-eme omume rụrụ arụ si arata mmadụ. N’isi nke 8, e ji nnọọ okwu ndị na-eru n’obi kọwaa abamuru nke amamihe na òkù ọ na-akpọ. Isi nke 9, nke ji okwu ndị na-akpali akpali mechie ilu ndị a tụrụla atụ n’akwụkwọ ahụ, bụ akụkọ nke na-akpali anyị ịchụso amamihe.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:7; 9:10—Olee otú egwu Jehova si bụrụ “mmalite nke ihe ọmụma” na “mmalite amamihe”? Ma mmadụ enweghị egwu Jehova, onye ahụ enweghị ike inweta ihe ọmụma, n’ihi na ọ bụ Ya bụ Onye Okike nke ihe nile na Onye chepụtara Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Rom 1:20; 2 Timoti 3:16, 17) Ọ bụ Ya na-enye ihe ọmụma nile. N’ihi ya, ịtụ egwu Jehova na ịsọpụrụ Ya bụ mmalite nke ihe ọmụma. Egwu Chineke bụkwa mmalite nke amamihe n’ihi na mmadụ agaghị enwe amamihe ma o nweghị ihe ọmụma. Ọzọ, onye na-enweghị egwu Jehova agaghị eji ihe ọmụma ọ bụla o nwere wetara Onye kere ya otuto.

7:1, 2—Gịnị ka “okwu ọnụ m nile” na “ihe nile m nyere n’iwu” bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’ebe a gụnyere? E wezụga ozizi Bible, ha gụnyere iwu, ma ọ bụ ụkpụrụ ezinụlọ, bụ́ ndị nne na nna tụrụ maka ọdịmma nke ndị ezinụlọ ha. Ụmụaka kwesịrị ịdị na-erubere ụkpụrụ ndị a na ozizi Akwụkwọ Nsọ ndị nne na nna ha na-akụziri ha isi.

8:30—Ònye bụ “onye ọkà” e kwuru okwu ya ebe a? Amamihe a kọwara dị ka mmadụ kpọrọ onwe ya onye ọkà. Amamihe a a kọwara dị ka mmadụ abụghị nanị ihe nkịtị e ji kọwaa akụkụ dị iche iche nke amamihe, kama nke ahụ, ọ na-ezo aka n’Ọkpara Chineke e buru ụzọ mụọ, bụ́ Jizọs Kraịst, tupu ya abịa n’ụwa dị ka mmadụ. Ogologo oge tupu a mụọ ya dị ka mmadụ n’ụwa, ‘e kere ya ná mmalite ụzọ Chineke.’ (Ilu 8:22) Dị ka “onye ọkà,” o soro nnọọ Nna ya rụọ ọrụ mgbe Ọ na-eke ihe nile.—Ndị Kọlọsi 1:15-17.

9:17—Gịnị bụ “mmiri e zutere ezute,” n’ihi gịnịkwa ka o ji “atọ ụtọ”? Ebe ọ bụ na Bible ji ịṅụ mmiri oyi e si n’olulu mmiri dọpụta mee ihe atụ nke mmekọahụ mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enwe, mmiri e zutere ezute na-anọchi anya ịkwa iko na nzuzo. (Ilu 5:15-17) Ọ bụ mmadụ iche na ya ṅụrụ mmiri dị otú ahụ n’enweghị onye hụrụ ya na-eme ka o yie ka ọ̀ dị ụtọ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

1:10-14. Anyị kwesịrị ịmụrụ anya ka ndị mmehie wee ghara iji nkwa nke inwe akụ̀ na ụba rata anyị iso ha kpaa àgwà ọjọọ.

3:3. Anyị kwesịrị iji nnọọ ebere na eziokwu kpọrọ ihe ma na-egosipụta ha dị ka ihe olu dị oké ọnụ ahịa. Anyị kwesịkwara ide àgwà ndị a n’obi anyị, mee ka ha banye anyị n’ụmị.

4:18. A na-enweta ihe ọmụma banyere Chineke nke nta nke nta. Iji nọgide na-enweta ìhè ahụ Chineke na-enye, anyị aghaghị ịnọgide na-adị umeala n’obi.

5:8. Anyị kwesịrị ịgbara nnọọ ihe ọ bụla ga-eduba anyị n’omume rụrụ arụ ọsọ, ma ọ̀ bụ egwú, ntụrụndụ, Intanet, ma ọ bụ akwụkwọ na magazin.

5:21. Onye hụrụ Jehova n’anya ọ̀ ga-emebi mmekọrịta ya na ezi Chineke n’ihi ihe ụtọ na-adịru nwa oge? Mbanụ! Ihe ga-akasị nyere anyị aka ịnọgide na-eme omume dị ọcha bụ ịma na Jehova na-ahụ ihe anyị na-eme nakwa na anyị ga-aza ya ajụjụ maka ya.

6:1-5. Lee ezigbo ndụmọdụ e nyere anyị ebe a ịghara ‘ịnọrọ ndị mmadụ n’ibe,’ ma ọ bụ ikwe nkwa ịkwụrụ ha ụgwọ ha ji ma a chọọ ha achọọ! Ọ bụrụ na anyị echebara ihe anyị mere echiche ma chọpụta na ọ dịghị mma, anyị kwesịrị ịga ozugbo ‘rịọchie mmadụ ibe anyị ntị’ site n’ịrịọ ya arịrịọ ugboro ugboro ma mee ihe nile anyị nwere ike ime iji mezie ihe anyị mebiri.

6:16-19. Ụdị mmehie asaa ahụ a kpọrọ aha ebe a jikọtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị mmehie nile. Anyị kwesịrị ịmụta ịkpọ ha asị.

6:20-24. Iji Akwụkwọ Nsọ zụlite mmadụ nwere ike inyere ya aka ịghara ịdaba ná mmekọahụ rụrụ arụ. Ndị nne na nna kwesịrị iji inye ụdị ọzụzụ ahụ kpọrọ ihe.

7:4. Anyị kwesịrị ịmụta ịhụ amamihe na nghọta n’anya.

ILU NDỊ A TỤRỤ IJI DUZIE ANYỊ

(Ilu 10:1–29:27)

Ilu ndị ọzọ Solomọn tụrụ bụ okwu ndị dị mkpirikpi bụ́ ndị na-akụziri anyị ihe. Ilu ndị a a tụrụ n’ụdị ikwu ihe ya na ibe ya dị iche, ikwu ihe ya na ibe ya bụ otu ihe, na iji ihe atụnyere ihe ọzọ na-akụziri anyị ihe ndị bara nnọọ uru banyere àgwà na okwu ọnụ.

Isi 10 ruo isi 24 gosiri mkpa ọ dị ịtụ egwu Jehova. Ọ bụ “ndị Hezekaịa, bụ́ eze Juda” depụtaghachiri ilu ndị dị n’isi 25 ruo nke 29. (Ilu 25:1) Ilu ndị a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi dabere na Jehova na ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

10:6—Olee otú ‘ihe ike si ekpuchi ọnụ ndị na-emebi iwu’? Nke a nwere ike ịdị otú ahụ n’ihi na ndị ajọ mmadụ na-eji ire ụtọ ekpuchi echiche ọjọọ ha na-echere ndị ọzọ. Ma ọ bụkwanụ o nwere ike ịbụ na ebe ọ bụ na a na-emesikarị ndị ajọ mmadụ ike, ihe ike a na-emeso ha na-emechi ha ọnụ.

10:10—Olee otú “onye na-egbu iku anya” si akpata mwute? “Mmadụ nke jọgburu onwe ya” nwere ike ime ihe karịrị ‘ikwu ihe gbagọrọ agbagọ,’ ọ na-ejikwa akụkụ ahụ́ ya dị iche iche ekwu okwu, dị ka ihe atụ ‘igbu iku anya ya,’ iji nwaa izochi ihe o bu n’obi n’ezie. (Ilu 6:12, 13) Aghụghọ dị otú a nwere ike ịkpatara ndị ọ na-emeso ya mwute dị ukwuu.

10:29—Gịnị bụ “ụzọ Jehova”? Ụzọ a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụzọ Jehova si emeso ụmụ mmadụ ihe, ọ bụghị ụdị ndụ anyị kwesịrị ibi. Ụzọ Chineke si emeso ụmụ mmadụ ihe bụ ichebe ndị aka ha dị ọcha na ibibi ndị na-emebi iwu.

11:31—N’ihi gịnị ka e ji kwesị ịkwụghachi onye na-emebi iwu ụgwọ karịa onye ezi omume? Nkwụghachi ụgwọ a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ntaramahụhụ a ga-enye onye ezi omume na onye ajọ omume. Mgbe onye ezi omume mehiere, ụgwọ a na-akwụ ya maka mmehie ya bụ ịdọ aka ná ntị. Onye na-emebi iwu na-ama ụma eme mmehie ma jụ ichegharị mewe ezi ihe. N’ihi ya, e kwesịrị inye ya ntaramahụhụ siri ike, nke ahụ bụkwa ihe ọ na-enweta.

12:23—Olee otú mmadụ si ‘ekpuchi ihe ọmụma’? Ikpuchi ihe ọmụma apụtaghị na mmadụ anaghị egosipụtatụ ya egosipụtatụ. Kama nke ahụ, ọ pụtara na mmadụ na-eji akọ egosipụta ya, ghara iji ya na-etu ọnụ.

14:17—Olee otú o si bụrụ na ‘a na-akpọ onye na-ezu nzube ọjọọ asị’? Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “nzube ọjọọ” pụrụ ịpụta iji amamihe eme ihe ma ọ bụ iche echiche ọjọọ. N’ezie, a na-akpọ onye na-eche echiche ọjọọ asị. Ma otú ahụ ka ọ dịkwa onye na-eji amamihe eme ihe ma họrọ ‘ịghara ịbụ akụkụ nke ụwa.’—Jọn 15:19.

18:19—Olee otú ‘nwanne e jehieworo megide si dị ike karịa obodo siri ike’? Dị ka obodo siri ike nke a nọchibidoro anọchibido, onye dị otú ahụ nwere ike ịjụwapụ isi ịgbaghara mmejọ ahụ. Esemokwu dị n’etiti onye dị otú ahụ na onye mejọrọ ya pụrụ ịbụ ihe mgbochi dị ka “ihe ntụchi nile nke ụlọ elu.”

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

10:11-14. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwu anyị na-ewuli ndị ọzọ elu, anyị kwesịrị inwe ezi ihe ọmụma, ịhụnanya ana-akpali obi anyị, anyị ejirikwa amamihe na-ekwu okwu.

10:19; 12:18; 13:3; 15:28; 17:28. Ka okwu anyị na-adị ole na ole ma bụrụ ndị e chere echiche kwuo.

11:1; 16:11; 20:10, 23. Jehova chọrọ ka anyị na-akwụwa aka ọtọ n’achụmnta ego anyị.

11:4. Ọ bụ iberibe mmadụ ịhapụ ọmụmụ Bible onwe onye, ọmụmụ ihe ọgbakọ, ekpere, na ịga ozi ọma n’ihi akụ̀ na ụba.

13:4. Nanị ịdị “na-achọsi ike” inweta ibu ọrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ inweta ndụ n’ụwa ọhụrụ ezughị. Anyị aghaghịkwa ịdị na-arụsi ọrụ ike ma gbalịsie ike iru ihe ndị a chọrọ maka ha.

13:24; 29:15, 21. Nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya adịghị azụtọ ya ma ọ bụ na-eleghara mmejọ ya anya. Kama nke ahụ, ọ na-eme ihe iji gbazie nwa ya tupu àgwà ọjọọ ndị ahụ amaa ya ahụ́.

14:10. Ebe ọ na-agaghị ekwe anyị omume ikwupụtacha otú ihe dị anyị n’obi mgbe nile, ndị na-ahụ anyị enweghịkwanụ ike ịghọtacha ihe dị anyị n’obi mgbe nile, ọ bụghị mgbe nile ka ha ga-akasili anyị obi otú anyị chọrọ. Mgbe ụfọdụ, anyị aghaghị idi nsogbu anyị site n’ịdabere nanị na Jehova.

15:7. Anyị ekwesịghị ịgwa mmadụ ihe nile anyị maara otu mgbe, dị nnọọ ka onye ọrụ ubi na-adịghị awụsa mkpụrụ ọghịgha ya nile n’otu ebe. Onye maara ihe na-efesa ihe ọmụma ya obere obere n’ikwekọ ná mkpa e nwere mgbe ahụ.

15:15; 18:14. Ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka inwe ọṅụ, ọbụna mgbe anyị nọ ná nsogbu.

17:24. N’adịghị ka “onye nzuzu,” bụ́ onye anya ya na uche ya na-awagharị awagharị kama ịdịkwasị n’ihe ndị dị mkpa, anyị kwesịrị inweta nghọta ka anyị wee nwee ike ịdị na-eji amamihe eme ihe.

23:6-8. Anyị kwesịrị ịkpachara anya iji zere ịdị na-eji ihu abụọ ele ọbịa.

27:21. Otuto nwere ike igosipụta ụdị mmadụ anyị bụ. Anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi ma ọ bụrụ na otuto ahụ emee ka anyị mata na ihe ọ bụla anyị rụzuru sitere n’aka Jehova ma kpalie anyị ịnọgide na-ejere Ya ozi. Anyị na-egosi na anyị adịghị umeala n’obi ma ọ bụrụ na otuto e toro anyị emee ka anyị malite iche na anyị akala ndị ọzọ.

27:23-27. Ilu ndị a ji ihe atụ nke onye ọzụzụ atụrụ gosi mkpa ọ dị inwe afọ ojuju ka anyị na-ebi ndụ nke ahụghị ihe onwunwe n’anya na ịrụsi ọrụ ike. Ilu ndị a kwesịrị nnọọ ime ka anyị hụ mkpa ọ dị ịdabere na Chineke. *

28:5. Ọ bụrụ na anyị ‘achọọ Jehova’ site n’ikpegara ya ekpere na ịmụ Okwu ya, anyị ‘ga-enwe ike ịghọta ihe nile’ dị anyị mkpa ịghọta iji jeere ya ozi.

‘OZI NDỊ A KPỌRỌ IBU’

(Ilu 30:1–31:31)

Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu ji ozi abụọ a kpọrọ “ibu” mechie. (Ilu 30:1; 31:1) N’ozi Agua, o ji ihe dị iche iche tụnyere ibe ha n’ụzọ na-akpali mmadụ iche echiche iji gosi otú afọ na-esighị eju ndị anyaukwu nakwa otú o si bụrụ ihe na-anaghị ekwe omume ịghọta otú onye aghụghọ si eji okwu ire ụtọ enweta nwa agbọghọ. * Ọ dọkwara anyị aka ná ntị izere mpako na iji iwe ekwu okwu.

Okwu ndị ahụ nne Lemuel gwara ya nwere ndụmọdụ banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya na ikpe ikpe n’ezi omume. Nkọwa a kọwara ezigbo nwunye ji okwu ndị a mechie: “Nyenụ ya ihe sitere na nke aka ya abụọ rụtara; ka ọrụ ya nile tookwa ya.”—Ilu 31:31.

Nweta amamihe, nabata ịdọ aka ná ntị, mụta ịtụ egwu Chineke, dabere na Jehova. Lee ọtụtụ ihe bara uru anyị na-amụta n’ilu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ! Ka anyị gbalịa ike anyị nile itinye ha n’ọrụ ma nweta ụdị obi ụtọ ‘nwoke nke na-atụ egwu Jehova’ na-enweta.—Abụ Ọma 112:1.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 49 Lee Ụlọ Nche nke August 1, 1991, peeji nke 31.

^ par. 53 Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1992, peeji nke 31.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ọ bụ Jehova na-enye ezi ihe ọmụma nile

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee ihe ‘ifesa ihe ọmụma’ pụtara?