Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi

Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi

Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi

IHE ka ọtụtụ ná ndị nọ n’okpukpe ndị e nwere n’ụwa na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi, n’agbanyeghị ebe ọ ga-abụ. Otú ha si akọwa ya pụrụ ịdịgasị iche, ma n’ụzọ bụ́ isi, olileanya ha bụ otu—ibi ndụ obi ụtọ n’ebe ndị mara mma n’anwụghị anwụ. Nke a ọ́ bụghị ihe ị na-atụ anya ya? Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji nwee ọchịchọ dị otú a? Ọ̀ dị mgbe ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Onye Okike tinyere ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụmụ mmadụ site na mgbe o kere ha, malite n’oge o kere di na nwunye mbụ ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ebighị ebi ka [Chineke] tinyeworo n’obi ha.”—Eklisiastis 3:11.

Otú ọ dị, ka ọchịchọ di na nwunye mbụ ahụ nwere ịdị ndụ ebighị ebi wee mezuo, ha aghaghị ikwe ka Chineke na-ekpebiri ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha mere nke ahụ, Jehova gaara agụ ha ná ndị ruru eru ịdị ndụ ruo “mgbe ebighị ebi” n’ebe obibi ọ kwadebeere ha, ya bụ, ogige Iden.—Jenesis 2:8; 3:22.

A Tụfuo Ndụ Ebighị Ebi

Bible gosiri na Chineke kụrụ “osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” n’ubi ahụ, bụ́ nke ọ gwara Adam na Iv ka ha ghara iri mkpụrụ ya, ma ọ bụghị ya, ha ga-anwụ. (Jenesis 2:9, 17) Adam na Iv ịghara iri mkpụrụ osisi ahụ ga-egosi Chineke na ha na-erubere ya isi. Irikwanụ ya ga-egosi na ha adịghị erubere Chineke isi. Adam na Iv jụrụ irubere Jehova isi ma dụnyere Setan, bụ́ mmụọ nke jụrụ ime ihe Chineke kwuru, úkwù. N’ihi ihe a merenụ, Chineke ziri ezi ikpebi na Adam na Iv erughịzi eru ịdị ndụ ebighị ebi.—Jenesis 3:1-6.

Ihe Chineke chere ha n’ihu bụ ndụ ma ọ bụ ọnwụ, ịdị adị ma ọ bụ adịghị adị. Ihe si n’isi ha nupụrụ pụta bụ ọnwụ, ngwụsị nke ịdị adị ha. Ọ gaghị ekwe omume Adam na Iv ma ọ bụ ụmụ ha ịdịgide ndụ site n’ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ n’ihi na ha nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. *

Nnupụisi Adam wetaara ụmụ ya nile ahụhụ. Pọl onyeozi kọwara ihe siri na ya pụta. O dere, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ndị Rom 5:12.

E Weghachi Ndụ Ebighị Ebi

Pọl onyeozi gosiri ọnọdụ ụmụ Adam nọ na ya site n’iji ha tụnyere ndị ohu e nwere na narị afọ nke mbụ. N’ihi mmehie nke nne na nna ha, a mụnyere ụmụ Adam na Iv ‘n’ohu nke mmehie,’ ha agaghịkwa agbanahụ ya, nke a pụtara na ha ga na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:16, 17) Ọ bụrụ na Jehova emeghị ihe kwekọrọ n’iwu ya iji gbapụta ụmụ Adam na Iv n’ohu ha nọ na ya, ha agaghị agbanahụ ya n’onwe ha. Pọl kọwara, sị: “Dị ka amamikpe nke ụdị mmadụ nile sitere n’otu njehie [nke Adam], n’otu aka ahụkwa, site n’otu ime ihe ziri ezi, a na-akpọ ụdị mmadụ nile ndị ezi omume maka ndụ.” “Otu ime ihe ziri ezi” ahụ dugara Jizọs n’iji ndụ mmadụ ya zuru okè chụọ àjà dị ka “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ nile.” Jehova maara na ihe mgbapụta ahụ nwere ikike nke ịtọhapụ ụmụ mmadụ ‘n’ikpe’ nke “amamikpe” n‘ụzọ kwekọrọ n’iwu ahụ.—Ndị Rom 5:16, 18, 19; 1 Timoti 2:5, 6.

Ọ bụ nke a mere ndị ọkà mmụta sayensị agaghị achọtali ndụ ebighị ebi ná mkpụrụ ndụ e ketara eketa nke mmadụ. E nwere ebe ọzọ a ga-achọta ya. Dị ka Bible si kwuo, ihe kpatara ọnwụ ụmụ mmadụ na-anwụ bụ n’ihi na ha mere mmehie nakwa n’ihi na ha dara iwu, ọ bụghị n’ihi ihe si ha n’ọbara. Ihe a ga-eji weghachi ndụ ebighị ebi—àjà mgbapụta Jizọs—bụkwa ihe iwu chọrọ. Àjà mgbapụta ahụ bụkwa ihe na-egosi na Chineke bụ onye ezi omume nakwa na o nwere obiọma. Oleezi ndị ga-erite uru site n’àjà mgbapụta ahụ ma nweta ndụ ebighị ebi?

Onyinye nke Anwụghị Anwụ

Jehova bụ Chineke “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ dịghị anwụ anwụ. (Abụ Ọma 90:2) Jizọs Kraịst bụ onye mbụ Jehova nyere onyinye nke anwụghị anwụ. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Kraịst, ebe e siworo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, adịkwaghị anwụ anwụ; ọnwụ abụkwaghị nna ukwu n’ebe ọ nọ.” (Ndị Rom 6:9) N’ezie, mgbe Pọl na-akọwa ọdịiche dị n’etiti Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na ndị ọchịchị bụ́ mmadụ, ọ kọwara na ọ bụ Jizọs bụ nanị onye na-apụghị ịnwụ anwụ n’ime ha. Jizọs na-adịgide “ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” A pụghị ‘ibibi ndụ ya ebibi.’—Ndị Hibru 7:15-17, 23-25; 1 Timoti 6:15, 16.

Ọ bụghị nanị Jizọs nwetara ụdị onyinye ahụ. Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị a họọrọ ịchị dị ka ndị eze n’ebube nke eluigwe nwetakwara ụdị mbilite n’ọnwụ ahụ Jizọs nwere. (Ndị Rom 6:5) Jọn onyeozi gosiri na e nyere otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ ihe ùgwù a. (Mkpughe 14:1) Ha nwetakwara anwụghị anwụ. Pọl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ ha, sị: “Anụ ahụ́ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke . . . N’ihi na opi ahụ ga-ada, a ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnọdụ nke apụghị ire ure, a ga-agbanwekwa anyị. N’ihi na ihe a nke pụrụ ire ure aghaghị iyikwasị ereghị ure, ihe a nke pụkwara ịnwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.” Ọnwụ enweghị ike n’ahụ́ ndị nwetara ụdị mbilite n’ọnwụ a.—1 Ndị Kọrint 15:50-53; Mkpughe 20:6.

Ihe a Chineke kpughere dị nnọọ ịrịba ama. E kedịghị ndị mmụọ ozi ka ha ghara ịnwụ anwụ n’agbanyeghị na ha bụ ndị mmụọ. Ihe na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ na a ga-egbu ndị mmụọ ahụ e kere eke so Setan nupụrụ Chineke isi. (Matiu 25:41) Ma, ndị ha na Jizọs ga-eso chịa nwetara onyinye nke anwụghị anwụ, bụ́ nke na-egosi na Jehova nwere nnọọ obi ike na ha ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.

Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ nanị otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na anọ, nke dị nnọọ nta ma e jiri ha tụnyere ọtụtụ ijeri ụmụ mmadụ nọ n’ụwa, ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Mbanụ. Ka anyị hụ ihe mere anyị ji sị mba.

Ndụ Ebighị Ebi na Paradaịs Elu Ala

Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe kwuru banyere ìgwè mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị e nyere ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ndị a kpọlitere n’ọnwụ ma mee ka ha nweghachi ume na ike ntorobịa ha sokwa ha. (Mkpughe 7:9; 20:12, 13; 21:3, 4) E dugara ha ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ, bụ́ nke na-enwupụ enwupụ dị ka kristal, nke si n’ocheeze Chineke na-asọpụta.’ N’akụkụ abụọ nke mmiri ahụ, “e nwere osisi nke ndụ . . . , akwụkwọ nke osisi ndị ahụ bụkwa maka ọgwụgwọ nke mba nile.” Jehova Chineke ji obiọma na-akpọ anyị oku, sị: “Ka onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ bịakwa; ka onye ọ bụla nke chọrọnụ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:1, 2, 17.

Osisi na mmiri ndị a abụghị ọgwụ na-agbatị ndụ ma ọ bụ isi iyi nke na-eme ka mmadụ nọgide bụrụ okoro na agbọghọ, dị ka ndị nke ahụ ndị ahụ na-emepụta ọgwụ ndị e ji agbatị ndụ na ndị na-eme nchọpụta chọsiri ike. Kama nke ahụ, ha nọchiri anya ndokwa Chineke mere site n’aka Jizọs Kraịst iji mee ka ụmụ mmadụ zuo okè ọzọ.

Nzube Chineke nke bụ́ ime ka ụmụ mmadụ na-erube isi dị ndụ ebighị ebi agbanwebeghị. A ga-emezu nzube ahụ n’ihi na Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Abụ Ọma 37:29 na-ekwu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Nkwa a na-akpali anyị, tinyere ụmụ mmadụ ndị nwetara anwụghị anwụ n’eluigwe ikwupụta, sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ụzọ gị bụ nke ezi omume na nke eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi. Olee onye na-agaghị atụ gị egwu n’ezie, Jehova, ma nye aha gị otuto, n’ihi na nanị gị na-eguzosi ike n’ihe?”—Mkpughe 15:3, 4.

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike inweta onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa nke bụ́ ndụ ebighị ebi? Ya bụrụ otú ahụ, ị ghaghị ịkwụsi ike n’akụkụ “Eze mgbe ebighị ebi” ma na-erubere ya isi. Ọ dị gị mkpa ịmụ banyere Jehova na onye o si n’aka ya mee ka ụdị ndụ ahụ kwe omume, ya bụ, Jizọs Kraịst. A ga-enye ndị nile dị njikere ibi ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke tụrụ n’ihe banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi onyinye nke “ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu banyere ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, biko lee broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ọchịchọ Ndị Mmadụ Nwerela Eri Ogologo Oge

Otu ihe odide a na-akpọ Epic of Gilgamesh, nke bụ́ uri ndị Mesopotemia nke e chere na e dere ya na puku afọ abụọ T.O.A., kọrọ banyere otu dike nke chọrọ ịnọgide n’okorobịa. Ndị Ijipt oge ochie na-agbasi ozu, na-eche na ebe ọ bụ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, na ọ ga-ewereghachi ahụ́ onye o si n’ime ya pụọ ma nọgide na-adị ndụ. N’ihi nke a, n’ili ụfọdụ nke ndị Ijipt, a kwajuru ihe nile ga-adị ndị ahụ nwụrụ anwụ mkpa iji bie ndụ mgbe ha nwụsịrị.

Ọ bụ n’ihe dị ka narị afọ nke asatọ T.O.A. ka ndị China na-agbalị imepụta ihe ga-agbatị ndụ mmadụ kweere na a pụrụ ime ka mmadụ ghara ịnwụ anwụ; ha kwekwaara na narị afọ nke anọ T.O.A. na a pụrụ iji ọgwụ gbatịa ndụ mmadụ. Ndị biri ndụ n’oge ụwa na-emepebeghị anya na Europe na ndị Arab chọsiri ike ma hà ga-achọta ọgwụ na-agbatị ndụ, ha gbalịkwara imepụta nke ha. Ihe ụfọdụ ndị ha gwakọtara iji mee ọgwụ ahụ bụ nnu arsenic, mercury, na sọlfọ. E nweghị onye ma mmadụ ole ọgwụ a gburu.

E nwere otu akụkọ mgbe ochie a gbasara bụ nke a kpọrọ Isi Iyi Ntorobịa—isi iyi nke a sịrị na ọ na-eme ka mmadụ nweghachi ikike ntorobịa ya ma onye ahụ ṅụọ mmiri sitere na ya.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga Na-agwụ Ike?

Ụfọdụ chere na ndụ ebighị ebi ga na-agwụ ike, ihe ọ ga-abụ bụ iji nwayọọ nwayọọ na-egburu oge site n’ịdị na-emeghachi ihe ndị ha mere eme. Eleghị anya, ihe na-agbata ha n’obi ma ha nụ ndụ ebighị ebi bụ ịgbatịkwu ụdị ndụ a na-adị ugbu a na ọnọdụ e nwere ugbu a, bụ́ nke ọtụtụ mmadụ ga-ele anya dị ka ihe na-agwụ ike. Ma, na Paradaịs nke Chineke ga-eweghachi, ọ na-ekwe ụmụ mmadụ nkwa na “ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Ụdị ndụ a ga-enye ụmụ mmadụ ohere ịmatakwu banyere ihe ndị Jehova kere eke nakwa itinye oge n’ịmụta nkà nile ndị magburu onwe ha, ịmụ banyere ụdị ihe nile e nwere na ịrụ ihe ndị nile anyị na-apụghị ịrụ ugbu a.

Dr. Aubrey de Grey, bụ́ ọkà n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa na Mahadum Cambridge nke so na-enyocha otú a ga-esi gbatịa ndụ, kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe ike ịmụ ihe ga-agwụ ndị gụrụ akwụkwọ ma jiri ya na-eme ihe, ọ dịghịkwa mgbe ha na-agaghị enwe ihe ọhụrụ ndị ha ga-enwe mmasị ime.” Ọ bụrụgodị na ọ dị otú a, Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na-ekwu na “mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.”—Eklisiastis 3:11.